Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • su isi 8 p. 61-67
  • Ndị Nlanarị site ná Mba Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Nlanarị site ná Mba Nile
  • Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “MKPỤRỤ” ABRAHAM AHỤ E KWERE NÁ NKWA
  • NDỊ A GỌZIRI SITE NÁ “MKPỤRỤ” AHỤ
  • Chineke Lere Okwukwe Ebreham Ule
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
su isi 8 p. 61-67

Isi nke 8

Ndị Nlanarị site ná Mba Nile

1. Olee nkwa e kwere Abraham nke na-egosi na ọ ga-ekwe ezinụlọ nile nke mmadụ omume inweta nkwado Chineke?

JEHOVA ji ịhụnanya nwee mmasị n’ebe ndị mba nile na agbụrụ nile nọ. O mewo ndokwa ka ezinụlọ nile nke elu ala nwee ike inweta nkwado na ngọzi ya. Jehova gwara Abram (Abraham), bụ onye sitere n’usoro ọmụmụ nwa Noa bụ Shem, sị: “Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, jee nke gị ruo ala ahụ nke m ga-eme ka ị hụ ya anya; m ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu, m ga-agọzikwa gị, mee ka aha gị dị ukwuu; gị bụrụkwa ngọzi. M ga-agọzikwa ndị na-agọzi gị, ọ bụkwa onye na-akọcha gị ka m ga-abụ ọnụ, a ga-agọzikwa agbụrụ nile nke ụwa n’ime gị.” (Jenesis 12:1-3; Ọrụ 7:2-4) “Agbụrụ nile nke ụwa”—nke ahụ na-agụnye anyị taa, n’agbanyeghị mba ebe a mụrụ anyị ma ọ bụ asụsụ anyị na-asụ.—Abụ Ọma 65:2.

2. (a) Dị ka Abraham, àgwà dị aṅaa dị anyị mkpa? (b) Dị ka e gosiri ná Ndị Hibru 11:8-10, n’ụzọ dị aṅaa ka Abraham si gosipụta àgwà dị otú ahụ?

2 Onye ahụ Jehova kwere nkwa nke a bụ nwoke nwere okwukwe, ọbụna dị ka anyị na-aghaghị inwe okwukwe ka anyị wee soro keta ngọzi ahụ nke Chineke kwere nkwa ya ebe a. (Jemes 2:23; Ndị Hibru 11:6) Okwukwe Abraham abụghị nanị nke egbugbere ọnụ, kama ọ bụ nke e tinyere n’ọrụ. O mere ya ka o si na Mesopotamia kwapụ wee gaa n’ala dị anya nke ukwuu, nke ọ na-ahụtụbeghị mbụ. “Okwukwe ka o ji biri dị ka ọbịa n’ala nke e kwere ya rịị ná nkwa, dị ka ala na-abụghị nke aka ya,” n’ekekọtaghị onwe ya n’alaeze obodo ọ bụla nke dị n’ebe ahụ. “N’ihi na ọ na-ele anya obodo ahụ [Alaeze Chmeke] nke nwere ezi ntọala ahụ, nke Chineke bụ onyeọkà ya na onye rụrụ ya.”—Ndị Hibru 11:8-10.

3. Ule okwukwe siri ike dị aṅaa ka Abraham bara n’ime ya n’ihe banyere Aisak?

3 Mgbe Abraham gbara 100 afọ, nwunye ya gbakwara 90 afọ, Jehova jiri nwa nwoke bụ Aisak gọzie ha n’ụzọ ọrụ ebube. N’ihe banyere nwa nwoke a, Abraham banyere n’ule siri ike nke okwukwe na nrube isi n’ebe Chineke nọ. Jehova gwara Abraham ka ọ kpọrọ Aisak, onye bụ nwa okorobịa ugbu a, gaa n’ala Moraịa ma were ya chụọ àjà nsure ọkụ n’ebe ahụ. Abraham rubere isi ime nke a, na-enwe okwukwe n’ikike Chineke nwere iweghachi ọkpara ya ná ndụ site ná mbilite n’ọnwụ. (Ndị Hibru 11:17-19) Abraham ekeworị Aisak agbụ, bụ onye rubeere nna ya isi, tụkwasịkwa ya n’elu ebe ịchụ àjà, Abraham jikwa mma ọ ga-eji gbuo ya n’aka ya mgbe mmụọ ozi Jehova gbochiri ya. Ule ahụ agamiwo ruo nke zuru ezu iji nwapụta na Abraham agaghị egbochi inye Chineke ihe ọ bụla. N’ihi ya, Chineke mesiri ọgbụgba ndụ ya na Abraham ike dị ka Bible si dekọọ ya, sị:

4. N’oge ahụ, nkwa ọzọ dị aṅaa ka Chineke kwere metụta ndị nke mba nile?

4 “Eji m onwe m nụọ iyi, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, Na n’ihi na i mewo ihe a, n’ihi na i gbochighịkwa nwa gị nwoke onye i nwere nanị ya, na n’ịgọzi m ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba m ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke elugwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri; mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá nke ndị iro ya. Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.”—Jenesis 22:15-18.

5. (a) Gịnị ka e sere onyinyo ya site n’Abraham ịnwa ịchụ Aisak n’àjà? (b) Ná mmezu nke Jenesis 12:3, olee otú ndị mmadụ si ‘akọcha’ Abraham ahụ Ka Ukwuu, gịnịkwa na-esi na ya apụta? (ch) Olee otú anyị ga-esi ‘gọzie’ ya?

5 Mgbe anyị ghọtara na Abraham Ka Ukwuu bụ Jehova nakwa na Aisak sere onyinyo Jisọs Kraist, anyị na-amalite ịghọta otú ihe omume nile ndị a si bụrụ ihe dị mkpa nye anyị n’otu n’otu. N’ezie, ọ bụ otú anyị si mesoo Jehova Chineke na-ekpebi ọdịnihu anyị. Olileanya ndụ ebighị ebighị ga-ekwe anyị omume inweta n’ihi na Chineke nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya dị ka àjà maka mmehie nile anyị, dị ka e mere ihe atụ ya site n’Abraham ịnwa ịchụ Aisak n’àjà. (Jọn 3:16) Onye ọ bụla nke nọgidere ‘n’ịkọcha’ Jehova, na-ekwutọ ya, ma ọ bụ na-elelị nzube ịhụnanya ya nile, na-edo onwe ya ịnata ọbụbụọnụ nke ga-abụ mbibi ebighị ebi. (Tụlee 1 Samuel 3:12-14; 2:12.) Ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị nwere obi ekele, anyị ‘ga-agọzi’ Abraham ahụ Ka Ukwuu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ikwupụta n’enweghị mgbochi na ọ bụ site na Jehova ka ihe ọma nile si apụta, tinyere onyinye nke ndụ na-erughịrị anyị site n’Ọkpara ya. Tinyere nke a, anyị ga-akọrọ ndị ọzọ banyere ịdị mma Jehova ya na àgwà nile mara mma nke ọbụbụeze ya. (Jemes 1:17; Abụ Ọma 145:7-13) N’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-edo onwe anyị n’ọnọdụ ịnata ngọzi site n’ebe ọ nọ ruo mgbe ebighị ebi.

“MKPỤRỤ” ABRAHAM AHỤ E KWERE NÁ NKWA

6. (a) Ònye bụ “mkpụrụ” bụ isi nke Abraham? (b) Olee otú anyị ga-esi nweta ngọzi na-abịa site n’aka ya?

6 Dị ka otu akụkụ nke ndokwa o mere maka ịgọzi agbụrụ mmadụ, Jehova zubere maka otu ọchịchị eluigwe nke ezi omume. A mụrụ Jisọs Kraist dị ka onye sitere n’eriri Abraham, dị ka nwa ya kachasị mkpa, ma ọ bụ “mkpurụ,” ọ bụkwa ya ka Jehova nyere ike ịbụ eze. (Ndị Galetia 3:16; Matiu 1:1) Ya mere, dị ka e gosiri site n’iyi Chineke ṅụụrụ Abraham, ọ bụ site na Jisọs Kraist ka a ga-agọzi ndị nke mba nile nke ala. Ị̀ na-eme ihe a chọrọ iji nwetara onwe gị ngọzi ahụ? Dị ka ihe atụ, ụzọ ibi ndụ gị ọ̀ na-egosi na ị matara ịdị mkpa nke àjà Jisọs ji ndụ ya chụọ? Ị̀ na-edo onwe gị n’ezie nye ike ọchịchị ya dị ka Eze?—Jọn 3:36; Ọrụ 4:12.

7. (a) Ònyekwa ka a gụnyere ná “mkpụrụ Abraham”? (b) Olee otú anyị si mata na ọ bụghị ndị nile ji ikwesị ntụkwasị obi fee Chineke ga-eje eluigwe?

7 E nyere Jọn onyeozi ihe ngosi amụma nke ihe na-eme n’eluigwe ebe ọ hụrụ ndị na-esonyere Jisọs Kraist n’Ugwu Zaiọn nke eluigwe. N’otu aka ahụkwa, ha bụ otu akụkụ nke “mkpụrụ Abraham.” Dị ka e dere ná Mkpughe 14: 1-5, “a gbatara ha n’etiti mmadụ,” ha dịkwa 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Ndị Galetia 3:26-29) Òle ndị ka ha gụnyere? Bible mere ka o doo anya na ọ dịbeghị mgbe ọ bụ nzube Chineke ịkpọrọ ndị nile nwere àgwà ezi omume laa n’eluigwe. (Matiu 11:11; Ọrụ 2:34; Abụ Ọma 37:29) Ohere ọma ahụ nke iso Kraist kere òkè n’Alaeze eluigwe dịịrị nanị “ìgwè atụrụ nta” ndị ga-eso ya bụrụ ndị eze na ndị nchụaja ruo otu puku afọ.—Luk 12:32; Mkpughe 5: 9, 10; 20:6.

8. Olee mgbe nhọpụta nke “ìgwè atụrụ nta” ahụ malitere, ruokwa ogologo oge ha aṅaa ka ọ dịruru?

8 Olee otú e si mee nhọpụta nke “ìgwè atụrụ nta” ahụ? Ọkpụkpọ òkù ahụ e ji amara kpọọ iso kere òkè n’Alaeze eluigwe ka e bu ụzọ nye ndị Israel anụ ahụ. Ma n’ihi egosighị okwukwe ha, ha ewepụtaghị ozuzu nke 144,000 ahụ. Ya mere, a kpọrọ ndị Sameria, ma e mesịa, a kpọkwara ndị nke mba nile. (Ọrụ 1:8) E ji mmụọ nsọ tee ndị mbụ n’ime ndị ga-eso Kraist kekọọ òkè mmanụ na Pentikọst nke afọ 33 O.A. Nhọpụta nke ìgwè nke a nọgidere ruo mgbe Chineke kachiri 144,000 ahụ akara dị ka ndị ọ nwapụtaworo. Mgbe ahụ, e chigarịrị ihu n’ịkpọkọta mmadụ ndị ga-ebi n’elu ala dị ka ndị ga-eji obi ekele doo onwe ha n’okpuru ọchịchị eluigwe.

9. (a) Aha dịgasị aṅaa n’ime Bible ka e ji mara ndị òtù eluigwe ahụ? (b) Òle ndị ka Israel anụ ahụ sere onyinyo ha?

9 A na-ezo ndị ahụ ha na Kraist ga-eketakọ Alaeze eluigwe aka n’Akwụkwọ nsọ dị ka “ndị a họputara,” “ndị nsọ,” ‘ndị Chineke tere mmanụ.’ (2 Timoti 2:10; 1 Ndị Kọrint 6:1, 2; 2 Ndị Kọrint 1:21) A na-akọwakwa ha n’ozuzu dị ka “nwanyị a na-alụ ọhụrụ” nke Kraist. (Mkpughe 21:2, 9; Ndị Efesọs 5:22, 32) Ọ bụrụ na e lee ha anya n’ụzọ ọzọ, a na-akpọ ha “ụmụnna” Kraist, “ndị ha na Kraist na-ekekọ” na “ụmụ” Chineke. (Ndị Hibru 2: 10, 11; Ndị Rom 8:15-17; Ndị Efesọs 1:5) N’agbanyeghị mba ha siri pụta, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, ha bụ “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 2: 28, 29; 9:6-8) Mgbe Jehova kwụsịrị ọgbụgba ndụ Iwu nke ya na ndị Israel anụ ahụ, o webatara Israel ime mmụọ n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ya na ha. Ma mmekọrịta ya na Israel anụ ahụ mgbe ha nọ n’okpuru Iwu ahụ tọrọ ụkpụrụ ihe ndị gaje ịbịa. (Ndị Hibru 10:1) Mgbe ahụ, ònye ka mba Israel anụ ahụ sere onyinyo ya, bụ nke Chineke họpụtara dị ka “ihe nke aka” ya? Eziokwu nile na-ezo aka n’Israel ime mmụọ, bụ ndị Chineke họpụtara isoro Kraist chịa achịa n’eluigwe. (Jiri Ọpụpụ 19:5, 6 tụnyere 1 Pita 1:3, 4 na 1 Pita 2:9.) Ha na Kraist bụ ihe ọrụ ahụ nke ọ bụ site na ya ka ngọzi ga-esi rute ndị nile na-erube isi n’etiti agbụrụ mmadụ aka. Ịghọta nke a nke ọma bụ otu isi ihe dị n’ịghọta Bible.

NDỊ A GỌZIRI SITE NÁ “MKPỤRỤ” AHỤ

10. Òle ndị ka ndị na-abụghị ndị Israel na-efe Jehova sere onyinyo ha?

10 N’oge Chineke ka na-emeso mba Israel n’ụzọ pụrụ iche, o jikwa ịhụnanya mee ndokwa maka ndị ọzọ na-abụghị ndị mba ahụ, bụkwa ndị obi ha kwaliri ikere òkè n’ezi ofufe isoro ndị Israel na-akpakọrịta. A kpọtụrụ ha aha n’ụzọ dị mma n’ihe ndekọ Bible. Hà nwekwara ndị nke oge a ha nọchiri anya ha? Ee, n’ezie. N’ọtụtụ ụzọ, ha sere onyinyo ndị na-abụghị ndị Israel ime mmụọ, ma ha nwere obi ụtọ n’olileanya dị ịtụnanya nke ndụ ebighị ebi dị ka ndị Alaeze Chineke ga-achị n’elu ala. Ndị a bụ ndị Chineke gwara Abraham okwu banyere ha, na-asị na ndị nke “mba nile nke ụwa” ga-agọzi onwe ha site ná “mkpụrụ” ya.—Jenesis 22:18; Deuterọnọmi 32:43.

11. (a) Nhota dị aṅaa ka e hotara ndị dị otú a n’ememe nraranye nke ụlọ nsọ ahụ Solomon wuru? (b) Olee otú “ụmụ ala ọzọ” si ‘arapara na Jehova’ n’oge anyị a, dị ka e si buo ya n’amụma n’Aịsaịa 56:6, 7?

11 Ọ nọgidewo na-abụ nzube Chineke ka e jikọta mma- dụ nile n’ezi ofufe. Dị ka e gosiri n’oge a na-arara ụlọ nsọ ahụ Solomon wuru na Jerusalem nye, eze ahụ kpere ekpere ka Jehova nụrụ ekpere ndị ọbịa, bụ ndị chọrọ isoro ndị Israel fee ofufe nke Chineke na-anara nke ọma. (2 Ihe Emere 6:32, 33) Tinyere nke a, n’Aịsaịa 56:6, 7, Chineke kwere nkwa, sị: “Ụmụ ala ọzọkwa ndị na-arapara na Jehova ijere ya ozi na ịhụ aha Jehova n’anya na ịbụrụ ya ndị ohu, . . . m ga-eme ka ha bịaruo ugwu nsọ m, m ga-emekwa ka ha ṅụrịa n’ụlọ ekpere m. . . . N’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị nile dị iche iche.” N’ịtụgharị uche ná mmụọ dị n’okwu a, “ụmụ ala ọzọ” nke oge a na-ezukọta ugbu a site ná mba nile dị iche iche, ọ bụghị dị ka ndị bịara nanị ikiri ihe na-emenụ, kama dị ka ndị mmadụ ‘na-arapara na Jehova.’ Ha na-eme nke a site n’ịrara ndụ ha nye ya, na-egosipụtakwa nke a site na baptism ime mmiri, na-ejekwa ozi n’ọdịdị na-egosipụta ịhụnanya ha hụrụ “aha Jehova” na ihe nile ọ na-anọchi anya ya.—Matiu 28:19, 20.

12. Olee otú Iwu Moses si gosi ma ndị ahụ nwere olileanya ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị n’elu ala hà ga-enwe ọtụtụ dị elu nke a chọrọ n’ebe ndị Israel ime mmụọ nọ?

12 Ikwesị ntụkwasị obi ha kwesịkwara ịdị ka nke ndị Kraist e jiri mmụọ nsọ tee mmanụ. N’okpuru Iwu Moses, Jehova chọrọ ka “ndị ọbịa,” bụ́ ndị malitere ife ezi ofufe debe otu iwu ahụ nke na-achị Israel. (Ọnụ Ọgụgụ 15: 15, 16) Mmekọrịta ga-adị n’etiti ha agaghị abụ nanị nke ikwe ka ha biri, kama ọ bụ nke ezi ịhụnanya. (Levitikọs 19:34) N’otu aka ahụ, ndị ndị ọbịa ahụ sere onyinyo ha na-achọ ime ka ndụ ha kwekọzuo n’ihe Jehova chọrọ, ka ha werekwa ịhụnanya nke ịdị n’otu soro ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ fee ofufe.—Aịsaịa 61:5.

13. Nkọwa dịgasị aṅaa e nyere n’Aịsaịa 2:1-4 ka anyị kwesịrị iburu n’obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbanye n’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ?

13 Site n’ọnụ onye arnụma ya bụ Aịsaịa, Jehova kọwara ìgwè mmadụ na-anụ ọkụ n’obi, ndị sitere ná “mba nile,” bụ ndị na-enubata n’ụlọ ofufe Jehova zuru ụwa ọnụ. O buru amụma, sị: “Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị: Bịanụ ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.” Dị ka ihe siri na ya pụta, ha ‘akpụgharịwo mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè,’ ọbụnakwa n’ime ụwa nke a jupụtara n’ọgba aghara, ha ‘adịghị amụtakwa agha ọzọ.’ (Aịsaịa 2:1-4) Ị na-ahụ onwe gị n’etiti ìgwè mmadụ ahụ obi dị ụtọ? ị̀ na-enwe ụdị ọchịchọ ha nwere ịmụta ihe Jehova na-achọ, na-achọkwa itinye ihe ndị a n’ọrụ ná ndụ gị, kwụsịkwa ịdabere ná ngwá agha dị iche iche? Chineke ekwewo nkwa na oke ìgwè mmadụ ndị na-agbaso ụzọ ndụ nke a ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta’ dị ka ndị nlanarị baa n’ime “ụwa ọhụrụ” ya nke dị n’udo.—Mkpughe 7:9, 10, 14; Abụ Ọma 46:8, 9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya