Isi nke 7
Jiri Amamihe Mee Ihe Mgbe Mbibi Na-abịa Nso
1. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji nwụọ ọnwụ na-enweghị isi (a) mgbe ụgbọ mmiri Titanic mikpuru? (b) mgbe Ugwu Pelée tiwara?
MGBE e sitere n’ebe a pụrụ ịtụkwasị obi dọọ aka ná ntị na mbibi na-abịa, ndị maara ihe na-eme ihe ichebe ndụ ha. (Ilu 22:3) Ma ọtụtụ puku mmadụ alawo n’iyi nanị n’ihi na ha tụkwasịrị obi ha n’ebe na-ezighị ezi. N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị nile a dọrọ ha ka ha banye n’ụgbọ e ji azọpụta ndụ, ọtụtụ narị ndị njem sooro ụgbọ mmiri bụ Titanic mikpuo n’ime mmiri n’afọ 1912 n’ihi na ha kwenyere n’okwu ahụ nke bụ na ọ pụghị imikpu emikpu. Mgbe ugwu Pelée dị na Martinique malitere ịgbọpụta ntụ ọkụ na nkume na 1902, egwu jidere ndị bi n’obodo Saint-Pierre nke dị ya nso, ma n’ihi na ọdịmma onwe onye nke ndị a maara aha ha n’obodo ahụ nọ n’ihe ize ndụ, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo na onye editọ nke akwụkwọ akụkọ obodo ahụ chọrọ ụzọ imejụ egwu ndị mmadụ, na-agba ha ume ka ha ghara ịgbapụ. Na mberede, ugwu ahụ gbawara, wee gbuo 30,000 mmadụ.
2. (a) Ịdọ aka ná ntị dị ngwa dị aṅaa ka a na-akpọsa n’oge anyị a? (b) N’ihi gịnị ka ọnọdụ ahụ ji sie ike?
2 N’oge anyị a, a na-akpọsa ịdọ aka ná ntị dị ngwa ọbụna karị—ọ bụghị banyere mbibi nke otu obodo, kama ọ bụ banyere agha eluigwe na ala nke Chineke bụ Amagedọn. (Aịsaịa 34:1, 2; Jeremaịa 25:32, 33) Ndịàmà Jehova anọgidewokwa na-ejekwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha nile, na-agwa ha ka ha jiri amamihe mee ihe iji chebe ndụ ha. Ị̀ hụrụ ndụ n’anya ruo n’ókè ime ihe kwesịrị ekwesị, meekwa ya ozugbo, n’egbughị oge?
“ỤWA NA-AGABIGA”
3. N’ihi gịnị ka omume anyị n’ebe ụwa nọ ji emetụta olileanya anyị maka nlanarị?
3 Otu ihe dị oké mkpa n’ebe olileanya gị maka nlanarị dị bụ omume gị n’ebe ụwa dị. Ruo ogologo oge ị na-adị ndụ dị ka mmadụ, ị nọ n’ime ụwa. Ma i kwesịghị ikere òkè n’ọchịchọ ọjọọ ya nile wee ṅomiekwa ọrụ asọpụrụghị Chineke ya nile. Ị gaghị achọ isonyere ya site n’ịtụkwasị mmadụ na atụmatụ ha nile obi kama ịtụkwasị Chineke na nzube ya obi. Ma ị ghaghị ime otu nhọrọ; ị pụghị ịnọ n’akụkụ abụọ ahụ. “Onye ọ bụla . . . zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onyeiro nke Chineke.” N’ihi gịnị? N’ihi na dị ka Okwu Chineke gwara anyị, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”—Jemes 4:4; 1 Jọn 5:19; Abụ Ọma 146:3-5.
4. (a) N’iji Bible gị mee ihe, kọwaa ọrụ na omume ndị ga-egbochi ndị mmadụ ibi ndụ n’okpuru Alaeze Chineke. (b) N’ihi gịnị ka onye tinyeburu onwe ya n’ihe ndị a kwesịrị iji hapụ ha ọsọ ọsọ?
4 O doro anya na Jehova agaghị echebe ndị ahụ ụzọ ndụ ha na-egosi na ha na-arapagide n’ihe ahụ Chineke kpọrọ asị baa n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ nke ezi omume. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị a? Ọtụtụ ha bụ ọrụ na omume ndị ụwa na-adịghị agụ n’ihe ụjọọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịlanarị ọgwụgwụ nke ụwa ọjọọ nke a, n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme, na-echekwa, anyị ga-anara ịdọ aka ná ntị Bible nke bụ na ndị nile na-akwa iko, ndị lụrụ di na nwunye na-akwa iko, ndị na-enwe mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nke nwanyị na nwanyị, na ndị nile na-etinye aka n’omume nile rụrụ arụ na agụụ ịkwa iko agaghị eso ná ndị nlanarị ahụ. N’agbanyeghị otú ndị ọzọ si tinye aka n’ịgha ụgha na izu ohi, anyị ga-ajụ ụzọ ịdị ndụ ahụ. N’agbanyeghị na mmekọrịta ndị mmụọ ọjọọ aghọwo ihe zuru ebe nile, anyị ga-ezere ya. Ọ bụ ezie na ndị ọzọ pụrụ inwe anya ukwu, na-akpasu esemokwu, bụrụ ndị na-ewe iwe ọsọ ọsọ, ma ọ bụ na-achọ imeri ahụ mgbakasị site n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè, anyị agaghị eṅomi ha. Ọ bụrụ na anyị etinyewo aka n’ihe ndị a, ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe a chọrọ. Ọ bụna ma a sị na ụfọdụ n’ihe ndị a dị ka “ihe dị mma” nye anyị n’oge gara aga, anyị ga-ahapụ ha. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya n’ezie, anyị hụrụ ndụ n’anya, Okwu Chineke dọkwara aka ná ntị na “ndị na-eme ihe ndị dị otú a agaghị eketa alaeze Chineke.”—Ndị Galetia 5:19-21; Ndị Efesọs 5:3-7; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 2 Ndị Kọrint 7:1; Mkpughe 22:15.
5. (a) Ọ bụrụ na ndụ dị oké ọnụ ahịa n’anya anyị, gịnị ka anyị na-aghaghị ime? (b) Àgwà ọma nile dị aṅaa ka a kpọtụrụ uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ná ngwụsị nke amaokwu a? Olee otú ha siri dị mkpa? Olee otú anyị ga-esi zụlite ha?
5 Ọ bụrụ na ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ dị anyị mkpa, anyị ga-achọ ụzọ ime ihe ga-atọ Ọnye ahụ Na-enye Ndụ, bụ Jehova Chineke ụtọ. (Ọrụ 17:24-28; Mkpughe 4:11) N’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, anyị aghaghị itinye Okwu ya n’ọrụ n’akụkụ ndụ anyị nile. Mgbe anyị na-eme nke ahụ, n’oge na-adịghị anya, anyị ga-eleba anya nke ọma n’ebe omume anyị na-emeso onwe anyị na ndị ọzọ dị, n’ebe ihe onwunwe onwe onye na ihe nnweta dị iche iche dị, tụgharịakwa uche otú ihe ndị a si emetụta onọdụ anyị n’ihu Chineke. Ndị gbara anyị gburugburu pụrụ inwe echiche dị elu banyere onwe ha, banyere agbụrụ ha ma ọ bụ ụcha akpụkpọ ahụ ha ma ọ bụ mba ha, ma anyị ga-echesi echiche ike banyere akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ nke na-asị: “Chineke na-edo onwe ya imegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.”—Jemes 4:6; Zefanaịa 2:2, 3; Abụ Ọma 149:4.
6, 7. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nyochaa ndụ anyị site n’enyemaka nke ihe dị na 1 Jọn 2:15-17?
6 Ọ bụ ezie na ndị ọzọ na-ekwe onwe ha ka ha bụrụ ohu nye ọchịchọ nke ọgbọ mmadụ na-ahụ ihe onwunwe n’anya kpasuru ma ọ bụ na-enwe mkpali nke ọchịchọ ịbụ onye a ma ama, anyị ga-enyocha ndụ anyị site n’enyemaka nke ihe e dere na 1 Jọn 2:15-17 nke na-asị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na [oké ngosi nke ihe mmadụ nwere]—esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa ya na agụụ ihe ọjọọ ya, ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ bụrụ na mgbanwe dị anyị mkpa, ugbu a bụ oge ime ya.
7 Ụwa nke a na ụzọ ndụ ya agaghị anọgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụghị ihe “na-apụghị imikpu emikpu.” Ndị ndú ụwa pụrụ ịnwa ịnọgide na-ejidesi ndị na-eso ụzọ ha ike, na-eme ka ha kwenye ná mgbalị nile ha na-eme ka ụwa dị mma. Ma nanị ụzọ a pụrụ isi zọpụta mmadụ ná mbibi nke na-abịanụ bụ ịṅa ntị n’ozi ịdọ aka ná ntị nke Chineke. N’ụzọ dị otú a ka ndị Nineve n’oge onye amụma bụ Jona si setịpụ ihe nlereanya anyị ga-eṅomi.
“HA CHEGHARỊRỊ NÁ NKWUSA NKE JONA”
8. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Nineve si gosi amamihe n’ịdọ aka ná ntị Chineke nke Jona wetaara ha, gịnị sikwa n’ime ya pụta?
8 Na narị afọ nke itoolu T.O.A., Jehova nyere Jona ụrụ nke ijekwuru ndị Nineve, bụ isi obodo Asiria, ikwusa na n’ihi ajọ omume ha, a ga-akwatu Nineve. Mgbe Jona dọrọ ha aka ná ntị na n’ime iri ụbọchị anọ, ha ga-ala n’iyi, hà si aṅaa meghachi omume? Kama ịkwa emo, ha “kwere na Chineke, ha wee kpọsaa obubu ọnụ, yiri ákwà mkpé.” Eze ahụ n’onwe ya sonyekwaara ha, kwaliekwa mmadụ nile ka ha kpọkuo Chineke site n’obi ha, sikwa n’ụzọ ọjọọ na ime ihe ike ha nile chegharịa. Ọ tụgharịrị uche, sị: “Ònye maara, ma eleghị anya ezi Chineke ga-echegharị . . . si n’iwe ya dị ọkụ chegharịa, ka anyị wee ghara ịla n’iyi?” N’ihi na ha hapụrụ ụzọ ọjọọ ha, Jehova meere ha ebere. A zọpụtara ndụ ha.—Jona 3:2-10.
9, 10. (a) N’echiche dị aṅaa ka Jisọs sịrị na ndị Nineve bụ ihe atụ a ga-enomi? (b) Olee ndị taa yiri ndị Nineve ahụ?
9 N’iji tụọ ndị Juu na-ekweghị ekwe mmehie ha n’anya n’ime narị afọ mbụ O.A., Jisọs zoro aka n’ihe ahụ mere n’oge ochie, na-asị: “Ndị ikom Nineve ga-eso ọgbọ a bilie n’ikpe ahụ, ha ga-amakwa ya ikpe: n’ihi na ha chegharịrị ná nkwusa nke Jona; ma lee, onye ka Jona nọ n’ebe a.”—Matiu 12:41.
10 Gịnị banyere oge anyị a? Ọ dị onye ọ bụla na-egosi ụdị nchegharị ahụ? Ee; ọ dị ọtụtụ puku mmadụ n’ụwa nile, bụ ndị, dị ka ndị Nineve, ndị na-egosibeghị okwukwe n’ebe Chineke nke Bible nọ mgbe ọ bụla, ma ha na-aṅa ntị n’ozi ịdọ aka ná ntị ahụ ugbu a. Mgbe ha mụtara ihe mere mbibi ji na-abịakwasị ụwa nke a, ha na-achọ ebere Chineke. Ha na-enwe ezi mgbanwe nke uche na obi n’ihe banyere ụzọ ndụ ha mbụ wee na-etinye onwe ha n’ịrụ “ọrụ kwesịrị nchegharị” ugbu a. (Ọrụ 26:20; leekwa Ndị Rom 2:4) Ọ bụ ọchịchọ gị ịbụ otu n’ime ha? Ọ bụrụ otú ahụ, egbula oge.
CHỌỌ UDO NGWA NGWA
11. (a) Gịnị bụ akụkọ ihe mere eme banyere ndị Gibeon? (b) N’ihi gịnị ka ha jiri chọọ isoro Israel mee udo?
11 Ndị Gibeon nke oge Joshua jikwara amamihe mee ihe ka e wee zọpụta ndụ ha. Ha bụ ndị Kenean, ndị ụzọ ndụ ha rụrụ arụ, bụrụkwa nke ịchọ ihe onwunwe, nke ikpere arụsị na nke ife ndị mmụọ ọjọọ. Jehova nyere iwu maka mbibi ha. Ha matararịị otú Jehova si zọpụta Israel n’aka Ijipt n’iri afọ anọ gara aga, na ndị eze dị iche iche nke ndị Amọraịt n’ebe dị n’ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan enweghịkwa ike iguzogide ha. Onye ọ bụla maara na, n’ejighị ihe nkụkpọ ọ bụla mee ihe, mgbidi ukwu nile nke Jeriko dara n’ihu ha, na e bibikwara Ai o wee ghọọ ikpó ájá nke tọgbọrọ n’efu. (Joshua 9:3, 9, 10) Ndị bi n’obodo Gibeon chọrọ ịdị ndụ, ma ha ghọtara na ha apụghi imeri n’ibu agha megide Chineke Israel. Ha aghaghị ime ihe ngwa ngwa. Ọ bụ gịnị ka ha ga-eme? Ha apụghị ịrụgide Israel ka ha na ha nwee nkwekọrịta udo, kama ha chere na ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha ga-agbalị inweta ya. N’ụzọ dị aṅaa?
12. (a) Gịnị mere e ji hapụ ndị Gibeon n’agbanyeghị ihe ha mere? (b) Mgbanwe dị aṅaa ka ha na-aghaghị ime, ọrụ dịkwa ahaa ka e nyere ha ịrụ?
12 Ha jiri akọ mee ihe, wee zijere Joshua ndị ikom ndị ọdịdị ha yiri nke ndị gaworo njem dị anya. Ka ha na-ejekwuru Joshua, ha kwuru na ha si ala dị anya bịa, na ha nụrụ oké ihe nile Jehova meworo, na dịkwa ka ndị nnọchianya nke ndị ha, na ha abịawo inye onwe ha dị ka ndị ohu, ịrịọkwa ka ha na ha gbaa ndụ. Joshua na ndị isi Israel wee kwenye. E mesịa, mgbe a chọpụtara aghụghọ ahụ, ndị Gibeon jiri obi umeala kwupụta na ha tụrụ egwu maka ndụ ha, ha gosikwara ọchịchọ ime ihe ọ bụla a ga-achọ ka ha mee. (Joshua 9:4-25) Jehova hụrụ ihe ahụ nile mere. A ghọgbughị ya. Ọ hụrụrịị na ha adịghị anwa imebi ndị ya, dị ka ndị Moab mererịị, ọ ghọtakwara ezi ọchịchọ ha nwere ịdị ndụ. Ya mere, o kwere ka e nye ha ọrụ ije ozi n’okpuru nduzi ndị Livaị n’ụlọ nsọ ya, ikpokọta nkụ na ikute mmiri, si otú a na-akwado ofufe Jehova. Otú ọ dị, ka e wee nabata ha n’ije ozi dị otú ahụ, ha aghaghị ịhapụ ofufe na-adịghị ọcha mbụ ha.—Joshua 9:27; Levitikọs 18:26-30.
13. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka anyị ga-esi rite uru site n’ihe atụ amụma ahụ nke metụtara ndị Gibeon? (b) Ka ha wee bụrụ ndị Joshua ahụ ka Ukwuu chebere ndụ, gịnị ka a chọrọ n’aka ndị mmadụ n’oge a?
13 N’ihi eziokwu ahụ bụ na anyị bi nso n’ọgwụgwụ nke “mgbe ikpeazụ” ndị a, ọ dị mkpa ka onye ọ bụla nke chọrọ ịlanarị mee ihe n’egbughị oge, jirikwa obi eziokwu zuru okè. A pụghị ịghọgbu onye ahụ Jehova ga-eji rụọ ọrụ mbibi, bụ Jisọs Kraist dị ka a ghọgburu Joshua. Nanị ụzọ ya na mmadụ ndị dị otú ahụ ga-esi banye ná nkwekọrịta ka o wee ghara igbu ha bụ ka ha kwupụta okwukwe ha kwere na Jehova dị ka ezi Chineke n’ihu ọha. (Tụlee Ọrụ 2:17-21) Ha aghaghịkwa ịnara Jisọs Kraist n’ọnọdụ ahụ Chineke kenyere ya, malite mgbe ahụ na-adị ndụ dị ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ ndụ nile nke ụwa a a mara ikpe n’anya. Mgbe ahụ, ha aghaghị ịghọ ndị ohu Chineke dị umeala n’obi, na-esonyere ọgbakọ ndị nke ya na-efe ya ofufe dị nsọ.—Jọn 17:16; Mkpughe 7:14, 15.
14. N’ihi gịnị ka nzọpụta Jehova zọpụtara ndị Gibeon n’aka usuu ndị iro ji baara anyị uru?
14 Ozugbo ndị Gibeon sonyechaara ndị nke Jehova, ha nwetara mmegide dị ukwuu. Ndị eze ise nke ndị Amọrait gbara Gibeon gburugburu iji rụgide ndị bi n’ime ya ka ha bịaghachi n’akụkụ ha, iji megide ndị Israel. Ndị Gibeon wee zipụrụ Joshua ozi ngwa ngwa maka enyemaka. Mgbapụta ha nwetara bụ ụdị a na-ahụtụbeghị n’akụkọ ihe mere eme nile ruo mgbe ahụ. Jehova tinyere ọgba aghara n’etiti ndị iro ahụ, wụkwasịkwa ha akụ mmiri igwe site n’eluigwe, sitekwa n’ọrụ ebube mee ka ehihie dịgide ruo mgbe Israel gbukpụrụ ndị iro ahụ. (Joshua 10:1-14) Nzọpụta ndị Gibeon ahụ bụ ihe atụ amụma nke ọrụ mgbapụta dị ebube nke oké ìgwè mmadụ na-efe ezi Chineke ahụ n’agha eluigwe na ala ahụ bụ Amagedọn. Ohere irite uru ná nzọpụta ahụ ghere oghe nye ndị nke mba ọ bụla ma ọ bụrụ na ha ejiri amamihe mee ihe ugbu a. Ị̀ na-eji ohere ahụ eme ihe?—Mkpughe 7:9, 10.