Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 112
  • Ụgbọ Ha Ekpuo n’Otu Agwaetiti

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụgbọ Ha Ekpuo n’Otu Agwaetiti
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Pụrụ Ichebe Anyị
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Jizọs Gara Ije n’Elu Mmiri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Pọl Emerie Ihe Isi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • N’Oké Osimiri Galili
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 112
Mgbe Pọl na ndị ha na ya so si n’ụgbọ mmiri ha kpuru ekpu pụta n’ikpere mmiri obodo Mọlta

AKỤKỌ NKE 112

Ụgbọ Ha Ekpuo n’Otu Agwaetiti

LEE! ụgbọ mmiri ahụ nọ ná nsogbu! Ọ na-etiwasị! Ị̀ na-ahụ ndị ahụ mabanyere n’ime mmiri? Ụfọdụ n’ime ha eruwala n’elu ala. Onye ahụ ọ̀ bụ Pọl? Ka anyị chọpụta ihe nọworo na-eme ya.

Cheta na e ji Pọl eji ruo afọ abụọ n’ime Sesaria. Mgbe e mesịrị, e tinyere ya na ndị mkpọrọ ndị ọzọ n’ụgbọ mmiri, ha wee gawa Rom. Mgbe ha gafere na nso agwaetiti Krit, ajọ ifufe malitere ife. Ifufe ahụ fesiri ike nke na ha apụghịzi iduzi ụgbọ ahụ ọzọ. Ha apụghịkwa ịhụ anyanwụ n’ehihie ma ọ bụ kpakpando n’abalị. N’ikpeazụ, mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ndị nọ n’ime ụgbọ ahụ enweghịzi olileanya na a ga-azọpụta ha.

Pọl wee bilie ọtọ, sị ha: ‘Ọ dịghị onye n’ime unu ga-anwụ, ọ bụ naanị ụgbọ a ga-ala n’iyi. N’ihi na n’abalị gara aga, mmụọ ozi Chineke bịakwutere m, sị, “Atụla egwu, Pọl! Ị ghaghị iguzo n’ihu Siza onye ọchịchị Rom. Chineke ga-azọpụtakwa ndị niile gị na ha nọ n’ime ụgbọ.”’

Ihe dị ka n’ime abalị n’ụbọchị iri na anọ kemgbe oké ifufe ahụ malitere, ndị na-anya ụgbọ mmiri ahụ chọpụtara na mmiri ahụ adịchaghịzi omimi! N’ihi ịtụ egwu na ụgbọ ahụ ga-etiwasị na nkume n’ọchịchịrị ahụ, ha tụdara arịlịka ha. N’ụtụtụ echi ya, ha hụrụ ụsọ mmiri. Ha kpebiri ịnyara ụgbọ ahụ ruo kpọmkwem n’ụsọ mmiri ahụ.

Ma mgbe ha ruru ụsọ osimiri ahụ nso, ụgbọ ha metụrụ mkputamkpu ájá wee tọ na ya. Ebili mmiri wee malite itiwasị ya. Onyeisi ndị agha nke na-elekọta ha sịrị ha: ‘Unu ndị pụrụ igwu mmiri, burunụ ụzọ maba n’oké osimiri, gwupụnụ n’elu ala. Ndị ọzọ, soronụ ha maba ma jidenụ iberibe osisi ndị a tikapụtara n’ụgbọ a aka.’ Ọ bụkwa ihe ha mere. N’ụzọ dị otú a, narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ ruru n’elu ala n’udo, dị nnọọ ka mmụọ ozi ahụ kwere ná nkwa.

A na-akpọ agwaetiti ahụ Mọlta. Ndị ala ahụ nwere obiọma, ha wee lekọta ndị si n’ụgbọ ahụ pụta. Mgbe ihu igwe bịara dị mma, e tinyere Pọl n’ụgbọ ọzọ, buru ya gawa Rom.

Ọrụ 27:1-44; 28:1-14.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya