Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ws isi 12 p. 98-105
  • Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Chineke Na-eru Nso Mmezu Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Chineke Na-eru Nso Mmezu Ya
  • Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọgbụgba Ndụ Ka Mma nke Nwere Onye Ogbugbo Ka Mma
  • E Dochie Ọgbụgba Ndụ Ochie ahụ ghọworo “Ihe Ochie”
  • “Ọgbụgba Ndụ Ebighị Ebi”
  • Unu Ga-abụ “Alaeze nke Ndị Nchụàjà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • “Onyeisi Udo” ahụ Echee Ndị Na-anọghị n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ihu
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • I Nwere Ike Irite Uru n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
ws isi 12 p. 98-105

Isi 12

Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Chineke Na-eru Nso Mmezu Ya

1. (a) Gịnị ga-eme elu ala anyị ma ọ bụrụ na Chineke anọgideghị n’ọgbụgba ndụ ya banyere ehihie na ọgbụgba ndụ ya banyere abalị? (b) Ebe Chineke na-eji ịnọgidesị ike n’ihe na-arapagidesi ike n’ọgbụgba ndụ ya, gịnị ka anyị na-aghaghị inwe ihe ido anya banyere ya?

GỊNỊ ka anyị ga-eme ọ bụrụ na Chineke emezughị ọgbụgba ndụ ya banyere ehihie na abalị? Kama inwe ehihie isochi abalị, ụwa anyị ga-enwe ìhè na-adịgide adịgide ma ọ bụ bụrụ nke ọchịchịrị na-adịgide adịgide gbachiri. (Jenesis 1:​1, 2, 14-⁠19) Ma Chineke na-eji ịnọgidesi ike n’ihe na-arapara n’ọgbụgba ndụ ya nile. Ya mere anyị pụrụ inwe ezigbo ihe ido anya na ọ dịghị mgbe a ga-ebibi ọnwa, anyanwụ, na ụyọkọ kpakpando nile nke eluigwe; a gaghị ebibikwa mbara Ala anyị.

2. Gịnị ka Jehova gwara ndị Juu n’ihe banyere ọgbụgba ndụ ya nke ehihie na nke abalị?

2 N’ikwu banyere ọgbụgba ndụ ya banyere ehihie na abalị, Chineke gwara ndị Juu ahụ nọ n’okpuru alaeze ezinụlọ ndị eze nke Devid, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-emebi ọgbụgba ndụ m nke ehihie, na ọgbụgba ndụ m nke abalị, ka ehihie na abalị wee ghara ịdị na mgbe ha; ya bụ na a ga-emebi ọgbụgba ndụ m, nke mụ na Devid, bụ́ ohu m, gbara, ka o wee ghara inwe nwa nwoke nke bụ eze n’elu ocheeze ya.”​—⁠Jeremaịa 33:​20, 21.

3. Gịnị ka okwu ndị a na-egosi banyere ọgbụgba ndụ ya na Devid maka Alaeze nke na-adịru ebighị ebi?

3 N’okwu ndị ahụ anyị nwere ihe nnwapụta a na-ekwughị hoo haa nke na-egosi na ala anyị, anyanwụ na ọnwa, ga-adịgide ruo ebighị ebi. (Eklisiastis 1:4) Ụwa anyị ga-abụ nke ụmụ mmadụ bi n’ime ya ruo ebighị ebi, ka ha wee mara ụtọ ịma mma nke ehihie na abalị n’okpuru Chineke ahụ na-edebe ọgbụgba ndụ, Onye Okike nke mmadụ. Dịkwa ka Jehova nọgidesiworo ike n’ọgbụgba ndụ ya nke ehihie na abalị, otú a ka ọ nọgidesiworo ike n’ihe n’ebe ọgbụgba ndụ ya nke o so Eze Devid nke oge ochie gbaa maka Alaeze na-adịru ebighị ebi n’eriri ezinụlọ Devid. Nke a bụ eziokwu n’agbanyeghị na ọ bụ ezie na ọ dịwo mkpa ka e si n’ụwa bupụ ebe isi ọchịchị nke Alaeze ahụ gaa n’eluigwe anya na-adịghị ahụ.​—⁠Abụ Ọma 110:​1-⁠3.

4. (a) E jikọrọ ọgbụgba ndụ Chineke na Devid banyere Alaeze nke na-adịru ebighị ebi na ọgbụgba ndụ ọzọ dị aṅaa? (b) Gịnị ka Jisọs Kraịst kwuru banyere ya, ọ̀ bụkwa n’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa?

4 E jikọrọ ọgbụgba ndụ Chineke maka Alaeze na-adịru ebighị ebi n’eriri nke ụmụ sitere na Devid na ọgbụgba ndụ ọzọ, ya bụ “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” ahụ. Jisọs kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ nke a gaje iwere ọnọdụ nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ. Nke a bụ mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi mesịrị Ememe Ngabiga ndị Juu n’abalị Nisan 14 na 33 O.A. O guzobere ihe e mesịrị kpọọ “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” Ọ maara na, n’otu ụbọchị Ememe Ngabiga ahụ, ọ ga-awụsị ọbara ya n’àjà. N’ihi nke ahụ, o welitere iko mmanya na-acha ọbara ọbara, ma tupu o nye ya ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, ọ sịrị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m.”​—⁠Luk 22:20; 1 Ndị Kọrint 11:​20, 23-⁠26.

5. Ònye ka Chineke kwere nkwa nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Republic of Israel ọ̀ na-azọrọ na ya so n’ọgbụgba ndụ nke a?

5 Dị ka ọgbụgba ndụ ochie ahụ, e sooro otu mba gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma ọ bụghị nke ọ bụla ná mba nke Krisendọm. Ọ bụ ezie na e ji Jeremaịa onye amụma mee ihe ikwe mba Israel nkwa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ihe karịrị 2,500 afọ gara aga, Republic of Israel nke taa adịghị azọrọ ịnọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Kama nke ahụ, Republic of Israel ghọrọ onye òtù nke òtù UN.

6. Dị ka ihe dị na Jeremaịa isi 31 si dị, n’ihi gịnị ka Chineke ji hụ na ọ dị mkpa nke ịgba ọgbụgba ndụ ọhụrụ, gịnịkwa ka ọ gaje ịrụpụta?

6 N’ihi gịnị ka Chineke ji chọọ ọgbụgba ndụ ọhụrụ? Jeremaịa 31:​31-⁠34 na-akọwa, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), mgbe mụ na ụlọ Israel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ: ọ bụghị dị ka ọgbụgba ndụ ahụ si dị nke mụ na ndị bụ nna ha gbara n’ụbọchị m jidere ha n’aka ime ka ha si n’ala Ijipt pụta; n’ihi na ha onwe ha mebiri ọgbụgba ndụ m ahụ, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nwe ha; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta. N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ nke mụ na ụlọ Israel ga-agba mgbe ụbọchị nile ahụ gasịrị, (ọ bụ ihe sị n’ọnụ Jehova pụta); m ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka m ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ; m ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga⁠-⁠abụkwara m otu ndị: ha agaghị emekwa onwe ha ka ha mụta ọzọ, onye ọ bụla o mee ka onye agbata obi ya mụta, onye ọ bụla o meekwa ka nwanne ya mụta, sị, Maranụ Jehova: n’ihi na ha nile ga-amara mụ onwe m, site n’onye dịkarịsịrị nta n’ime ha wee ruo onye dịkarịsịrị ukwuu n’ime ha, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta): n’ihi na m ga-agbaghara ajọ omume ha, m gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.”

Ọgbụgba Ndụ Ka Mma nke Nwere Onye Ogbugbo Ka Mma

7. Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ọ̀ bụ ọgbụgba ndụ ahụ ndị Israel mebiri nke e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o jiri kara ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mma?

7 Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ abụghị ọgbụgba ndụ ochie ahụ e mere nanị ka ọ dị ọhụrụ, bụ́ nke ndị Israel mebiri. Ee e, ọ dịghị ma ọlị! N’ihi na Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst na Rom akwụkwọ, na-asị: “Unu anọghị n’okpuru iwu, kama n’okpuru amara.” (Ndị Rom 6:14) Ọ bụ n’ezie ọgbụgba ndụ ọhụrụ, a tụkwara anya na ọ ga-aka mma, n’ihi na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nwere ike ime ka ihe dị mma karị nye ndị ahụ ọ na-anabata n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Na nke mbụ, o mere ka onye ogbugbo ma ọ bụ onye ngabita ka mma bilite, n’iguzobe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Onye Ogbugbo a zuru ókè, n’enweghị mmehie dị ka Mosis onye amụma.

8. (a) Gịnị ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere nke mere ka ọ kara ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mma? (b) Ònye bụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke ka mma? (ch) Gịnị ka Ndị Hibru 8:​6, 13 na-ekwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na ịka ukwuu nke Onye Ogbugbo ya, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere n’ebe ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ dị?

8 Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ e ji Mosis onye amụma mee onye ogbugbo ya dị mma n’onwe ya. Otú ọ dị, ọgbụgba ndụ ahụ nyere ohere maka àjà ụmụ anụ, ndị ọbara ha na-apụghị ịsachapụ mmehie mmadụ mgbe ọ bụla. Ya mere ka Jehova Chineke wee guzobe ọgbụgba ndụ ka mma, a ga-enwe onye ogbugbo na àjà ka mma. Onye Ogbugbo a dị oké mkpa mesịrị bụrụ Jisọs Kraịst. N’igosipụta ọkịka nke Onye Ogbugbo nke a n’iji ya tụnyere Mosis onye amụma, Bible na-enye nkọwa sonụ: “Ma otú ọ dị, o ruwo n’ife ofufe nke ka mma, n’ụzọ ha otú ọ bụkwa onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ka mma, bụ́ ọgbụgba ndụ nke e nyeworo n’iwu n’elu nkwa ụfọdụ ka mma. . . . Mgbe ọ na-asị, ọgbụgba ndụ ọhụrụ, o mewo nke mbụ ka ọ bụrụ ihe ochie.”​—⁠Ndị Hibru 8:​6, 13.

E Dochie Ọgbụgba Ndụ Ochie ahụ ghọworo “Ihe Ochie”

9. (a) N’ụbọchị dị aṅaa ka ọgbụgba ndụ ochie ahụ gabigara? (b) Gịnị weere ọnọdụ n’ụtụtụ ahụ, ọ̀ bụkwa iji mee ka ihe dị aṅaa doo anya?

9 Ọgbụgba ndụ ahụ ghọrọ “ihe ochie,” ma ọ bụ ihe oge ya gafeworo, gabigara 50 ụbọchị mgbe e mesịrị ka Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ bilite n’ọnwụ. Nke a weere ọnọdụ n’ụbọchị Pentikọst. N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ihe ahụ Ememe nke Nchịkọta Ihe nke ndị Juu sere onyinyo ya malitere iwere ọnọdụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, 120 ndị na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gbakọrọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jerusalem wee nata mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa, ná mmezu nke amụma Joel 2:​28-⁠32. O mesiri mmalite nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ike site n’inye ndị ahụ na-ekiri ihe na-emenụ ihe nnwapụta a nụrụ ná ntị na nke a hụrụ n’anya.

10. N’ụbọchị Pentikọst ahụ, olee otú e si mee ka ọ pụta ìhè na e jiwo mmụọ nsọ tee ndị na-eso ụzọ Jisọs mmanụ?

10 Mgbe Jisọs si na mmiri a nọ mee ya baptism pụta e wee wụkwasị ya mmụọ nsọ, n’ụzọ ọrụ ebube e ji onyinyo nke nduru na-efegharị n’elu isi ya mee ihe nnọchianya nke mmụọ ahụ. Ma n’ọnọdụ nke 120 ndị Hibru ahụ na-eso ụzọ n’ụbọchị Pentikọst ahụ, olee otú e si mee ka otite e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ pụta ìhè? Ọ bụ site ná mpụta ìhè nke ire dị ka nke ọkụ n’elu isi ha, nakwa site n’inye ha onyinye nke inwe ikike ikwupụta Okwu Chineke n’asụsụ ndị mba ọzọ, bụ́ ndị ọ na-adịtụbeghị mgbe ha mụrụ ha.​—⁠Matiu 3:16; Ọrụ 2:​1-⁠36.

11. (a) Gịnị kwesịrị ịdoworịị ndị Juu anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú anyị si mara na ndị Juu adịghị agwarịta onwe ha sị, “Maranụ Jehova,” ọ̀ bụkwa obi ụtọ dị aṅaa ka ha na-enweghị?

11 O kwesịrị ido ndị Juu na ndị rabaị ha anya na ọgbụgba ndụ Iwu Mosis adịghị arụkwa ọrụ ọzọ. Kemgbe ìgwè ndị agha Rom bibisịrị Jerusalem na 70 O.A., ha enwebeghị ụlọ nsọ. N’oge ahụ, ihe ndekọ nile nke usoro ọmụmụ ha furu ma ọ bụ laa n’iyi. Otú a taa ha amaghị onye si n’agbụrụ Livaị na onye bụ nwa Erọn iji wee nwee ike ije ozi dị ka onye isi nchụàjà maka mba ndị Juu. Kama ịgwarịta ibe ha, sị, “Maranụ Jehova,” ha lere ịkpọpụta aha Chineke anya dị ka imerụ ihe dị nsọ. Ya mere ha adịghị ekere òkè n’obi ụtọ nke Ndịàmà Jehova n’ihi eziokwu ahụ bụ na e jiwo ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie ọgbụgba ndụ ochie ahụ bụ “ihe ochie.”

“Ọgbụgba Ndụ Ebighị Ebi”

12. (a) N’ekpere dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova pụrụ iji obi ha sonye? (b) Na gịnị ka a kpọlitere Jisọs site n’ọnwụ?

12 N’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe ọnọdụ nke ndị Juu nọ na ya taa, Ndịàmà Jehova nwere Onyeisi Nchụ-àjà na-arụsi ọrụ ike, nke na-arụ ọrụ n’aka nri nke Chineke n’eluigwe. Ọ bụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, onye ogbugbo karịrị Mosis nke ukwuu. Site n’obi, ndị àmà ndị a nke Jehova pụrụ isonyere ekpere nke onye dere ihe ahụ dị na Ndị Hibru 13:​20, 21: “Ma Chineke nke udo, onye weere ọbara nke ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ si ná ndị nwụrụ anwụ kughachi oké onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ ya, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs, ya mee ka unu zuo okè n’ezi ihe nile ọ bụla ime ihe ọ na-achọ.” Ebe “oké onye ọzụzụ atụrụ” ahụ tọgbọrọ ndụ mmadụ ya n’ihi “atụrụ” ahụ, ọ pụrụ ịbụ onye a kpọlitere n’ọnwụ n’ahụ nke mmụọ nke na-enweghị ọbara, nke na-adịghị anwụ anwụ, kama na-enwe uru nke ọbara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e debere n’ikwesị ntụkwasị obi, nke mmetụta ọma ya nile na-adịru ebighị ebi.

13. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si echeta ọnwụ nke Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kwa afọ? (b) Gịnị ka ihe nnọchianya ndị ahụ bụ ihe atụ ha?

13 Ndịàmà Jehova na-echeta ọnwụ ịchụ àjà Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, kwa afọ n’ememe ncheta nke “nri anyasị Onyenwe anyị.” Achịcha ekoghị eko ahụ nke ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-eri n’oge “nri anyasị” ahụ na-anọchite anya anụ ahụ zuru òkè nke Onye Ogbugbo ahụ, mmanya ahụkwa na-anọchite anya ọbara dị ọcha, nke a na-emerụghị emerụ, nke nwere kpọmkwem uru nke ndụ nke Onye Ogbugbo ahụ, dị ka ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru si dị.​—⁠1 Ndị Kọrint 11:​20-⁠26; Levitikọs 17:11.

14. Mgbe ndị ahụ nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ riri ma ṅụọ ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta ahụ, gịnị ka ha na-eme, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ?

14 Mgbe ndị ahụ so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na⁠-⁠aṅụ site n’iko mmanya nke Ememe Ncheta ahụ n’oge “nri anyasị nke Onyenwe anyị,” ọ bụ nanị n’ụzọ ihe atụ ka ka ha na-aṅụ ọbara, nke Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ọ bụkwa n’ụzọ ihe atụ ka ha na-eri anụ ahụ ya mgbe ha na-eri achịcha ekoghị eko nke Ememe Ncheta ahụ. N’ime nke a, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, ha na-egosipụta okwukwe ha n’ime àjà mgbapụta nke Ọkpara Chineke, Onye Nnapụta nke ihe nile a kpọrọ mmadụ.

15. (a) Ogologo oge ha aṅaa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nọruworo, oleekwa otú o siworo bụrụ n’ezie ọgbụgba ndụ ka mma? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji zoo aka n’ebe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nọ dị ka “ọgbụgba ndụ ebighị ebi”?

15 Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke gbaworo ihe karịrị 1,950 afọ ugbu a, na-eru nso mmezu nke nzube ya. Ka ọ dị ugbu a o jiriworị ọtụtụ narị afọ nọọ ogologo oge karịa ọgbụgba ndụ Iwu Mosis. Ebe e wukwasịrị ya n’elu nkwa ndị ka mma na àjà ka mma nke nwere Onye Ogbugbo ka mma, ọ bụrụwo n’ezie ọgbụgba ndụ ka mma. N’ihi na ọ dịghị mkpa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ọzọ na nke ka mma nọchie ya, a na-ezo aka n’ebe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere ihe ịga nke ọma dị dị ka “ọgbụgba ndụ ebighị ebi.”​—⁠Ndị Hibru 13:20.

16. N’ihi ihe dị aṅaa ka anyị ga-eji kelee Jehova Chineke?

16 Ekele dịrị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, na o welitewo Onye Ogbugbo ka Mosis mma, onye ọ bụ site na ya ka Ọ pụrụ iwezụga ọgbụgba ndụ Iwu Mosis n’ụzọ iwu kwadoro, site n’ịkpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ ma nye ọbara nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-adịru ebighị ebi!

[Foto dị na peeji nke 105]

Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke Jisọs bụ onye ogbugbo ya ji ihe dị ukwuu karịa ọgbụgba ndụ ochie ahụ nke Mosis bụ onye ogbugbo ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya