Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 20
  • Daịna Abanye ná Nsogbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Daịna Abanye ná Nsogbu
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zere Mkpakọrịta Ọjọọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • ‘Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ’
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Jekọb Enwee Ezinụlọ Buru Ibu
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ahụ́ Ga-eru Gị Ala Ma Gị na Ndị Chineke Nọrọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 20
Daịna na Shikem

AKỤKỌ NKE 20

Daịna Abanye ná Nsogbu

Ị̀NA-AHỤ ndị Daịna na-eje ileta? Ọ na-eje ịhụ ụfọdụ ụmụ agbọghọ ndị bi n’ala Kenan. Nna ya Jekọb ọ̀ ga-enwe obi ụtọ banyere nke a? Iji nye aka ịza ajụjụ nke a, lee ma ị ga-echeta ihe Ebreham na Aịzik kwuru banyere ndị inyom Kenan.

Ụmụ agbọghọ atọ ndị Kenan

Ebreham ọ̀ chọrọ ka Aịzik nwa ya lụrụ nwa agbọghọ Kenan? Ọ chọghị. Aịzik na Ribeka hà chọrọ ka Jekọb nwa ha lụrụ nwa agbọghọ Kenan? Ee e, ha achọghị. Ị̀ ma ihe kpatara ya?

Ọ bụ n’ihi na ndị Kenan na-efe chi ụgha ofufe. Ha abụghị ezigbo ndị e kwesịrị inwe dị ka di ma ọ bụ nwunye, ha abụghịkwa ezigbo ndị e kwesịrị inwe dị ka ndị enyi. O doro anya na Jekọb enweghị obi ụtọ na nwa ya nwaanyị na ụmụ agbọghọ ndị Kenan ndị a bụ enyi.

N’ezie, Daịna bara ná nsogbu. Ị̀ na-ahụ nwoke Kenan nke na-ele Daịna anya na foto a? Aha ya bụ Shikem. Otu ụbọchị, mgbe Daịna jere ileta ndị enyi ya, Shikem duuru ya wee dinaa ya n’ike. Nke a adịghị mma n’ihi na ọ bụ naanị ndị ikom na ndị inyom bụ́ di na nwunye kwesịrị idinakọ. Ihe ọjọọ a Shikem mere Daịna kpatara nsogbu ndị ọzọ.

Mgbe ụmụnne ndị ikom nke Daịna nụrụ ihe merenụ, ezigbo iwe were ha. Mmadụ abụọ n’ime ha, Simiọn na Livaị, were ezigbo iwe nke na ha weere mma agha ha jee n’ime obodo ahụ ma nweta ndị ikom ahụ na mberede. Ha na ụmụnne ha gburu Shikem na ndị ikom ndị ọzọ niile. Jekọb were iwe na ụmụ ya mere ihe ọjọọ a.

Olee otú nsogbu a niile si malite? Ọ bụ n’ihi na Daịna metere ndị na-adịghị ege iwu Chineke ntị enyi. Anyị agaghị achọ ime ndị dị otú a enyi, ànyị ga-achọ?

Jenesis 34:1-31.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya