Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 3 p. 3
  • Anyị Emewela Ihe Siiri Ọtụtụ Ndị Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Emewela Ihe Siiri Ọtụtụ Ndị Ike
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu Mmalite
    Teta!—2016
  • Ozi Ọma na Narị Asụsụ Ise
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Akwụkwọ “Na-asụ” Asụsụ Ndị Dị Ndụ
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Ịchịkọta Ndị Mmadụ Site n’Asụsụ Nile
    Ozi Alaeze Anyi—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 3 p. 3
Ndị a e sere ebe a si n’agbụrụ dị iche iche

ISIOKWU TETA! A | IME KA NDỊ NA-ASỤ ASỤSỤ DỊ ICHE ICHE NỤ OZI ỌMA

Anyị Emewela Ihe Siiri Ọtụtụ Ndị Ike

E NWERE ihe dị ka puku asụsụ asaa ndị mmadụ na-asụ n’ụwa niile. Otú a e si nwee ọtụtụ asụsụ na-eme ka agụmakwụkwọ, ịga njem, ọchịchị, na azụmahịa ghara ịna-adịcha mfe. Nsogbu a dị kemgbe ụwa. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka n’afọ 475 T.O.N.K., mgbe Eze Ahazuirọs na-achị Peshia (ọ dị ka ọ bụ ya bụ Zaksis nke Mbụ), ọ dịrịghị ya mfe ime ka ndị niile ọ na-achị mara ihe o nyere n’iwu n’ihi na a na-asụ ọtụtụ asụsụ n’ime otu narị ógbè na iri abụọ na asaa ọ na-achị. E dere iwu ahụ ka ọ dị otú ógbè nke ọ bụla si ede ihe nakwa otú ha si asụ asụsụ.a

Ndị ọchịchị na ọtụtụ ndị ọzọ na-agbasa ozi taa anaghị emeli ụdị ihe ahụ Eze Ahazuirọs mere. Ma, o nwere ndị na-eme ya. Ndịàmà Jehova na-asụgharị akwụkwọ ha dị iche iche, ihe ndị a na-egere egere, vidio, nakwa Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ asaa na iri ise. Ụdị asụsụ ndị ogbi dị́ ihe dị ka iri asatọ sokwa n’asụsụ ndị ahụ. Ha na-ebipụtakwa akwụkwọ ndị ìsì n’ụdị dị iche iche.

N’agbanyeghị ihe a niile Ndịàmà Jehova na-eme, ha anaghị eji ihe ndị ha na-asụgharị akpa ego. A naghịkwa akwụ ndị nsụgharị ha na ndị na-arụrụ ha ọrụ ụgwọ. Oleezi ihe mere ha ji agba mbọ na-asụgharị ihe ndị ha na-emepụta n’ọtụtụ asụsụ, oleekwa otú ha na-esi asụgharị ha?

a Gụọ Esta 8:9 na Baịbụl gị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya