Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 21
  • Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ò Nwere Mgbe Ị Na-enwere Ndị Mmadụ Anyaụfụ? Ụmụnne Josef Nweere Ya Anyaụfụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Biko, Geenụ Ntị ná Nrọ A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Ànọ M n’Ọnọdụ Chineke?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 21
Ụmụnne Josef eree ya ka ohu

AKỤKỌ NKE 21

Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị

LEGODỊ otú nwa okoro a si nọrọ nnọọ ná mwute ma yie onye na-enweghị olileanya. Onye a bụ Josef. Ụmụnne ya eresịla ya ndị ikom ndị a na-eje Ijipt. Josef gaje ịbụ ohu n’ebe ahụ. Gịnị mere ụmụnne ya ji mee ihe ọjọọ nke a? Ọ bụ n’ihi na ha na-emere Josef anyaụfụ.

Nna ha Jekọb hụrụ Josef n’anya nke ukwuu. O gosipụtara ịhụnanya ya site n’imere ya ogologo uwe mara mma. Mgbe ụmụnne ya iri, ndị tọrọ ya, hụrụ otú Jekọb si hụ Josef n’anya, ha malitere imere Josef anyaụfụ na ịkpọ ya asị. Ma ọ dịkwa ihe ọzọ mere ha ji kpọọ ya asị.

Josef rọrọ nrọ abụọ. N’ime nrọ abụọ ahụ, ụmụnne ya kpọrọ isiala nye ya. Mgbe Josef kọọrọ ụmụnne ya nrọ ndị a, ha kpọrọ ya asị ọbụna karị.

Otu ụbọchị, mgbe ụmụnne ya ndị okenye na-elekọta atụrụ nna ha, Jekọb gwara Josef ka o jee lee otú ha na-eme. Mgbe ụmụnne Josef hụrụ ya ka ọ na-abịa, ụfọdụ n’ime ha wee sị: ‘Ka anyị gbuo ya!’ Ma Ruben, bụ́ nwanne ya nke kasị okenye, sịrị: ‘Mba, unu emela otú ahụ!’ Kama nke ahụ, ha jidere Josef wee tụba ya n’ime otu olulu nke mmiri na-adịghị. Ha wee nọdụ ala iji kpebie ihe a ga-eme ya.

Mgbe ụmụnne Josef na-anara ndị Ishmel ego ha ji ree nwanne ha

N’oge ahụ, e nwere ụfọdụ ndị Ishmel na-agafe. Juda wee sị ụmụnne ya: ‘Ka anyị resị ya ndị Ishmel ndị a.’ Otú ahụkwa ka ha mere. Ha rere Josef iri mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ. Lee obi ọjọọ na arụrụala nke ahụ bụ!

Gịnị ka ụmụnne ya ga-agwa nna ha? Ha gburu ewu wee sụnye uwe Josef nke mara mma n’ime ọbara ewu ahụ ọtụtụ ugboro. Ha wegaara nna ha Jekọb uwe ahụ n’ụlọ wee sị ya: ‘Anyị chọtara uwe a. Lee ya anya, mara ma ọ̀ bụ uwe Josef.’

Jekọb hụrụ na ọ bụ ya. O wee kwaa ákwá, sị: ‘Anụ ọjọọ egbuwo Josef.’ Nke ahụ bụ nnọọ ihe ụmụnne Josef chọrọ ka nna ha chee. O wutere Jekọb nke ukwuu. O bere ákwá ọtụtụ ụbọchị. Ma ọ dịghị ọnwụ Josef nwụrụ. Ka anyị hụ ihe mere ya n’ebe ahụ e duuru ya jee.

Jenesis 37:1-35.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya