Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 18
  • Jekọb Ejee Heran

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jekọb Ejee Heran
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jekọb Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ụmụnne Nwanyị Abụọ Obi Na-adịghị Mma “Wuru Ụlọ Izrel”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jekọb Enwee Ezinụlọ Buru Ibu
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Mgbalị Siri Ike—Olee Mgbe Jehova Na-agọzi Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 18
Mgbe ụmụ nwoke ndị si obodo Heran na-agwa Jekọb banyere Leban na Rechel nwa ya nwaanyị

AKỤKỌ NKE 18

Jekọb Ejee Heran

Ị̀ MA ndị a Jekọb na-agwa okwu? Mgbe o mesịrị njem ọtụtụ ụbọchị, Jekọb zutere ha n’akụkụ olulu mmiri. Ha na-elekọta atụrụ ha. Jekọb jụrụ ha, sị: ‘Olee ebe unu si bịa?’

‘Heran,’ ka ha zara.

‘Ùnu ma Leban?’ ka Jekọb jụrụ ha.

Ha zara ‘Ee. Lee, nwa ya nwaanyị bụ́ Rechel ka o du ìgwè atụrụ ya na-abịa.’ Ị̀ na-ahụ Rechel n’ebe ahụ ka ọ na-abịa?

Mgbe Rechel na-elekọta atụrụ nna ya

Mgbe Jekọb hụrụ Rechel na atụrụ nwanne nne ya, bụ́ Leban, o jere bupụ nkume dị n’olulu mmiri ahụ ka ha wee ṅụọ mmiri. Jekọb wee sutu Rechel ọnụ ma gwa ya onye ọ bụ. Rechel nwere obi ụtọ nke ukwuu, ọ laa n’ụlọ wee gwa nna ya, bụ́ Leban.

Obi tọrọ Leban ụtọ nke ukwuu oge Jekọb nọnyeere ya. Mgbe Jekọb kwuru na ya chọrọ ịlụ Rechel, obi tọrọ Leban ụtọ. Ma, ọ gwara Jekọb ka ọ rụọ ọrụ n’ubi ya ruo afọ asaa n’ihi Rechel. Jekọb mere nke a n’ihi na ọ hụrụ Rechel n’anya nke ukwuu. Ma mgbe oge ruru ka ọ lụọ ya, ị̀ ma ihe mere?

Leban kpọnyere Jekọb nwa ya nwaanyị bụ́ Lia, bụ́ onye tọrọ Rechel, kama ịkpọnye ya Rechel. Mgbe Jekọb kwere ịrụrụ ya ọrụ afọ asaa ọzọ, ọ kpọnyere ya Rechel ka ọ bụrụ nwunye ya. Chineke kwere ka ndị ikom n’oge ahụ na-enwe karịa otu nwunye. Ma dị ka Bible na-egosi ugbu a, nwoke ga-enwe nanị otu nwunye.

Jenesis 29:1-30.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya