Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g18 nke 2 p. 15
  • 12 Nwee Ihe Ndị I Bu n’Obi Imezu ná Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 12 Nwee Ihe Ndị I Bu n’Obi Imezu ná Ndụ
  • Teta!—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE Ọ PỤTARA
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Olee otú m ga-esi eme ihe ndị m kpebiri ime?
    Teta!—2011
  • Olee Otú M Ga-esi Eme Ihe Ndị M Kpebiri Ime?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Otú Ị Ga-esi Ruo Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Ndị I Setịpụụrụ Onwe Gị
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2018
g18 nke 2 p. 15
Ebe otu nwa okorobịa na-ese ụlọ

Ihe i bu n’obi imezu dị ka ụlọ e sere ese, ị ga-agba mbọ iji rụọ ụlọ ahụ

MAKA NDỊ NA-ETO ETO

12 Nwee Ihe Ndị I Bu n’Obi Imezu ná Ndụ

IHE Ọ PỤTARA

Ihe mmadụ bu n’obi imezu dị iche na ihe onye ahụ chọrọ ka o meere ya. E nwee ihe mmadụ bu n’obi imezu, ọ ga-eme atụmatụ otú ọ chọrọ isi mee ya, dịrị njikere ime mgbanwe ma ọ́ dị mkpa, rụsiekwa ọrụ ike iji mezuo ya.

Mmadụ nwere ike nwee ihe o bu n’obi ịrụzu n’ụbọchị ole na ole ma ọ bụ n’izu ole na ole. O nwekwara ike nwee ihe o bu n’obi ịrụzu n’ọnwa ole na ole, ma ọ bụkwanụ n’ime otu afọ ma ọ bụ karịa. Ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịrụzu ihe ndị ga-ewe ya otu afọ ma ọ bụ karịa bụ ibu ụzọ mee ndị nke na-agaghị ewecha oge.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na mmadụ ana-emezu ihe ndị o bu n’obi ime, obi ga na-esikwu ya ike, ya na ndị enyi ya ana-adịkwu ná mma, ya ana-enwekwukwa obi ụtọ.

Obi ịna-esi mmadụ ike: Ọ bụrụ na i mezuo obere ihe i bu n’obi ime, ọ ga-eme ka obi kaa gị imewe ndị nke buru ibu. Ọ ga-emekwa ka obi sikwuo gị ike na ị ga-emerili nsogbu ndị nwere ike ịbịara gị n’ụbọchị, dị ka ihe atụ, ma ndị ọgbọ gị na-anwa gị ime ihe na-adịghị mma.

Gị na ndị enyi gị ịna-adị ná mma: Ndị mmadụ na-achọ ka ha na onye ma ihe ọ chọrọ ime ma dịkwa njikere ịrụ ọrụ iji mezuo ya bụrụ enyi. Ihe ọzọkwa bụ na otu n’ime ihe na-akacha enyere ndị enyi aka ịdị n’ezigbo mma bụ ịgbakọ aka iji mezuo otu ihe.

Ịna-enwe obi ụtọ: E nwee ihe i bu n’obi ime ma mechaa mezuo ya, obi ga-atọ gị ezigbo ụtọ.

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Christopher kwuru, sị: “Ọ na-amasị m inwe ihe ndị m bu n’obi imezu. Ha na-eme ka m nwee ihe m ji n’aka ime nakwa ihe m na-atụ anya ịrụzu. Mmadụ hụ na o mezuola ihe o bu n’obi ime, obi na-atọ ya ezigbo ụtọ. O nwedịrị ike ịsị: ‘Ọ̀ bụ m mechara mee ihe a? Amaghị m na m ga-emecha mee ihe a.’”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye na-ele ifufe anya agaghị agha mkpụrụ, onye na-elekwa ígwé ojii anya agaghị ewe ihe ubi.”—Ekliziastis 11:4.

IHE I NWERE IKE IME

Ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị ị chọrọ ime na otú ị ga-esi emezu ha.

Kpebie ihe ndị ị ga-achọ ime. Depụta ihe ndị ị ga-achọ ime, hazie ha n’usoro ha si dị gị mkpa.

Hazie otú ị ga-esi emezu ya. Na nke ọ bụla n’ime ihe ndị ị chọrọ ime, mee ihe ndị a na-esonụ:

  • Kwuo oge ị ga-emechali ya.

  • Hazie otú ị ga-esi eme ya.

  • Chee banyere ihe ndị nwere ike ime ka o siere gị ike imezu ya na otú ị ga-esi emeri ha.

Malite ozugbo. Echela ka ihe niile ga-adị gị mkpa iji mezuo ihe ị chọrọ zuchaa tupu gị ebido. Jụọ onwe gị, sị: “Olee ihe mbụ m kwesịrị ime iji mezuo ihe m bu n’obi ime? Mezie ihe ahụ. Nke ọ bụla i mechara, kanye ihe na ya.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya.”—Ilu 21:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya