Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 1 p. 4-9
  • Ndụ Obi Ụtọ Ọ̀ Ga-ekwe Nnweta n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Obi Ụtọ Ọ̀ Ga-ekwe Nnweta n’Ezie?
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È Nwere Nzube Dị ná Ndụ?
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ndụ Gị—gịnị Bụ Nzube ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “Ọrụ Mmadụ Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Gịnị Na-eme Ka Ndụ Nwee Ezi Nzube?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 1 p. 4-9

Isi 1

Ndụ Obi Ụtọ Ọ̀ Ga-ekwe Nnweta n’Ezie?

1-10. Gịnị ka a chọrọ iji nwee obi ụtọ ná ndụ?

“ỌDỊ mma ịdị ndụ!” Nke ahụ bụ mmetụta mmadụ na-enwe mgbe obi dị ya ụtọ. Ma ọ bụrụ na anyị echee ihe bụ eziokwu ihu, anyị maara na ndụ adịghị adị otú ahụ mgbe nile. E nwere nsogbu dị iche iche. Ndị a pụrụ ịdị ọtụtụ nke ukwuu ma bụrụ oké ibu arọ nke na ezi obi ụtọ na-eyi nanị nrọ. Ò kwesịrị ịdị otú ahụ?

2 Ị maara na ọ bụ ihe dịgasị iche iche na-emejupụta ndụ obi ụtọ. Iji dị ndụ obi ụtọ, ọ dị anyị mkpa iri nri n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu, na iyi ákwà kwesịrị ekwesị. Anyị chọrọ ebe obibi bụ́ ebe anyị pụrụ inweta nchebe na izu ike. Ma ihe ndị a bụ nanị ihe ndị bụ isi. Mkpakọrịta na-enye obi ụtọ na ezi ahụ ike dịkwa mkpa.

3 Ma ọbụna ndị nwere ihe ndị a n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ka pụkwara ịdị na-achọ ezi obi ụtọ. Ụdị ọrụ mmadụ na-arụ, ma ọ bụ ụdị ọnọdụ ndị ọ na-aghaghị ịrụ ọrụ na ha, pụrụ ịnapụ ya afọ ojuju. Ọzọkwa, n’ọtụtụ ezinụlọ, e nwere esemokwu n’etiti di na nwunye ma ọ bụ ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha. Anyị apụghịkwa ilefuru anya na o kwere omume na ọrịa ma ọ bụ ọnwụ mberede pụrụ ịdakwasị anyị nile. Ì kwere na ọ bụ ihe kwere omume ịnagide nsogbu ndị a na ndị ọzọ n’ụzọ nke na anyị pụrụ ịchọta ezi afọ ojuju? E nwere ihe mere a ga-eji kwere otú ahụ. Ma ka onye ọ bụla wee mara ụtọ nke ndụ obi ụtọ, ihe mbụ dị ya mkpa bụ ihe nke ọ na-abụghị mmadụ nile nwere​—⁠ihe mere a ga-eji dị ndụ.

4 Ka i wee nwee obi ụtọ n’ezie, ndụ gị aghaghị inwe nzube. N’akwụkwọ ya bụ The Transparent Self, Prọfesọ S. M. Jourard na-ede, sị:

“Mmadụ na-adị ndụ ruo ókè ọ na-ahụ ndụ ya dị ka ihe nwere nzube na ihe bara uru nakwa ruo ókè o nwere ihe mere a ga-eji dị ndụ . . . Ozugbo nzube, uru na olileanya kwụsịrị ịdị n’ime mmadụ, ọ na-amalite ịkwụsị ịdị ndụ; ọ na-amalite ịnwụ.”

A na-ahụta nke a ugbu a, ọbụna n’ụlọ ọrụ. Otu akụkọ si Canada banyere ịgha ọrụ kwuru, sị:

“Ụmụ mmadụ na-achọ nzube ná ndụ ha, ha enwekwaghị afọ ojuju n’ịbụ akụkụ na-adịkwaghị mma nke a pụrụ ịtụfu atụfu n’ígwè ọrụ nke usoro ọha mmadụ.”​—⁠Atlas World Press Review.

5 Nke a na-enye aka ịkọwa ihe mere ọtụtụ n’ime ndị bara ọgaranya na-ejighị enwe afọ ojuju n’ezie. Ee, ọ bụ eziokwu na ha na-eri ihe, ehi ụra, nwee ezinụlọ ma na-ekere òkè n’ụfọdụ n’ime ihe ndị na-enye obi ụtọ na ntụsara ahụ ná ndụ. Ma ha pụrụ ịmara na a pụkwara ikwu nke a banyere ọtụtụ ụmụ anụmanụ. Ọ ghaghị ịdị ihe karịrị nke a ná ndụ.

6 Nanị ogologo ndụ abụghịkwa azịza ya. Ọtụtụ ndị metụworo okenye maara site n’ahụmahụ na ịdị ogologo ndụ n’enweghị echiche nke inwe ihe a rụzuru ma ọ bụ ịbụ onye dị mkpa na-akpata ike ọgwụgwụ. Ị̀ hụwo nke ahụ?

7 Enweghị ezi ihe mere a ga-eji dị ndụ abụghị ihe dịịrị nanị ndị kataworo ahụ. Otu nnyocha nke Mahadum Daito Bunka nke Japan mere gosiri na n’ime 1,500 ndị nọ na kọleji, 50 pasent nke ụmụ agbọghọ na 34 pasent nke ụmụ okoro echewo echiche banyere igbu onwe ha. N’ihi gịnị? Nke mbụ n’ihe ndị e kwuru dị ka ihe kpatara ya bụ “enweghị nzube ná ndụ.” È nwere ọdịiche dị ukwuu na Europe, ná mba ndị dị n’America nakwa n’Africa? Ịrị elu zuru ụwa ọnụ n’igbu onwe onye na-egosi na ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụ mmadụ enweghị obi ụtọ ma bụrụkwa ndị ike ịdị ndụ gwụworo.

8 Ọ pụrụ ịbụ na anyị onwe anyị enweghị mmetụta nke enweghị olileanya dị otú ahụ. Anyị pụrụ ịchọpụta na o kwere mee inwetụ obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu anyị. Ma, anyị apụghị izere ịjụ sị, Ndụ ò nwere ezi nzube? Olee otú m pụrụ isi nwee obi ụtọ na-adịgide adịgide?

9 Ọtụtụ narị afọ gara aga, otu eze nyochara ọtụtụ n’ihe nchụso ndị e nwere ná ndụ​—⁠inwe ezinụlọ, inweta akụ̀ na ụba, ịgụkwu akwụkwọ, iri nri dị mma na iwu ụlọ ndị mara oké mma. Ihe ndị dị otú a pụrụ iyi ihe ndị na-eweta obi ụtọ. Ma ọ chọpụtara na ha pụkwara iweta oké mkpasu iwe. Ọ jụrụ, sị:

“Gịnị ka mmadụ nwere ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, na n’ime nchegbu nke obi ya, nke ya onwe ya na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ya n’okpuru anyanwụ? N’ihi na ụbọchị ya nile bụ nanị ihe mgbu, mkpasu iwe ka mweda n’ala ya bụkwa; ọbụna n’abalị obi ya edinaghị ịrahụ ụra. Nke a bụkwa ihe efu.”a

10 E mere ka ịbụ ihe efu ya doo anya ka oge na-aga mgbe ọ kọwara ihe na-echere mmadụ mgbe afọ ole na ole nke ndụ ya gasịrị​—⁠ịda mbà n’ikike nke ịhụ ụzọ, aka na ụkwụ ndị na-esighị ike, eze ndị na-ere ere ma ọ bụ ndị dapụrụ adapụ, nsogbu nke ihi ụra na n’ikpeazụ, ọnwụ.b

11-13. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị na-eche ihu banyere ndụ, oleekwa otú ha si metụta ikwere na Chineke?

11 Ya mere, ọbụna ma ọ bụrụ na anyị echee na e nwere obi ụtọ nke a ga-achọta ná ndụ, a ka nwekwara ajụjụ ndị na-eju anya ndị na-emetụta anyị nile. Karịsịa ugbu a. N’ihi gịnị? Vermont Royster, bụ́ editọ, kwuru na n’ihe karịtụrụ 50 afọ, ụmụ mmadụ amụbawo ihe ọmụma na ikike ha nke imepụta ihe nke ukwuu, ma mgbe ahụ o kwukwara, sị:

“N’ebe a ka e nwere ihe na-akpali ọchịchọ ịmara ihe. N’ịtụgharị uche banyere mmadụ n’onwe ya, banyere oké nsogbu ya dị iche iche, banyere ọnọdụ ya na mbara ala nke a, anyị agatebeghị aka karịa otú ọ dị ná mmalite. Anyị ka nọgidere na-enwe ajụjụ ịza banyere ndị anyị bụ na ihe mere anyị ji dịrị na ebe anyị na-aga.”​—⁠Science Digest.

12 N’ezie, mmadụ pụrụ ịnwa ileghara ajụjụ ndị dị otú ahụ anya ma ‘na-anụ ụtọ ndụ.’ A pụrụ ikwu ihe dị ukwuu banyere inweta obi ụtọ ná ndụ n’agbanyeghị nsogbu ndị dị na ya. Ma ọ bụghị iche eziokwu ihu bụ́ ibi ndụ nke ka a sịkwa.c Ndụ anyị ga-enwe ezi nzube na ebe ndabere maka obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịmalite ịghọta, “ndị anyị bụ na ihe mere anyị ji dịrị na ebe anyị na-aga.” Ànyị pụrụ ime nke ahụ?

13 Ndị na-eche echiche ekwubiwo mgbe mgbe na azịza ahụ dabeere n’ajụjụ ahụ bụ isi, ‘Chineke ọ̀ dị adị?’ Ọ bụrụ na e nwere Chineke, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ọ ga-ama ebe anyị si bịa, ihe mere anyị ji dịrị n’ebe a na ebe anyị na-aga. Ọ ga-amakwa ihe mere ajọ ihe ji dịrị, ma ọ̀ ga-abịaru ná ngwụsị, nakwa, ọ bụrụ otú ahụ, n’ụzọ dị aṅaa. Ọ ga-amakwa ihe anyị pụrụ ime iji mee ka ndụ anyị nwee obi ụtọ na nzube karị. Ya mere, mgbe ahụ, ‘Chineke ọ̀ dị adị?’

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Eklisiastis 2:​22, 23, n’ime Bible.

b  Eklisiastis 12:​1-⁠7.

c  Tụlee Eklisiastis 7:​2-⁠6.

Igbe dị na peeji nke 7]

‘Ọ̀ BARA URU ỊDỊ NDỤ?’

Michele, bụ́ nwanyị onye France, kọrọ na ya hapụrụ ụlọ ya na obodo ya “iji gbanarị ụwa nke ihu abụọ na emeghị ihe a tụrụ anya ya nke ndị gbara m gburugburu.” Mgbe ahụ⁠—⁠

“Etinyere m aka n’omume rụrụ arụ, ọgwụ ọjọọ na ndị enyi dị ize ndụ. Ndị uwe ojii na ndị Interpol nọ na-achọgharị m. Ọ fọrọ nke nta ka m ghọọ onye a manyere amanye ịgbara onye ọzọ akwụna. Ka m na-agagharị na-achọ nkọwa maka ịdị adị anyị, agakwuuru m òtù dị iche iche. Ma ịdị ndụ yiri ihe na-abaghị uru. Enwere m mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe ma chee nanị echiche nke ịnwụ.”

Igbe dị na peeji nke 9]

NWOKE NKE NỌ NÁ MGBAGWOJU ANYA

Otu nwoke na Japan nke aha ya bụ Yamamoto na-akọ, sị:

“Ka m na-ejike maka ule ịbanye mahadum afọ ole na ole gara aga, eji m ókè dị ukwuu nke oge m chee echiche banyere nzube nke ndụ. Ka m na-amụwanye akwụkwọ banyere nkà ihe ọmụma ụwa, otú ahụ ka m na-enwewanye ndakpọ olileanya. Mgbe m gafesịrị n’ule m, esonyeere m otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma ka m na-ahụ ihe ọjọọ nile ndị dị m gburugburu, echekwara m ajụjụ ahụ ihu ọzọ, ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ?’”

Ọ chọtaghị azịza ndị na-eju afọ na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ, bụ́ ndị o doro anya na ha agwọtabeghị nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe ọmụmụ ya nke akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ ahụmahụ ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị adịghịkwa nke gosiri na ọchịchị ọ bụla nke mmadụ nwere azịza ahụ. Ụmụ mmadụ anwalewo ụdị ọchịchị nile, ma ajụjụ banyere ihe bụ nzube nke ndụ ka dịgidere. Nwoke onye Japan ahụ kwukwara, sị:

“Amalitere m ịdị ndụ nke ịchọ ihe ụtọ, na-eme otú ahụ ruo ókè ụfọdụ n’ihi obi nkoropụ. Ma n’oge na-adịghị anya amụtara m ihe nzuzu nke a bụ. Emesịrị m bịarute ná nkwubi okwu ahụ bụ na azịza nye ajụjụ nọgideworo na-abụrụ m ihe mgbagwoju anya banyere nzube ma ọ bụ ihe mere a ga-eji dị ndụ dabeere na ma Chineke ọ̀ dị adị ma ọ bụ na ọ dịghị.”

[Foto dị na peeji nke 4]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya