Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 78
  • Ihe Aka Dere ná Mgbidi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Aka Dere ná Mgbidi
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu Anọ Ndị Gbanwere Ụwa
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Daniel—Akwụkwọ A Na-ekpe Ikpe
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Alaeze Ukwu Efunahụ Otu Eze Dị Nganga
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 78
Mgbe Eze Belshaza na ndị ọbịa ya na-ele anya ka otu aka na-ede ihe n’ahụ́ mgbidi

AKỤKỌ NKE 78

Ihe Aka Dere ná Mgbidi

GỊNỊ na-eme n’ebe a? Ndị a nọ n’oké oriri. Eze Babilọn kpọrọ otu puku mmadụ bụ́ ndị ukwu oriri. Ha ji iko ọlaedo na iko ọlaọcha na arịa ndị e weere n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem na-aṅụ mmanya. Ma, na mberede, a hụrụ mkpịsị aka mmadụ nke malitere ide ihe ná mgbidi ụlọ ahụ. Egwu jidere mmadụ niile.

Ọ bụ Belshaza, nwa nwa Nebukadneza, bụ eze nke na-achị mgbe ahụ. O tiri mkpu ka e duta ndị amamihe ya. Ọ sị ha: ‘Onye ọ bụla nke pụrụ ịgụ ihe odide nke a na ịkọrọ m isi ya, aga m enye ya ọtụtụ onyinye, m ga-emekwa ya onyeisi nke atọ kachasị mkpa n’alaeze m.’ Ma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị amamihe ya pụrụ ịgụ ihe ahụ e dere ná mgbidi ma ọ bụ ịkọ isi ya.

Nne eze wee nụ mkpọtụ ahụ, wee bata n’ime ụlọ oriri ahụ. O wee sị eze: ‘Biko atụla egwu hie nne. Ọ dị otu nwoke nọ n’alaeze gị nke maara chi dị nsọ. Mgbe nna nna gị bụ́ Nebukadneza bụ eze, o mere ya onyeisi ndị amamihe ya. Aha ya bụ Daniel. Zie ozi ka a kpọọ ya, ọ ga-akọrọ gị isi ihe a niile.’

E dutara Daniel ngwa ngwa. Mgbe ọ jụsịrị ịnara onyinye ọ bụla, ọ malitere ịkọ ihe mere Jehova ji chụtuo nna nna Belshaza, bụ́ Nebukadneza, n’ocheeze ya. Daniel sịrị: ‘Ọ dị mpako nke ukwuu. Jehova wee nye ya ahụhụ.’

Daniel wee sị Belshaza: ‘Gị onwe gị maara ihe niile mere ya, ma gị agaa n’ihu na-adị mpako dị ka Nebukadneza. I jiwo iko na arịa niile a chịtara n’ụlọ nsọ Jehova ṅụọ ihe ọṅụṅụ. I fewo chi ndị e ji osisi na nkume mee, ị sọpụrụghịkwa Onye Okike ukwu anyị. Ọ bụ ya mere Chineke ji zite aka ahụ ide okwu ndị a.

Ebe otu aka na-ede MENE, MENE, TEKEL na PARSIN n’ahụ́ mgbidi

‘Nke a bụ ihe e dere,’ ka Daniel sịrị: ‘MEʹNE, MEʹNE, TEʹKEL na PARʹSIN.’

‘MEʹNE pụtara na Chineke agụwo ụbọchị alaeze gị ọnụ, ma weta ya ná njedebe. TEʹKEL pụtara na a tụwo gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ wee hụ na ị bụghị ezigbo mmadụ. PARʹSIN pụtara na e nyewo ndị Midia na ndị Peshia alaeze gị.’

Mgbe Daniel ka kpụ nnọọ okwu n’ọnụ, ndị Midia na ndị Peshia malitere ibuso Babilọn agha. Ha dọọrọ obodo ahụ n’agha, wee gbuo Belshaza. Ihe ahụ aka dere ná mgbidi mezuru kpọmkwem n’abalị ahụ! Ma gịnị ga-eme ụmụ Izrel ugbu a? E mesịa, anyị ga-achọpụta nke ahụ, ma, ka anyị buru ụzọ hụ ihe mere Daniel.

Daniel 5:1-31.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya