Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 49
  • Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Joshụa na Ndị Gibiọn
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Joshụa 1:9—‘Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike’
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Ihe Jọshụa Chetara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ọ Chọrọ Ka Ihe Gaara Anyị nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 49
Mgbe Jọshụa na-agwa anyanwụ ka ọ kwụrụ otu ebe

AKỤKỌ NKE 49

Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe

LEE Jọshụa. Ọ na-asị: ‘Anyanwụ, kwụrụ otu ebe!’ Anyanwụ ahụ wee kwụrụ otu ebe. Ọ kwụụrụ n’ebe ahụ n’etiti mbara igwe ruo otu ụbọchị zuru ezu. Ọ bụ Jehova mere ka anyanwụ kwụrụ otu ebe! Ma ka anyị hụ ihe mere Jọshụa ji chọọ ka anyanwụ ahụ nọgide na-acha.

Mgbe ajọ ndị eze ise nke Kenan malitere ibuso ndị Gibiọn agha, ndị Gibiọn zipụrụ mmadụ ịrịọ Jọshụa ka ọ bịa nyere ha aka. O wee sị ya: ‘Bịakwute anyị ọsọ ọsọ! Zọpụta anyị! Ndị eze niile nke mba ndị dị n’ugwu abịawo ibuso ndị ohu gị agha.’

Ngwa ngwa, Jọshụa na ndị agha ya niile wee jee. Ha jere ije ogologo abalị ahụ niile. Mgbe ha jeruru Gibiọn, ndị agha nke ndị eze ise ahụ tụrụ egwu, wee malite ịgba ọsọ. Jehova wee mee ka oké àkụ́ mmiri igwe si n’eluigwe daa, akụ̀ mmiri igwe ahụ gburu ọtụtụ ndị agha karịa nke ndị agha Jọshụa gburu.

Jọshụa hụrụ na anyanwụ ga-ada n’oge na-adịghị anya. Ọchịchịrị ga-agba, ọtụtụ n’ime ndị agha nke ajọ ndị eze ise ahụ ga-agbalagakwa. Nke a mere Jọshụa ji kpegara Jehova ekpere, wee sị: ‘Anyanwụ, kwụrụ otu ebe!’ Mgbe anyanwụ ahụ nọgidere na-acha, ndị Izrel bịara nwee ike imeri n’agha ahụ.

E nwere ọtụtụ ndị eze ọjọọ ọzọ na Kenan bụ́ ndị kpọrọ ndị Chineke asị. O were Jọshụa na ndị agha ya ihe dị ka afọ isii imeri ndị eze iri atọ na otu nke ala ahụ. Mgbe ha nwesịrị mmeri ndị a, Jọshụa si n’ala Kenan ahụ wepụta ala o kenyere ebo Izrel ndị ka chọrọ ala.

Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Jọshụa nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na afọ iri. N’oge niile ahụ ya na ndị enyi ya nọ ndụ, ndị Izrel rubeere Jehova isi. Ma mgbe ndị ezi mmadụ a nwụsịrị, ndị Izrel malitere ime ihe ọjọọ na inwe nsogbu. Nke a bụ oge enyemaka Chineke dị ha mkpa n’ezie.

Joshua 10:6-15; 12:7-24; 14:1-5; Ndị Ikpe 2:8-13.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya