Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 106
  • A Tọhapụ Ha n’Ụlọ Mkpọrọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Tọhapụ Ha n’Ụlọ Mkpọrọ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Ha Bụ Ndị Nkịtị Na-agụghị Akwụkwọ”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Jehova Bụ Onye Na-achị Anyị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 106
Mgbe mmụọ ozi meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ, gwa ndịozi Jizọs ka ha laa

AKỤKỌ NKE 106

A Tọhapụ Ha n’Ụlọ Mkpọrọ

LEE mmụọ ozi nke na-emeghe ibo ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ. Ndị ikom ọ na-akpọpụta bụ ndịozi Jizọs. Ka anyị chọpụta ihe mere e ji tụọ ha mkpọrọ.

Ọ dịbeghị anya a wụsara mmụọ nsọ n’isi ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma lee ihe merenụ: Otu ehihie, Pita na Jọn jere n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. N’ebe ahụ, otu nwoke nke dara ngwụrọ kemgbe a mụrụ ya nọ nso n’ọnụ ụzọ. Ndị mmadụ na-ebuga ya ebe ahụ kwa ụbọchị ka o wee rịọ ego n’aka ndị na-aba n’ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn, ọ rịọrọ ha ka ha nyetụ ya ihe. Gịnị ka ndịozi ahụ ga-eme?

Ha kwụsịrị lee nwoke ogbenye ahụ anya. Pita sịrị ya: ‘Enweghị m ego, ma ihe m nwere ka m ga-enye gị. N’aha Jizọs, bilie jee ije!’ Pita wee jide nwoke ahụ n’aka nri, o wee wụlie elu ozugbo, malite ije ije. Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe merenụ, o juru ha anya, ha enweekwa ezi obi ụtọ n’ọrụ ebube ahụ.

Pita sịrị ha: ‘Ọ bụ n’ike nke Chineke, onye mere ka Jizọs bilite n’ọnwụ, ka anyị rụrụ ọrụ ebube a.’ Mgbe ya na Jọn na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị ndú okpukpe bịara. Ha were iwe na Pita na Jọn na-agwa ndị mmadụ na a kpọlitewo Jizọs n’ọnwụ. N’ihi ya, ha jidere ha ma tụọ ha mkpọrọ.

N’echi ya, ndị ndú okpukpe ahụ nwere nnọkọ. A kpọbatara Pita na Jọn na onye ahụ ha gwọrọ. Ndị ndú okpukpe ahụ wee jụọ ha, sị: ‘N’ike ònye ka unu rụrụ ọrụ ebube a?’

Pita gwara ha na ọ bụ n’ike Chineke, onye mere ka Jizọs si n’ọnwụ bilie. Ndị nchụàjà ahụ amaghị ihe ha ga-eme, n’ihi na ha apụghị ịgọnahụ na ọrụ ebube ahụ emeghị eme n’ezie. Ya mere, ha dọrọ ndịozi ahụ aka ná ntị ka ha ghara ikwu okwu ọzọ banyere Jizọs, wee hapụ ha ka ha laa.

Ka ụbọchị na-aga, ndịozi ahụ nọgidere na-ekwusa banyere Jizọs, na-agwọkwa ndị ọrịa. Akụkọ banyere ọrụ ebube ndị a gbasara. N’ihi ya, ọbụna ìgwè mmadụ si n’obodo niile dị Jeruselem nso na-ekutere ndịozi ahụ ndị ọrịa ka ha gwọọ ha. Nke a mere ka ndị ndú okpukpe ahụ na-emere ha anyaụfụ, ha wee dọkpụrụ ndịozi ahụ tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Ma ha anọghị ebe ahụ ogologo oge.

N’abalị, mmụọ ozi Chineke meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ, dị ka ị na-ahụ n’ebe a. Mmụọ ozi ahụ wee sị ha: ‘Gaanụ guzoro n’ụlọ nsọ Chineke, nọgidenụ na-agwa ndị mmadụ okwu.’ N’ụtụtụ echi ya, mgbe ndị ndú okpukpe zigara ndị ikom n’ụlọ mkpọrọ ahụ ka ha dute ndịozi ahụ, ha anọghịzi ya. Mgbe e mesịrị, ndị ikom ahụ hụrụ ha ebe ha na-ezi ihe n’ụlọ nsọ, ha eduru ha gaa n’ụlọ nzukọ Sanhedrin.

Ndị ndú okpukpe ahụ wee sị ha: ‘Anyị nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izi ihe ọzọ banyere Jizọs. Ma unu ejiwo ozizi unu zijupụta Jeruselem.’ Ndịozi ahụ wee zaa ha, sị: ‘Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’ Ha wee nọgide na-ekwusa “ozi ọma.” Nke ahụ ọ́ bụghị ezi ihe nlereanya nke anyị ga-agbaso?

Ọrụ isi 3 ruo isi 5.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya