Isi nke 1
Gịnị Ka Mbara Ala Bụ Ụwa Ga-aghọ?
1. Ọdịnihu dị aṅaa ka ị na-atụ anya ya, n’ihi gịnịkwa?
GỊNỊ bụ ọdịnihu gị dị ka otu n’ime ọtụtụ ijeri mmadụ dị ndụ ugbu a na mbara ala bụ Ụwa? Ị̀ ga-achọ ka ọ bụrụ ndụ nke udo na ntụkwasị obi, n’etiti ndị hụrụ ibe ha n’anya n’ezie? Nke ahụ na ihe karịrị ya pụrụ ịbụ nke gị. Ma nke ahụ abụghị ọdịnihu nke ihe ka ukwuu na-atụ anya ya. Gịnị mere ọ bụghị?
2, 3. Olee otú iyi egwu nke agha nuklia si emetụta ụzọ ụmụ mmadụ si ele ọdịnihu anya?
2 Iyi egwu nke agha nuklia akpatala obi abụọ dị ukwuu n’ihe banyere ma à gajekwa inwe ọdịnihu ọ bụla ma ọlị maka ọtụtụ ìgwè dị ukwuu nke agbụrụ mmadụ. Mgbe mbụ e ji bọmbụ atọm mee ihe n’ibu agha na 1945, e gburu ihe karịrị 70,000 ndị ikom, ndị inyom na ụmụntakịrị ozugbo ahụ. Ọtụtụ puku ndị ọzọ nwụrụ ọnwụ nhụsianya na ihe mgbu n’ime ụbọchị na afọ ndị sochiri. Ma taa, otu mkpụrụ ogbunigwe yiri nke ahụ nwere ike mgbawa nke bọmbụ nile a tụrụ n’Agha Ụwa nke Abụọ. E nwere ọtụtụ iri puku ngwá agha nuklia ndị e gwunyegasịrị n’ala maka iji ha mee ihe mgbe ọ bụla a chọrọ ya. Ụwa ka anọkwa na-emefu $2,000,000,000 kwa ụbọchị n’ịkwakọba ngwá agha nke mere ka obi na-amapụ ọtụtụ mmadụ n’ihi egwu.
3 Ma, a sịkwanụ na e nwee nanị “agha nuklia a kpaara ókè”? Ihe ga-esi n’ime ya pụta gajekwa ịdị oké egwu. Dị ka Carl Sagan, onyeọkà mmụta sayensị a ma ama sịrị, ọ bụrụ na mba nile ejiri ọbụna ókè dị nta nke ike nuklia ha nwere mee ihe, “ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-ebibi mmepeanya anyị zuru ụwa ọnụ. . . . O yikwara ka ọ ga-ekwe omume igbuchapụ agbụrụ mmadụ nile.” Ọtụtụ mmadụ na-agbalị iwepụ olileanya dị otú ahụ n’uche ha, ma nke ahụ adịghị ewepụ ihe ize ndụ ahụ. Ọnụ ọgụgụ mmadụ na-amụba n’ike n’ike eguzobewo òtù ndị na-achọ nlanarị. N’olileanya nke bụ na ụfọdụ ga-alanarị, ha ewuwo ebe mgbaba dị iche iche n’ebe ndị dipụrụ adịpụ, jirikwa ihe oriri na ọgwụ kwajuo ha, ya na égbè ndị a ga-eji busoo ndị mwabata a na-achọghị agha.
4. N’ihi gịnị ka e ji ele mmetọ nke gburugburu ebe obibi mmadụ anya dị ka oké ihe iyi egwu?
4 E wezụga agha nuklia, ndị ọkà mmụta sayensị na-adọ aka ná ntị banyere mbibi zuru ụwa ọnụ site n’ụzọ e si emetọ gburugburu ebe obibi mmadụ. Mmetọ nke ikuku anyị na-ekuru na-akpata oké nchegbu. A na-egbuchapụ ọhịa dị iche iche n’ókè na-eyi egwu; ma ndị a dị mkpa maka usoro nrugharị nke ikuku ndụ nke ụwa, usoro mmiri ozuzo ya na nchekwa nke ala. Site n’amaghị ihe na anya ukwu, a na-ala ala ịkọ ihe dị mkpa n’iyi. A na-emetọ ebe dị iche iche e si enweta mmiri, mgbe mgbe site n’ajọ ọgwụ dị iche iche. Ma ihe ndị a dị mkpa iji mee ka ndụ mmadụ dịgide.
5, 6. Ọnọdụ ndị ọzọ dị aṅaa na-egbochi ndị mmadụ ịtụ anya na ndụ ga-adị ná ntụkwasị obi na obi ụtọ?
5 Nke ka na-akpata nchegbu ugbu a dị ka ị pụrụ iche, bụ eziokwu ahụ bụ́ na imempụ aka ike na-emezi ka ndị mmadụ bụrụ ndị mkpọrọ n’ụlọ ha dị iche iche. Ọgba aghara nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ọha mmadụ na-eme ka ndụ nọrọ n’ihe ize ndụ. Enweghị ọrụ nke gbasara ebe nile na ihe ịda oké ọnụ ahịa nke na-ala elu elu na-eduba n’ịnọ n’ụkọ na ndakpọ olileanya. Ndụ ezinụlọ nke ọtụtụ mmadụ adịghj eju afọ ma ọlị; a dịghị ahụkarị- kwa ihe nkekọ nile nke ịhụnanya, nke kwesịrị ijikọ ezinụlọ ọnụ. N’ebe nile, omume nke ụmụ mmadụ bụ “Mụ onwe m tupu ndị ọzọ!”
6 Mgbe ahụ, n’ole ebe ka mmadụ ọ bụla pụrụ ịchọta ezi ihe ndabere maka ịtụ anya ịma ụtọ ndụ nke dị ntụkwasị obi? Ọ bụrụ na ọdịnihu anyị dị ka ndị bi n’elu ala dabeere kpam kpam n’ihe ndị mmadụ na mba dị iche iche ndị so kpata nsogbu ndị a dị njikere, nweekwa ike ime, ọdịnihu ga-abụ ihe na-enweghị olileanya n’ezie. Ma ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị?
EZIOKWU NDỊ A NA-EKWESỊGHỊ ILEFURU ANYA
7. (a) Olee ihe àmà na-egosi na Bible bụ Okwu Chineke? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mmadụ mara ihe Bible na-ekwu?
7 Mgbe mgbe, ụmụ mmadụ adịghị agụnye Onye Okike nke ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ n’atụmatụ ha nile. Ma ànyị pụrụ isi aṅaa mata ihe nzube Ya bụ? Bible na-agwa anyị. Ugboro ugboro, Akwụkwọ a na-asị na ihe dị n’ime ya si n’ebe Chineke nọ, site n’ike mmụọ nsọ Chineke. Nzọrọ nke a ọ̀ bụ eziokwu? Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, ndụ gị dabeere n’ịdị na-eme ihe nke kwekọrọ na ya. N’ihi ịdị mkpa nke okwu a, anyị na-agba gị ume inyocha Bible n’onwe gị. Ị ga-ahụ ya dị ka ihe pụrụ iche, bụ ọtụtụ amụma ya ndị na-egosipụta ihe ọmụma zuru ezu banyere ọdịnihu. Amamihe ya mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ndị kasị mkpa nye obi ụtọ gị na-adịgide adịgide enweghị atụ. Anyị ji n’aka na ọ bụrụ na i jiri uche ghere oghe tụlee ihe àmà dịnụ, ị ga-amata na Bible aghaghị ịbịaworị nanị site n’ebe ka mmadụ elu, site n’aka Chineke onye hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya n’ezie.a Bible nwere ihe ọmụma dị mkpa maka nlanarị anyị n’oge a dị oké njọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ bụ akwụkwọ a kachasị kesaa n’ụwa.—Lee 2 Pita 1:20, 21; 3:11-14; 2 Timoti 3:1-5, 14-17.
8. Site n’aha dị aṅaa ka Bible na-eme ka a mara Onye Okike nke mbara ala bụ Ụwa?
8 Amaokwu mbụ nke Bible kwuru dị ka eziokwu bụ isi na “Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1)b Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị họọrọ ịhapụ Chineke n’enweghị aha, Bible emeghị otú ahụ. N’ịkọwa Onye Okike n’aha ya, Jenesis 2:4 na-agwa anyị na “Jehova, bụ Chineke mere ụwa na eluigwe.” (Leekwa Jenesis 14:22; Ọpụpụ 6:3; 20:11.) E dere akụkụ ka ukwuu nke Bible n’asụsụ Hibru na mbụ, n’ihe odide Bible Hibru ahụ, aha ahụ Chineke nwere n’onwe ya pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 7,000 ugbo dị ka letragramma- ton ((יהוה dị nsọ. Ndị nsụgharị ụfọdụ na-ede ya dị ka Yahweh, ma n’asụsụ Igbo, ụdị aha ahụ a na-ejikarị eme ihe bụ Jehova.
9. (a) Site n’aka onye ka aha Chineke ahụ malitere? (b) Mkpa ha aṅaa ka aha Chineke dị nye anyị? (Joel 2:32; Maịka 4:5)
9 Ọ bụghị ụmụ mmadụ ndị na-ekpesi okpukpe ike chepụtara aha nke a. Onye Okike ahụ họọrọ ya n’onwe ya. (Ọpụpụ 3:13-15; Aịsaịa 42:8) Ọ bụghị aha a ga-eji na-eme ihe ná mgbanwerịta ya na Buddha, Brahma, Allah, ma ọ bụ Jisọs. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, onye amụma ahụ bụ Moses chetaara mba Israel oge ochie, sị: “Ị mawokwa taa, chetakwara obi gị, na Jehova [Hibru: [יהוה, ya onwe ya bụ Chineke n’eluigwe dị n’elu na n’elu ụwa dị n’okpuru. Ọ dịghị onye ọzọ.” (Deuterọnọmi 4:39) Nke a bụ Chineke ahụ nke Jisọs kpekuru ekpere, onye ọ gwara okwu dị ka ‘onye nanị ya bụ ezi Chineke.’ Taa, mmadụ ndị maara ihe na-efe Ya ofufe, bụ ndị si ná mba nile dị n’elu ala.—Jọn 17:3; Matiu 4:8-10; 26:39; Ndị Rom 3:29.
10. N’ihi gịnị ka iyi egwu nke agha nuklia na mmebi ihe nke mmetọ ikuku na mmiri merela na-agaghị emebi nzube Chineke maka ala?
10 N’ihi eziokwu ahụ bụ na Jehova bụ Onye Okike nke ụwa, mbara ala ahụ nile bụ nke ya, ọdịnihu ya dịkwa ya n’aka. (Deuterọnọmi 10:14; Abụ Ọma 89:11) Nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ akarịghị ike Chineke ịgwọta. Olileanya nke agha nuklia na-emenye ụmụ mmadụ egwu. Ma, ọ̀ bụ iwu onye na-achị ike nuklia dum dị n’ókè hiri nne nke ukwuu n’ime ijeri kwuru ijeri kpakpando dị iche iche? Ọ̀ bụ na Chineke enweghị ihe ọmụma na ike dị mkpa iji chekwaa ndụ na mbara ala bụ Ụwa? N’otu aka ahụ, nsogbu nile nke biliterela n’ihi na ụmụ mmadụ ejirila amaghị ihe na anya ukwu metọsịa gburugburu ebe obibi ha agaghị egbochi nzube nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile. Onye ahụ nke nwere amamihe na ike dị mkpa iji kee ala na ụdị ihe dị iche iche dị ịtụnanya dị ndụ n’elu ya pụkwara inye ya mmalite e mere ka ọ dị ọcha ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ nzube ya. (Aịsaịa 40:26; Abụ Ọma 104:24) Ya mere, gịnị bụ nzube Jehova banyere mbara ala ebe obibi anyị nke a?
OGOLOGO OGE HA AṄAA KA ALA GA-ADỊRU?
11. (a) Gịnị ka ndị ọkà mmụta sayensị ụfọdụ kwetara na ụ ga-eme ala n’ikpeazụ? (b) Ònye maara banyere ihe ndị a karịa ha, n’ihi gịnịkwa?
11 Ọ̀ bụ nzube Chineke ibibi ala na ihe nile dị ndụ dị n’elu ya? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta nke ihe ndị dị na mbara ígwè na-atụpụta echiche bụ na n’otu oge n’ọdịnihu, na anyanwụ anyị ga-ebuwanye ibu nke ukwuu wee kpuchie elu ala. E nwere ndị na-eche na n’ihi ọdịdị nke eluigwe na ala a na-ahụ anya, na oge aghaghị ịbịa mgbe anyanwụ na-agaghị achakwa ọzọ, ala apụkwaghị ịkwado ndụ. Ma, hà ziri ezi? Gịnị ka Onye Okike sịrị—Onye mere ka ike na ihe dịrị, onye mepụtara iwu nile nke ịdị adị anyị dabeere na ha?—Job 38: 1-6, 21; Abụ Ọma 146:3-6.
12. N’ụzọ dị ariaa ka okwu Eklisiastis 1:4 siworo bụrụ eziokwu?
12 Mmụọ Jehova kpaliri Eze onye arnamihe bụ Solomon ide banyere ogologo ndụ mmadụ n’iji ya tụnyere ndịgide nke ala n’onwe ya. N’Eklisiastis 1:4, Solomon dedara okwu ndị a: “Otu ọgbọ alaa, ọgbọ ọzọ abịa; ma [ala] na-eguzoru mgbe ebighị ebi.” Akụkọ ihe mere eme nke mmadụ na-agba- ra ịbụ eziokwu nke okwu a àmà. Ọ bụ ezie na otu ọgbọ na-anọchi ọgbọ ọzọ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ala, bụ ụwa nke anyị bi n’elu ya, nọgide na-eguzo. Ma ruo ogologo oge ha aṅaa? Dị ka ndepụta nkịtị nke New World Translation of the Holy Scriptures si kwuo, ọ ga-abụ “ruo mgbe a na-amaghị ama.” Gịnị ka nke ahụ pụtara?
13. (a) Gịnị ka “mgbe a na-amaghị ama” pụrụ ịpụta? (b) N’ihi ya, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ala ga-adịru mgbe ebighị ebi?
13 Okwu Hibru bụ ‘oh-lam’, nke a sụgharịrị ịbụ “mgbe a na-amaghị ama” n’ebe a, pụtara n’ụzọ bụ isi otu oge nke, ọ bụrụ na e lee ya anya site n’oge dị ugbu a, bụ nke a na-amaghị ama ma ọ bụ nke zoro ezo nhụta kama ọ bụ ogologo oge. Nke ahụ pụrụ ịbụ mgbe ebighị ebi. Ma, ọ̀ pụtara otú ahụ n’ebe nke a? Ka nkọwa nke a ọ na-egosi, ma eleghị anya, n’oge ụfọdụ a na-amaghị ama n’ọdịnihu, bụ nke e zoro ezo ugbu a nye anyị, na ala ga-abịaru ọgwụgwụ ya? Ihe ụfọdụ Bible sịrị na ha ga-adịru “mgbe a na-amaghị ama” mesịrị gwụsịa. (Tụlee Ọnụ Ọgụgụ 25:13 [NW]; Ndị Hibru 7:12.) Ma Akwụkwọ nsọ na-ejikwa ‘oh-lam’ na-eme ihe n’okwu banyere ihe na-adị ebighị ebi—dị ka ihe atụ, Onye Okike ahụ n’onwe ya. (Tụlee Abụ Ọma 90:2 [NW] na 1 Timoti 1:17.) Banyere ihe okwu ahụ pụtara n’ihe gbasara ala, a hapụghị anyị n’obi abụọ. N’Abụ Ọma 104:5, a gwara anyị: “Ọ tọwo ntọala [nke ala] n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike; ka a ghara iwezuga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”c—Leekwa Abụ Ọma 119:90.
14. Ànyị si aṅaa mara na ala agaghị emesịa ghọọ ihe tọgbọrọ n’efu?
14 Ihe ga-adịru ebighị ebi abụghị nanị ala tọgbọ nkịtị nke na-adịghị eme ihe omume. Na Jeremaịa 10:10-12 [NW], a gwara anyị: “Jehova bụ Chineke n’eziokwu . . . Ọ bụ Onye mere ala site n’ike ya, Onye ji amamihe ya mee ka ala nke na-eme ihe omume guzosie ike, Onye jiwokwara nghọta ya setipụ eluigwe nile.” Rịba ama na ọ bụghị nanị na o mere “ala” kama o mekwara ka “ala nke na-eme ihe omume” guzosie ike. N’ọnọdụ nkọwa nke a kpe azụ, ọtụtụ ndị nsụgharị na-asụgharị okwu Hibru ahụ bụ te-vel’ dị ka nanị “ụwa.” Otú ọ dị, dị ka Old Testament Word Studies nke William Wilson dere si kwuo, te-vel’ pụtara “elu ala, dị ka ihe na-eme ihe omume nke mmadụ bikwa, ala nke mmadụ pụrụ ibi n’elu ya, ụwa.” Banyere nzube Jehova maka ala nke a nke na-eme ihe omume nke mmadụ bi n’elu ya, Abụ Ọma 96:10 ji imesi obi ike kwuo, sị: “Jehova bụ eze. Ọzọ, elu [ala] dum mmadụ bi na-eguzosi ike, a dịghị ewezụga ya n’ọnọdụ ya.”—Leekwa Aịsaịa 45:18.
15. Eziokwu ndị a si aṅaa kwekọọ n’ekpere ahụ Jisọs kụziiri ụmụazụ ya?
15 Otú a, ọ bụ banyere mbara ala bụ Ụwa nke anyị bi n’elu ya ka Jisọs Kraịst ziri ụmụazụ ya ikpere Chineke, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa. ”—Matiu 6:9, 10.
16. (a) Ụdị mmadụ dị aṅaa ga-ebi n’elu ala mgbe ahụ? (b) Gịnị bụ “ụwa ọhụrụ” ahụ nke Bible na-ekwu maka ya?
16 Nzube Jehova abụghị ka ndị ga-ebijupụta ala bụrụ ụmụ mmadụ ndị na-enweghị nsọpụrụ maka Onyenwe ya, ndị na-ahụghịkwa mmadụ ibe ha n’anya. Ogologo oge gara aga, o kwere nkwa, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:9, 29) Ọ bụ mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke, ndị na-ahụkwa mmadụ ibe ha n’anya n’ezie ga-ebijupụta “elu ala dum mmadụ bi nke gaje ịbịa,” nke Bible na-ekwu maka ya. (Ndị Hibru 2:5 [NW]; tụlee Luk 10:25-28) Mgbanwe ndị ga-eme n’okpuru Alaeze eluigwe nke Chineke ga-adị ukwuu hie nne nke na Bible na-ekwu banyere “ụwa ọhụrụ”—ọ bụghị ala nkịtị dị iche, kama òtù ọhụrụ nke mmadụ ndị ga-ebi n’ime ọnọdụ paradaịs ahụ nke Onye Okike ihe a kpọrọ mmadụ zubere site na mgbe ọ malitere okike ya n’elu ala.—Mkpughe 21:1-5, Jenesis 2:7-9, 15.
17. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịmụta ihe Chineke na-achọ maka nlanarị ugbu a?
17 Ọ dị mkpa na a ga-eme oké mbibi tupu nguzobe nke “ụwa ọhụrụ” ahụ—bụ mbibi karịrị ihe ọ bụla ihe a kpọrọ mmadụ hụtụwọro. Maka ọdịmma nke ala n’onwe ya na nke ndị nile nwere ekele n’ezie nye Onye Okike ya, ọ gaje “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” (Mkpughe 11:17, 18) Oge Chineke maka ime nke a adịla ezi nso! Mgbe e mezuru nke a, à ga-achọta gị n’etiti ndị ahụ lanarịrịnụ?—1 Jọn 2:17; Ilu 2: 21,22.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ ahụ bụ Is the Bible Really the Word of God? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Ọ gwụla ma e kwuru na ọ bụghị otú ahụ, nhota Bible nile e mere n’ime akwụkwọ a sitere na Union Igbo Bible.
c N’ihi ya ụfọdụ ndị na-ede akwụkwụ ọkọwa okwu ghọtara ‘oh-lam’ dị ka e ji ya mee ihe n’Eklisiastis 1:4 ịbụ “mgbe ebighị ebi.” The New English Bible, Revised Standard Version, The Jerusalem Bible, The Bible in Living English, King James Version na ndị ọzọ na-ede ya otú ahụ.
[Foto dị na peeji nke 5]