Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 11 p. 54-58
  • Aha Gị Ọ̀ Dị n’Akwụkwọ nke Ndụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Aha Gị Ọ̀ Dị n’Akwụkwọ nke Ndụ?
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbịa “dị ka Onye Ohi”
  • “Aha Ole na Ole”
  • Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’Ime Akwụkwọ nke Ndụ!
  • Gee Ntị n’Ihe Mmụọ Nsọ Na-ekwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ikpughe Otu Ihe Omimi Dị Nsọ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • “Jidesie Ihe I Nwere Ike”
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 11 p. 54-58

Isi nke 11

Aha Gị Ọ̀ Dị n’Akwụkwọ nke Ndụ?

SADIS

1. Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ ahụ dị na Sadis, oleekwa otú Jisọs si malite ozi ya?

N’EBE dị ihe dị ka 48 kilomita na ndịda nke obodo Akhisar nke oge a (Taịataịra) ka ọgbakọ ọzọ nke natara ozi sitere n’aka Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube dị: Sadis. Na narị afọ nke isii tupu Oge Anyị, obodo nke a bụ isi obodo nke alaeze oge ochie nke Lydia, bụrụkwa ọnọdụ nke oké ọgaranya ahụ bụ Eze Croesus. N’oge Jọn, ihe isi ike adakwasịwo ya, ịdị ebube ya nke oge ochie n’okpuru Croesus aghọwokwa akụkọ nkịtị. N’otu aka ahụ, ọgbakọ ndị Kraịst dị n’ebe ahụ adakpọwokwa n’ime mmụọ. Na nke mbụ ya, Jisọs ejighị okwu ịja mma malite ozi ya, kama nke ahụ, ọ sịrị: “Degakwara mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Sadis akwụkwọ, sị, Ihe ndị a ka ọ na-ekwu, bụ́ onye nwere mmụọ asaa ahụ nke Chineke, na kpakpando asaa ahụ: Amatara m ọrụ gị nile, na i nwere aha na ị dị ndụ, ma ị bụ onye nwụrụ anwụ.”—Mkpughe 3:1.

2. (a) Mkpa dị aṅaa ka ọ dị ndị Kraịst ahụ nọ na Sadis ịmara na Jisọs nwere “mmụọ asaa ahụ”? (b) Gịnị ka e ji mara ọgbakọ Sadis ahụ, ma gịnị bụ ọnọdụ ya n’ezie?

2 Gịnị mere Jisọs ji kọwaa onwe ya dị ka “onye nwere mmụọ asaa ahụ”? N’ihi na mmụọ ndị a nọchiri anya mmụọ nsọ Jehova nke na-erupụta n’ozuzu ya. Jọn mesịrị kọwaakwa ha dị ka “anya asaa,” na-akọwa ikike ịhụ ụzọ nke ọma nke mmụọ nsọ Chineke nyere Jisọs. (Mkpughe 5:6) Otú a, o nwere ike ikpughe ma lebara ọnọdụ ọ bụla pụrụ ịdịnụ anya. (Matiu 10:26; 1 Ndị Kọrint 4:5) A maara ọgbakọ ahụ dị na Sadis dị ka nke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike. Ma Jisọs pụrụ ịhụ na ọ nwụrụ anwụ n’ime mmụọ. Ihe àmà gosiri na ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ọgbakọ ahụ adabaghachiwo n’ọnọdụ enweghị mmasị yiri nke ha nwere tupu ha aghọọ ndị Kraịst.—Tụlee Ndị Efesọs 2:1-3; Ndị Hibru 5:11-14.

3. (a) N’ihi gịnị ka “mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Sadis” kwesịrị iji rịba ama n’ụzọ pụrụ iche na Jisọs nwere “kpakpando asaa ahụ”? (b) Ndụmọdụ siri ike dị aṅaa ka Jisọs nyere ọgbakọ ahụ dị na Sadis?

3 Jisọs chetakwaara “mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Sadis” na ọ bụ Ya onwe ya bụ onye ahụ ji “kpakpando asaa ahụ.” O ji ndị okenye ọgbakọ ndị ahụ n’aka nri ya, na-enwe ikike iduzi ha n’ọrụ ọzụzụ atụrụ ha. Ha kwesịrị ịtụkwasị uche ha ‘n’ịmara ihu ìgwè atụrụ ahụ.’ (Ilu 27:23) N’ihi nke a, ọ ga-akara ha mma ige ntị nke ọma n’ihe ọzọ Jisọs kwuru: “Ghọọ onye na-eche nche, meekwa ka ihe fọdụrụ guzosie ike, bụ́ nke gaje ịnwụ anwụ: n’ihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụworo nke zuworo ezu n’ihu Chineke m. Ya mere, na-echeta otú ị nataworo, ya na otú ị nụrụ; na-edebekwa ya, chegharịakwa. Ya mere, a sị na i cheghị nche, m ga-abịa dị ka onye ohi, ị gaghị amarakwa oge hour m ga-abịakwasị gị ma ọlị.”—Mkpughe 3:2, 3.

4. N’ụzọ dị aṅaa ka okwu Pita ga-esi nyere ọgbakọ ahụ dị na Sadis aka ‘iwusi ihe ndị fọdụrụ ike’?

4 Ọ dị mkpa ka ndị okenye nọ na Sadis cheta ọṅụ ha nwere na mbụ mgbe ha nụrụ eziokwu ahụ na ngọzi ndị ha natara n’oge ahụ. Ma ugbu a, ha anwụwo n’ihe banyere ọrụ ime mmụọ. Oriọna nke ọgbakọ ha na-anyụ anyụ n’ihi na ha adịghị arụ ọrụ okwukwe. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Pita onyeozi degaara ọgbakọ ndị dị n’Esia (nke na-aghaghị ịgụnyeworị Sadis) akwụkwọ ka ha wulite mmasị n’ebe ozi ọma ahụ dị ebube dị, bụ́ nke ndị Kraịst naraworo, nke e kwusawokwara “n’ime mmụọ nsọ e zipụtara n’eluigwe”—dị ka mmụọ asaa ahụ dị n’ọhụụ Jọn nọchiri anya ha. Pita chetakwaara ndị Kraịst ahụ nọ n’Esia na ha so ‘n’ọgbọ ndị ahụ a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka ha wee kwusaa ịdị mma nile nke onye ahụ onye kpọpụtara ha n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè ya dị ebube.’ (1 Pita 1:12, 25; 2:9) Ịtụgharị uche n’eziokwu ime mmụọ ndị dị otú ahụ ga-enyere ọgbakọ ahụ dị na Sadis aka ichegharị, wee “meekwa ka ihe fọdụrụ guzosie ike.”—Tụlee 2 Pita 3:9.

5. (a) Gịnị meworo mmasị nke ndị Kraịst nọ na Sadis? (b) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị Kraịst nọ na Sadis anakwereghị ndụmọdụ Jisọs?

5 Ka ọ dị mgbe ahụ, mmasị na ịhụnanya ha nwere n’eziokwu ahụ yiri ọkụ nke fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ na ọ nyụwo. Nanị unyi ole na ole ka nọ na-acha ọkụ. Jisọs gbara ha ume ka ha fụnwuo ọkụ ahụ, mee ka ọ maliteghachi inwu enwu, chegharịa site ná mmehie nke nlefuru anya ha dubaworo ha na ya, wee ghọghachikwa ọgbakọ nke dị ndụ n’ime mmụọ. (Tụlee 2 Timoti 1:6, 7.) Ma ọ bụghị otú ahụ, mgbe Jisọs bịara na mberede—“dị ka onye ohi”—imezu ihe e kpere n’ikpe, ọgbakọ ahụ dị na Sadis agaghị adị njikere.—Matiu 24:43, 44.

Ịbịa “dị ka Onye Ohi”

6. Jisọs si aṅaa bịa “dị ka onye ohi” na 1918, ọnọdụ dịkwa aṅaa ka ọ hụrụ ndị na-asị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya n’ime ya?

6 Ịdọ aka ná ntị Jisọs nke bụ na ya ga-abịa “dị ka onye ohi” dị irè ruo oge anyị a. O nwere mmetụta pụrụ iche n’ebe ndị Kraịst nọ, bụ́ ndị dịrị ndụ banye n’ime ụbọchị Onyenwe anyị. N’oge na-adịghị anya mgbe 1914 gasịrị, e nwere mmezu nke amụma Malakaị, nke sị: “Onyenwe unu ahụ unu onwe unu na-achọ ga-abịaru ụlọ ukwu ya na mberede; ọbụna onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-atọ unu ụtọ, lee, ọ na-abịa, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Malakaị 3:1; Mkpughe 1:10) Dị ka “onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ,” Jisọs bịara ime nnyocha na ikpe ndị ahụ sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya ikpe. (1 Pita 4:17) N’oge ahụ, na 1918, Krisendọm mikpuru n’ịwụfu ọbara n’Agha Ụwa Mbụ, bụrụkwa nke nwụrụ anwụ kpam kpam n’ụzọ ime mmụọ. Ọbụna ezi ndị Kraịst, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa tupu agha ahụ, banyere n’oge nke ịda mbà n’ime mmụọ. A tụbara ụfọdụ n’ime ndị okenye ha bụ isi n’ụlọ mkpọrọ, ọ fọdụkwara nke nta ka a kwụsị ọrụ nkwusa ahụ kpam kpam. Mgbe mmụọ Jehova metere ndị Kraịst ndị a n’ụra n’afọ so ya, ọ bụghị ha nile dị njikere. Ụfọdụ n’ime ha, dị ka ụmụ agbọghọ nzuzu dị n’ilu Jisọs, adịghị njikere n’ụzọ ime mmụọ maka ihe ùgwù ahụ nke ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na e nwere ọtụtụ ndị, dị ka ụmụ agbọghọ ahụ maara ihe, ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jisọs, nke bụ: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ma ọ bụ oge hour ahụ.”—Matiu 25:1-13.

7. N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Kraịst taa mkpa ịnọ na nche?

7 Mkpa nke ndị Kraịst ịnọ na nche agwụsịghị ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị. N’oké amụma ya banyere “ihe ịrịba ama mgbe ọ bụla a gaje imezu ihe ndị a nile,” Jisọs dọsiri aka ná ntị ike, sị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ . . . Lezienụ anya, mụrụnụ anya, na-ekpekwanụ ekpere: n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ bụ. Ma okwu m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ nile, Na-echenụ nche.” (Mak 13:4, 32, 33, 37) Ee, ruo kpọmkwem oge hour nke a, onye ọ bụla n’ime anyị, ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ n’oké ìgwè mmadụ ahụ, aghaghị ịnọgide na-eche nche, na-alụkwa ọgụ megide ịdaba n’ụra ime mmụọ. Mgbe ụbọchị Jehova bịara na mberede “dị ka onye ohi na-abịa n’abalị,” ka anyị bụrụkwa ndị mụ anya, ka ikpe wee ghara ịma anyị.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3; Luk 21:34-36; Mkpughe 7:9.

8. Olee ụzọ òtù Jọn nke oge a siworo kpalie ndị Chineke ịmụrụ anya n’ime mmụọ?

8 Òtù Jọn nke oge a n’onwe ya nọ na nche banyere mkpa ọ dị ịkpali ndị Chineke ịmụrụ anya n’ime mmụọ. Iji mezuo nke a, ha na-eme ndokwa maka mgbakọ ndị pụrụ iche gburugburu ụwa ọtụtụ ugbo n’afọ. N’otu afọ na-adịbeghị anya gara aga, ngụkọta nke ndị bịara 2,981 mgbakọ distriktị e nwere bụ 10,953,744, e mekwara 122,701 ndị ọhụrụ kwere ekwe baptism. Ruo ihe karịrị otu narị afọ, òtù Jọn ahụ ejiwo magazin Ụlọ Nche na-eme ihe n’ịkpọsa aha na nzube Jehova. Mgbe ha nwesịrị ajọ mkpagbu n’oge agha ụwa abụọ ahụ, Ụlọ Nche kpaliri Ndịàmà Jehova inweghachi ịnụ ọkụ n’obi site n’ibipụta isiokwu ndị dị ka “Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-adịghị Atụ Egwu” (1919), “Ọkpụkpọ Òkù Ime Ihe” (1925), na “Inwe Mmeri Megide Mkpagbu” (1942).

9. (a) Gịnị ka ndị Kraịst nile kwesịrị ịnọ na-ajụ onwe ha? (b) Agbamume dị aṅaa ka Ụlọ Nche nyeworo?

9 Dị ka ọ dị na Sadis, otú ahụkwa ka ọ dị n’ọgbakọ nile taa, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nọgide na-enyocha onwe ha. Anyị nile kwesịrị ịnọgide na-ajụ onwe anyị, sị: Ànyị ‘na-arụzu ọrụ anyị nke ọma’ n’ihu Chineke? N’ekpeghị ndị ọzọ ikpe, ànyị na-ewulite mmụọ nke iji onwe onye chụọ àjà, na-agbalịkwa iji obi anyị nile jeere Chineke ozi n’onwe anyị? N’ikwekọ na nke a, magazin Ụlọ Nche enyewo agbamume site n’ịtụle isiokwu ndị dị ka “Nọgidenụ Na-anwapụta Ihe Unu Onwe Unu Bụ” na “Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị.”a Ebe anyị nwere enyemaka Akwụkwọ Nsọ dị otú ahụ, ka anyị nyochaa onwe anyị nke ọma mgbe anyị na-agbalị iji obi umeala na ekpere na-eje ije n’ikwesị ntụkwasị obi n’ihu Jehova.—Abụ Ọma 26:1-3; 139:23, 24.

“Aha Ole na Ole”

10. Ihe dị aṅaa nke na-agba ume ka Jisọs hụtara n’ime ọgbakọ ahụ dị na Sadis, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta anyị?

10 Okwu ndị ọzọ Jisọs gwara ọgbakọ ahụ dị na Sadis na-enye agbamume dị ukwuu. Ọ sịrị: “Ma i nwere aha ole na ole na Sadis ndị na-emerụghị uwe ha: ha ga-esokwa m na-ejegharị n’ime uwe ọcha; n’ihi na ha bụ ndị kwesịrị. Onye na-emeri emeri ka a ga-egbokwasị uwe ọcha otú a; m gaghị ehichapụkwa aha ya n’ime akwụkwọ nke ndụ nke m ma ọlị, m ga-ekwupụtakwa aha ya n’ihu Nna m, na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.” (Mkpughe 3:4, 5) Ọ̀ bụ na okwu ndị a adịghị akpali anyị iwusi mkpebi anyị ike ịbụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi? Site n’òtù ndị okenye ileghara ihe anya dị ka otu òtù, ọgbakọ dum pụrụ ịdaba n’oké ụra ime mmụọ. Ma, ụfọdụ ndị nọ n’ime ọgbakọ ahụ pụrụ iji obi ike mee mgbalị ịnọgide dị ka ndị Kraịst dị ọcha, ndị na-enweghịkwa ntụpọ, wee si otú a nọgide na-enwe ezi aha n’ebe Jehova nọ.—Ilu 22:1.

11, 12. (a) Ọbụna n’oge oké ndapụ n’ezi ofufe ahụ, olee otú ụfọdụ ndị ga-esiworị dị ka “aha ole na ole” ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na Sadis? (b) Nnapụta dị aṅaa bịaara ndị Kraịst yiri ọka n’ime ụbọchị Onyenwe anyị?

11 Ee, “uwe” ndị ahụ na-ezo aka n’ọmụma a maara onye Kraịst dị ka onye ezi omume. (Tụlee Mkpughe 16:15; 19:8.) Ọ ga-abụwororịị Jisọs ihe obi ụtọ ịhụ na, n’agbanyeghị enweghị mmasị nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ, “aha ole na ole,” ya bụ ndị Kraịst e tere mmanụ ole na ole na Sadis, ka na-agbalị ijigide ihe nke a e ji mara ha. N’otu aka ahụ, mgbe Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, dọbatara ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst n’ime ya n’ime ọtụtụ narị afọ nke ndapụ n’ezi ofufe ahụ, a ghaghị inweworị mmadụ ole na ole ndị gbalịrị, n’agbanyeghị oké mmegide, ime uche Jehova. Ha bụ ndị ezi omume dị ka ọka nke e zobere n’etiti ìgwè òtù dị iche iche ndị yiri ata.—Mkpughe 17:3-6; Matiu 13:24-29.

12 Jisọs kwere nkwa na ya ga-anọnyere ndị Kraịst ndị a yiri ọka “ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” Ọ maara ndị ha bụ na aha ọma ha mewooro onwe ha. (Matiu 28:20; Eklisiastis 7:1) Cheedị nnọọ echiche ọṅụ mmadụ “ole na ole” ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ga-enweworị, bụ́ ndị dị ndụ ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị ahụ! E mesịrị kewapụ ha n’ebe Krisendọm nwụrụ anwụ n’ime mmụọ dị, chịkọtakwa ha baa n’ọgbakọ ezi omume nke yiri nnọọ ọgbakọ ahụ dị na Smụana.—Matiu 13:40-43.

13. Ngọzi dịgasị aṅaa na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị “na-emerụghị uwe ha”?

13 Ndị ahụ nọ na Sadis, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ, ndị na-emetọghịkwa ihe e ji mara ha dị ka ndị Kraịst na-enweta mmezu nke olileanya dị ebube. Mgbe e guzobesịrị Alaeze Mesaịa nke Jisọs na 1914, a na-akpọlite ha gaa ná ndụ dị ka mmụọ, dịkwa ka ndị na-enwe mmeri, a na-eyikwasị ha uwe ọcha dị ka ihe nnọchianya nke ezi omume ha na-enweghị ntụpọ. Ebe ha jeworo ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduje ná ndụ, ha ga-enweta nkwụghachi ụgwọ ebighị ebi.—Matiu 7:14; leekwa Mkpughe 6:9-11.

Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’Ime Akwụkwọ nke Ndụ!

14. Gịnị bụ “akwụkwọ nke ndụ” ahụ, aha olee ndị kwa ka e debara n’ime ya?

14 Gịnị bụ “akwụkwọ nke ndụ” ahụ, ọ̀ bụkwa aha ole ndị na-adịgide n’ime ya? Akwụkwọ, ma ọ bụ akwụkwọ mpịakọta, nke ndụ ahụ na-ezo aka n’ihe ndekọ nke ndị ohu Jehova ndị ga-anata onyinye nke ndụ ebighị ebi. (Malakaị 3:16) Ná Mkpughe ebe a, e zoro aka kpọmkwem n’aha ndị Kraịst e tere mmanụ. Ma e dekọkwara aha ndị ga-anata ndụ ebighị ebi n’elu ala n’ime ya. Ọzọkwa, a pụrụ ‘ihichapụ’ aha ndị mmadụ n’akwụkwọ ahụ. (Ọpụpụ 32:32, 33) Otú ọ dị, ndị ahụ so n’òtù Jọn ndị aha ha na-adịgide n’akwụkwọ nke ndụ ahụ ruo mgbe ha nwụrụ na-enweta ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (Mkpughe 2:10) Ọ bụ aha ndị a ka Jisọs na-ekwupụta n’ihu Nna ya na n’ihu ndị mmụọ ozi Ya n’ụzọ pụrụ iche. Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ oké ụgwọ ọrụ!

15. Olee otú ndị oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi mee ka e deba aha ha n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ?

15 Oké ìgwè mmadụ ahụ ndị e dekwara aha ha n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ, ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta ná ndụ. Site n’ịnọgide n’okwukwe n’oge nile nke Ọchịchị Puku Afọ Jisọs nakwa n’oge oké ule ahụ nke ga-esochi ya, a ga-eji ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs elu ala kwụghachi ndị a ụgwọ. (Daniel 12:1; Mkpughe 7:9, 14; 20:15; 21:4) Mgbe ahụ, aha ha ga-abanye n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ. N’ịmara ihe e si n’ọnụ mmụọ nsọ kwupụta n’ebe a, ọ̀ bụ na ị dịghị eji ịnụ ọkụ n’obi na-azaghachi n’òkù ahụ Jisọs na-akpọ mgbe mgbe, sị: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst”?—Mkpughe 3:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche, July 15, 2005, na March 15, 2005.

[Foto dị na peeji nke 57]

Ka aha gị dịgide n’akwụkwọ nke ndụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya