4. È Kere Anyị Ka Anyị Na-ata Ahụhụ?
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya
Ịmata azịza ajụjụ a nwere ike ịgbanwe otú anyị si ele ihe anya.
Ihe Ị Ga-echebara Echiche
Chineke, onye kere ọmarịcha ihe ndị dị n’ụwa a, ọ̀ ga-eke anyị ka anyị na-ata ahụhụ?
N’ihi ahụhụ anyị na-ata, ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe na-akatọ Chineke ma ọ bụ na-ekwu na Chineke adịghị. Ha kweere na ahụhụ anyị na-ata na-egosi na (1) Chineke agaghị akwụsịli ya, (2) Chineke achọghị ịkwụsị ya, ma ọ bụkwanụ (3) na Chineke adịghị.
È nwere ụzọ ọzọ e nwere ike isi lee okwu a anya?
MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ
Lee vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? Ọ dị na jw.org.
Ihe Baịbụl Kwuru
Chineke ekeghị anyị ka anyị na-ata ahụhụ.
Ọ chọrọ ka ndụ na-atọ anyị ụtọ.
“Ọ dịghị ihe dịịrị ha mma karịa ịṅụrị ọṅụ na ime ihe ọma n’oge ndụ ha; nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.”—EKLIZIASTIS 3:12, 13.
Chineke nyere nne na nna anyị mbụ ihe niile dị ha mkpa.
O nweghị mgbe o bu n’obi ka ha na ụmụ ha na-ata ahụhụ.
“Chineke wee sị ha: ‘Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.’”—JENESIS 1:28.
Nne na nna anyị mbụ kpebiri inupụrụ Chineke isi.
Ọ bụ otú a ka ha si jiri aka ha kpatara onwe ha na ụmụ ha ahụhụ.
“Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—NDỊ ROM 5:12.a
Chineke ekeghị anyị ka anyị jiri aka anyị na-eduzi onwe anyị.
E keghị anyị ka anyị na-achị onwe anyị otú ahụ a na-ekeghị anyị ka anyị biri n’ime mmiri.
“Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—JEREMAYA 10:23.
Chineke achọghị ka anyị na-ata ahụhụ.
Ọ chọrọ ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji zere nsogbu.
“A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri.”—AỊZAYA 48:18.
a Na Baịbụl, “mmehie” apụtaghị naanị ime ihe ọjọọ, kama, ọ pụtakwara ọnọdụ nne na nna anyị mbụ mụbara anyị niile n’ime ya.