Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 2 p. 8-9
  • Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ KA MMADỤ IDI IHE PỤTARA?
  • GỊNỊ MERE IDI IHE JI DỊ MKPA?
  • OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊNA-EDI IHE
  • Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ma O Mejọọ Ihe
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi
    Teta!—2017
  • Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 2 p. 8-9
Ebe nne na-agba nwa ya ume n’ihi na nwa ahụ na-enwe mwute na o sitaghị nri ọ na-esi

IHE NKE 3

Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe

GỊNỊ KA MMADỤ IDI IHE PỤTARA?

Ọ naghị esiri onye na-edi ihe ike inwetaghachi onwe ya ma o nwee nsogbu. Mmadụ na-esi n’ihe ndị mere ya amụta àgwà a. Otú ahụ nwatakịrị na-ada ada mgbe ụfọdụ tupu ya amụta ịga ije, ka onye ahụ ga-enwekwa nsogbu mgbe ụfọdụ tupu ihe agaara ya nke ọma ná ndụ.

GỊNỊ MERE IDI IHE JI DỊ MKPA?

Ụmụaka ụfọdụ na-ada mbà n’obi ma ihe siere ha ike, ma ihe ha na-eme agaghị nke ọma, ma ọ bụ ma mmadụ nye ha ndụmọdụ n’ihe ahụ. Ndị ọzọ na-ahapụdị ihe ahụ kpamkpam. Ma, ha kwesịrị ịghọta na:

  • Ọ bụghị mgbe niile ka ihe mmadụ na-eme na-aga nke ọma.—Jems 3:2.

  • O nweghị onye na-agaghị enwe nsogbu mgbe ụfọdụ ná ndụ ya. —Ekliziastis 9:11.

  • Ihe ga-eme ka mmadụ na-emekwu nke ọma bụ ma a na-agwa ya ebe ndị ọ na-anaghị emeta. —Ilu 9:9.

Nwa gị mụta ịna-edi ihe, ọ ga-enyere ya aka ịma na ọ ga-emerili nsogbu ndị ga-abịara ya.

OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊNA-EDI IHE

Mgbe nwa gị na-emeghị nke ọma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” —Ilu 24:16.

Nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme ka ọ ghara inwe nsogbu ahụ o nweburu. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ọ ga-eme ma ọ daa ule n’ụlọ akwụkwọ? O nwere ike ịda mbà n’obi, chee na o nweghịzi ihe ọ dị mma ya.

Nyere nwa gị aka ịmata ụzọ ọ ga-esi mewe nke ọma. Ọ ga-eme ka ọ gbalịwa imezi ihe ahụ o mehiere, kama ịnọ na-enwe mwute.

Ma, ejikwala aka gị emeziri ya ihe o mehiere. Kama, nyere ya aka ka ọ chọta ụzọ ọ ga-esi mezie ya n’onwe ya. I nwere ike ịjụ ya, sị: “Olee ihe ị ga-eme ka ị na-aghọtakwu ihe a na-akụziri unu n’ụlọ akwụkwọ?”

Mgbe nsogbu bịara.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.”—Jems 4:14.

O nweghị onye ma otú ihe ga-adịrị ya echi. Onye bụ́ aka ji akụ̀ taa nwere ike ịda ogbenye echi. Onye ahụ́ dị taa nwere ịke ịda ọrịa echi. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, ọ bụghịkwa ndị dị ike na-emeri n’agha; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”—Ekliziastis 9:11.

O doro anya na ị na-agbalị ichebe nwa gị ka ọ ghara ịba ná nsogbu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị nsogbu niile ka ị ga-echebeli nwa gị na ya.

Ebe ọ bụ na nwa gị etorubeghị ịrụwa ọrụ, nsogbu ọ ga-enwe nwere ike ọ gaghị abụ na a chụrụ ya n’ọrụ ma ọ bụkwa na ụkọ ego ji ya n’olu. Ma, e nwere nsogbu ndị ọzọ i nwere ike inyere ya aka ka o die, dị ka, mgbe ya na enyi ya sere okwu, ma ọ bụ ọnwụ onye ezinụlọ unu.a

Mgbe e nyere nwa gị ndụmọdụ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Nụrụ ndụmọdụ . . . ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.”—Ilu 19:20.

Mmadụ nye nwa gị ndụmọdụ, ọ pụtaghị na ọ kpọrọ ya asị. Kama, ọ chọrọ inyere ya aka ka o mezie ihe ọ na-anaghị emeta.

Ị kụziere nwa gị ịnabata ndụmọdụ, ọ ga-abara gị na ya uru. Otu nwoke aha ya bụ John nke nwere ezinụlọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a na-ahapụ ụmụaka mgbe ọ bụla ha mejọrọ ihe, ha agaghị amụta ihe. Ha ga na-esi n’otu nsogbu abanye n’ọzọ. Ọrụ gị ga-abụkwa ịna-agbatara ha ọsọ enyemaka mgbe ọ bụla ha banyere ná nsogbu. Ihe a ga-eme ka ndụ ghara ịna-atọ nne na nna na nwa ha ụtọ.”

Olee otú ị ga-esi nyere nwa gị aka ịna-anabata ndụmọdụ? Mgbe ọ bụla e nyere nwa gị ndụmọdụ, ma ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ̀ bụ n’ebe ọzọ, ekwukwala na ndụmọdụ ahụ ezighị ezi. Kama ime otú ahụ, jụọ ya, sị:

  • “Olee ihe i chere mere e ji nye gị ndụmọdụ a?”

  • “Olee otú ị ga-esi mezikwuo ihe?”

  • “Olee ihe ị ga-eme mgbe ọzọ ụdị ihe a mere?”

Cheta na ndụmọdụ ga-abara nwa gị uru ugbu a nakwa ma o too.

a Gụọ isiokwu bụ́ “Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2008.

Ebe nne na-agba nwa ya ume n’ihi na nwa ahụ na-enwe mwute na o sitaghị nri ọ na-esi

BIDO UGBU A KỤZIWERE NWA GỊ IHE

Ọ na-adịrị ụmụaka mụtara ịna-edi nsogbu mfe inwe ndidi n’ihe ha na-amụ na ịna-eme ihe ahụ nke ọma

Na-eme Ihe Ndị Ị Na-akụziri Nwa Gị

  • M mejọọ ihe, m̀ na-ekweta, ka m̀ na-ebo ya ndị ọzọ?

  • M̀ na-ekwu banyere ihe ndị m mejọrọ na ihe m mụtara na ha?

  • M̀ na-achị ndị ọzọ ọchị maka ihe ndị ha mejọrọ?

Ihe Anyị Mere . . .

“Anyị apaghị ụmụ anyị apa ka ha ghara inwe nsogbu ọ bụla ma ọ bụ mejọọ ihe ọ bụla. Mgbe m dị ntakịrị, idi ihe ndị ahụ baara m uru. M ga-asị na otú a anyị na-apaghị ụmụ anyị apa baara ha ezigbo uru mgbe ha toro.”—Jeff.

“Mgbe ọ bụla mụ na nwunye m mejọrọ ụmụ anyị, anyị na-arịọ ha mgbaghara. M chere na ndị nne na nna kwesịrị ịna-akọrọ ụmụ ha banyere ihe ndị ha mejọrọ na nsogbu ndị ha nwere n’oge gara aga. Ọ ga-eme ka ha mata na ihe ndị ahụ bụ ihe ha na ndụ so aga.” —James.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya