Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
“Ọ dị anyị mma ịnụ n’ọnụ gị ihe ị tụkwasịrị uche gị na ha: n’ihi na ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:22) Ndị a bụ́ ndị ndú obodo na Rom nke narị afọ mbụ setịpụrụ ezi ihe nlereanya. Ha chọrọ ịnụ n’ọnụ onye ihe metụtara, kama ịnụ nanị n’ọnụ ndị nkatọ bụ́ ndị ihe na-emetụtaghị.
N’otu aka ahụ, a na-ekwujọkarị Ndịàmà Jehova n’oge a, ọ ga-abụkwa imehie ihe ịtụ anya ịmata ihe bụ eziokwu banyere ha site n’ọnụ ndị buuru ha ihe ọjọọ n’obi. Ya mere obi dị anyị ụtọ ịkọwara gị ụfọdụ n’ime ihe ndị bụ́ isi anyị kweere.
Bible, Jisọs Kraịst, na Chineke
Anyị kweere na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru.” (2 Timoti 3:16) Ọ bụkwa ezie na ụfọdụ ndị ekwuwo na anyị abụghị ndị Kraịst n’ezie, nke a abụghị eziokwu ma ọlị. Anyị kwenyezuru n’àmà Pita onyeozi gbara banyere Jisọs Kraịst, sị: “Aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.”—Ọrụ 4:12.
Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Jisọs kwuru na ya bụ “Ọkpara Chineke” nakwa na ‘Nna m zitere m,’ Ndịàmà Jehova kweere na Chineke ka Jisọs ukwuu. (Jọn 10:36; 6:57) Jisọs n’onwe ya kwetara, sị: “Nna m ka Mụ onwe m ukwuu.” (Jọn 14:28; 8:28) N’ihi ya anyị ekweghị na Jisọs na Nna ya hà nhata dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu na-ekwu. Kama nke ahụ, anyị kweere na Chineke kere ya nakwa na ọ nọ n’okpuru Ya.—Ndị Kọlọsi 1:15; 1 Ndị Kọrint 11:3.
N’asụsụ Igbo, aha Chineke bụ Jehova. Bible na-ekwu, sị: “Gị onwe gị, onye nanị aha gị bụ JEHOVA, bụ onye kasị elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18, King James Version) N’ikwekọ n’okwu a, Jisọs mere ka aha Chineke pụta ìhè nke ukwuu, na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ.” Ya onwe ya kwa kpegaara Chineke ekpere, sị: “Emere m ka aha Gị pụta ìhè nye ndị I nyere m.”—Matiu 6:9; Jọn 17:6.
Ndịàmà Jehova kweere na ha kwesịrị ịdị ka Jisọs n’ime ka ndị ọzọ mara aha Chineke na nzube ya nile. Ya mere anyị na-aza aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova n’ihi na anyị na-eṅomi Jisọs, bụ́ “onye àmà kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mkpughe 1:5; 3:14) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Aịsaịa 43:10, gwara ndị na-anọchite anya Chineke, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara.”
Alaeze Chineke
Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa,” o mekwara ka Alaeze ahụ bụrụ isiokwu na-ebute ụzọ n’ozizi ya. (Matiu 6:10; Luk 4:43) Ndịàmà Jehova kweere na Alaeze ahụ bụ ọchịchị dị adị n’ezie nke si n’eluigwe, na ọ ga-achị elu ụwa, nakwa na Jisọs Kraịst bụ Eze ya a họpụtara ahọpụta nke a na-adịghị ahụ anya. “Ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya,” ka Bible na-ekwu. “Ịba ụba nke ọchịchị ya na udo agaghị agwụ agwụ.”—Aịsaịa 9:6, 7, KJ.
Otú ọ dị, Jisọs Kraịst agaghị abụ nanị eze nke ga-achị n’ọchịchị Chineke. Ọ ga-enwe ọtụtụ ndị ya na ha ga-eso chịa n’eluigwe. “A sị na anyị na-enwe ntachi obi,” ka Pọl onyeozi dere, “anyị ga-esokwa Ya bụkọọ eze.” (2 Timoti 2:12) Bible na-egosi na ụmụ mmadụ ndị ahụ a kpọlitere iso Kraịst chịa n’eluigwe bụ nanị “[narị puku na iri puku anọ na anọ], bụ́ ndị a gbatararịị n’ụwa.”—Mkpughe 14:1, 3.
Dị ka o kwesịrị, ọchịchị ọ bụla aghaghị inwe ndị ọ na-achị, Ndịàmà Jehova kwekwaara na ọtụtu ijeri ndị ọzọ, ma e wezụga ndị a ga-achị n’eluigwe, ga-enweta ndụ ebighị ebi. N’ikpeazụ, ụwa, bụ́ nke e meworo ka ọ ghọọ paradaịs mara mma ga-ejupụta ná ndị a ruru eru ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị, ha nile ewee na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi Kraịst na ndị ya na ha ga-eso chịa. Ya mere Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na ọ dịghị mgbe a ga-ebibi elu ala nakwa na a ga-emezu nkwa Bible ahụ bụ́: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29; 104:5.
Ma olee otú Alaeze Chineke ga-esi bịa? Ọ̀ bụ site ná mmadụ nile iji mkpebi nke aka ha doo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke? N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-egosi n’ụzọ ziri ezi na ọbịbịa nke Alaeze ahụ ga-achọ ka Chineke n’onwe ya tinye aka n’ihe omume nke ụwa: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Daniel 2:44.
Olee mgbe Alaeze Chineke ga-abịa? Dabere n’amụma Bible ndị na-emezu ugbu a, Ndịàmà Jehova kweere na ọ ga-abịa nnọọ n’isi nso. Anyị na-agba gị ume ịtụle amụma ụfọdụ ndị na-ekwu akụkụ dị iche iche nke “mgbe ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe a. E dekọrọ ha na Matiu 24:3-14; Luk 21:7-13, 25-31; na 2 Timoti 3:1-5.
N’ihi na anyị ‘hụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’anya site n’obi, mkpụrụ obi, uche na ume anyị dum, hụkwa onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị,’ mba, agbụrụ, na ihe mmadụ bụ adịghị ekewa anyị. (Mak 12:30, 31) E ji ịhụnanya a na-egosipụta n’etiti ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst ná mba nile mara anyị n’ebe nile. (Jọn 13:35; 1 Jọn 3:10-12) N’ihi ya, anyị na-anọgide na-anọpụ iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba ndị ahụ. Anyị na-anwa ịdị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs nke oge mbụ, bụ́ ndị o kwuru banyere ha, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16, NW) Anyị kweere na ịnọpụ iche n’ebe ụwa dị pụtara izere omume rụrụ arụ ndị jupụtara nnọọ n’ebe nile taa, gụnyere ịgha ụgha, izu ohi, ịkwa iko, di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị, iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ikpere arụsị, na ihe ndị ọzọ dị otú ahụ, bụ́ ndị a katọrọ na Bible.—1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Efesọs 5:3-5; Ọrụ 15:28, 29.
Olileanya Maka Ọdịnihu
Ndịàmà Jehova kweere na ndụ anyị dị ugbu a n’ụwa a abụghị nanị ndụ dịnụ. Anyị kweere na Jehova zitere Kraịst n’ụwa ịwụpụ ọbara ya dị ka ihe mgbapụta ka ụmụ mmadụ wee nwee ike ịbụ ndị ezi omume n’anya Chineke ma nweta ndụ ebighị ebi n’ime usoro ihe ọhụrụ. Dị ka otu onyeozi Jisọs kwuru: “A gụsịrị anyị ná ndị ezi omume ugbu a n’ime ọbara Ya.” (Ndị Rom 5:9; Matiu 20:28) Ndịàmà Jehova na-ekele Chineke na Ọkpara ya n’ụzọ dị ukwuu maka mgbapụta a e mere ndokwa ya nke na-eme ka ịdị ndụ n’ọdịnihu kwe omume.
Ndịàmà Jehova nwere obi ike zuru ezu ná ndụ a ga-adị n’ọdịnihu, bụ́ nke na-adabere ná mbilite n’ọnwụ ga-adị n’Alaeze Chineke. Anyị kweere, dị ka Bible na-akụzi, na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-akwụsị ịdị adị n’ezie, na “n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” (Abụ Ọma 146:3, 4; Ezikiel 18:4; Eklisiastis 9:5) Ee, ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ n’ọdịnihu na-adabere na Chineke icheta ha ná mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.
Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na ọtụtụ ndị dị ndụ ugbu a ga-alanarị mgbe Alaeze Chineke ga-eweta ọchịchị nile dị ugbu a ná njedebe, dị ka Noa na ezinụlọ ya lanarịrị Iju Mmiri ahụ, ha ga-adịgide ndụ iji dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha. (Matiu 24:36-39; 2 Pita 3:5-7, 13) Ma anyị kwenyere na nlanarị na-adabere n’ime ihe Jehova chọrọ, dị ka Bible na-ekwu: “Ụwa na-agabigakwa, . . . ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17; Abụ Ọma 37:11; Mkpughe 7:9, 13-15; 21:1-5.
O doro anya na ọ gaghị ekwe omume n’ebe a ikwucha ihe nile Ndịàmà Jehova kweere, ma anyị na-agba gị ume inwetakwu ihe ọmụma.
Ọ gwụlakwa ma e gosịrị nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na nsụgharị ahụ sitere na New World Translation of the Holy Scriptures—With References nke dị n’asụsụ Bekee.
[Ihe e dere n’ụdị pụrụ iche na peeji nke 4]
Anyị na-aza aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova n’ihi na anyị na-eṅomi Jisọs