Isi nke 2
Isiokwu Bụ́ Isi nke Bible
Ịkọwa Akwụkwọ Nsọ Ihe omimi ndị ahụ a kpọchibidoro n’akwụkwọ Mkpughe anọwo na-agbagwoju ndị ji ezi obi na-amụ Bible anya ruo ogologo oge. N’oge Chineke kara aka, e kpughere ihe omimi ndị ahụ, ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa, olee mgbe, ọ̀ bụkwa nye olee ndị? Ọ bụ nanị mmụọ Chineke pụrụ ime ka a mata ihe ọ pụtara ka oge ahụ na-eru nso. (Mkpughe 1:3) Ọ bụ ndị ohu Chineke na-anụ ọkụ n’obi n’elu ala ka a ga-ekpughere ihe omimi ndị ahụ dị nsọ, ka e wee wusie ha ike ime ka a mara ihe ndị o kpere n’ikpe. (Matiu 13:10, 11.) Anyị adịghị ekwu na nkọwa ndị e nyere n’ime akwụkwọ a enweghị ntụpọ ọ bụla. Dị ka Josef oge ochie sịrị: “Ọ́ bụghị Chineke nwe akụkọ isi nrọ nile?” (Jenesis 40:8) Otú ọ dị, anyị na-ekweresi ike na nkọwa ndị e nyere n’ebe a kwekọzuru nnọọ na Bible, na-egosi ụzọ kwesịrị ịrịba ama amụma Chineke siworo mezuo n’ihe ndị na-eme n’ụwa n’oge anyị a dị oké egwu.
1. Gịnị bụ nzube ukwu nke Jehova?
OTU ilu Bible na-asị: “Ikpeazụ ihe dị mma karị mmalite ya.” (Eklisiastis 7:8) Ọ bụ n’akwụkwọ Mkpughe ka anyị na-agụ banyere mmezu ikpeazụ na-akpali akpali nke nzube ukwu Jehova nwere ido aha ya nsọ n’ihu ihe nile e kere eke. Dị ka Chineke kwupụtara ugboro ugboro site n’ọnụ otu n’ime ndị amụma oge ochie ya: “Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezikiel 25:17; 38:23.
2. Ihe ọmụma dị aṅaa nke na-eju afọ ka Mkpughe, ya na akwụkwọ Bible ndị ọzọ e buru ụzọ dee, na-enyere anyị aka inweta?
2 Dị nnọọ ka Mkpughe na-akọwa ọgwụgwụ dị ebube nke ihe dị iche iche, otú a ka a kọwaara anyị mmalite ha n’akwụkwọ Bible ndị bu ụzọ. Site n’inyocha ihe ndekọ nke a, a na-enyere anyị aka ịghọta isiokwu ndị o metụtara, nweekwa nghọta zuru ezu nke nzube nile nke Chineke. Lee nnọọ ka nke a si bụrụ ihe na-eju afọ! Ọzọkwa, o kwesịrị ịkpali anyị ime ihe ka anyị wee kere òkè n’ọdịnihu dị ebube nke na-echere ihe a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 145:16, 20) Kpọmkwem n’ebe a, o yiri ihe kwesịrị ekwesị ịtụle akụkọ na isiokwu nke Bible dum, ka anyị wee buru n’uche ihe iseokwu bụ isi nke na-eche ihe nile a kpọrọ mmadụ ihu ugbu a, tinyekwara nzube Chineke e dere ede idozi ihe iseokwu ahụ.
3. Amụma dị aṅaa nke dị n’akwụkwọ Jenesis na-egosipụta ihe bụ isiokwu nke Bible dum, nke gụnyere Mkpughe?
3 Akwụkwọ mbụ nke Bible, bụ́ Jenesis, na-akọ banyere ihe mere “na mbụ,” na-akọwakwa ọrụ okike ihe nke Chineke, gụnyere ihe kasị elu o kere n’elu ala, bụ́ mmadụ. Ọ bụkwa na Jenesis ka e dere amụma Chineke mbụ, nke Chineke n’onwe ya buru n’ogige nke Iden n’ihe dị ka 6,000 afọ gara aga. Ọ dịbeghị anya e jiri otu agwọ mee ihe iduhie nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv; ya onwe ya rụgidere di ya, bụ́ Adam, isonyere ya n’imebi iwu Jehova site n’iri “mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” Mgbe ọ na-ama di na nwunye ahụ mehiere emehie ikpe, Chineke gwara agwọ ahụ, sị: “Iro ka m ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echipịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echipịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 1:1; 2:17; 3:1-6, 14, 15) Amụma ahụ guzobere isiokwu nke Bible dum, gụnyere Mkpughe.
4. (a) Mgbe Chineke busịrị amụma mbụ ahụ, gịnị mere nne na nna anyị mbụ? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa na-ebilite banyere amụma ahụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị anyị mkpa ịmara azịza ha?
4 Ozugbo o busịrị amụma ahụ, Chineke chụpụrụ nne na nna anyị mbụ n’Iden. Ha apụghịkwa inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs ọzọ; ha aghaghị ịdịpụcha ndụ ha n’akụkụ ala ebe ahụ a na-edozighị edozi nke dị n’èzí. Mgbe a masịworo ha ikpe, ha ga-amụ ụmụ ndị ibu mmehie na-anyịgbu. (Jenesis 3:23–4:1; Ndị Rom 5:12) Ma, gịnị ka amụma ahụ e buru n’Iden pụtara? Olee ndị ka o metụtara? Gịnị jikọrọ ya na Mkpughe? Ozi dị aṅaa ka o nwere nye anyị taa? Ka anyị wee nwere onwe anyị site ná mmetụta ọjọọ nile nke ihe ndị ahụ mere Jehova ji buo amụma ahụ, ọ dị anyị oké mkpa ịmata azịza nye ajụjụ ndị a.
Ndị Bụ́ Isi n’Ihe Nkiri Ahụ
5. Mgbe agwọ ahụ duhiere Iv, gịnị bilitere n’ihe banyere ọbụbụeze na aha Chineke, oleekwa otú a ga-esi dozie ihe iseokwu ahụ?
5 Ọ bụ agwọ ahụ nke gwara Iv okwu ụgha, na-atụrụ ya aro nke bụ na ọ gaghị anwụ n’ihi nnupụisi ya kama nke ahụ na ọ ga-aghọ onye nweere onwe ya, onye bụ chi nwanyị, ka e lekwasịrị anya buo amụma ahụ dị na Jenesis 3:15. Agwọ ahụ si otú a na-ekwu na Jehova bụ onye ụgha, na-egosikwa na ụmụ mmadụ pụrụ imeziwanye ọnọdụ ha site n’ịjụ ọchịchị Ya kasị elu. (Jenesis 3:1-5) A mara ịbụ ọkaaka nke Jehova aka, metọọkwa aha ọma ya. Akwụkwọ Mkpughe kọwara otú Ọkaikpe ezi omume ahụ, bụ́ Jehova, ga-esi jiri ọchịchị Alaeze nke dị n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst mee ihe ibuli ọbụbụeze ya elu, wepụkwa ịta ụta nile n’aha ya.—Mkpughe 12:10; 14:7.
6. Mkpughe si aṅaa mee ka a mara onye ahụ nke sitere n’agwọ gwa Iv okwu?
6 N’ihe banyere aha ahụ bụ “agwọ,” ò metụtara nanị agwọ nkịtị? Ọ dịghị ma ọlị! Mkpughe mere ka anyị mara ajọ mmụọ ahụ e kere eke nke sitere n’agwọ kwuo okwu. Ọ bụ “dragon ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi,” “weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.”—Mkpughe 12:9; 2 Ndị Kọrint 11:3.
7. Gịnị na-egosi na nwanyị ahụ nke Jenesis 3:15 nọ n’ebe ndị bụ mmụọ?
7 Ọzọ, Jenesis 3:15 kwuru okwu banyere “nwanyị ahụ.” Nwanyị a ọ̀ bụ Iv? Eleghị anya Iv chere otú ahụ. (Tụlee Jenesis 4:1.) Ma, ibu iro na-adịgide adịgide n’etiti Iv na Setan ghọrọ ihe na-agaghị ekwe omume mgbe Iv nwụrụ n’ihe karịrị 5,000 afọ gara aga. Ọzọ, ebe Agwọ ahụ nke Jehova gwara okwu bụ mmụọ a na-adịghị ahụ anya, anyị kwesịrị ịtụ anya na nwanyị ahụ ga-abụkwa onye nọ n’ebe ndị bụ mmụọ. Mkpughe 12:1, 2 kwadoro nke a, na-egosi na nwanyị ihe atụ a bụ nzukọ Jehova dị n’eluigwe nke ndị mmụọ e kere eke.—Leekwa Aịsaịa 54:1, 5, 13.
Mkpụrụ Abụọ Ndị Na-emegiderịta Onwe Ha
8. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị inwe mmasị dị omimi n’ihe e kwuru ugbu a banyere mkpụrụ abụọ?
8 Ihe ọzọ a hụrụ na Jenesis 3:15 bụ mkpụrụ abụọ. Anyị kwesịrị inwe mmasị dị omimi n’ihe ndị a, n’ihi na ha metụtara oké ihe iseokwu ahụ nke onye kwesịrị ekwesị ịbụ ọkaaka n’elu ụwa nke a. Nke a metụtara onye ọ bụla n’ime anyị, ma ànyị bụ ụmụntakịrị ma anyị bụ ndị okenye. Olee nke ị na-akwado n’ime mkpụrụ ndị a?
9. Gịnị ka o doro anya na mkpụrụ nke Agwọ ahụ gụnyere?
9 Nke mbụ, e nwere mkpụrụ, ma ọ bụ nwa nke Agwọ ahụ. Gịnị bụ nke a? O doro anya na nke a gụnyere ndị mmụọ ndị ọzọ ahụ e kere eke ndị sonyeere Setan ná nnupụisi ya, ndị e mesịkwara ‘tụdakọta ha na ya’ bịa na gburugburu elu ala. (Mkpughe 12:9) Ebe a kọwara Setan, ma ọ bụ Beelzebul, dị ka “onyeisi ndị mmụọ ọjọọ,” ọ pụtara ìhè na ọ bụ ha mejupụtara nzukọ ya a na-adịghị ahụ anya.—Mak 3:22; Ndị Efesọs 6:12.
10. Olee otú Bible si gosipụta ndị ọzọ dị ka akụkụ nke mkpụrụ Setan?
10 Ọzọkwa, Jisọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge ya okwu, sị: “Unu onwe unu sitere na nna unu, bụ́ Ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime.” (Jọn 8:44) Site ná mmegide ha megidere Ọkpara Chineke bụ Jisọs, ndị ndú okpukpe ndị ahụ gosiri na ha onwe ha bụkwa ụmụ Setan. Ha bụ akụkụ nke mkpụrụ Setan, na-ejere ya ozi dị ka nna ha n’ụzọ ihe atụ. Ọtụtụ mmadụ ndị ọzọ, n’akụkọ ihe mere eme nile, esiwokwa otú ahụ gosipụta onwe ha ịbụ ndị na-eme uche Setan, karịsịa n’imegide na n’ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jisọs. N’ozuzu ha, a pụrụ ịkọwa mmadụ ndị a dị ka ndị na-emejupụta nzukọ Setan a na-ahụ anya n’elu ala.—Lee Jọn 15:20; 16:33; 17:15.
E Mere Ka A Mata Mkpụrụ nke Nwanyị Ahụ
11. Mgbe ọtụtụ narị afọ gabigara, gịnị ka Chineke kpughere banyere mkpụrụ nke nwanyị ahụ?
11 Ihe ikpeazụ amụma ahụ dị na Jenesis 3:15 zoro aka na ya bụ mkpụrụ nke nwanyị ahụ. Ka Setan nọ na-ewulite mkpụrụ nke ya, Jehova nọ na-akwadebe ka “nwanyị” ya, ma ọ bụ nzukọ eluigwe ya yiri nwunye, mụpụta otu mkpụrụ. Ruo ihe dị ka 4,000 afọ, Jehova nọgidere jiri nwayọọ nwayọọ na-ekpughere ndị mmadụ na-atụ egwu Chineke, ndị na-erubekwara ya isi, ihe ọmụma metụtara ọbịbịa nke mkpụrụ ahụ. (Aịsaịa 46:9, 10) Abraham, Aịsak, Jekọb, na ndị ọzọ pụrụ isi otú a wulite okwukwe ha ná nkwa nke bụ na mkpụrụ ahụ ga-esi n’usoro ọmụmụ ha pụta. (Jenesis 22:15-18; 26:4; 28:14) Setan na ndị na-akwado ya akpagbuwo ndị ohu Jehova dị otú a mgbe mgbe n’ihi okwukwe ha nke na-adịghị ada ada.—Ndị Hibru 11:1, 2, 32-38.
12. (a) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa mgbe gịnị mere ka mkpụrụ bụ isi nke nwanyị ahụ bịarutere? (b) Gịnị ka e tere Jisọs mmanụ ime?
12 Mgbe e mesịrị, n’afọ 29 nke Oge Anyị, nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs bịara n’Osimiri Jọdan, e wee mee ya baptism. Jehova nọ n’ebe ahụ jiri mmụọ nsọ mụta Jisọs, na-asị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” (Matiu 3:17) N’ebe ahụ, e mere ka a mata Jisọs dị ka onye e sitere ná nzukọ ime mmụọ nke Chineke dị n’eluigwe zite. E tekwara ya mmanụ dị ka Onye A Họpụtara ịbụ Eze nke Alaeze eluigwe ahụ nke ga-eweghachi ọchịchị elu ala n’aha Jehova, si otú a na-edozi ihe iseokwu nile metụtara ọchịchị ma ọ bụ ọbụbụeze otu mgbe ruo mgbe nile. (Mkpughe 11:15) N’ihi nke a, Jisọs bụ Onye bụ isi ná mkpụrụ nwanyị ahụ, bụ́ Mesaịa ahụ e buru n’amụma.—Tụlee Ndị Galetia 3:16; Daniel 9:25.
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya ịmata na mkpụrụ nke nwanyị ahụ ga-agụnye ihe karịrị nanị otu onye a ma ama? (b) Mmadụ ole ka Chineke họpụtaworo site n’etiti ụmụ mmadụ ịghọ akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ ahụ, òtù dịkwa aṅaa ka ha na-emejupụta? (ch) Olee ndị ọzọ so òtù ahụ na-arụkọ ọrụ n’ịdị n’otu?
13 Mkpụrụ nke nwanyị ahụ ọ̀ ga-abụ nanị otu onye a ma ama? Otú ọ dị, gịnị banyere mkpụrụ nke Setan? Bible mere ka a mata na mkpụrụ nke Setan gụnyere ìgwè ndị mmụọ ọjọọ na ụmụ mmadụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ihi ya, ọ gaghị abụrụ anyị ihe ijuanya ịmata nzube Chineke nke ịhọpụta 144,000 ndị na-ekwesị ntụkwasị obi site n’etiti mmadụ ịbụ ndị nchụàjà ga-eso chịa achịa, ha na Mkpụrụ ahụ bụ Mesaịa, bụ́ Jisọs Kraịst. Mkpughe na-ezo aka n’ebe ndị a nọ mgbe o kwuru na Ekwensu, n’ibu iro ya megide nzukọ Chineke nke yiri nwanyị, ‘ga-apụ ibu agha megide ndị fọdụrụ ná mkpụrụ ya.’—Mkpughe 12:17; 14:1-4.
14 N’ime Bible, a kpọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ ụmụnna Jisọs, dịkwa ka ụmụnna ya, ha na-enwekọ otu Nna na otu nne. (Ndị Hibru 2:11) Nna ha bụ Jehova Chineke. N’ihi ya, nne ha aghaghị ịbụ “nwanyị ahụ,” bụ́ nzukọ eluigwe nke Chineke, nke dị ka nwunye ya. Ha na-aghọ akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ ahụ, ebe Kraịst Jisọs bụ akụkụ ya bụ isi. Ọgbakọ nke ndị Kraịst ndị a e ji mmụọ nsọ mụta n’elu ala na-emejupụta nzukọ Chineke a na-ahụ anya nke na-eje ozi n’okpuru nduzi nzukọ ya yiri nwanyị nke dị n’eluigwe, ebe a ga-eme ka ha na Kraịst Jisọs dịrị n’otu mgbe ha bilitere n’ọnwụ. (Ndị Rom 8:14-17; Ndị Galetia 3:16, 29) Ọ bụ ezie na ha abụghị akụkụ nke mkpụrụ ahụ, a na-ejikọta ọtụtụ nde nke atụrụ ọzọ ndị sitere ná mba nile isoro nzukọ Chineke dị n’elu ala na-ejekọ ozi. Ị̀ bụ otu n’ime atụrụ ọzọ ndị a? Ya bụrụ otú ahụ, olileanya obi ụtọ i nwere bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ paradaịs.—Jọn 10:16; 17:1-3.
Otú Iro Si Malite
15. (a) Kọwaa ntolite nke mkpụrụ Setan ndị bụ mmadụ na ndị bụ mmụọ. (b) Gịnị mere mkpụrụ Setan n’oge Iju Mmiri nke ụbọchị Noa?
15 A malitere ịhụ mkpụrụ Setan ndị bụ mmadụ n’oge mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Dị ka ihe atụ, e nwere akụkọ banyere Ken, bụ́ mmadụ mbụ a mụrụ amụ, bụ́ “onye si n’ajọ onye ahụ pụta, wee gbuo nwanne ya” bụ́ Ebel. (1 Jọn 3:12) Mgbe e mesịrị, Ịnọk kwuru okwu banyere Jehova ịbịa “ya na ndị nsọ ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ nile ikpe, na ịtụ ndị nile ndị na-asọpụrụghị Chineke ihe n’anya, bụ́ ọrụ nile nke asọpụrụghị Chineke ha nke ha rụrụ n’asọpụrụghị Chineke, ha na okwu dị ike nile nke ndị mmehie ndị na-asọpụrụghị Chineke kwugidere ya.” (Jud 14, 15) Karịsịa, ndị mmụọ ozi na-enupu isi sonyeere Setan, wee ghọọ akụkụ nke mkpụrụ ya. Ndị a “hapụrụ ebe obibi nke aka ha” n’eluigwe ka ha wee nwoghara anụ ahụ mmadụ wee lụrụ ụmụ agbọghọ bụ mmadụ. Ha mụtara ụmụ a gwara ọgwa, ndị ka mmadụ ike, ndị bụ ndị ntigbu. Ụwa dị n’oge ahụ jupụtara n’ime ihe ike na ajọ ihe, nke mere na Chineke bibiri ya n’Iju Mmiri ahụ, ebe Noa na ezinụlọ ya bụ nanị mmadụ ndị lanarịrịnụ. Ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi—ndị bụ ndị mmụọ ọjọọ ugbu a n’okpuru nduzi Setan—ka a manyere ịgbahapụ ndị nwunye ha bụ mmadụ, ha na ụmụ ha bụ mmadụ, ndị mbibi na-eche ihu. Ha nwogharịrị onwe ha gaghachi n’ụdị mmụọ, wee laghachi n’ebe obibi nke ndị bụ mmụọ ebe ha nọ ugbu a na-echere mmezu na-abịaru nso nke ihe Chineke kpere n’ikpe megide Setan na mkpụrụ ya.—Jud 6; Jenesis 6:4-12; 7:21-23; 2 Pita 2:4, 5.
16. (a) Onye ọchịchị aka ike dị aṅaa ka a hụrụ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ò sikwa aṅaa gosipụta na ya bụ akụkụ nke mkpụrụ Setan? (b) Chineke si aṅaa tisasịa ndị ahụ chọrọ iwu ụlọ elu nke Babilọn?
16 Nwa mgbe nta ka oké Iju Mmiri ahụ gasịrị, otu onye ọchịchị aka ike aha ya bụ Nimrọd pụtara n’elu ala. Bible kọwara ya dị ka “dike n’ịchụ nta n’ihu Jehova”—nke bụ n’ezie akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ. Dị ka Setan, o gosiri mmụọ nke nnupụisi wee wuo obodo ukwu nke Bebel, ma ọ bụ Babilọn, iji megide nzube Jehova nke ịhụ na ihe a kpọrọ mmadụ gbasazuru ijupụta ụwa. Ebe bụ isi na Babilọn gaara abụ otu nnukwute ụlọ elu “nke elu ya ga-eru n’eluigwe.” Chineke tisasịrị ndị ahụ chọrọ iwu ụlọ elu ahụ. Ọ ghagburu asụsụ ha wee ‘mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa nile’ ma kwere ka Babilọn n’onwe ya nọgide.—Jenesis 9:1; 10:8-12; 11:1-9.
Ọchịchị Dị Iche Iche Apụta
17. Ka ụmụ mmadụ mụbara n’elu ala, akụkụ dị aṅaa rụrụ arụ nke ihe omume mmadụ pụtara ìhè, dịkwa ka ihe si na ya pụta, alaeze ukwu dịgasị aṅaa bilitere?
17 Na Babilọn, a malitere inwe akụkụ dị iche iche nke ihe omume mmadụ ndị tolitere n’imegide ọbụbụeze Jehova. Otu n’ime ndị a bụ ihe banyere ọchịchị. Ka ihe a kpọrọ mmadụ na-amụba, ndị ọzọ nwere oké ọchịchọ gbasoro ihe nlereanya Nimrọd n’iwere ike ọchịchị. Mmadụ malitere inwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya. (Eklisiastis 8:9) Dị ka ihe atụ, n’oge Abraham, Sọdọm, Gọmọra, na obodo ndị ọzọ dị ha nso dabara n’okpuru ọchịchị ndị eze dị iche iche sitere Shaịna na ala ndị ọzọ dị anya. (Jenesis 14:1-4) E mesịa, ndị ọkà n’ibu agha na nhazi ihe kewapụtara nnukwute alaeze dị iche iche iji mee onwe ha ọgaranya, ka ha nweekwa ebube. Bible na-ezo aka n’ebe ụfọdụ n’ime ndị a dị, gụnyere Ijipt, Asiria, Babilọn, Medo-Peasia, Gris, na Rom.
18. (a) Olee otú ndị Chineke na-esi eme omume n’ihe banyere ndị ọchịchị? (b) Olee ụzọ ndị ọchịchị ndị a siworo mee ihe maka ọdịmma nke Chineke n’oge ụfọdụ? (ch) Olee ụzọ ọtụtụ ndị ọchịchị siworo gosi onwe ha ịbụ akụkụ nke mkpụrụ Agwọ ahụ?
18 Jehova kwere ka ọchịchị ndị a nọgide, ndị ya rubekwaara ha isi n’ụzọ a kpara ókè mgbe ha bi n’ala ndị dị n’okpuru ọchịchị ndị ahụ dị iche iche. (Ndị Rom 13:1, 2) Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị dị iche iche jere ozi ọbụna iji mee ka nzube Chineke gaa n’ihu ma ọ bụ iji chebe ndị ya. (Ezra 1:1-4; 7:12-26; Ọrụ 25:11, 12; Mkpughe 12:15, 16) Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọchịchị emegidewo ezi ofufe n’ụzọ jọgburu onwe ya, na-egosipụta onwe ha ịbụ akụkụ nke mkpụrụ Agwọ ahụ.—1 Jọn 5:19.
19. È si aṅaa egosipụta ndị ọchịchị ụwa dị iche iche n’akwụkwọ Mkpughe?
19 Ọchịchị mmadụ akụwo afọ n’ala kpam kpam ná mgbalị ya iwetara anyị bụ mmadụ obi ụtọ ma ọ bụ n’igbo mkpa anyị dị iche iche. Jehova ekwewo ka ihe a kpọrọ mmadụ nwalee ụdị ọchịchị dị iche iche, ma ọ dịghị akwado mmerụ ma ọ bụ ụzọ ọchịchị dị iche iche siworo chigbuo ndị mmadụ. (Ilu 22:22, 23) Ná Mkpughe, a kọwara na ndị ọchịchị nchigbu dị iche iche jikọrọ aka ịbụ otu ajọ anụ ọhịa dị mpako.—Mkpughe 13:1, 2.
Ndị Eze Ahịa Na-achọ Ọdịmma Nanị Onwe Ha
20, 21. Òtù nke abụọ dị aṅaa ka a na-aghaghị ịgụnyekọta ha na “ndị ọchị agha” na “ndị dike” dị ka ndị so n’ajọ mkpụrụ nke Setan, n’ihi gịnịkwa?
20 Ndị ọzọ a hụrụ na ha na ndị ndú ọchịchị na-emekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya bụ ndị na-adịghị ekwu eziokwu, ndị na-ebugharị ihe ahịa a na-ahụ anya. Ihe ndekọ ndị a chọpụtara ná mkpọmkpọ ebe nke Babilọn oge ochie gosiri na azụmahịa nke e ji erigbu mmadụ ndị nọ n’ọnọdụ ọjọọ jupụtara n’ebe ahụ. Ndị eze ahịa ụwa anọgidewo na-arụ ọrụ maka uru nke onwe ha ruo oge anyị a, mgbe e nwere n’ọtụtụ mba mmadụ ole na ole ndị baworo ọgaranya, ebe ịda ogbenye nọ na-echi ihe ka ọtụtụ ọnụ n’ala. N’ọgbọ a e nwere ọtụtụ ụlọ mmepụta ihe, ndị eze ahịa na ndị na-emepụta ihe enwetawo uru site n’iresị ndị ọchịchị oké nkwakọba nke ajọ ngwá agha ndị e ji ebibi ihe, gụnyere ngwá agha ọgwụrụ mba, bụ́ ndị na-akpata oké nchegbu ugbu a. A ghaghị ịgụnyekọta ndị eze ahịa anyaukwu ndị ahụ na ndị ọzọ yiri ha na “ndị ọchị agha” na “ndị dike” dị ka ndị so ná mkpụrụ ajọ omume Setan. Ha nile bụcha akụkụ nke nzukọ elu ala ahụ nke Chineke na Kraịst na-ekpe ikpe dị ka ihe kwesịrị mbibi.—Mkpughe 19:18.
21 Otu akụkụ ọzọ nke òtù ụmụ mmadụ aghaghị isonyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ na azụmahịa anyaukwu dị ka nke kwesịrị inweta ikpe ọmụma nke Chineke. Gịnị bụ nke ahụ? Ọ pụrụ iju gị anya ihe Mkpughe kwuru banyere ihe nke a zuru ụwa ọnụ a maara nke ọma.
Babilọn Ukwu Ahụ
22. Ụdị okpukpe dị aṅaa bilitere na Babilọn oge ochie?
22 Owuwu nke Babilọn mbụ ahụ metụtara ihe karịrị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ebe e guzobere obodo ahụ imegide ọbụbụeze Jehova, o metụtara okpukpe. N’eziokwu, Babilọn oge ochie ghọrọ ebe bụ isi nke ikpere arụsị. Ndị nchụàjà ya na-ezi ozizi ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, dị ka nke bụ na mkpụrụ obi mmadụ na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị, na e nwekwara ebe mmadụ na-eje mgbe ọ nwụsịrị, nke jupụtara n’ihe egwu dị iche iche, nke ndị mmụọ ọjọọ na-elekọta. Ha mere ka ife ihe okike na ìgwè chi nwoke na chi nwanyị dị iche iche gaa n’ihu. Ha chepụtara akụkọ ifo dị iche iche iji kọwaa mmalite nke ụwa na mmadụ nke nọ n’elu ya, na-emekwa ihe omume na ịchụ àjà dị iche iche rụrụ arụ, ndị e chere na ọ bụ iji nwee ike ịmụ ụmụ na inweta ihe omume n’ubi, na inwe mmeri n’agha.
23. (a) Mgbe ha na-agbasa site na Babilọn, gịnị ka ndị mmadụ ji na-aga, gịnị sikwa na nke a pụta? (b) N’ihi ya, aha dị aṅaa ka Mkpughe kpọrọ alaeze okpukpe ụgha ahụ zuru ụwa ọnụ? (ch) Gịnị ka okpukpe ụgha nọgideworo na-alụ ọgụ megide?
23 Ka ìgwè asụsụ dị iche iche sitere Babilọn gbasara n’elu ala, ha burukwara okpukpe Babilọn na-agbasa. Otú a, ihe omume na nkwenkwe yiri ndị nke Babilọn oge ochie mụbara n’etiti ndị mbụ bi na Europe, Africa, kọntinent ndị dị n’America, Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ, na Ebe Ndịda Oké Osimiri; ọtụtụ n’ime nkwenkwe ndị a nọgidekwara ruo taa. N’ihi nke a, Mkpughe zoro aka n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ebe alaeze okpukpe ụgha nke a jikọtara ụwa dum nọ dị ka obodo ukwu nke a na-akpọ Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe, isi nke 17, 18) N’ebe ọ bụla a kụworo ya, okpukpe ụgha emepụtawo usoro ndị ụkọchukwu nwere aka ike, nkwenkwe ụgha, amaghị ihe, na adịghị ọcha. Ọ bụwo ihe ọrụ siri ike n’aka Setan. Babilọn Ukwu ahụ anọgidewo na-ebu agha megide ezi ofufe nke Eze Onyenwe anyị bụ Jehova.
24. (a) Agwọ ahụ si aṅaa nwee ike ichipịa Mkpụrụ nke nwanyị ahụ “n’ikiri ụkwụ”? (b) N’ihi gịnị ka e ji kọwaa ya n’amụma dị ka nanị mmerụahụ n’ikiri ụkwụ?
24 Dị ka akụkụ kasị njọ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ butere ụzọ n’ịkpagbu, e mesịakwa, n’igbu onye nnọchianya bụ isi nke mkpụrụ nke nwanyị ahụ. Otú a, Agwọ ahụ ‘chipịara ya [“mkpụrụ” ahụ] n’ikiri ụkwụ.’ (Jenesis 3:15; Jọn 8:39-44; Ọrụ 3:12, 15) N’ihi gịnị ka e ji kọwaa nke a dị ka nanị mmerụ ahụ e merụrụ n’ikiri ụkwụ? Ọ bụ n’ihi na mmerụahụ nke a metụtara ya nanị nwa mgbe n’elu ala ebe a. Ọ dịgideghị adịgide n’ihi na Jehova mere ka Jisọs si ná ndị nwụrụ anwụ bilite n’ụbọchị nke atọ wee bulie ya elu gaa ná ndụ dị ka mmụọ.—Ọrụ 2:32, 33; 1 Pita 3:18.
25. (a) Olee ụzọ Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube siwororịị mee ihe megide Setan na ndị mmụọ ozi ya? (b) Olee mgbe a ga-ewepụ mkpụrụ elu ala nke Setan? (ch) Gịnị ka ọ ga-apụta mgbe Mkpụrụ nke nwanyị Chineke chipịara Setan, bụ́ agwọ ahụ, “n’isi”?
25 Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube nọ ugbu a na-eje ozi n’aka nri nke Chineke, na-ekpe ndị iro Jehova ikpe. O meworị ihe megide Setan na ndị mmụọ ozi ya, na-atụda ha n’ala meekwa ka ọrụ ha nile bụrụ na gburugburu elu ala nke a—bụ ihe kpatara mmụba nke ihe otiti n’oge anyị a. (Mkpughe 12:9, 12) Ma dị ka e buru n’amụma, a ga-ewepụ mkpụrụ elu ala nke Setan mgbe Chineke ga-emezu ihe e kpere n’ikpe megide Babilọn Ukwu ahụ na akụkụ ndị ọzọ nile nke nzukọ Setan dị n’elu ala. N’ikpeazụ, Mkpụrụ nke nwanyị Chineke bụ́ Jisọs Kraịst, ga-echipịa Setan, bụ́ agwọ ochie ahụ na-aghọ aghụghọ, “n’isi,” nke ahụ ga-abụkwa ibibi ya kpam kpam wee wezụga ya ruo mgbe ebighị ebi n’ihe omume nile nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Ndị Rom 16:20.
26. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị nyochaa amụma nke dị ná Mkpughe?
26 Olee ụzọ a ga-esi mezuo ihe a nile? Ọ bụ nke a ka e kpugheere anyị n’akwụkwọ Bible bụ Mkpughe. E kpugheere anyị nke a n’otu usoro nke ọhụụ dị iche iche, ndị e mere ka ha pụta ìhè site n’ihe àmà ma ọ bụ ihe atụ ndị na-akpali akpali. Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi nyochaa amụma nke a dị oké ike. N’ezie, anyị ga-abụ ndị obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị anụ ma debekwa okwu nile nke Mkpughe! Site n’ime otú a, anyị ga-ekere òkè n’iwetara aha Eze Onyenwe anyị bụ Jehova otuto, wee nwetakwa ngọzi ebighị ebi ya nile. Biko gụrụ gaa n’ihu, jirikwa amamihe tinye ihe ị mụtara n’ọrụ. Ọ pụrụ ịbụrụ gị nzọpụta n’oge ọgwụgwụ nke a nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.
Igbe dị na peeji nke 13]
Ihe odide cuneiform oge ochie maka azụmahịa
Akwụkwọ bụ́ Ancient Near Eastern Texts, nke James B. Pritchard lekọtara odide ya, depụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 300 iwu ndị Hammurabi chịkọtara n’oge Babilọn. Ndị a gosiri na ọ dị mkpa ịkatọ akwụbaghị aka ọtọ nke o doro anya na o jupụtara n’ụwa azụmahịa nke oge ndị ahụ. Dị ka ihe atụ: “Ọ bụrụ na onye nọ n’ọkwá dị elu azụta ma ọ bụ nata maka nchebe, ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo ma ọ bụ ohu nwoke ma ọ bụ ohu nwanyị ma ọ bụ oké ehi ma ọ bụ atụrụ ma ọ bụ ịnyịnya ibu ma ọ bụ ụdị ihe ọ bụla site n’aka nwa onye nọ n’ọkwá dị elu ma ọ bụ ohu onye nọ n’ọkwá dị elu n’enweghị onye akaebe na nkwekọrịta e dere ede, ebe ọ bụ na onye ahụ nọ n’ọkwá dị elu bụ onye ohi, a ghaghị igbu ya.”