Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • tp isi 8 p. 86-93
  • Olee Ndị Ga-abụ Ndị Lanarịrị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Ga-abụ Ndị Lanarịrị?
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atụ Nlanarị Ndị Gara Aga
  • Ihe Jehova Na-achọ n’Obi Ụmụ Mmadụ
  • Ihe Ị Pụrụ Ime Ugbu a
  • Mbibi Ụwa Gasịa—E Nwee Udo Zuru Ụwa
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ị̀ Dị Njikere Ịlanahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Kaa Ha Akara n’Egedege Ihu”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
tp isi 8 p. 86-93

Isi 8

Olee Ndị Ga-abụ Ndị Lanarịrị?

1. (a) Na gịnị ka mmadụ ịlanarị baa n’Usoro Ihe Ọhụrụ nke udo nke Chineke dabeere? (b) Olee otú Mkpughe isi 7 si akọwa ndị ahụ ga-alanarị ibi na Paradaịs n’elu ala?

ỊLANARỊ mbibi ụwa nke na-abịa agaghị abụ ihe ndabara, dị ka ọ na-adịkarị n’agha ndị mmadụ lụrụ. Ọ gaghị abụ ihe a ga-ekpebi site n’ebe mmadụ bi, ma ọ bụ site n’onye ahụ ime ngwa ngwa ịgbaga n’ebe nchedo bọmbụ ma ọ bụ ihe nchedo ọzọ mgbe a nụrụ opi ịdọ aka ná ntị. Nlanarị ga-adabere n’amara Chineke na nhọrọ nke onye ọ bụla meworo tupu “mkpagbu ukwu” ahụ amalite. Ị̀ ga-esi aṅaa mee nhọrọ nke ga-etinye gị n’etiti ndị ahụ ga-alanarị ibi ndụ n’ụwa n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke nke dị n’udo dịkwa ka paradaịs?—Mkpughe 7:9, 10, 14, 15.

2. Ònye na-eguzobe ihe nile ọ ga-ewe maka nlanarị, oleekwa ebe a na-achọta ha?

2 Ọ bụghị nanị na Bible kwuru na a ga-enwe ndị lanarịrị mbibi ụwa na-abịanụ. O guzobekwara ụkpụrụ inyere anyị aka ịmata ụdị mmadụ ha ga-abụ. Ebe Chineke mere ka nlanarị ahụ kwe omume, n’ụzọ ziri ezi ọ bụ ya bụ onye setịpụrụ ihe ọ ga-ewe inweta ya.

3. Ka e wee nwee udo na ntụkwasị obi, gịnị mere o ji dị mkpa na a ga-ebipụ ndị na-emebi iwu?

3 Chineke ga-eji amamihe na ikpe ziri ezi hụ na ndị ga-alanarị ga-abụ mmadụ ndị ga-aba uru n’Usoro Ihe Ọhụrụ ya, ọ bụghị ndị ga-emebi ya. Ndị ezi omume agaghị enwe udo na ntụkwasị obi ma ọ bụrụ na o kwe ka ndị ajọ omume lanarị. Ebe obibi na nchebe nke onwe ha ka ga-anọ n’ihe ize ndụ. Ma Bible na-ekwe nkwa, sị: “N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” Site nanị na Chineke itinye ụkpụrụ ahụ n’ọrụ, dị ka ọ dị n’Abụ Ọma 37:9-11, ka “ịba ụba nke udo ga-atọkwa” ndị ga-alanarị ụtọ. A na-ahụ ụzọ Chineke ga-esi mee nke a n’oge gara aga mgbe mmebi iwu nke mmadụ kpaliri Chineke iweta mbibi.

Ihe Atụ Nlanarị Ndị Gara Aga

4-6. (a) Gịnị na-agba àmà na mbibi Jerusalem na 70 O.A. bụ ihe mere eme n’ezie? (b) N’ihi gịnị ka mbibi ahụ jiri bịa? (ch) Gịnị mere o ji kwe ndị na-eso ụzọ Jisọs omume ịgbapụ?

4 N’ime obodo Rom taa, a ka nwekwara ihe nguzo ncheta site na narị afọ nke mbụ nke Oge Anyị, bụ́ Ihe Nguzobe nke Titus. N’elu ya ka e gosipụtara ihe ndị e si n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem na-ebupụ mgbe mbibi nke 70 O.A. gasịrị. Ya mere mbibi ahụ bụ ihe mere eme. Ọ bụkwa akụkọ ihe mere eme n’otu aka ahụ bụ́ eziokwu ahụ bụ na ọtụtụ iri afọ tupu mbibi ahụ Jisọs Kraịst ekwuwo banyere ọbịbịa ya na ụzọ mmadụ pụrụ isi lanarị.

5 Ndị Juu echigharịwo pụọ n’ebe Chineke nọ na-ejeso ụmụ mmadụ na omenala okpukpe ndị mmadụ mebere. (Matiu 15:3-9) Ha tinyere ntụkwasị obi ha n’ebe ụmụ mmadụ ndị na-achị achị nọ karịa n’Alaeze Chineke e kwere ná nkwa. (Jọn 19:15) Ha gara nnọọ n’ihu ịjụ na ịlụ ọgụ megide eziokwu ahụ Ọkpara Chineke na ndị na-eso ụzọ ya kwusara. Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere ihe ịgbaso ụdị ụzọ nke a ga-ebute.—Matiu 23:37, 38; 24:1, 2.

6 Ihe si na ya pụta bụ nnọọ dị ka e buru ụzọ kwuo. N’afọ 66 O.A., ndị Juu biliri imegide ndị Rom. Ndị Rom lara azụ na mberede ka ha lụsosịrị Jerusalem ọgụ na nke mbụ ya. Nke a bụ ihe àmà na ohere nye ndị ahụ kwere ime ihe Jisọs buworo ụzọ kwuo: Gbapụnụ—si n’ime obodo ahụ a kwadoworo nye mbibi na n’ime ókèala nile nke Judia, pụọ, n’agụghị ihe ọ bụla a na-aghaghị ịhapụ n’azụ. Nke ahụ ka ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs mere. E mesịa, n’afọ 70 O.A., ndị Rom laghachitere, mgbe ha nọchibidosịrị ya, ha bibiri Jerusalem na ndị jụrụ ịṅa ntị. Onye hụrụ ihe merenụ bụ́ ọkọ akụkọ ndị Juu bụ Josephus, na-asị na 1,100,000 ndị mmadụ n’ime Jerusalem nwụrụ n’ihi ụnwụ nri, ọrịa, ọgba aghara obodo, ma ọ bụ ná mma agha ndị Rom. Ma ndị Kraịst ji ihe ha nụrụ mee ihe gbapụrụ.—Luk 19:28, 41-44; 21:20-24; Matiu 24:15-18.

7. Gịnị dị ndị mmadụ mkpa ime iji lanarị mgbe ndị Babilọn bibiri mba Israel?

7 E nwekwara otu ụdị ọnọdụ ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ asaa nke bu ụzọ mgbe Chineke kwere ka ndị agha Babilọn n’okpuru Eze Nebukadneza [nke Abụọ] bibie mba Israel. Mbibi ahụ bụkwa ihe mere eme e nwere ihe ndekọ ya. Ọtụtụ afọ tupu nke ahụ e mee, Chineke site ná ndị amụma ya adọwo ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ aka ná ntị na ụzọ ha na-agbaso na-eduga ná mbibi. “Chigharịanụ, sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu chigharịa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka unu ga-anwụ?” bụ òkù Chineke kpọrọ ha. (Ezikiel 33:11) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ etinyeghị okwukwe n’ịdọ aka ná ntị ahụ, ọbụnakwa mgbe ndị agha Babilọn nọchibidoro Jerusalem, ndị Israel nọgidere na-ele anya na ọ dịghị mbibi ga-abịa. Ma o weere ọnọdụ dị ka e buru n’amụma. Chineke hụkwara na e chebere ndị ahụ gosipụtara okwukwe ha site ná nrubeisi.—Jeremaịa 39:15-18; Zefanaịa 2:2, 3.

8-10. (a) Olee ihe mere Jehova jiri weta mbibi ụwa n’oge Noa? (b) N’ihi gịnị ka e jiri chebe Noa na ezinụlọ ya?

8 Laghachi azụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ anyị na-ahụta ngosipụta dịkarịsịrị ochie nke ụkpụrụ Chineke maka nlanarị. O metụtaghị nanị mbibi nke otu mba kama nke ụwa. Nke ahụ bụkwa ihe mere eme n’ezie, metụta Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ n’ime afọ 2370/2369 T.O.A., n’oge Noa. Banyere ọnọdụ jupụtara ebe nile tupu mbibi ụwa ahụ, Bible na-asị: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile. Ma e bibiri ụwa n’ihu ezi Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.”—Jenesis 6:5, 11.

9 Ihe ọjọọ na ime ihe ike kpaliri Chineke ime ihe. Nanị Noa na ezinụlọ ya gosiri okwukwe na nrubeisi. Site n’ebere nye ha na iji guzobe ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa, Jehova Chineke ‘emereghị ụwa ochie ebere, bụ́ nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.’ Ihe si na ya pụta bụ na e mere ka “ụwa nke dị n’oge ahụ laa n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya.”—2 Pita 2:5; 3:5-7.

10 Ma, Noa na ezinụlọ ya lanarịrị. N’ihi gịnị? Na nke mbụ, ha ejesoghị “ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” n’ajọ omume ha. Ha emikpughị onwe ha nke ukwuu n’ihe nkịtị ndị a na-eme ná ndụ, bụ́ iri ihe, ịṅụ ihe, na ịlụ di ma ọ bụ nwunye, nke na ha amaghị uche Chineke ma ọ bụ ghara ịnara ịdọ aka ná ntị ya. Noa ‘sooro Chineke jegharịa’ n’ezi omume. Nke a apụtaghị na ya na ezinụlọ ya wepụrụ aka n’ime ihe ọjọọ nanị. Kama, ha mere ihe ndị kwesịrị ekwesị iji mee ezi ihe. Ha kwere n’ezie n’ihe Chineke kwuru, ha gosikwara nke a site n’iwu oké ụgbọ dị okpukpu atọ nke ogologo ya karịrị 400 amaụkwụ. Noa mekwara nke ọma n’ịbụ “onye na-ekwusa ezi omume,” na-akọrọ ndị ọzọ banyere nzube nile nke Chineke, na-akpọsa ụzọ nke ezi omume.—Jenesis 6:9, 13-16; Matiu 24:37-39; Ndị Hibru 11:7.

11. Dị ka e gosiri site n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị ndị a, gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị ga-alanarị mbibi ụwa nke na-abịanụ?

11 Mmadụ asatọ ndị a lanarịrị n’ihi okwukwe ha na ọrụ ha nke sitere n’okwukwe. Jisọs na ndị ozi ya zoro aka ná mbibi ụwa ahụ dị ka ihe amụma nke ihe na-eche ụmụ mmadụ ihu ‘n’ọgwụgwụ oge a.’ Ya bụ na o doro anya na anyị onwe anyị kwa ga-ekewapụ onwe anyị n’ebe ụwa nke na-eche mbibi ihu dị, dị ka Noa na ezinụlọ ya mere. Anyị aghaghịkwa ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke. Anyị apụghị nnọọ ịdabere n’ụkpụrụ onwe anyị ma na-ele anya ịlanarị. Okwu Chineke na-asị: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.” (Ilu 16:25) Ngosi efu ọ bụla nke ezi omume apụghịkwa iweta nlanarị ma ọlị. N’ihi na Jehova Chineke na-ahụ ihe dị n’obi.—Ilu 24:12; Luk 16:15.

Ihe Jehova Na-achọ n’Obi Ụmụ Mmadụ

12, 13. (a) Ọnọdụ ndị dị aṅaa na-akpali ndị mmadụ ịchọ mgbanwe? (b) Gịnị mere nke a ezughị ezu iji hụ na ha lanarịrị baa n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke? (ch) Iji soro ná ndị ga-alanarị, gịnị kwesịrị ịkpali mwute anyị n’ebe ọnọdụ ọjọọ dị ugbu a dị?

12 Ọtụtụ ndị enweghị obi ụtọ n’ihi ọnọdụ dị ugbu a, ha na-egosikwa ya site n’ime mkpesa, ime ngagharị iwe, na n’ala ụfọdụ site n’ịkwatu ọchịchị n’ike. Ọtụtụ na-egosi mwute n’ihi oké ụtụ isi na ịrị elu nke ọnụ ahịa nke ihe ndị e ji ebi ndụ. Ha na-egosi oké mwute n’ihi ihe ize ndụ nke imempụ. Egwu na-eme ka ha chọọ mgbanwe. Ma, nke a ò zuwo ịhụ na ha lanarịrị baa n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke? Ee e, o zughị. N’ihi gịnị?

13 N’ihi na mmadụ pụrụ inwe mwute n’ihi ọnọdụ ndị a ma bụrụkwa onye na-achọ nanị ọdịmma ya. Ọ pụrụ ọbụna ịkwado ụdị ụfọdụ nke emeghị ihe n’eziokwu na omume rụrụ arụ—ma ọ bụrụhaala na ya onwe ya ataghị ahụhụ. Otú ọ dị, mmadụ ndị obi ha ziri ezi na-ele ihe anya n’ụzọ dị iche. Mgbe ha na-amụ Bible ha na-ahụta na ọnọdụ ọjọọ nile bụ nanị ihe àmà ndị a na-ahụ anya nke ọrịa ji ụwa kpọmkwem. Ha na-achọpụta na ihe kpatara ihe àmà ndị a bụ enweghị nchegbu maka ịmara na ime uche Jehova nakwa ịdị ndụ n’ụkpụru ezi omume ya. Ya mere, ha anaghị enwe mwute n’ụzọ bụ isi n’ihi ikpe na-ezighị ezi nke ọha mmadụ, imempụ, mmetọ mbara, ma ọ bụ iyi egwu nke agha. Kama, ndị dị otú ahụ nwere obi ziri ezi na-enwe mwute karịsịa n’ihi ịhụ ka ụzọ omume rụrụ arụ nke mmadụ na-ewetara aha Chineke nkọcha. Ọ na-ewutekwa ha na ndị ọzọ, ọ bụghị nanị ha onwe ha, na-ata oké ahụhụ otú a n’ihi ya.

14. Olee ndị bụ ndị ‘a kara akara’ maka nlanarị n’oge mbibi Jerusalem n’aka ndị Babilọn?

14 Iji lanarị mbibi ụwa na-abịanụ, anyị aghaghị ịdị ka ndị ahụ e chebere mgbe Babilọn bibiri Jerusalem na 607 T.O.A., mmadụ ndị a kọwara dị ka “ndị na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile” nke a na-eme n’obodo ahụ. (Ezikiel 9:4) Ọnọdụ dị iche iche bụ “ihe arụ” n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, a na-emegbu ndị ogbenye, ọbụna na-agbara ụfọdụ n’ohu n’ụzọ megidere iwu n’aka ndị obodo ha. (Jeremaịa 34:13-16) Ọnọdụ omume nke alaeze Juda adịwo njọ ọbụna karịa nke alaeze ebe ugwu Israel, nke onye amụma bụ Hosea kọwara na mbụ, sị: “Ọ bụ na nanị ọgbụgba iyi, na okwu ụgha, na ogbugbu mmadụ, na izu ohi . . . iwusi ọbara mmadụ emetụwokwa iwusi ọbara mmadụ.” (Hosea 4:2; Ezikiel 16:2, 51) Ọ bụ nanị ndị mmebi iwu ahụ na egosighị nsọpụrụ ọ bụ n’ebe Chineke nọ na-ewute n’obi ka ‘a kara akara’ maka nlanarị.—Ezikiel 9:3-6.

15. Gịnị na-adọghachi ụfọdụ ndị azụ ime mgbanwe ndị dị mkpa iji lanarị mbibi ụwa na-abịanụ?

15 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị taa ga-achọ ịdị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi n’udo, ịba ụba, na ịtụsapụ ahụ, ha achọghị ime mgbanwe n’ụzọ ndụ ha nke ịmụ Bible na ịgbaso ụkpụrụ ya maka ihe ziri ezi ga-eweta. N’ime ime obi ha, ha enweghị n’ezie ịhụnanya maka ezi omume ma ọ bụ nchegbu si n’obi maka mmadụ ibe ha. Ebe Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke ga-eguzobe ọha mmadụ ọhụrụ nke “ezi omume bi n’ime ha,” ozi ọma banyere ya na-amasị nanị ndị ahụ hụrụ ezi omume n’anya. Ndị ọzọ na-ahụ onwe ha dị ka ndị a mara ikpe n’ihi ya.—2 Pita 3:13; 2 Ndị Kọrint 2:14-17.

Ihe Ị Pụrụ Ime Ugbu a

16-18. (a) Mmadụ ọ̀ pụrụ isi aṅaa ghọọ onye a kara akara maka nlanarị? (b) Gịnị ka ọ na-aghaghị ime banyere ofufe ụgha, mgbe ahụkwa banyere ezi ofufe? (ch) Olee otú ọ na-aghaghị isi lee òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche dị ka òtù UN anya?

16 Jehova ga-echebe nanị ndị ahụ ji ezi obi chọọ ịdị ndụ n’okpuru ịchịisi ezi omume ya. Ọ gaghị amanye onye ọ bụla mgbe ahụ ibi n’ọnọdụ nke ha na-achọghị n’onwe ha. N’ihi ya, ndị a ga-echebe ga-egosi ezi nnakwere ha nke ọchịchị Chineke ugbu a. A na-aka ha “akara” maka nlanarị site na ha iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” nke onye Kraịst, na-eme ka ndụ ha kwekọọ n’ụzọ Chineke, na-enyekwa ihe àmà na ha bụ ndị na-eso ụzọ Ọkpara Chineke. N’ụzọ dị otú a, ha ‘na-ahọrọ ndụ’ na ngọzi, ọ bụghị ọnwụ. (Ndị Kọlọsi 3:5-10; Deuterọnọmi 30:15, 16, 19) Gịnị ka ị ga-ahọrọ?

17 Nhọrọ gị metụtara ido onwe gị n’okpuru Chineke n’ofufe. Jisọs sịrị: “Oge awa na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya.” (Jọn 4:23) N’ihi ya, ịlanarị mbibi ụwa nke na-abịa chọrọ ka anyị gbakụta ofufe ụgha nile azụ ma na-ekere òkè n’ezi ofufe. Ọzọ, a gaghị achọta ndị ga-alanarị n’etiti ndị tinyere ntụkwasị obi ha n’òtù United Nations ma ọ bụ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ, ebe ndị a bụ akụkụ nke ụwa nke a ga-ebibi.—Mkpughe 17:11; 18:17-21.

18 Ngọzi na-agaghị agwụ agwụ na-echere ndị ahụ weere ụzọ ahụ nke na-eduba ná nlanarị. Tụlee ugbu a ihe ụfọdụ ndị Chineke kwere ná nkwa nye ndị tinyere okwukwe n’Okwu ya, gosikwa okwukwe ahụ site n’ime ihe kwesịrị ekwesị.

[Foto dị na peeji nke 87]

“Oké ìgwè mmadụ” ga-alanarị mbibi ụwa wee biri n’elu ụwa n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya