Isi 5
Ị Pụrụ Ịnagide Nsogbu Nile nke Ndụ
1-7. N’ihi ihe ndị dị aṅaa ka anyị ga-eji nwee nchekwube banyere nsogbu nile nke ndụ? Olee otú o si metụta Chineke?
“NDỤ jupụtara ná nsogbu,” ka ndị mmadụ na-ekwu. Ị pụrụ ikwere.
2 Nsogbu ego na-eti ọtụtụ ndị ihe otiti—ụgwọ, ịrị elu nke ọnụ ahịa, ejighị ọrụ n’aka, ma ọ bụ ịchọta ezi ụlọ. Oké nsogbu alụmdi na nwunye na ezinụlọ juru n’ebe nile. Mmekọahụ, mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ bụ nsogbu ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe. Nye ndị agadi, ndakpọ ọnọdụ ahụ ike na-eweta ihe isi ike. Ihe a nile na-akpata oké nsogbu mmetụta uche ma ọ bụ nchekasị.
3 Ruo ókè hà aṅaa ka ị na-anagide nsogbu nile nke ndụ nke ọma? Akụkọ ndị na-akọ maka ịda mbà n’obi na igbu onwe onye juru ebe nile na-egosi nke ọma na ọtụtụ apụghị nnọọ ịnagide. Ma e nwere ọtụtụ nde ndị na-akwụsi ike mgbe ha na-eche ihe isi ike ihu. N’ihi gịnị?
4 Ndị ikpeazụ a amụtawo ịdabere na ndụmọdụ nke Onye Okike mmadụ dị ka a na-achọta ya na Bible. Ọ dịghị onye ọkà mmụta akparamàgwà, onye ndụmọdụ alụmdi na nwunye, onye na-ede ihe odide nke inye ndụmọdụ n’akwụkwọ akụkọ, nke maara banyere ndụ karịa Chineke. O kere ndị mmadụ mbụ, ya mere o nwere ihe ọmụma zuru ezu banyere ihe ndị mejupụtara elu ahụ, uche na mmetụta anyị. (Abụ Ọma 100:3; Jenesis 1:27) N’ịbụ onye ka mmadụ nke na-adịghị adịte ndụ aka mma, Jehova maara ihe na-aga n’ime ahụ anyị na ihe mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme.—1 Samuel 16:7.
5 Ọzọkwa, ọ maara nsogbu ndị na-eche anyị ihu n’ụwa nke a karịa otú onye ọ bụla n’ime anyị maara. Ọ bụghị nanị afọ ole na ole, kama kemgbe oge nke nwoke mbụ ahụ, Jehova ahụwo nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ—ha nile. Bible na-agwa anyị, sị: “Jehova siri n’eluigwe legide anya; ọ hụwo ụmụ mmadụ nile; . . . lekwasị ndị nile bi n’ụwa anya; . . . na-aghọtakwa ọrụ nile nke ha nile.” (Abụ Ọma 33:13-15) Nke ahụ pụtara na ọ maara ihe na-aga nke ọma na ihe na-adịghị aga nke ọma n’ịnagide ụdị nsogbu ọ bụla anyị nwere.
6 Site n’imesapụ aka, ọ na-eme ka o kwe anyị omume irite uru site n’ihe ọmụma na ahụmahụ ya. Bible nwere ndụmọdụ ya nile, bụ́ ndị e depụtara n’ụzọ nke na ọ na-ekwekọ ná mkpa ndị anyị nwere n’agbanyeghị ọnọdụ ndị anyị nọ na ha ná ndụ, n’agbanyeghị ebe anyị bi. Dị ka Abụ Ọma 19:7-11 si na-ekwu: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi: ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.”
7 Ka anyị tụlee ná mkpirikpi otú ihe àmà ndị ahụ pụrụ isi nyere mmadụ aka ịnagide nsogbu abụọ nke onwe onye ndị siri ike, ya bụ, oké nchekasị na owu ọmụma. Mgbe a tụlesịrị enyemaka bara uru nke Bible n’ihe ndị a, anyị ga-atụle nsogbu ndị ọzọ a na-enwekarị—ndị metụtara ego, alụmdi na nwunye na ọgwụ ọjọọ.
OLEE OTÚ Ị PỤRỤ ISI NAGIDE NCHEKASỊ?
8-11. Ruo ókè hà aṅaa ka nsogbu nke nchekasị siruru ike?
8 Mmadụ ole na ole ga-asị na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ha nwere oké nchekasị. Ka nsogbu ndị anyị nwere n’otu n’otu na-ehiwanye nne—n’ihe metụtara ego, ezinụlọ, mmekọahụ, mpụ—ọ bụkwa otú ahụ ka nchekasị na-akawanye njọ. Otu akụkọ akwụkwọ akụkọ kwuru n’oge na-adịbeghị anya na ihe e ji mara oge anyị karịsịa abụghị ụzọ ime ihe ma ọ bụ otu ụdị ejiji. Ọ bụ “oké mmetụta ọjọọ nke nchekasị.”
9 Ị̀ maara na nchekasị pụrụ ọbụna ime ka ndụ gị dị mkpụmkpụ? Rịba ama:
“N’ịbụ nke a kpọrọ ‘Ogbu Mmadụ nke Narị Afọ nke Iri Abụọ,’ nchekasị na-ebilitekarị site ná mkpa ndị metụtara ọnọdụ uche ndị a na-ahụ n’oge ndụ. Ọrịa elu ahụ ndị ọ na-akpalite ugbu a na-etinye ihe n’ime ka e nwee ọtụtụ ọnụ ọgụgụ nke ndị na-aga ụlọ ọgwụ na ndị na-anwụ kwa afọ—ya dịkarịsịa ala ọtụtụ iri nde.”—To the Point, magazin akụkọ Africa.
“Nchekasị siri ike ma ọ bụ nke dịrị ogologo oge pụrụ ime ka ọ dịrị ọrịa ndị dị ka ọkọ akpụkpọ ahụ na àzụ̀zụ̀ ruo n’ọrịa obi na ọrịa cancer mfe ịwakwasị ahụ.”—The Wall Street Journal, U.S.A.
Ọ na-emetụta ọbụna ndị a ka bu n’afọ. Nchekasị nke ndị inyom dị ime, ndị sitere n’ihe ndị dị ka enweghị nkwekọ n’alụmdi na nwunye ma ọ bụ egwu nke enweghị ọrụ, pụrụ ịkpatara ụmụ ndị ka nọ n’akpa nwa nsogbu elu ahụ, nke uche na nke mmetụta.
10 Nchekasị na-emebikwa ihe n’ihi na ọ na-eme ka e nwee nsogbu ndị ọzọ. N’ihi ya ọtụtụ ndị na-atụfu oge ha kwesịrị itinye n’ọrụ, na-eme ka nsogbu ego ha hiwanye nne. Ọ na-akpata ime ihe ike, ọbụna n’ime alụmdi na nwunye. Otu onye bụ di dere, sị:
“Kwa ụbọchị, m na-enwe obi erughị ala na ahụ ịma jijiji karị. Ọ na-adị m ka m tie onye ọ bụla ihe, ọ na-abụkarịkwa nwunye m ka ọ na-adabara. Ọ na-adị m ka m ṅụọ ihe ndị na-aba n’anya, ma ọ dịghị enye aka n’ụzọ ọ bụla.”
11 Nchekasị ụfọdụ kwesịrị ekwesị ná ndụ, ha adịchaghị njọ. Isi n’àkwà bilite n’ụtụtụ na-eweta nchekasị, dịkwa ka ikiri egwuregwu ịgba bọl na-akpali akpali na-eme. Ọ bụ nchekasị nke siri oké ike ma dịtee anya (ma ọ bụ obi erughị ala) bụ nke na-emerụ ahụ. N’ezie, ọtụtụ n’ime nrụgide ndị na-adịkwasị anyị pụrụ iyi ndị a na-apụghị izere ezere, na-emetụta ndị ọzọ ma ọ bụ ọnọdụ dị iche iche ná ndụ nke onwe anyị. Otú o sina dị, ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ime banyere nchekasị nke na-emerụ ahụ? Ọ bụrụ na anyị pụrụ ịnagide nchekasị n’ụzọ ka mma, ọ pụrụ ibelata nsogbu ndị ọzọ, dị ka ndị na-emetụta ahụ ike anyị.
12-14. Olee otú ndụmọdụ Bible pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide nchekasị?
12 Otu onye a matara n’ụwa nile dị ka otu n’ime ndị ozizi kachasị ndị dịrịla ndụ mgbe ọ bụla, bụ́ Jisọs Kraịst, nyere otu ihe bụ isi nke e ji anagide nchekasị. Mgbe a jụrụ ya nke kachasị mkpa n’iwu nile nke Chineke, Jisọs zara sị, ‘Ị ga-ahụ Jehova n’anya site n’obi, mkpụrụ obi na uche gị dum. Ị ga-ahụkwa onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ (Matiu 22:37-39) Tinye nke ahụ n’ọrụ, ọ ga-enyekwara gị aka ịnagide nchekasị.
13 Dị ka ihe atụ, ka ị na-eji ịhụnanya na-emeso di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị ikwu gị, o yikarịrị ka udo ọ̀ ga-aba ụba. Ọnọdụ ịhụnanya na obi ụtọ ga-ebilite. Nchekasị ga-ebelata. Ee, a pụrụ ịgbaso ndụmọdụ nke a nke Akwụkwọ Nsọ, na-enweta ihe ndị dị mma n’ibelata nchekasị.
14 Ọ kwụsịghị nanị n’ezinụlọ. Ka ị na-etinye ndụmọdụ Bible nke igosi ịhụnanya n’ọrụ—gụnyere ‘ụkpụrụ ọma’ ahụ nke imere ndị ọzọ ihe ị ga-achọ ka ha meere gị—ụmụ mmadụ ga-enwe mmasị n’ebe ị nọ karị. (Luk 6:31) Nke ahụ abụrụwo eziokwu n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ógbè. Ee, a pụrụ inwe esemokwu ụfọdụ, ma ọ ga-adị ala. Ọ dị mfe ịhụ nke ahụ, n’ihi ya, ị ga-eche nchekasị dị ala ihu.
15, 16. Gịnị ka ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtaworo banyere ndụmọdụ Bible metụta ịhụnanya?
15 Ọbụna nye ndị ọkà mmụta sayensị, a na-aghọta na ihe Bible na-ekwu ga-enyere ndị mmadụ aka ibelata nchekasị ma nagide ya. Prọfesọ Hans Selye (Mahadum Montreal), bụ́ otu n’ime ndị a kasị mara n’ihe banyere mmetụta nke nchekasị na-enwe, dụrụ ọdụ, sị:
“Kama ịdabere n’ebe ọgwụ ma ọ bụ ụzọ ndị ọzọ nke ime ihe dị, ana m eche na e nwere ụzọ ọzọ ka mma a ga-esi mee ihe banyere nchekasị, bụ́ nke gụnyere ile ihe dị iche iche na-eme ná ndụ anyị anya n’ụzọ dị iche.”
O mesiri mkpa ọ dị ike inwe “nkà ihe ọmụma nke àgwà nke ụmụ mmadụ pụrụ iji bie ndụ,” bụ́ nke “ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya ihe dị ukwuu karịa nchọpụta ọ bụla.” Ọ̀ bụ gịnị? Mgbe 40 afọ nke ịmụ ihe banyere nchekasị gasịrị, ọ sịrị na n’ụzọ dị mkpa, ihe ngwọta ya mesịrị bụrụ—ịhụnanya.
16 N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na ọbụna ná ndụ a na-adị site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, igosi ịhụnanya dị ka Bible si kwuo bara nnọọ uru? N’ihi gịnị ka o ji dị irè? Dr. Selye sịrị:
“Oké mmetụta abụọ ndị na-akpata adịghị ma ọ bụ ịdị adị nke nchekasị bụ ịhụnanya na ịkpọasị. Bible mere ka okwu nke a pụta ìhè ọtụtụ ugbo. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na anyị emezigharịghị ọchịchọ onwe onye nanị nke anyị bu pụta ụwa n’ụzọ ụfọdụ, anyị na-akpalite ịtụ egwu na ibu iro n’ime ndị ọzọ. . . . Ruo ókè anyị pụrụ ịkpalikwu ụmụ mmadụ ịhụ anyị n’anya kama ịkpọ anyị asị, ọ bụkwa ókè ahụ ka ọnọdụ anyị na-aka mma, otú ahụkwa ka nchekasị ọ ga-adị anyị mkpa ịnagide na-adị ala.”
17, 18. N’ụzọ ọzọ dị aṅaa ka ndụmọdụ Bible pụrụ isi nyere anyị aka n’ihe banyere nchekasị?
17 Iwe bụ ihe ọzọ na-akpata nchekasị. Anyị nile na-ewe iwe mgbe ụfọdụ, dị ka Bible na-ekwere. Ma ọ na-adụ ọdụ, sị: “Ọ dị mma, bụ́ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, karịa dike: ọ dịkwa mma, bụ́ onye na-achị mmụọ ya, karịa onye na-ewere obodo n’agha.” (Ilu 16:32; Ndị Efesọs 4:26) Ya mere ọ bụrụ na iwe ewee anyị, ndụmọdụ Chineke bụ izere ịdaba n’oké ọnụma ma ọ bụ ‘isi ikopụ anyị.’ Ndị na-eleghara ndụmọdụ ahụ anya na-ekwukarị okwu iwe ma ọ bụ dabanye n’ịlụ ọgụ mgbe mgbe. Ihe ndị na-esi na ya apụta mgbe ụfọdụ na-abụ mmerụ ahụ nke elu ahụ ma ọ bụ ibu iro, na-akpata nchekasị na-adịte anya. N’ihi nke a, ruo ókè ị pụrụ ịgbaso ndụmọdụ amamihe nke dị irè e nwere na Bible banyere iwe, a ga-enyere gị aka ịnagide nchekasị.
18 Dị ka ihe atụ ọzọ, Bible na-enyekwara anyị aka ibelata nchekasị site n’ịgba anyị ume ibi ndụ n’ụzọ a gwara ọgwa na n’ezi uche. Ndị ụfọdụ na-arụ ọrụ ndọlị mgbe nile, ndị ọzọ adịghị arụkebe. Ndị ụfọdụ na-eji ihe a kpọrọ ihe mgbe nile, ndị ọzọ adịghị eji ma ọlị. Nke ọ bụla n’imebiga ihe ókè dị otú a na-akpatakarị nsogbu ma na-eme ka e nwee nchekasị. Otú ọ dị, gụọ banyere okwu ndị ahụ e kwuru n’Eklisiastis 3:1-8, ebe Chineke na-ekwu na e nwere oge maka ihe ọ bụla. Ị̀ hụlanụ, Bible na-enye echiche ziri ezi na nke ezi uche dị na ya karị banyere ndụ. Ọrụ dị mma, n’ụzọ na-emegide umengwụ. Bible na-agbakwa ndị mmadụ ume ka ha zurutụ ike mgbe ụfọdụ ma nụrụ ụtọ ihe si n’ịrụsi ọrụ ike ha apụta. (Eklisiastis 3:12, 13; 10:18; Ilu 6:9-11) E nwere uru a ga-erite site n’oge ụfọdụ e tinyere n’ichesi echiche ike banyere ihe ndụ pụtara na ụzọ anyị kwesịrị isi bie ya. Ma e nwekwara ihe dị mma ná mmadụ isoro ezinụlọ ya na ndị enyi tụsara ahụ. Ruo ókè anyị pụrụ itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ banyere inwe ezi nguzo, anyị ga-enwe nsogbu dị ala banyere nchekasị.
ỊNAGIDE OKÉ IHE MGBU NKE OWU ỌMỤMA
19, 20. Ruo ókè hà aṅaa ka nsogbu nke owu ọmụma siruru n’ike?
19 “Owu ọmụma zuru ebe nile,” ka onye ọrụ ebere na Toronto bụ́ Henry Regehr kwuru. “Kwụsị onye ọ bụla n’okporo ámá ma kwuo sị ‘gwa m banyere owu ọmụma gị,’ ị ga-anụkwa ka akụkọ na-arị ibe ya elu.” Ná nnyocha e ji 52,000 mmadụ mee, ihe karịrị 40 pasent sịrị na ha “na-enwe owu ọmụma mgbe mgbe.” Ọ bụ mmetụta nke kachasị ewetara onye ọ bụla enweghị ntụsara ahụ, na-ebibi obi ụtọ. Ọ dịghịkwa asọpụrụ onye ọ bụla, ọ na-abịakwasị ma ndị okenye ma ụmụntakịrị, nwoke na nwanyị. Ọ bụ eziokwu na anyị pụrụ iche banyere onye nọ nanị ya, dị ka onye di ya nwụrụ, ịbụ onye owu na-ama n’ezie, ma ụfọdụ n’ime ndị owu kachasị ama bụ ndị lụrụ di na nwunye na-apụghị inwe nkwurịta okwu.
20 Ọtụtụ ndị na-anwa iji mmekọahụ na-ezighị ezi chụọ owu ọmụma ma ọ bụ jiri ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya rikpuo ya ma ọ bụ jiri oké iri nri bịadaa ya. Ma ihe ndị ahụ na-akpata ya ka na-anọgide. Otu ihe na-akpata ya bụ uto nke obodo ukwu dị iche iche, bụ́ ebe ụmụ mmadụ pụrụ ịgba gị gburugburu ma ị ka bụrụkwa onye owu na-ama. Nkewa nke alụmdi na nwunye amụbawo nsogbu a. Ọbụna telivishọn na-eyi ka ọ na-etinye ihe n’owu ọmụma site n’ibelata mkparịta ụka.
21-23. Olee ndụmọdụ Bible nke pụrụ inye aka n’ihe banyere owu ọmụma? N’ụzọ dị aṅaa?
21 Gịnị ka a pụrụ ime iji nye aka ịnagide owu ọmụma? Ebe anyị na-adịghị achọ ime ka nsogbu ahụ yie ihe na-esighị ike, a pụrụ ịsị na Bible pụrụ inyere onye ọ bụla aka ịnagide owu ọmụma n’ụzọ ka irè. Ò si aṅaa dị otú ahụ? Otu ihe bụ na owu ọmụma na-edujekarị n’ịda mbà n’obi na enwekwaghị ùgwù onwe onye. Mmadụ iso Onye Okike ya nwee ezi mmekọrịta pụrụ inye aka iweghachi onye dị otú ahụ. Ọ pụrụ ịzụlite echiche ka ukwuu nke ịba uru, na-amata na Chineke nwere mmasị n’ebe ọ nọ, bụ́ nke pụrụ iduje n’ile ndụ anya n’ụzọ ka mma. (Matiu 18:10) Ọzọkwa, Bible na-ewepụtara ndị Kraịst ụzọ ndụ nke pụrụ inye aka inwere onwe onye pụọ n’owu ọmụma.
22 Mgbe mgbe a na-agwa ndị owu na-ama ka ha “jiri ọrụ n’aka.” Nke a nwere uru ụfọdụ. Ma Bible na-enye ndụmọdụ nke ka zie ezi ma na-arụ ọrụ. Ọ na-agba ndị Kraịst ume ka ha dị uchu n’ime ihe ọma nye ndị ọzọ, bụ́ nke na-arụpụtakwa obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Anyị nwere ihe nlereanya n’ebe Dọkas nọ, bụ́ onye tinyere oge n’imere ndị Kraịst ndị ọzọ ihe, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị di ha nwụrụ. Mgbalị ya nyeere ha aka n’ụzọ ihe onwunwe, o yikwara ka o nyeere ha aka imeri owu ọmụma. N’otu oge ahụ, Dọkas n’onwe ya abụghị onye owu na-ama kama onye a hụrụ n’anya. Ị pụrụ inweta ọṅụ n’ịgụ banyere ya n’Ọrụ 9:36-42.
23 Ọrụ na-akwụ ụgwọ nke ukwuu nke ọtụtụ ndị Kraịst nwere abụrụwo inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke na Bible. N’ezie, Pọl onyeozi kwuru na nnwere onwe ime otú ahụ n’ókè ka ukwuu bụ ihe ndabara nke ndị na-alụbeghị di na nwunye nwere, bụ́ nke ga-enyekwara ha aka n’ezie ịnagide owu ọmụma. (1 Ndị Kọrint 7:32-35) Pọl n’onwe ya bụ ihe atụ nke a. Gụọ n’Ọrụ 17:1-14 otú Pọl si nọgide n’ọrụ, na-enyere ọtụtụ ndị aka n’obodo Tesalọnaịka, n’agbanyeghị mmegide na-enweghị atụ. Mgbe ahụ rịba ama mmetụta nke ịdị nso dị n’etiti ha nke si na ya pụta, bụ́ nke e kwuru okwu ya ná 1 Ndị Tesalọnaịka 2:8. Ọtụtụ narị puku Ndịàmà Jehova taa pụrụ ịgba àmà banyere ihe na-akwụghachi ụgwọ ọ bụ ịnọgide n’ọrụ, na-akụziri ndị ọzọ Bible.
24. Uru dị aṅaa ka mkpakọrịta ndị Kraịst bara? (Eklisiastis 4:9, 10)
24 Ọzọ, Ndịàmà Jehova na-ezukọta mgbe nile n’ìgwè dị iche iche ịmụ Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ha na-amụ ihe, ha na-anụ ụtọ nke mkpakọrịta na-ekpo ọkụ nke ndị Kraịst. N’ikwu eziokwu, nanị isoro ndị ọzọ nọrọ abụghị ihe ngwọta n’onwe ya nye owu ọmụma, dị ka ọtụtụ ndị bi n’obodo ukwu maara. Ma ndị na-abịa nzukọ ndị dị otú a so ná ndị Kraịst na-agbalịsi ike itinye agbamume Bible ahụ inwe ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ n’ọrụ site n’obi ha. (Ndị Filipaị 2:4) Nzukọ ndị a na-abụ oge na-akpali akpali, ma na-eweta obi ụtọ. Ndị bịara na-esonye n’ikpegara Chineke ekpere dị mkpirikpi, bụ́ ihe ọtụtụ ndị chọpụtaworo na ọ na-enyere ha aka ịmata na ha akwụghị nanị ha mgbe ọ bụla. (Jọn 16:32) Anyị na-agba gị ume ịbịa nzukọ Ndịàmà Jehova. N’ebe ahụ ị pụrụ ịhụ otú ịgbaso ndụmọdụ Bible si enyere ọtụtụ ndị aka ịnagide owu ọmụma na nsogbu ndị ọzọ, dị ka ndị metụtara ego ma ọ bụ ezinụlọ.
Igbe dị na peeji nke 45]
ỌNỌDỤ NDỊ KACHASỊ ‘AKPATA NCHEKASỊ’ NÁ NDỤ
ỌKWÁ IHE NA-EME NÁ NDỤ
1 Ọnwụ di ma ọ bụ nwunye
2 Ịgba alụkwaghịm
3 Nkewa alụmdi na nwunye
4 Ịga mkpọrọ
5 Ọnwụ nke onye òtù ezinụlọ
6 Mmerụ ahụ ma ọ bụ ọrịa nke onwe onye
7 Alụmdi na nwunye
8 Ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ
9 Idozi okwu alụmdi na nwunye
10 Ezumike nká
11 Mgbanwe n’ahụ ike nke onye òtù ezinụlọ
12 Afọ ime
13 Ihe isi ike dị iche iche nke mmekọahụ
14 Inweta onye ọhụrụ n’ezinụlọ
15 Nhazigharị n’achụmnta ego
Ọ dabeere ná nnyocha nke Dr. T. Holmes na Dr. R. H. Rahne mere—“Modern Maturity.”
Igbe dị na peeji nke 50]
“Ná ndụ ha na-adị n’ọgbakọ ha, Ndịàmà na-abụ ezi ọha mmadụ nke ntụkwasị obi na nnabata ihe. . . . Ndịàmà Jehova na-enye [mmadụ] ụzọ ọzọ a pụrụ isi soo ndụ, bụ́ nke na-enye ndị òtù ya ụzọ ịchọta onye ha bụ na ùgwù onwe onye, ọha mmadụ nke nnabata ihe, na olileanya maka ọdịnihu.”—“Religious Movements in Contemporary America.”
[Foto dị na peeji nke 41]
ỊRỊ ELU NKE ỌNỤ AHỊA
ỌRỊA
EJIGHỊ ỌRỤ N’AKA
NSOGBU EZINỤLỌ
EBE OBIBI
[Foto dị na peeji nke 49]
Imere ndị ọzọ ihe ọma, dị ka Dọkas mere, na-enye aka igbochi owu ọmụma.