Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 2 p. 10-11
  • Kụziere Nwa Gị Ịbụ Onye A ga-atụkwasịli Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kụziere Nwa Gị Ịbụ Onye A ga-atụkwasịli Obi
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ BỤ MMADỤ ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI?
  • GỊNỊ MERE MMADỤ ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI JI DỊ MKPA?
  • OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI
  • Uru Ịrụ Ọrụ Dị n’Ụlọ Bara
    Teta!—2017
  • Ịmụta Ikwe Ka A Pụọ
    Teta!—1998
  • 8 Na-eme Ihe Ị Na-akụziri Ụmụ Gị
    Teta!—2018
  • Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 2 p. 10-11
Ebe nna na-enyere nwa ya aka ịgba ihe a kụrụ akụ mmiri

IHE NKE 4

Kụziere Nwa Gị Ịbụ Onye A ga-atụkwasịli Obi

GỊNỊ BỤ MMADỤ ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI?

Ndị a ga-atụkwasịli obi na-eme ihe ha kwuru. Ha na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere ha nke ọma, na-arụchakwa ya n’oge.

Ụmụaka nwere ike ịmụta otú ha ga-esi bụrụ ndị a ga-atụkwasịli obi n’agbanyeghị na ha ka dị ntakịrị. Otu akwụkwọ aha ya bụ Parenting Without Borders kwuru, sị: “Mgbe nwatakịrị dị ọnwa iri na ise, ọ ga na-eme ihe ọ bụla ndị mụrụ ya gwara ya mee. Ma, mgbe o ruru ọnwa iri na asatọ, ọ ga na-emezi ihe ọ bụla ọ hụrụ nne na nna ya na-eme. N’ọtụtụ ebe, ndị nne na nna na-ebido mgbe ụmụ ha dị ihe dị ka afọ ise ma ọ bụ asaa na-enye ha ọrụ ndị ha ga na-arụ n’ụlọ. Ha na-arụkwa ọrụ ndị ahụ nke ọma n’agbanyeghị na ha ka dị ntakịrị.”

GỊNỊ MERE MMADỤ ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI JI DỊ MKPA?

Ọtụtụ ụmụ okoro na agbọghọ ndị hapụrụ nne na nna ha gaa biri nke ha na-ejikwa ọsọ lọghachikwute nne na nna ha n’ihi nsogbu ndị ha na-enwe mgbe ha gara biri nke ha. Mgbe ụfọdụ, ihe mere ihe a ji eme bụ n’ihi na ha na-emefusị ego aghara aghara; ha amaghị otú e si eme ihe dị n’ụlọ, na otú ha ga-esi na-eme ihe ndị ọzọ ha kwesịrị ime.

N’ihi ya, ọ ga-akacha mma ka ị zụọ ụmụ gị ugbu a ka ha mụta ihe ndị ga-enyere ha aka ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi ma ha too. Otu akwụkwọ aha ya bụ How to Raise an Adult kwuru, sị: “Ọ gaghị adị mma ka ị na-emere ha ihe niile, ha ruzie afọ iri na asatọ, gị ahapụ ha ka ha gaa biri nke ha.”

OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI

Nye ya ọrụ ọ ga na-arụ n’ụlọ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Uru dị n’ụdị ndọgbu n’ọrụ niile.”—Ilu 14:23.

Ụmụaka na-enwekarị mmasị iso ndị mụrụ ha na-arụ ọrụ. Ihe a kwesịrị ime ka ị na-ekenye nwa gị ọrụ ọ ga na-arụ n’ụlọ.

Ndị nne na nna ụfọdụ anaghị enwe mmasị ime ya. Ha na-eche na ụmụ ha nwere ọtụtụ ihe omume e nyere ha n’ụlọ akwụkwọ ka ha mee n’ụlọ, n’ihi ya na ọ dịghị mma inyekwa ha ọrụ ọzọ n’elu nke ahụ.

Ma, ụmụaka ndị nwere ọrụ ha na-arụ n’ụlọ na-aka eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ọ na-eme ka ha mụta ịnara ọrụ e nyere ha ma rụchapụ ya. Akwụkwọ ahụ bụ́ Parenting Without Borders kwudịrị na “ọ bụrụ na anyị anaghị ekwe ka ụmụaka anyị soro anyị na-arụ ọrụ, ha too, ọ ga-eme ka ha na-eche na ọ dịghị mkpa ka ha soro na-arụ ọrụ . . . Ọ ga-emekwa ka ha na-atụ anya ka a na-emere ha ihe niile.”

Ihe a akwụkwọ a kwuru gosiri na ọ dị mkpa ka anyị zụọ ụmụ anyị ka ha soro na-arụ arụ, kama ịbụ naanị ndị oriri, ka ha na-enye enye, kama ịbụ naanị ndị ga na-anara anara. Ikenye ụmụaka ọrụ ha ga na-arụ n’ụlọ ga-eme ka ha ghọta na e ji ha kpọrọ ihe n’ezinụlọ, nakwa na ha nwere ọrụ ha kwesịrị ịna-arụ.

Nyere ụmụ gị aka ịghọta na ha ga-ata ahụhụ ihe ha mejọrọ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị, ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.”—Ilu 19:20.

Ụmụ gị mejọọ ihe, dị ka ihe atụ, ha mebie ihe mmadụ n’amaghị ama, ekpuchila ihe ahụ ha mere. Ụmụaka kwesịrị ịta ahụhụ ihe ha mejọrọ. Ha kwesịrị ịrịọ mgbaghara maka ihe ahụ ha mebiri ma ọ bụdị kwụọ ụgwọ ya ma ọ́ dị mkpa.

Ụmụ gị ghọta na ọ bụ hanwa ga-eji isi ha buru ihe ha metara, ọ ga-enyere ha aka

  • ịna-ekwu eziokwu ma na-ekweta mmejọ ha

  • ịghara ịna-ata ndị ọzọ ụta maka ihe hanwa mejọrọ

  • ịghara ịna-achọ ịgọrọ isi ha ma ha mejọọ

  • ịna-arịọ mgbaghara mgbe ọ bụla ha kwesịrị ime otú ahụ

Ebe nna na-enyere nwa ya aka ịgba ihe a kụrụ akụ mmiri

BIDO UGBU A KỤZIWERE NWA GỊ IHE

A kụziere ụmụaka otú ha ga-esi bụrụ ndị a ga-atụkwasịli obi, ọ ga-enyere ha aka ịna-eme nke ọma ma ha too

Na-eme Ihe Ndị Ị Na-akụziri Nwa Gị

  • Àdị m ike ọrụ, na-ahazi ihe m nke ọma ma na-edebe oge?

  • Ụmụ m hà na-ahụ m ebe m na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ?

  • M mejọọ ihe, m̀ na-ekweta, m̀ na-arịọkwa mgbaghara mgbe m kwesịrị ime otú ahụ?

Ihe Anyị Mere . . .

“Malite mgbe ụmụ anyị ka dị ntakịrị, m siwe nri, ha na-abịa enyere m aka. M pịawa ákwà, ha na-abịa soro m na-apịa. M na-ehicha ụlọ, ha na-abịakwa soro m na-ehicha. Ịrụ ọrụ ndị a na-atọ ha ụtọ. Ha na-enwe obi ụtọ na mụ na ha nọ, nakwa na ha so m na-eme ihe m na-eme. Ihe a bụ otú ha si mụta ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi.”—Laura.

“O nwere otu ụbọchị m nyere nwa m nwoke ekwentị ka ọ kpọọ otu enyi anyị ma rịọ ya mgbaghara maka okwu na-adịghị mma ọ gwara ya. Ruo ọtụtụ afọ, ọ bụ anyịnwa na-agwa ya ka ọ rịọ onye ọ gwara okwu n’ụzọ na-adịchaghị mma mgbaghara. Ma ugbu a, ọ mụtala ịna-eji aka ya eme ya.”—Debra.

URU NWATAKỊRỊ IJI ISI YA BURU IHE O METARA BARA

Otu onye nkụzi aha ya bụ Jessica Lahey kwuru n’otu magazin a na-akpọ Atlantic, sị: “Ụmụaka mejọọ ihe, ndị nne na nna kwesịrị ịhapụ ha ka ha si n’ihe ahụ ha mejọrọ mụta ihe. N’afọ ọ bụla, ụmụ akwụkwọ m ndị nke kacha eme nke ọma ma na-enwe obi ụtọ bụ ndị nke dara n’ule n’oge gara aga, a hapụ ha ka ha jiri isi ha buru ihe ha mejọrọ, jirikwa aka ha mezie ya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya