Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g18 nke 1 p. 3
  • Otú E Si Enweta Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Enweta Ya
  • Teta!—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Otú E Si Enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2018
  • Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2018
g18 nke 1 p. 3
Ebe otu nwoke na-aga n’otu ụzọ

OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ

Otú E Si Enweta Ya

Ị̀ NA-EWERE ONWE GỊ KA ONYE OBI ỤTỌ? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe mere i ji na-enwe obi ụtọ? Ọ̀ bụ n’ihi ezinụlọ gị, ọrụ gị ka ọ̀ bụ okpukpe gị? O nwere ike ịbụ na o nwere ihe ndị ị na-atụ anya ha ga-eme gị obi ụtọ, dị ka, ịgụcha akwụkwọ, inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụta ụgbọala ọhụrụ.

Ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ ma ha nweta ihe ha na-atụ anya ya ma ọ bụ mechaa ihe ha chọrọ ime. Ma, obi ụtọ ahụ ọ̀ na-adịte aka? Ọtụtụ mgbe, ọ naghị adịte aka. Ọ na-agbawakwa ha obi.

E kwuo na mmadụ na-enwe obi ụtọ, ọ pụtara na obi na-adị onye ahụ mma. Ụdị obi ụtọ a na-adịte aka, na-emekwa ka ndụ ju onye ahụ afọ.

Ihe ọzọ bụkwa na iji na-enwe obi ụtọ, ọ dịghị mkpa na anyị ga-enweta ihe niile anyị chọrọ ná ndụ, kama, anyị kwesịrị ịmụta ikwe ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ. Ọ bụrụ na mmadụ asị na ya ga-enwe obi ụtọ ma ya mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ọ pụtara na o nweghị mgbe onye ahụ ga-enwe obi ụtọ ná ndụ ya.

Iji mee ka o dokwuo anya, ka anyị jirigodị obi ụtọ tụnyere inwe ezigbo ahụ́ ike. Gịnị na-eme ka ahụ́ gbasie mmadụ ike? Onye ahụ ga-akpachara anya n’ihe ọ na-eri, otú o si emega ahụ́ na ihe ndị ọzọ ọ na-eme ná ndụ. Otú ahụkwa ka ọ dị inwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru, anyị ga na-enwe obi ụtọ.

Olee ihe ụfọdụ mmadụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịna-enwe obi ụtọ. Ụfọdụ dị mkpa karịa ibe ha. Ma ihe ndị a na-esonụ na-enye ezigbo aka:

  • INWE AFỌ OJUJU NA IMESAPỤ AKA

  • INWE EZIGBO AHỤ́ IKE NA IDI NSOGBU NDỊ BỊAARA ANYỊ

  • ỊHỤNANYA

  • MGBAGHARA

  • ỊGHỌTA IHE MERE ANYỊ JI DỊRỊ NDỤ

  • OLILEANYA

Baịbụl kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị ụzọ ha na-enweghị ntụpọ.” (Abụ Ọma 119:⁠1) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya