Isi 6
Nsogbu Ego—Gịnị Na-enye Aka?
1-3. N’ihi gịnị ka enyemaka banyere ego ji dị mkpa?
“EMEME oriri na-eme ka i nwee obi ụtọ, mmanya na-emekwa ka ị ṅụrịa, ma ị gaghị enweta nke ọ bụla n’ime ha n’ejighị ego.”—Eklisiastis 10:19, Good News Bible.
2 Ego bụ isi ihe na-akpata nchegbu n’ala nile. Otu ihe na-akpata ya bụ ịrị elu nke ọnụ ahịa. Kwa ụbọchị ọ na-efu ihe karị iji dịrị ndụ. Ọtụtụ ndị apụghị ọbụna ịzụta nri nke dị ha mkpa. Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị ikom na-arụ ụzọ ọrụ abụọ, ndị bụ nwunye na-apụwanye ịrụ ọrụ. Ezinụlọ dị iche iche na-ata ahụhụ. A na-enwe nsogbu ahụ ike. Dị ka o si adịkarị, nsogbu ego na-akawanye njọ mgbe ịzụrụ ihe n’aka batara n’ọnọdụ ahụ. N’ịdabere n’ịzụrụ ihe n’aka, ọtụtụ ndị banyere nke ukwuu n’iji ụgwọ nọgidere na-emefu ego n’ihe ndị na-adịghị ha mkpa n’ezie. Nke a adịghị otú ahụ nanị n’ala ndị mepere emepe kamakwa n’ebe ndị mmadụ na-enweghị ihe dị ukwuu.
3 Enyemaka dị aṅaa nke na-arụ ọrụ ka Bible na-enye? Ọ̀ pụrụ inyere gị aka inweta ọrụ ma nọgide na ya? Ọ̀ pụrụ ibelata nchegbu ezinụlọ gị banyere ego, na-eduje ná ndụ obi ụtọ karị?
IME IHE N’EZIOKWU NA ỊRỤSI ỌRỤ IKE HÀ NA-ENYE AKA?
4-6. Echiche dị aṅaa dị iche nke bakwara uru banyere ọrụ ka Bible na-enye? (Eklisiastis 8:12, 13)
4 “Ndị na-arụsi ọrụ ike adịghị enweta ụgwọ ọrụ kwesịrị ekwesị. Ì kwere?” N’otu nnyocha, 85 pasent kwere. Ọ na-eyikarị ka a ga-asị na ihe ịga nke ọma dabeere n’ịghọ aghụghọ, izu ohi, inye aka azụ na ịma mmadụ. Ma Akwụkwọ Nsọ na-emesi uru nke ikwu eziokwu na ịdị uchu ike. Dị ka ihe atụ, Bible na-asị:
“Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe, ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.”—Ndị Efesọs 4:28.
“Onye umengwụ na-achọsi ihe ike, ma ọ dịghị enweta ihe ọ bụla: a na-enye onye dị uchu ihe n’ụzọ zuru ezu. Ị̀ hụtụwo onye maara ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-ejere ndị eze ozi.”—Ilu 13:4; 22:29, Moffatt.
“Mee ka ọ bụrụ ebumnobi gị ibi ndụ dị jụụ, ilegide anya n’ọrụ nke aka gị, na inweta ihe i ji ebi ndụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ. N’ụzọ dị otú a unu ga-enweta nsọpụrụ nke ndị na-ekweghị ekwe, unu agaghị adaberekwa n’ebe onye ọ bụla nọ maka ihe dị unu mkpa.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:11, 12, Good News Bible.
5 Ma oge ma ọtụtụ ahụmahụ egosiwo na ndụmọdụ nke a na-arụ ọrụ. Ee, ọ bụ eziokwu na o yiri ka ndị dị umengwụ hà na-eme nke ọma karị. Ma n’ozuzu ya nakwa mgbe e mesịrị, ọ bụrụ na i tinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, ị ga-eme nke ọma karịa ndị na-eleghara ya anya.
6 Ndị were mmadụ n’ọrụ na-eme mkpesa mgbe mgbe na ndị ọrụ adịghị abịa ọrụ n’oge, na ha na-egbu oge nke ukwuu, na-eru unyi, a pụghịkwa ịtụkwasị ha obi. Ya mere, site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible, onye na-abịa ọrụ n’oge, nwee nlezianya, na-adị ọcha, kwesị ntụkwasị obi ma dị uchu ga-achọta ọrụ dị ka o si adịkarị. O yikwara ka ọ ga-enweta ego ka ukwuu, n’ihi na ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-adịkarị njikere ịkwụ ụgwọ maka ọrụ a rụrụ nke ọma. E nwere ọtụtụ akụkọ site n’ọnụ Ndịàmà Jehova banyere nke a.
7, 8. Olee uru ikwu eziokwu bara? (Ndị Rom 2:14, 15)
7 Ma ọ̀ bụ na ịgha ụgha na ịghọ aghụghọ adịghị mkpa n’oge ndị a? Ndị Kraịst, bụ́ ndị jụworo izu ohi, ịgha ụgha ma ọ bụ ịghọ aghụghọ n’ihi itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ahụwo na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ na-arụ ọrụ.
Otu ụlọ ọrụ dị na Johannesburg, South Africa, nke na-ere ngwá ọrụ eletrik adịghị eme nke ọma. Otu ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ndị e were n’ọrụ na-ezu ohi. Otu ụbọchi, onye isi ụlọ ọrụ ahụ kpọkọtara ndị ọrụ nile bụ ndị Africa ma chụọ ha n’ọrụ. Ma n’ụtụtụ echi ya, otu onye e were n’ọrụ nọ n’ụgbọ okporo ígwè nke ọ na-esobu na-aga ọrụ ma zute onye ọrụ ibe ya. Ọ jụrụ, sị, ‘Ò si aṅaa bụrụ na ị na-aga ọrụ?’ Onye ọrụ nke ọzọ ahụ sịrị na onye isi ọrụ bịakwutere ya iche wee gwa ya na ebe ọ bụ na ya na-ekwu eziokwu, na ọnọdụ nke ya dị iche. Nwoke nke mbụ ahụ kwuru na ọ bụkwa otú ahụ ka a gwara ya. Ka ha na-erute n’ụlọ ọrụ, ha zutere onye ọrụ nke atọ, bụ́kwa onye a kpọpụtara iche gwa ya ka ọ na-abịa ọrụ dị ka o si emebu. Ha nile bụcha ezi ndị Kraịst.
Robert rụụrụ ụlọ ọrụ ndị Britain na-arụ okporo ụzọ ọrụ. Otu ụbọchị, otu onye nduzi ụlọ ọrụ kwuru na ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ya, ka Robert gwa onye ahụ na ya anọghị ya. Ma mgbe Robert zara telifon, ọ kọwara na onye nduzi ahụ ji ihe n’aka. Ka ọ nụrụ nke ahụ, onye nduzi ahụ kọchara ya. Ma a hapụrụ okwu ahụ mgbe Robert kọwara na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova na ya apụghị ịgha ụgha. (Ndị Efesọs 4:25) Ka oge na-aga, mgbe Robert ruru ogo ibuli n’ọkwá, onye òtù ya n’ọrụ nke nwere anyaukwu gbalịrị iwelite ihe ịrụ ụka banyere ibụ onye eziokwu ya. Ugbu a onye nduzi ahụ kwuru banyere ịbụ onye eziokwu nke Robert. E buliri ya n’ọkwá.
8 Ọ̀ bụ ihe kwere mee ime ihe n’eziokwu ma ọ bụrụ na ị na-arụrụ onwe gị ọrụ? N’ọnọdụ ụfọdụ, ikwu eziokwu pụrụ iyi ihe na-abaghị uru. Ma ọ ka bụkwa ụzọ ime ihe nke kasị mma. Ọ na-enyere gị aka inwe ezi akọ na uche n’ebe Chineke nọ, na udo nke uche. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị mmadụ na-ahọrọ isoro onye ha lere anya na ọ gaghị aghọ aghụghọ rụkọọ ọrụ. Ọ bụ nnọọ dị ka Bible na-ekwu—ị “ga-enweta nsọpụrụ nke ndị na-ekweghị ekwe.”
ENYEMAKA N’IHE BANYERE EBE OBIBI
9-11. Olee ụzọ itinye Bible n’ọrụ pụrụ isi nye aka n’ihe banyere ebe obibi?
9 Inweta ebe obibi dị mma bụ nsogbu ọzọ bụ isi. N’ala ụfọdụ, a na-arụgide ndị nile nọ n’ezinụlọ ibikọ ọnụ n’otu ọnụ ụlọ. Ma ọ bụ, nsogbu ahụ pụrụ ịbụ inweta ebe obibi dị ọcha nke mmadụ ga-enwe ike ịkwụ ụgwọ ya. Bible ọ̀ pụrụ inye aka ná nsogbu ndị a?
10 Mgbe i nwetara ụlọ ị na-akwụ ụgwọ ya kwa ọnwa (ma ọ bụ nke ị naara ná ngo), i ji ihe onwunwe onye ọzọ na-eme ihe. O kwesịrị ka a rịba ama na Chineke gwara ndị Israel ka ha sọpụrụ ma lekọta ihe onwunwe ndị ọzọ. (Deuterọnọmi 22:1-4) Ọ gbakwara ume banyere ịdị ọcha elu ahụ. (Deuterọnọmi 23:12-14; Ọpụpụ 30:18-21) N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, ndị Kraịst nwere ezi obi na-agbalị izere ibibi ihe onwunwe, ha na-edebekwa ụlọ ọ bụla ha na-akwụ ụgwọ ya ọcha. N’ihi nke a, na n’ihi na ha ‘na-ebi ndụ dị jụụ,’ a na-enwekarị mmasị n’ebe ha nọ dị ka ndị bi n’ụlọ onye ọzọ, ọ bụrụwokwa ihe dịịrị ha mfe karị inweta ụlọ.
Otu ezinụlọ nke ndị Kraịst nwetara ụlọ site n’aka onye bụbu onye isi n’otu isi obodo nke otu mba Africa. Ha debere ụlọ ya ọcha ma kwụọ ụgwọ ụlọ n’oge. (Ndị Rom 13:8) Mgbe ha na-achọ ịpụ, ha gosiri onye ahụ nwe ụlọ ezinụlọ ọzọ si n’ọgbakọ ahụ. Onye ahụ nwe ụlọ kwuru na dị ka o si adịkarị, “a gaara ebuli” ọnụ ego ụlọ ahụ, nke pụtara ime ka ọ bụrụ okpukpu abụọ. Ma n’ihi na ọ maara na ndị Kraịst a ga-abụ ndị a pụrụ ịdabere n’ebe ha nọ, ndị dị ọcha, ọ hapụrụ ụgwọ ụlọ ahụ n’ihe ọ nọ na ya, bụ́ ihe dị ka ọkara nke ihe a na-ana n’ụlo ndị yiri ya na gburugburu ebe ahụ.
11 Ọbụna mgbe ọnọdụ ndị mmadụ na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ha gbochiri ya inweta ụlọ ka mma, ọ ka ga na-eritekwa uru. Ọ ga-eme ka ụlọ ya dị ọcha ma dị mma ile anya. Nke ahụ na-eme ka e nwee ndụ nke ahụ ike na obi ụtọ karị.
IJI EGO GỊ MEE IHE N’ỤZỌ AMAMIHE
12-16. Ndụmọdụ dị aṅaa nke na-arụ ọrụ ka e nwere banyere ego?
12 Eze Solomọn nke bara ọgaranya dere, sị: “Amamihe bụ ndo, ego bụkwa ndo: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.”—Eklisiastis 7:12.
13 Solomọn matara, dị ka anyị na-aghaghị ịmata, na ego na-enye ihe mgbochi pụọ ná nsogbu ndị ịda ogbenye pụrụ ịkpata. Ya mere, e kwesịghị imefusị ego; e kwesịrị iji amamihe jiri ya mee ihe. Ndụmọdụ dị aṅaa nke na-arụ ọrụ ka Bible na-enye anyị banyere ijikwa ego anyị?
14 Jisọs jụrụ, sị: “Ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, na-ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma o nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya? Ka ndị nile ndị na-ahụ ya wee ghara ịmalite ime ya ihe ọchị ma eleghị anya, mgbe ọ tọsịrị ntọala ya, ma o nweghị ike iwuzu ya, sị, Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike ịrụzu ya.”—Luk 14:28-30.
15 A pụrụ iji nke ahụ mee ihe n’ego ezinụlọ. Ọtụtụ di na nwunye ahụwo ya dị ka ihe dị mma ịnọdụ ala ma jiri nwayọọ gbakọọ usoro nhazi mmefu ego ha iji lee ma ihe bụ isi a chọrọ ịzụta ọ̀ bụ nke ga-ekwe mee, ma amamihe ọ̀ dịkwa na ya. E nyewokwara ha aka gaa n’ihu site n’ihe ncheta Bible nke bụ na ihe ndị a na-atụghị anya ha na-eme. (Eklisiastis 9:11) Nke a enyeworo ha aka izere ịzụrụ ihe ọ bụla ha hụrụ na iji oké ụgwọ.
16 Ọzọ, rịba nghọta nke a ama: “Onye na-ebiri ihe bụ ohu nke onye na-ebinye ya ihe.” (Ilu 22:7, Revised Standard Version) Ọ bụ ezie na Bible adịghị akagbu ibiri ma ọ bụ ibinye ihe, ọ na-eme ka anyị mata na ibirigharị ihe mgbe ọ na-adịghị mkpa pụrụ ime ka mmadụ ghọọ ohu nye ụlọ akụ̀ ma ọ bụ onye na-ebinye ihe. Onye amamihe ka ọ bụ bụ́ onye na-echeta na n’oge ndị a a na-anwa ọtụtụ ndị ịzụrụ ihe n’aka, nanị imesị ghọọ ndị ji ụgwọ, na-akwụ ọmụrụ nwa dị ukwuu.
17-19. Olee otú ndị ụfọdụ siworo tinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ n’ụzọ ị mma?
17 Bible enyeworo ọtụtụ ezinụlọ aka ibelata nsogbu ego site n’ibelata mmefusị. Jisọs setịpụrụ ezi ihe ilereanya. Mgbe o nyesịrị oké ìgwè mmadụ nri, o nyere iwu ka a chịkọta ihe ndị fọdụrụ. (Jọn 6:10-13) N’ịgbaso ihe ilereanya dị otú a, ndị okenye na ụmụntakịrị bụ ndị Kraịst pụrụ ịmụrụ anya izere imefusị ihe.
18 Ịmụta itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ banyere ego pụrụ ịchọ mgbanwe dị ukwuu n’ụzọ e si ele ihe anya. Ma ihe si na ya apụta ga-aba uru, dị ka akụkọ na-esonụ na-egosi:
N’oge na-adịghị anya mgbe ha gbasịrị akwụkwọ, otu di na nwunye na-eto eto na Zimbabwe malitere inwe nsogbu ego. Ụgwọ a na-akwụ nke nwoke dị nta; nke nwanyị chọrọ ọtụtụ ihe ọhụrụ na nri ndị pụrụ iche. Ọ malitekwara ịrụ ọrụ, ma nke ahụ eyighị ka o nyere aka n’ụzọ dị ukwuu. Nsogbu nke dị n’alụmdi na nwunye ha hiri nnọọ nne nke na o yiri ihe ịrụ ụka dị na ya ma hà ga-anọgidekwa na-ebi. Ndị okenye ụfọdụ nke ndị Kraịst wepụtara onwe ha inye aka. N’iji Bible mee ihe, ha kọrọ banyere mkpa ọ dị ịhazi mmefu ego. (Luk 14:28-30) Di na nwunye ahụ hụrụ uru ọ bara idepụta ihe ndị ha ga-azụ, na-edenye ego ole o yiri ka ha ga-ewe, na ịzụ nri ga-ezuru ha n’izu n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ga-ebelata mmefu. (Ilu 31:14) Ndị okenye ahụ sooro ha kerịta ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ banyere inwe afọ ojuju na mkpa ọ dị izere ọchịchọ okomoko ndị a na-apụghị ịkwụli ụgwọ ha ugbu a. (Luk 12:22-31) Lee ihe enyemaka ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ a bụ! N’ịbụ ndị ahụ ruru ala ugbu a karị n’ihe banyere ego, di na nwunye ahụ nwere obi ụtọ karị. Ọbụna ndị agbata obi kwuru okwu banyere ọganihu e nwere n’alụmdi na nwunye ha.
19 Ndị na-akpata ọnụ ego a kara aka eritewokwa uru site na ndụmọdụ na-arụ ọrụ nke Bible. Ọ dị otú a n’ọnọdụ nke otu di na nwunye laworo ezumike nká na Spain:
Ego na-ehighị nne nke Francisco na Maria na-enweta ezughị ezu ma ọlị. Ma ha kọwara na ihe na-agaziri ha site n’itinye ihe ha na-amụta n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, Ilu 6:6-8 na-asị: ‘Gakwuru ndanda. Lee ụzọ ya nile ma mara ihe. Ọ na-edozi nri ya na mgbe okpomọkụ, na-ekpokọtakwa ihe oriri ya na mgbe owuwe ihe ubi.’ Maria sịrị na ya mụtara ime nke a, na-azụrụ ihe mgbe e nwere ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, n’ihi ya kwa na-azụta ha n’ọnụ ego dị ala karị, dị ka ịzụta mkpụrụ osisi n’oge o ji amị. Ọ na-echerekwa oge ndị ụlọ ahịa ji ere ihe ná mgbuka iji zụrụ uwe ndị a ga-eyi n’afọ na-abịa. Ha ‘na-edozi nri ha na mgbe okpomokụ’ site n’ịrụ ọrụ ubi n’obere ala nke na-ewe 45 minit isi n’ụlọ ha garuo n’ebe ọ dị. Okwu ndị ahụ dị na 1 Jọn 2:16 na-enyekwa aka. Ha amụtawo inwe afọ ojuju n’arịa ndị ha nwere n’ụlọ ọbụna a sị na ndị a abụghị ndị na-ewu ewu. Kama imekwa oké mmefu n’ile ọbịa, ha na-enweta ọṅụ n’inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke.
ZERE IMEFUSỊ EGO GỊ
20-22. N’ihi gịnị ka ndụmọdụ Bible banyere ịṅụ mmanya ji bụrụ ihe na-enye aka?
20 Itinye aka n’omume ndị dị ka ịṅụ ọgwụ ma ọ bụ ihe na-aba n’anya n’ụzọ na-ezighị ezi, ise siga na ịgba chaa chaa pụrụ ịmịkpọ ego i nwere. Bible na-enyekwa aka n’akụkụ ndị a.a
21 Tụlee mmanya na-aba n’anya. Bible adịghị egbochi imeru ihe n’ókè n’ihe banyere ịṅụ ihe ndị na-aba n’anya. Ma ọ na-adụ ọdụ, sị:
“Ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya na-anọgide na-abụ ogbenye, ọ gaghị aba ọgaranya bụ́ onye na-ahụ mmanya na ibi ndụ dị elu n’anya.”
“Abụla otu n’ime ndị ahụ na-aṅụ mmanya n’akwụsịghị akwụsị . . . n’ihi na onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye na-eribiga ihe ókè na-akpatara onwe ha ịda ogbenye, isi nke na-ero ụra na-akpatakwa iyi nkịrịka ákwà.”—Ilu 21:17; 23:20, 21, Jerusalem Bible.
22 Ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata imefusị ego n’ụzọ dị iche iche. Ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya n’onwe ha dị oké ọnụ, ụfọdụ ndị na-emefu ihe ruru ọkara nke ihe a na-akwụ ha kwa izu ná mmanya. Na nanị otu ógbè ndị Canada bụ Quebec, a na-emefu ihe karịrị otu ijeri dollar kwa afọ ná mmanya. A na-emefu otu ijeri ọzọ n’ihe ndị e jikọro ha na ịṅụbiga mmanya ókè—ịgha ọrụ na ihe ọghọm ndị metụtara mmanya na-aba n’anya.
N’ebe ndịda Chile, a chụrụ otu onye na-ere akpụkpọ ụkwụ n’ọrụ n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè. Ọ malitekwara ịrụzi akpụkpọ ụkwụ n’obere ụlọ dị n’akụkụ n’otu nkịrịka ụlọ ebe ezinụlọ ahụ bi ma na-akwụ ụgwọ ya. Ma, ókè ka ukwuu nke ego ya gara n’ịṅụ mmanya, ọtụtụ mgbekwa nwunye ya aghaghị ịgbapụta ya n’ụlọ mkpọrọ. Ọ dịkwa mkpa na nwanyị ahụ ga-arụ ọrụ ruo ime abalị n’ime wig ka ha wee nweta ego nri. Ma ọ malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, bụ́ nke kpaliri ya ịbụ nwunye nke na-aghọta ihe ma na-enye nkwado karị. Nke a dujere di ya n’isonye n’ọmụmụ ihe ahụ. Ọ mụtara na mmadụ apụghị ịbụ onye na-aṅụbiga mmanya ókè ma bụrụ onye Kraịst, ya mere ọ kwụsịrị ịṅụ mmanya. Mgbe ahụ, ezinụlọ ahụ malitere iri nri ka mma. Ka oge na-aga ha zụtara ọbụna ụlọ dị nta na otu ụlọ ahịa ebe ọ na-arụ ọrụ ịrụzi akpụkpọ ụkwụ nke na-aga nke ọma.
23-25. Olee otú ịgba chaa chaa siworo tụkwasị ihe ná nsogbu?
23 Olee banyere ịgba chaa chaa, ma ọ bụ iti ébé nke ego dị ukwuu n’ịsọ mpi nke ịgba ọsọ ịnyịnya ma ọ bụ kalụkalụ ma ọ bụ iti ébé nke a na-ejikarị tiketi lọtrị eme? Ọtụtụ ndị nwere nsogbu ego n’ihi ịgba chaa chaa ná nrụgide. Ha na-anọgide na-enwe olileanya “igbu ozu,” ma ihe ha na-eme n’ezie bụ imefusị ego ha, bụ́ nke na-ewetara ezinụlọ ha ihe isi ike mgbe mgbe.
24 Otu nwoke onye Australia sịrị na ruo ọtụtụ afọ, “ịgba chaa chaa riri [ya] isi. Ana m agba chaa chaa ụbọchị asaa n’izu, m ka ga-agbakwa ma a sị na e nwere ụbọchị ọzọ fọrọ.” O bigidere ego n’aka ndị enyi ya ruo mgbe ha malitere izere ya. “Mgbe ụfọdụ, mgbe m na-eriteghị ihe ọ bụla, aga m eburu isi m kụọ ná mgbidi ma rịọ nwunye m arịrịọ, ‘Nye m nanị 50 cent. Ama m na m ga-erite ihe.’”
25 Mgbe ọ malitere ịmụ Bible, o nwere mmasị na ndụmọdụ Jisọs: “Lezienụ anya, debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla.” (Luk 12:15; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) N’ikwubi na ịgba chaa chaa ya na-egosipụta oké anyaukwu, nwoke a rụgidere onwe ya ịkwụsị. N’inwe ike iji ụgwọ a na-akwụ ya mee ihe n’ụzọ ga-abara ezinụlọ ya uru, ọ pụrụ ịghọta ilu ahụ nke ọma bụ́: “Akụ̀ na ụba nke e nwetara site n’atụmatụ ọjọọ ga-agwụsị; ma onye na-ekpokọba nke nta nke nta ga-eme ka ụlọ ndebe akụ̀ ya hiwanye nne.”—Ilu 13:11, An American Translation.
ISI IHE BỤ INWE AFỌ OJUJU
26, 27. N’ihi gịnị ka okwu ndụmọdụ Bible banyere inwe afọ ojuju ji baa uru?
26 Banyere ego, otu akụkụ nke Bible pụrụ inye ụfọdụ n’ime enyemaka kachasịnụ gụnyere ụzọ mmadụ si ele ihe anya n’onwe ya. Na 1 Timoti 6:7-10 anyị na-agụ, sị:
“Gịnị ka anyị wetara n’ụwa? Ọ dịghị! Gịnị ka anyị ga-ewepụ n’ụwa? Ọ dịghị! Ya mere mgbe ahụ, ọ bụrụ na anyị enwee nri na uwe, nke ahụ kwesịrị izuru anyị. Ma ndị chọrọ ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa, a na-amatakwa ha n’ọnyà nke ọtụtụ ọchịchọ nzuzu ndị na-emerụ ahụ. . . . Ụfọdụ ndị achọsiwo ike inwe [ego] nke na ha akpafuwo site n’okwukwe ma gbawaakwa obi ha site n’ọtụtụ ihe mwute.”—Good News Bible.
27 Ma hà bụ ogbenye ma hà bụ ọgaranya, afọ adịghị eju ndị hụrụ ego n’anya. Otu onye isi ọrụ nke na-agbasi mbọ ike na California gwara nwunye ya, sị: “Achọrọ m ịba ọgaranya . . . ọ bụrụkwa na m ga-eme nhọrọ n’etiti gị na [ụlọ ọrụ], m gaghị ahọrọ gị.” Ọ ghọrọ onye isi nke otu ụlọ ọrụ ukwu, na-agụ ego ya na nde na nde, ma biri n’ụlọ ọnụ ahịa ya bụ $700,000. Ma o kwuru, sị: “Ihe ọ bụla m nwere ezughị.” Eziokwu dị na ya bụ na ego adịghị eme ka e jide obi ụtọ n’aka. Afọ abụọ tupu ọ nwụọ, onye ahịa mmanụ ahụ na-agụ ego na nde na nde, bụ́ J. P. Getty kwuru, sị: “Ego enweghị njikọ ọ bụla n’ebe obi ụtọ dị. Ma eleghị anya o nwere njikọ n’ebe enweghị obi ụtọ dị.”
28-30. Ndụmọdụ dị aṅaa mara mma ka Jisọs nyere banyere akụ̀?
28 Ebe ọ na-adịghị akagbu inwe ego ma ọ bụ ihe onwunwe, Bible na-adọsi aka ná nti ike megide ịzụlite ịhụnanya maka ha. Ọ na-echetara anyị na ndụ adịghị esite n’ihe anyị nwere.—Luk 12:16-20.
29 Ya mere, kama iji nchegbu sitere n’ịchụso akụ̀ na ụba mejupụta ndụ gị, nwee afọ ojuju n’ihe i nwere ma ọ bụ ihe aka gị pụrụ iru na ha n’ụzọ ezi uche dị na ya. Okwu Jisọs ndị ahụ e dere na Luk 12:22-31 pụrụ inyere anyị aka inwe echiche dị otú ahụ:
“Unu echegbula onwe unu nye ndụ unu, ihe unu ga-eri; echegbukwala onwe unu nye ahụ unu, ihe unu ga-eyi. N’ihi na ndụ karịrị ihe e ji azụ ya, ahụ karịkwara uwe oyiyi ya. Tụgharịanụ uche n’ugoloọma, na ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi; nke na-enweghị ime ụlọ nta ma ọ bụ ọba; ma Chineke na-azụ ha: ùnu onwe unu abụghị ihe oké ọnụ ahịa karịa anụ ufe nke ukwuu? . . . Unu onwe unu achọkwala ihe unu ga-eri, na ihe unu ga-aṅụ, unu enwekwala obi abụọ. N’ihi na ihe ndị a nile ka mba nile nke ụwa na-achọ: ma Nna unu na-amata na ihe ndị a dị unu mkpa.”
30 Ebe nkobe ákwà nke jupụtara n’ákwà ndị dara oké ọnụ, nri mara abụba na ụlọ dị ebube pụrụ inye ọṅụ ruo n’ókè ụfọdụ, ma ha apụghị ịtụkwasị otu afọ ná ndụ gị—ha pụrụ iwepụ ọtụtụ afọ site na ya. Ma ị pụrụ inweta obi ụtọ dị ukwuu ná ndụ n’enweghị akụ̀ na ụba.
31-33. Olee otú ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi nyere gị aka ibi ndụ ka mma?
31 Ọ dịghịkwa gị mkpa inwe akụ iji nwee ndị enyi. Onye ọ bụla dabeere n’ego ya iji dọta ndị enyi na-ehie ụzọ. “Ndị enyi” e si otú ahụ nweta na-eri nri gị ma kerie ihe onwunwe gị, ma mgbe ego ahụ gwụrụ, otú ahụ ka ha sikwa apụ n’anya.—Eklisiastis 5:11; Ilu 19:6.
32 Ma mgbe ị nabatara echiche ziri ezi nke Bible banyere ọrụ, na-enweta ọṅụ ná ndụ ma na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ị ga-enweta “onyinye Chineke.” Dị ka Eklisiastis 3:12, 13 si na-akọwa ya: “Ọ dịghị ezi ihe dịịrị ha, ma ọ bụghị ka mmadụ ṅụrịa ọṅụ, meekwa ezi ihe n’ogologo ndụ ya. Ọzọkwa, mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bu.”
33 Ndụmọdụ Chineke n’okwu ndị a dị nnọọ mma nke ukwuu nke na mmadụ pụrụ iche, sị: Chineke ọ̀ ga-emeghe ụzọ otu ụbọchị maka ịkwụsị kpam kpam ịda ogbenye, erighị nri na-edozi ahụ na enweghị ezi ebe obibi, bụ́ ndị a na-ejikọkarị ha na nsogbu ego mgbe mgbe? Ọ ga-eme otú ahụ! E mesịakwa anyị ga-atụlekwa ihe àmà nke na-enye ihe mgbakwasị ụkwụ maka nkwenyesi ike dị otú a. Ma nke mbụ, ka anyị lebagodi anya ná nsogbu ndị ọzọ na-emetụta ndụ ụmụ mmadụ nke ukwuu ugbu a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Leekwa Isi nke 10, “Ahụ Ike Ka Mma na Ndụ Ka Ogologo—N’ụzọ Dị Aṅaa?”
Igbe dị na peeji nke 53]
OTU NWANYỊ ONYE NDỊDA AMERICA NKE NA-AZỤ AHỊA
Na Georgetown, Guyana, Norma onye dị 48 afọ nwere ụlọ ahịa a na-ere ihe ubi n’otu n’ime ahịa ndị kachasị ibu. Ọ na-aghọ aghụghọ mgbe o ji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ya na-atụ ihe. Ọ bụrụ na mmadụ asị ka e nye ya azụ̀ nnu ọ̀tụ̀tụ̀ ya dị ounce 4, ọ na-ahazi ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ya n’akara nke 3, otú ahụ ka o si eme. Ọzọ, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ígwè ndị o ji atụ ihe dị mkpirisi. N’ihi nke a, ndị na-azụ ya ahịa adịghị enweta ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu mgbe ọ bụla.
N’otu Sunday, otu onye ikwu ya nyere ya otu “Ụlọ Nche” nke tụlere ụkpụrụ Bible n’azụmahịa. Ihe o kwuru banyere emeghị ihe n’eziokwu yiri ka ọ na-agwa ya okwu kpọmkwem. (Ilu 20:23; Levitikọs 19:35, 36) Na Monday Norma tụfuru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ụgha ndị ahụ ma nweta ndị ziri ezi. Ọ malitere ije nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova ma na-enwe ọmụmụ Bible. N’agbanyeghị nkọcha sitere n’ezinụlọ ya, obi siwanyere ya ike na ya mere ihe ziri ezi.
Olee otu azụmahịa ya si gaa? Ọ pụghị inweta uru ahịa n’ihe ụfọdụ n’aghọghị aghụghọ, ya mere ọ kwụsịrị ire ha. Ma ndị na-azụ ya ahịa hụrụ mgbanwe ná ngwá ahịa ndị fọdụrụ ma kwuo sị, ‘Kemgbe ị ghọrọ onye Kraịst ị na-enye anyị ihe hiri nne karị maka ego anyị kwụrụ.’ Dị ka ihe si na ya pụta, azụmahịa ya malitere ịka mma. N’iji eziokwu na-enweta uru, Norma nwere ike ịkwụ ụgwọ o ji maka ebe obibi ya, tinye ego ụfọdụ n’ụlọ akụ̀ ma nye onyinye obi ebere. Ahụ ike ya akawokwa mma, n’ihi na ọ dịghị enweta isi ọwụwa n’ihi obi erughị ala nke ọ na-enwetabu mgbe ọ na-atụ egwu ịbụ onye e jidere n’aghụghọ ya.
Igbe dị na peeji nke 59]
“Iri pasent asatọ na asaa nke ndị Australia ekerewo òkè n’ụdị ụfọdụ nke ịgba chaa chaa n’ọnwa atọ gara aga.”—“The Sunday Mail” (Brisbane).
“Ọ Ga-akara Anyị Mma Ịgba Chaa Chaa Karịa Iri Nri! Ndị Queensland na-emefu ihe e mere atụmatụ na ọ dị $12 nde kwa izu n’ịgba chaa chaa—ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụkwa ókè ha na-emefu n’ịzụta ngwá nri na anụ.”—“The Sunday Mail” (Brisbane).
[Foto dị na peeji nke 57]
Ndụmọdụ Bible enyewo aka n’atụmatụ mmefu ego ezinụlọ
[Foto dị na peeji nke 60]
Ruo ókè hà aṅaa ka ụkpụrụ Bible banyere ịṅụbiga mmanya ókè, ise siga na ịgba chaa chaa na-arụ ọrụ?