Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 2 p. 6-7
  • 1. Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ahụhụ Anyị Na-ata?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1. Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ahụhụ Anyị Na-ata?
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya
  • Ihe Ị Ga-echebara Echiche
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2020
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 2 p. 6-7
Ebe otu ụkọchukwu ji Baịbụl n’aka na-agwa ndị mmadụ nwụnahụrụ okwu Chukwu.

1. Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ahụhụ Anyị Na-ata?

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya

Ọtụtụ ndị achọghị ife Chineke n’ihi na ha na-ekwu na ọ bụ ya na-akpata ahụhụ anyị na-ata.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche

Ọtụtụ okpukpe na-esi n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ akụzi na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata. Dị ka ihe atụ, lee ihe ụfọdụ n’ime ha na-ekwu:

  • Ọdachi ndị na-emere onwe ha bụ ihe Chineke ji ata ụmụ mmadụ ahụhụ.

  • Ụmụaka na-anwụ n’ihi na Chineke chọkwuru ndị mmụọ ozi n’eluigwe.

  • A lụwa agha, Chineke na-enyere otu mba aka ka ha merie mba nke ọzọ.

Ọ̀ ga-abụ na ihe ndị isi okpukpe na-ekwu banyere Chineke abụghị eziokwu? Ọ bụrụkwanụ na Chineke ajụla ha?

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

Lee vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ọ dị na jw.org.

Ihe Baịbụl kwuru

Ahụhụ anyị na-ata esighị Chineke n’aka.

Ihe Baịbụl gwara anyị banyere àgwà Chineke anaghị egosi na ahụhụ anyị na-ata si ya n’aka. Dị ka ihe atụ:

“Ụzọ [Chineke] niile bụ ikpe ziri ezi. . . . Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.”​—DIUTERỌNỌMI 32:4.

“Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi!”​—JOB 34:10.

“Onye Pụrụ Ime Ihe Niile adịghịkwa agbagọ ikpe.”​—JOB 34:12.

Chineke anaghị anabata okpukpe ndị na-aghagide ya ụgha.

Okpukpe niile na-etinye aka n’ịlụ agha na ime ihe ike, na ndị nke na-ekwu na Chineke na-ata anyị ahụhụ, socha n’okpukpe ndị Chineke na-anaghị anabata.

“Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m [ya bụ, aha Chineke]. Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu. . .  Aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.”​—JEREMAYA 14:14.

Jizọs katọrọ ndị okpukpe okwu ọzọ eme ọzọ.

“Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?’ Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.”​—MATIU 7:​21-23.

Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata?

Weregodị ya na otu nwoke na-azụ ụmụ ya nke ọma, na-emekwa ike ya niile iji na-egboro ha mkpa ha. E mechaa, otu n’ime ụmụ ya enupụrụ ya isi ma hapụ ụlọ pụọ, malite ibi ndụ ọjọọ. Ànyị ga-asị na ọ bụ nna ahụ mere nwa ya ji biwe ndụ ọjọọ? Ọ bụrụ na nwa ahụ emechaa daba ná nsogbu, ọ̀ ga-asị na ọ bụ nna ya kpatara ya? N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwu na ọ bụ Chineke kpatara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata.

Ma, ọ̀ pụtara na ọ bụ anyịnwa ka ụta dịịrị maka ahụhụ anyị na-ata?

Gụọ ajụjụ nke 2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya