Isi 18
È Nwere Ihe Dị Mma n’Okpukpe Nile?
1, 2. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụlee ma è nwere ihe dị mma n’okpukpe nile?
MGBE e kwuru banyere okpukpe, ọtụtụ ndị na-asị, ‘E nwere ihe dị mma n’okpukpe nile,’ ma ọ bụ, ‘Okpukpe nile bụ nanị ụzọ dị iche iche na-eduje n’ebe Chineke nọ.’
2 Ọ dị mfe ịhụ ihe mere mmadụ ụfọdụ pụrụ iji hụ izi ezi ụfọdụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe ọ bụla, n’ihi na ihe ka ọtụtụ na ha nile na-ekwu okwu banyere ịhụnanya ma na-akụzi na igbu mmadụ, izu ohi na ịgha ụgha dị njọ. Òtù okpukpe dị iche iche ezipụwo ndị ozi ala ọzọ ije lekọta ụlọ ọgwụ na inyere ndị ogbenye aka. Karịsịakwa na narị afọ abụọ gara aga, ha ekerewo òkè n’ịsụgharị na ikesa Bible, si otú a na-eme ka ọtụtụ mmadụ rite uru site n’Okwu Chineke. (2 Timoti 3:16) Ma ọ dịkwa mkpa ịjụ onwe anyị, sị: Olee otú Jehova na Jisọs Kraịst si ele okpukpe dị iche iche anya?
ỤZỌ NKE ZIRI EZI—ỤZỌ DỊ WARARA
3-5. Olee ụzọ Jisọs si lee okpukpe anya, n’ihi gịnịkwa?
3 Ụfọdụ ndị na-eche na e nwere ihe dị mma n’okpukpe nile na-ele ikwenye na Chineke agaghị anabata ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ n’agbanyeghị ihe okpukpe ha bụ anya dị ka inwe uche na-egheghị oghe. Ma Jisọs, bụ́ onye maara ma na-eme omume n’ụzọ na-egosipụta echiche nke Nna ya, nwere echiche dị iche. (Jọn 1:18; 8:28, 29) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ezi ezi n’ịsị na Ọkpara Chineke enweghị uche ghere oghe. Tụlee ihe o kwuru n’Ozizi Elu Ugwu:
“Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14.
4 Gịnị ka ọ na-ewe iji nọrọ n’ụzọ ahụ dị warara ma nwee nnwapụta Chineke? N’ikwekọ ná mmụọ ọgbara ọhụrụ nke imesapụ obi ma ọ bụ ijikọ chọọchị nile ọnụ, ụfọdụ ga-aza, sị, ‘Nanị mee ihe ọma ma zere imejọ ndị ọzọ,’ ma ọ bụ, ‘Nanị ihe dị gị mkpa bụ ịnabata Jisọs dị ka Onyenwe gị.’ Ma Jisọs sịrị na a chọrọ ihe dị ukwuu karị:
“Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye NA-EME IHE NNA M Nke bi n’eluigwe NA-ACHỌ. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị aha Gị . . . rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka m ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla M maara unu: si n’ebe M nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”—Matiu 7:21-23.
5 Ọ bụ eziokwu na Jisọs dụrụ ọdụ megide ikpe ikpe banyere adịghị ike ndị na-abaghị n’ihe nke ndị ọzọ. (Matiu 7:3-5; Ndị Rom 14:1-4) Ma n’isiokwu dị mkpa nke okpukpe, o gosipụtara mkpa ọ dị ịrapara na Bible, ma mee uche nke Nna ya. Jisọs katọrọ omume na ozizi ndị megidere Okwu Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ maara na Ekwensu ji okpukpe na-amata ndị mmadụ n’ọnyà. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ihe nile Setan nwere nke o ji arụ ọrụ bụcha ihe ụgha, ma ọ na-eche ha n’ihu ụmụ mmadụ n’ụzọ na-eme ka ha na-adọrọ mmasị. (Jenesis 3:4, 5; 1 Timoti 4:1-3) Ọbụna n’etiti ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst, e nwere ndị ndú okpukpe na-eje ozi maka ọchịchọ Ekwensu. (2 Ndị Kọrint 11:13-15) Ozizi ha na-enye echiche na-ezighị ezi banyere ụzọ nile nke Jehova nke ịhụnanya na mmesapụ aka. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ ihe ijuanya na Jisọs kpughere ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị ozizi ha megidere Akwụkwọ Nsọ?—Matiu 15:1-20; 23:1-38.
6, 7. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na anyị nwere ezi ihe ọmụma?
6 Ọtụtụ ndị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, eketawo okpukpe ha site n’ọmụmụ. Nanị ihe ndị ọzọ na-eme bụ ịgbaso ebe a ka n’ọnụ ọgụgụ na gburugburu ha. Ma ọbụna ọ bụrụ na e ji ezi nzube obi na-eme nke a, ọ pụrụ itinye mmadụ ‘n’ụzọ ahụ dị obosara nke na-eduje n’ịla n’iyi.’ (Jọn 16:2; Ilu 16:25) Pọl onyeozi (onye a kpọkwara Sọl) enwewo ịnụ ọkụ n’obi n’okpukpe ya ọbụna ruo n’ókè nke ịkpagbu ndị Kraịst. Ma, iji bụrụ onye Chineke na-anabata, ọ gbanwere gaa n’ụzọ ofufe ọhụrụ. (1 Timoti 1:12-16; Ọrụ 8:1-3; 9:1, 2) Ka oge na-aga, e nyere ya ike mmụọ nsọ ide na ụfọdụ ndị na-ekpesi okpukpe ike n’oge ahụ “na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị.” (Ndị Rom 10:2) Ì nwere ezi ihe ọmụma nke uche Chineke nke e setịpụrụ na Bible? Ị̀ na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ na ya?
7 Ejila nke a gwurie egwu, ma eleghị anya na-eche na ọ bụrụ na ị nọchaghị n’ezi ụzọ ahụ, Chineke ga-aghọta, ọ gharakwa ịbụrụ gị iwu ime mgbanwe ọ bụla. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na uche Chineke bụ ka mmadụ nile “bịaruokwa mmazu nke eziokwu,” mgbe ahụkwa dị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. (1 Timoti 2:3, 4; Jemes 4:17) Chineke buru amụma na ná “mgbe ikpeazụ” ọtụtụ ndị ‘ga-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya.’ O nyere iwu, sị: “Gị gbakụtakwa ndị a azụ.”—2 Timoti 3:1-5.
OLEE OTÚ Ị PỤRỤ ISI MARA?
8-11. Olee otú ozizi na ememe ụfọdụ a na-ahụkarị si emegide Bible?
8 Ọ bụ eziokwu na ofufe nke na-amasị Chineke aghaghị ikwekọ ‘ná mmazu,’ nnyocha na-ekpughe na ọtụtụ chọọchị na-ezi ozizi ndị na-emegide Bible. (Ndị Rom 10:2) Dị ka ihe atụ, ha na-anakwere ozizi ahụ na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. (Ezikiel 18:4, 20; lee peji nke 115.) Ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ozizi ahụ ọ̀ dị njọ nke ukwuu?’ Echefula na ụgha mbụ Setan ghara bụ na mmehie agaghị eweta ọnwụ. (Jenesis 3:1-4) Ebe ọnwụ bụ ihe a na-apụghị izere ezere ugbu a, ozizi ahụ bụ na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ yiri ka ọ na-akwado ụgha Setan ahụ. O dujewo ọtụtụ nde mmadụ n’isoro ndị mmụọ ọjọọ bụ́ ndị na-egosi onwe ha dị ka mkpụrụ obi nke ndị nwụrụ anwụ na-enwe mmekọrịta ndị na-atụ egwu. Ozizi ahụ na-emekwa ka eziokwu nke Bible banyere mbilite n’ọnwụ na-abịanụ nke ndị nwụrụ anwụ ghara inwe isi.—Ọrụ 24:15.
9 O metụtakwara akparamàgwà, n’ihi na ọtụtụ okpukpe na-anabata ma ọ bụ na-akwado ezumike na omenala dị iche iche dabeere na nkwenkwe nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Ememe Halloween, Ụbọchị Mkpụrụ Obi Nile na ndị ọzọ bụ ụbọchị ezumike ndị yiri nke ahụ, na-agwakọta n’ememe ndị e nwetara site n’okpukpe ndị na-abụghị nke ndị Kraịst.
10 Ngwakọrịta nke okpukpe na-abụghị nke ndị Kraịst na nke a sịrị na ọ bụ nke ndị Kraịst na-agbasapụ ruo n’ememe ndị ọzọ, dị ka Krismas. Chineke gwara ndị Kraịst ka ha mee ememe ncheta ọnwụ Jisọs, ọ bụghị ọmụmụ ya. (1 Ndị Kọrint 11:24-26) Bible na-egosikwa na a mụghị Jisọs na December, bụ́ udu mmiri mgbe oyi na-atụ n’Israel. (Luk 2:8-11) Ị pụrụ ileba anya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma ọ bụla ma hụ na a họọrọ December 25 n’ihi na ọ dịworị mbụ bụrụ ememe ndị Rom. Sir James Frazer kwuru, sị:
“Ọ bụrụ na e jikọọ ha nile ọnụ, ndabakọ ndị dị n’etiti [Krismas na Ista] na ememe ndị ọgọ mmụọ dị nso nke ukwuu dịkwa ọtụtụ nke ukwuu nke na ọ bụghị ihe ndabara. . . . [Ndị ụkọchukwu] hụrụ na ọ bụrụ na Iso Ụzọ Kraịst ga-emeri ụwa, ọ pụrụ ime otú ahụ nanị site n’ibelatatụ ụkpụrụ ndị siri oké ike nke Onye Guzobere ya, site n’imesawanye ọnụ ụzọ ahụ dị warara nke na-eduje ná nzọpụta.”—The Golden Bough.
11 Mgbe ọ mụtasịrị eziokwu ndị ahụ, olee onye na-ahụ Jehova n’anya n’ezie nke ga-anọgide na-anabata nkwenkwe na ememe ndị dabeere n’ịnakwere ikpere arụsị? Nye ụfọdụ ndị, ozizi ma ọ bụ ememe ndị a pụrụ iyi ihe nta. Ma Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ihe iko achịcha dị nta na-eko ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum.”—Ndị Galetia 5:9.
AGHA NA ỤKPỤRỤ OMUME
12, 13. Olee otú chọọchị dị iche iche na ezi Iso Ụzọ Kraịst si dị iche n’ihe metụtara agha?
12 Jisọs Kraịst setịpụrụ ihe enyemaka ọzọ n’ịchọpụta okpukpe nke Jehova na-anabata mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:34, 35) Ọtụtụ okpukpe na-ekwu okwu banyere igosi ịhụnanya, ma hà na-agba ume n’ezie igosi ụdị ịhụnanya ahụ nke Jisọs gosiri?
13 Anyị ahụworị na ndị Kraịst na narị afọ ndị bu ụzọ dịrị ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkọwa amụma ahụ dị n’Aịsaịa 2:4. Ha ‘kpụgharịrị mma agha ha ịbụ mma ogè, ha agaghịkwa ebuli mma agha megide ibe ha ma ọ bụ mụta agha ọzọ.’ (Lee peji nke 166, 167.) Ọnọdụ dị aṅaa ka chọọchị dị iche iche na ndị ndú okpukpe ha werewooro? Ọtụtụ ndị maara site n’ahụmahụ nke onwe ha na chọọchị dị iche iche akwadowo ma gọzie obubuagha—ndị Katọlik na-egbu ndị Katọlik, ndị Protestant na-egbu ndị Protestant. Nke a n’ezie abụghị ịgbaso ihe ilereanya Jisọs setịpụrụ. Ọ dị mma ịmara na ọ bụ ndị ndú okpukpe ndị Juu, ebe ha na-asị na ọdịmma nke mba nọ n’ihe ize ndụ, kwadoro ogbugbu e gburu Jisọs.—Jọn 11:47-50; 15:17-19; 18:36.
14-16. Ezi Iso Ụzọ Kraịst na-ewere ọnọdụ dị aṅaa n’ijigide ụkpụrụ omume nile nke Chineke?
14 Dị ka ihe enyemaka ọzọ iji mara ma òtù okpukpe ò nwere nnwapụta Chineke, tụlee ma ọ̀ na-anakwere ụkpụrụ omume ya kama nanị ịdị na-eleghara omume ọjọọ anya. Jisọs gbalịrị inyere ndị mmehie na-anyịgbu aka, gụnyere ndị na-aṅụbiga mmanya ókè na ndị na-akwa iko. Ndị na-eso ụzọ ya ga-eme otú ahụ. (Matiu 9:10-13; 21:31, 32; Luk 7:36-48; 15:1-32) Ọ bụrụkwa na onye ghọworo onye Kraịst emehie, ndị Kraịst ndị ọzọ pụrụ inyere ya aka, na-agbalị iweghachite ya n’amara Chineke na n’ịdị ike nke ime mmụọ. (Ndị Galetia 6:1; Jemes 5:13-16) Ma gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-eme mmehie n’enweghị nchegharị?
15 Otú ahụ ka ọ dị n’ọnọdụ nke otu nwoke na Kọrint. Pọl dere, sị:
“Ka unu na onye ọ bụla nke a na-akpọ ya aha na ọ bụ nwanna ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye anyaukwu, ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye nkwutọ, ma ọ bụ onye na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe; ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe. . . . Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti onwe unu.”—1 Ndị Kọrint 5:11-13.
Ndịàmà Jehova na-agbaso nduzi Chineke na nke a. Ọ bụrụ na onye na-eme mmehie dị oké njọ ajụ ịnabata enyemaka ma ghara ịhapụ ụzọ omume ya rụrụ arụ, a ghaghị ịchụpụ onye dị otú ahụ n’ọgbakọ. Ma eleghị anya nke a ga-eme ka ọ mụta ihe. Ma, ma nke ahụ ò mere ma ọ bụ na o meghị, ime ihe dị otú a na-eje ozi iji chebe ndị òtù nke ọgbakọ bụ́ ndị nwere ezi obi, ndị na-agbalịsi ike ijigide ụkpụrụ nile nke Chineke, ọ bụ eziokwu na ha ezughị okè n’onwe ha.—1 Ndị Kọrint 5:1-8; 2 Jọn 9-11.
16 Otú ọ dị, ị pụrụ ịma banyere ndị na-aga chọọchị, bụ́ ndị na-eme mmehie n’ihu ọha, ma eleghị anya ọbụna na-anata ùgwù ndị pụrụ iche na chọọchị ha n’ihi akụ̀ na ụba ha ma ọ bụ ha ịbụ ndị a ma ama. Site n’ịjụ ịgbaso iwu Chineke nke ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị, chọọchị dị iche iche na-eme ka ndị ọzọ chee na ha pụkwara ime mmehie. (Eklisiastis 8:11; 1 Ndị Kọrint 15:33) Chineke apụghị ịnwapụta ndị na-amịpụta mkpụrụ dị otú ahụ.—Matiu 7:15-20; Mkpughe 18:4-8.
ỊNỌGIDE N’ỤZỌ NKE NA-EDUBA NÁ NDỤ
17, 18. Olee otú ị pụrụ isi nọgide n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ?
17 Ozugbo ị chọtara ‘ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ,’ ọ dị gị mkpa ịnọgide na-amụ Bible ka i wee nọgide na ya. Gbaa mbọ ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị; zụlite agụụ maka ya. (1 Pita 2:2, 3; Matiu 4:4) Ọ ga-akwadebe gị maka “ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.
18 Ezi ọrụ ndị ahụ na-agụnye ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume Chineke, tinyekwara ịdị obi ọma na inyere ndị ọzọ aka, karịsịa ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị. (Jemes 1:27; Ndị Galetia 6:9, 10) Otú ahụ ka Jisọs dị. E wezụga isetịpụ ezi ihe ilereanya nke omume, ọ gwọrọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ na-agụ nri ma kasie ndị nọ ná mwute obi. Karịsịa, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe ma mee ka ha dị ike. Ọ bụ eziokwu na anyị apụghị iṅomi ọrụ ebube ya, anyị pụrụ inye ndị ọzọ enyemaka bara uru ruo ókè o kwere anyị mee, bụ́ nke pụrụ ịkpali ụfọdụ ito Chineke.—1 Pita 2:12.
19, 20. Ọrụ ọzọ dị aṅaa dị mkpa maka ndị Kraịst?
19 Ma ọrụ ọma nile nke Jisọs gụnyere ihe dị ukwuu karị. Ọ maara na ọrụ kachasị mma a rụụrụ ndị ọzọ bụ inyere ha aka ịmata ụdị ofufe nke Chineke na-anabata na ịkụziri ha banyere nzube nile nke Alaeze Chineke. Nke a pụrụ inyere ha aka inweta ihe mgbaru ọsọ nke ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ.—Luk 4:18-21.
20 N’otu aka ahụ, ndị Kraịst taa kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụrụ Jehova ndị àmà. Ha pụrụ ịgba àmà site n’omume ọma ha, bụ́ nke na-agụnye inyere ndị ọzọ aka idebe onwe ha “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.” (Aịsaịa 43:10-12; Jemes 1:27; Taịtọs 2:14) Ọzọ, ha pụkwara iwere “ozi ọma” ahụ gaa kpọmkwem n’ebe obibi ụmụ mmadụ, na-anọgidesi ike n’ọrụ a ruo mgbe Chineke ga-asị na a rụzuwo ya. (Luk 10:1-9) Ọ̀ bụ na ị chọghị inyere ndị agbata obi gị aka, gụnyere ezinụlọ gị, ịmụ banyere ofufe nke Jehova na-anabata? Mgbe ahụ, gị onwe gị kwa kwesịrị ikere òkè n’ikwupụta okwukwe gị n’ihu ọha; ime otú ahụ pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịchọta ụzọ nke na-eduba ná ndụ.—Ndị Rom 10:10-15.
Igbe dị na peeji nke 173]
“EZI ỤKPỤRỤ NA IME IHE IKE N’AUSCHWITZ”
N’akwụkwọ ya nke nwere isiokwu ahụ, onye Poland bụ́ ọkà mmụta ná mmekọrịta ọha na eze, bụ́ Anna Pawelczynska, kwuru na n’ọchịchị Nazi nke Germany “Ndịàmà Jehova guzosiri ike maka ihe ha kwere, bụ́ nke megidere agha na ime ihe ike nile.” Gịnị si na nke ahụ pụta? Ọ kọwara, sị:
“Ìgwè nta nke a nke ndị mkpọrọ bụ ike echiche siri ike, ha merikwara n’agha ha megide ọchịchị Nazi. Ndị Germany nọ n’òtù a abụrụwo òtù dị nta nke nguzogide na-adaghị mbà kpọmkwem n’ime mba nke nọ n’egwu, n’otu mmụọ ahụkwa nke adaghị mbà, ha rụrụ ọrụ n’ogige dị n’Auschwitz. Ha jisiri ike nweta nsọpụrụ nke ndị mkpọrọ ibe ha . . . nke ndị isi na-elekọta ndị mkpọrọ, na ọbụna nke ndị ọrụ SS. Onye ọ bụla maara na ọ dịghị Onyeàmà Jehova ga-eme ihe megidere ihe okpukpe ya kwere.”
[Foto dị na peeji nke 175]
Ị̀ nọ n’ụzọ ahụ dị obosara . . .
. . . ka ọ̀ bụ na nke dị warara?