Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 24 p. 155-160
  • Ozi Dị Ụtọ ma Na-elukwa Ilu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Dị Ụtọ ma Na-elukwa Ilu
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Égbè Eluigwe Asaa Ahụ
  • Ọgwụgwụ nke Ihe Omimi Ahụ
  • Akwụkwọ ahụ nke A Sagheworo
  • Nwa Akwụkwọ Nta ahụ Taa
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • “Ònye Kwesịrị Ịsaghe Akwụkwọ Ahụ?”
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ihe Omimi nke Chineke—Mmezu Ya Dị Ebube!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ịdị Ebube nke Ocheeze Eluigwe Jehova
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 24 p. 155-160

Isi nke 24

Ozi Dị Ụtọ ma Na-elukwa Ilu

Ọhụụ 6—Mkpughe 10:1–11:19

Isiokwu: Ọhụụ nke akwụkwọ nta ahụ; ahụmahụ ndị e nwere n’ime ụlọ nsọ; ọfụfụ nke opi nke asaa ahụ

Oge mmezu ya: Malite n’oge Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze na 1914 ruo n’oké mkpagbu ahụ

1, 2. (a) Gịnị ka ahụhụ nke abụọ ahụ rụpụtara, oleekwa mgbe a ga-ekwu na ahụhụ nke a agabigawo? (b) Ònye ka Jọn hụrụ ugbu a ka o si n’eluigwe na-arịdata?

AHỤHỤ nke abụọ ahụ akpatawo oké mbibi. O wetaworo Krisendọm na ndị ndú ya ihe otiti, gbuo “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmadụ,” ndị e si otú a kpughee dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 9:15) Jọn aghaghị icheworịị echiche mgbe nke ahụ gasịrị ihe ahụhụ nke atọ ahụ gaje nnọọ iweta. Ma, cheretụdị! Ahụhụ nke abụọ ahụ agwụchabeghị—ọ gaghị agwụcha ruo mgbe anyị ruru n’ihe ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 11:14. Tupu mgbe ahụ, Jọn ga-ahụ ihe omume nke ya onwe ya ga-ekere òkè pụtara ìhè na ya. Ọ malitere site n’ihe dị ebube nke ọ hụrụ:

2 “M wee hụ mmụọ ozi dị ike, ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, nke e gbokwasịworo ya igwe ojii dị ka uwe; eke na ogwurugwu ahụ dịkwa n’isi ya, ihu ya dịkwa ka anyanwụ, ụkwụ ya abụọ dịkwa ka ide ọkụ.”—Mkpughe 10:1.

3. (a) Ònye bụ ‘mmụọ ozi ahụ siri ike’? (b) Gịnị ka eke na ogwurugwu ahụ dị n’isi ya sere onyinyo ya?

3 Ònye bụ “mmụọ ozi dị ike” nke a? Ihe àmà gosiri na ọ bụ Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube n’ọnọdụ ọzọ. E ji igwe ojii nke ịbụ onye a na-apụghị ịhụ anya gbokwasị ya, nke na-echetara anyị okwu ndị Jọn buru ụzọ kwuo banyere Jisọs, sị: “Lee, ọ na-abịa, ya na igwe ojii; anya nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya, ndị ahụ ga-ahụkwa ya, bụ́ ndị mara ya ube.” (Mkpughe 1:7; tụlee Matiu 17:2-5.) Eke na ogwurugwu ahụ nke dị n’isi ya na-echetara anyị ọhụụ Jọn buru ụzọ hụ banyere ocheeze Jehova, nke “eke na ogwurugwu dịkwa ocheeze ahụ gburugburu, yiri emerald ma ọ bụrụ na a na-ele ya anya.” (Mkpughe 4:3; tụlee Ezikiel 1:28.) Eke na ogwurugwu ahụ tụrụ aro ịdị jụụ na udo nke dị gburugburu ocheeze Chineke. N’otu ụzọ ahụ, eke na ogwurugwu nke dị n’isi mmụọ ozi ahụ ga-egosipụta ya dị ka onyeozi pụrụ iche nke udo, “Onyeisi Udo” ahụ e buru n’amụma nke Jehova.—Aịsaịa 9:6, 7.

4. Gịnị ka ọ pụtara, bụ́ na (a) ihu mmụọ ozi ahụ siri ike ‘dị ka anyanwụ’? (b) na ụkwụ mmụọ ozi ahụ yiri “ide ọkụ”?

4 Ihu mmụọ ozi ahụ dị ike “dịkwa ka anyanwụ.” Tupu ugbu a, n’ọhụụ ya banyere Jisọs mgbe ọ nọ n’ụlọ nsọ Chineke, Jọn kwuru na ihu Jisọs “dịkwa ka anyanwụ na-amụ n’ike ya.” (Mkpughe 1:16) Jisọs, dị ka “anyanwụ nke ezi omume,” na-eji ọgwụgwọ dị na nku ya na-awara ndị ahụ na-atụ egwu aha Jehova dị ka anyanwụ. (Malakaị 4:2) Ọ bụghị nanị ihu ya, kamakwa ụkwụ mmụọ ozi nke a dị ebube, “dịkwa ka ide ọkụ.” Nguzosi ike ya bụ nke Onye ahụ Jehova nyeworo “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.”—Matiu 28:18; Mkpughe 1:14, 15.

5. Gịnị ka Jọn hụrụ n’aka mmụọ ozi ahụ siri ike?

5 Jọn gara n’ihu na-ahụ ihe: “Ọ na-ejidekwa nwa akwụkwọ nta n’aka ya, nke a sagheworo: o wee tụkwasị ụkwụ aka nri ya n’elu oké osimiri, tụkwasịkwa ụkwụ aka ekpe ya n’elu ala.” (Mkpughe 10:2) Nke a ọ̀ bụ akwụkwọ ọzọ? Ee, ma n’oge ugbu a a kachighị ya akara. Dị ka Jọn, anyị pụrụ ịtụ anya ịhụ mkpughe ndị ọzọ na-akpali akpali n’oge na-adịghị anya. Ma, e bugodị ụzọ gosi anyị ọnọdụ ihe gaje isochi.

6. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na ụkwụ Jisọs na-adịkwasị n’elu ala na n’elu oké osimiri? (b) Olee mgbe Abụ Ọma 8:5-8 mezuru n’ụzọ zuru ezu?

6 Ka anyị laghachi azụ ná nkọwa nke Jisọs. Ụkwụ ya ndị ahụ yiri ọkụ dị n’elu ala na n’elu oké osimiri, bụ́ ndị o nwere ike zuru ezu n’ahụ ha ugbu a. Ọ bụ kpọmkwem dị ka e kwuru ya n’abụ amụma ahụ, sị: “Ị [Jehova] gakwara n’ihu ime ya [Jisọs] ka o jiri ihe nta dị ala n’ebe ndị bụ chi nọ, i wee jiri ebube na ịma mma kpube ya n’isi dị ka okpueze. Ị na-eme ya ka ọ na-achị ọrụ nile nke aka gị abụọ; ihe nile ka i doworo n’okpuru ụkwụ ya abụọ: ewu na atụrụ na ehi, ha nile, ha na anụ ọhịa; nnụnụ eluigwe, na azụ nile nke oké osimiri, ihe ọ bụla nke na-agabiga n’ụzọ nile nke oké osimiri nile.” (Abụ Ọma 8:5-8, NW; leekwa Ndị Hibru 2:5-9.) E mezuru abụ ọma nke a n’ụzọ zuru ezu na 1914, mgbe e dokwasịrị Jisọs n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze Chineke, oge ọgwụgwụ wee malite. Otú a, ihe Jọn hụrụ n’ọhụụ ebe a malitere imezu n’afọ ahụ.—Abụ Ọma 110:1-6; Ọrụ 2:34-36; Daniel 12:4.

Égbè Eluigwe Asaa Ahụ

7. N’ụzọ dị aṅaa ka mmụọ ozi ahụ siri ike si tie mkpu, gịnịkwa ka iti mkpu ya pụtara?

7 Mmụọ ozi ahụ siri ike n’onwe ya mere ihe nke kwụsịtụrụ nkiri Jọn nọ na-ekiri ya: “O [mmụọ ozi ahụ] wee were oké olu tie mkpu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja: mgbe o tiri mkpu, égbè eluigwe asaa wee kwuo olu ha.” (Mkpughe 10:3) Iti oké mkpu dị otú ahụ ga-adọrọ uche Jọn, na-akwado eziokwu ahụ bụ na Jisọs bụ “Ọdụm ahụ nke si n’ebo Juda pụta.” (Mkpughe 5:5) Jọn ga-amatakwa na, mgbe ụfọdụ, a na-ekwukwa na Jehova ‘na-agbọ ụja.’ Jehova ịgbọ ụja mara ọkwa n’ụzọ amụma banyere nchịkọtaghachi nke Israel ime mmụọ na ọbịbịa “ụbọchị Jehova” nke ga-akpata mbibi. (Hosea 11:10; Joel 3:14, 16; Emọs 1:2; 3:7, 8) N’ihi nke ahụ, o doro anya na mkpu yiri nke ọdụm nke mmụọ ozi nke a siri ike na-agba àmà oké ihe omume ndị dị otú ahụ maka oké osimiri na elu ala. Ọ na-akpọku égbè eluigwe asaa ahụ ikwu okwu.

8. Gịnị bụ ‘olu nke égbè eluigwe asaa ahụ’?

8 Jọn ebuworị ụzọ nụ ụda égbè eluigwe ndị sitere kpọmkwem n’ocheeze Jehova. (Mkpughe 4:5) Laa azụ n’oge Devid, a na-ekwu okwu banyere égbè eluigwe mgbe ụfọdụ dị ka “olu Jehova.” (Abụ Ọma 29:3) Mgbe Jehova kwupụtara n’olu dara ụda nzube ya maka inye aha ya onwe ya otuto n’oge ije ozi elu ala nke Jisọs, nye ọtụtụ ndị, o yiri ụda égbè eluigwe. (Jọn 12:28, 29) N’ihi nke a, ọ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na ‘olu égbè eluigwe asaa ndị ahụ’ bụ nkwupụta ndị Jehova mere maka nzube ya. Eziokwu ahụ bụ na e nwere égbè eluigwe “asaa” na-ezo aka n’izu ezu nke ihe Jọn nụrụ.

9. Iwu dị aṅaa ka otu olu sitere n’eluigwe na-enye ugbu a?

9 Ma, gee ntị! Olu ọzọ na-adapụta. Ọ na-enye iwu nke na-aghaghị ịtụworị Jọn n’anya: “Ma mgbe égbè eluigwe asaa ahụ kwuru okwu, agaje m ide akwụkwọ: m wee nụ olu si n’eluigwe daa, sị, Kaa ihe égbè eluigwe asaa ahụ kwuru akara, edekwala ha n’akwụkwọ.” (Mkpughe 10:4) Jọn aghaghị ijiworị ịnụ ọkụ n’obi na-echere ịnụ na idetu ihe égbè eluigwe ndị ahụ kwuru, dị ka òtù Jọn ahụ jiworo ịnụ ọkụ n’obi chere taa ka Jehova kpughee nzube nsọ ya ndị a ga-ebipụta n’akwụkwọ. Mkpughe ndị ahụ na-abịa nanị n’oge Jehova kara aka.—Luk 12:42; leekwa Daniel 12:8, 9.

Ọgwụgwụ nke Ihe Omimi Ahụ

10. Ònye ka mmụọ ozi ahụ siri ike ji ṅụọ iyi ugbu a, nkwupụta okwu dị aṅaa ka ọ ṅụkwara iyi banyere ya?

10 Ka ọ dị ugbu a, Jehova nwere ọrụ ọzọ ọ gaje inye Jọn. Mgbe égbè eluigwe asaa ahụ dasịworo, mmụọ ozi ahụ siri ike kwuru okwu ọzọ: “Mmụọ ozi ahụ, nke m hụrụ ka ọ na-eguzo n’elu oké osimiri na n’elu ala, wee welie aka nri ya zoo n’eluigwe, wee were Onye ahụ nke na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi, bụ́ onye kere eluigwe na ihe nile dị ya n’ime, na ụwa na ihe nile dị ya n’ime, na oké osimiri na ihe nile dị ya n’ime, ṅụọ iyi na [“igbu,” NW] oge agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 10:5, 6) Ònye ka mmụọ ozi ahụ dị ike ji ṅụọ iyi? Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube ejighị onwe ya ṅụọ iyi, kama ọ bụ Ikike ahụ kasị ihe nile elu, Jehova, bụ́ Onye Okike ahụ na-adịghị anwụ anwụ nke kere eluigwe na ala. (Aịsaịa 45:12, 18) Mmụọ ozi ahụ ji iyi nke a ọ ṅụrụ mesie Jọn obi ike na Chineke agajeghịkwa igbu oge ọzọ.

11, 12. (a) Gịnị ka ọ pụtara bụ na “[igbu] oge agaghị adịkwa ọzọ”? (b) Gịnị ka e wetara ná mmezu ya?

11 Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘igbu oge’ bụ khroʹnos, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “oge.” N’ihi nke a, ụfọdụ echewo na e kwesịrị ịsụgharị okwu mmụọ ozi nke a ịbụ: “Oge agaghị adịkwa ọzọ,” dị ka à ga-asị na oge ga-agwụsị dị ka anyị si mara ya. Ma n’ebe a, e jighị okwu ọ bụla na-ezo ihe aka kpọmkwem mee ihe banyere okwu ahụ bụ khroʹnos. N’ihi ya, ọ naghị ezo aka n’oge n’ụzọ bụ isi, kama ọ na-ekwu banyere “otu oge” ma ọ bụ “otu ogologo oge.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a gajeghị inwe ogologo oge ọzọ (ma ọ bụ, igbu oge) n’ebe Jehova nọ. Otu ngwaa Grik e sitere n’okwu ahụ bụ khroʹnos nweta ka e jikwa mee ihe ná Ndị Hibru 10:37, ebe Pọl, n’ihota okwu site na Habakuk 2:3, 4, dere na “onye ahụ . . . ga-abịa, ọ gaghị anọkwa ọdụ.”

12 “[Igbu] oge agaghị adịkwa ọzọ”—lee nnọọ ka okwu ndị a si adọrọ mmasị òtù Jọn ahụ nke maliteworo ime agadi taa! N’echiche dị aṅaa ka a na-enweghị igbu oge? Jọn na-akọrọ anyị, sị: “Ma n’ụbọchị nke olu mmụọ ozi nke asaa ahụ, mgbe ọ gaje ịfụ opi, a ga-emekwa ka ihe omimi nke Chineke zuo okè, dị ka o ziri ozi ọma nye ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma ya.” (Mkpughe 10:7) Oge Jehova eruwo iweta ihe nzuzo ya ná ngwụsị obi ụtọ ya, na-enwe ihe ịga nke ọma dị ebube!

13. Gịnị bụ ihe omimi nke Chineke?

13 Gịnị bụ ihe nzuzo nke a? O metụtara mkpụrụ ahụ nke e kwere nkwa ya nke mbụ n’Iden, nke bụ, n’ụzọ bụ isi, Jisọs Kraịst. (Jenesis 3:15; 1 Timoti 3:16) O metụtakwara onye nwanyị ahụ bụ, onye Mkpụrụ ahụ ga-esi na ya pụta. (Aịsaịa 54:1; Ndị Galetia 4:26-28) Ọzọkwa, e jikọtakwara ndị bụ akụkụ nke abụọ nke òtù mkpụrụ ahụ nakwa Alaeze ahụ nke Mkpụrụ ahụ na-achị achị n’ime ya. (Luk 8:10; Ndị Efesọs 3:3-9; Ndị Kọlọsi 1:26, 27; 2:2; Mkpughe 1:5, 6) A ghaghị ikwusa ozi ọma banyere Alaeze eluigwe nke a pụrụ iche n’elu ụwa dum n’oge ọgwụgwụ a.—Matiu 24:14.

14. Gịnị mere e ji jikọta ahụhụ nke atọ na Alaeze Chineke?

14 O doro anya na nke a bụ ozi kasị mma. Ma, ná Mkpughe 11:14, 15, e jikọtara ahụhụ nke atọ na Alaeze ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na nye ihe a kpọrọ mmadụ ndị họọrọ usoro ihe nke Setan, nkwupụta nke ozi ọma ahụ nke bụ na e wetawo ihe omimi ahụ nke Chineke ná ngwụsị—ya bụ, na Alaeze Mesaịa nke Chineke abịawo—bụ ozi na-eweta ahụhụ. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 2:16.) Ọ pụtara na ndokwa ụwa nke ha nwere mmasị dị ukwuu na ya adịwo nnọọ nso mbibi ya. Olu nke égbè eluigwe asaa ahụ, ndị na-eweta ịdọ aka ná ntị oké ifufe dị otú a, na-apụtawanye ìhè, na-adawanyekwa ụda ka oké ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova na-abịa nso.—Zefanaịa 1:14-18.

Akwụkwọ ahụ nke A Sagheworo

15. Gịnị ka olu ahụ sitere n’eluigwe na mmụọ ozi ahụ siri ike gwara Jọn, mmetụta dị aṅaa ka o nwekwara n’ahụ Jọn?

15 Mgbe Jọn nọ na-echere ka a fụọ opi nke asaa nke a nakwa ka e mezuo ihe omimi nke Chineke, e nyere ya ọrụ ọzọ: “Olu ahụ nke m nụrụ ka ọ na-esi n’eluigwe daa, anụkwara m ya ọzọ ka ọ na-akpanyere m ụka, sị, Jee, nara akwụkwọ ahụ nke a sagheworo, bụ́ nke dị n’aka mmụọ ozi ahụ onye na-eguzo n’elu oké osimiri na n’elu ala. M wee jekwuru mmụọ ozi ahụ, sị ya ka o nye m nwa akwụkwọ nta ahụ. O wee sị m, Nara ya, ripịakwa ya; ọ ga-emekwa ka afọ gị luo ilu, ma n’ọnụ gị ọ ga-atọ ụtọ dị ka mmanụ aṅụ. M wee nara nwa akwụkwọ nta ahụ n’aka mmụọ ozi ahụ, wee ripịa ya; o wee tọọ ụtọ n’ọnụ m dị ka mmanụ aṅụ: mgbe m ripịasịrị ya, e wee mee ka afọ m luo ilu. Ha na-asịkwa m, Ị ghaghị ibu amụma ọzọ banyere ọtụtụ ndị na ọtụtụ mba na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ eze.”—Mkpughe 10:8-11.

16. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Ezikiel onye amụma si nwee ahụmahụ yiri nke Jọn? (b) N’ihi gịnị ka nwa akwụkwọ nta ahụ ji tọọ ụtọ n’ọnụ Jọn ma luo ilu n’ime afọ ya?

16 Ahụmahụ Jọn yiri nnọọ nke Ezikiel onye amụma nwere n’oge o bi n’ebe a chụlagara ya na Babylonia. E nyekwara ya iwu ka o rie otu akwụkwọ nke tọrọ ụtọ n’ọnụ ya. Ma mgbe ọ banyere ya n’afọ, e mere ka ọ bụrụ ibu ọrụ dịkwasịrị ya ibu amụma ihe ndị na-elu ilu nye ụlọ nnupụisi nke Israel. (Ezikiel 2:8–3:15) Akwụkwọ ahụ nke a sagheworo nke Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube nyere Jọn bụkwa ozi sitere n’aka Chineke. Jọn gaje ikwusa ozi banyere “ọtụtụ ndị na ọtụtụ mba na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ eze.” Iri akwụkwọ nke a dị ụtọ nye ya n’ihi na o sitere n’aka Chineke. (Tụlee Abụ Ọma 119:103; Jeremaịa 15:15, 16.) Ma ọ chọpụtara na ọ bụ ihe dị ilu n’afọ ya n’ihi na—dịkwa ka ọ dịrị Ezikiel tupu mgbe ahụ—o buru amụma ihe ndị na-adịghị ụtọ nye mmadụ ndị na-enupụ isi.—Abụ Ọma 145:20.

17. (a) Olee ndị gwara Jọn ka o buo amụma “ọzọ,” gịnịkwa ka nke a pụtara? (b) Olee mgbe a ga-emezu ihe nkiri nke a Jọn hụrụ?

17 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị na-agwa Jọn ka o buo amụma ọzọ bụ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Jọn, ọ bụ ezie na ọ nọ n’ebe a chụlagara ya n’agwaetiti Patmọs, ebuworịị amụma banyere ọtụtụ ndị, ọtụtụ mba, ọtụtụ asụsụ, na ọtụtụ ndị eze site n’ihe ndị e dekọworo ruo ugbu a n’ime akwụkwọ Mkpughe. Okwu ahụ bụ “ọzọ” pụtara na ọ ghaghị ide ma kpọsaa ihe ndị ọzọ e dekọrọ n’akwụkwọ Mkpughe. Ma cheta na n’ebe a, Jọn na-ekere òkè kpọmkwem n’ọhụụ amụma ahụ. Ihe o dekọrọ bụ n’ezie amụma nke gaje imezu mgbe 1914 gasịrị, mgbe mmụọ ozi ahụ siri ike weere ọnọdụ ya n’ịzọkwasị ụwa na oké osimiri ụkwụ. N’ihi nke a, gịnị ka oké ihe ngosi nke a pụtaara òtù Jọn ahụ taa?

Nwa Akwụkwọ Nta ahụ Taa

18. Ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị, mmasị dị aṅaa ka òtù Jọn ahụ nwere n’akwụkwọ Mkpughe?

18 Ihe Jọn hụrụ sere onyinyo ahụmahụ nke òtù Jọn ahụ nwere ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị. Nghọta ha ghọtara nzube Jehova, gụnyere ihe égbè eluigwe asaa ahụ pụtara, ezughi ezu n’oge ahụ. Otú ọ dị, ha nwere mmasị dị omimi ná Mkpughe, Charles Taze Russell ekwuwokwa okwu n’ọtụtụ akụkụ dị n’ime ya n’oge ndụ ya. Mgbe ọ nwụsịrị na 1916, a chịkọtara ọtụtụ n’ihe ndị o dere wee bipụta ha n’otu akwụkwọ nke aha ya bụ The Finished Mystery. Ma mgbe oge na-aga, akwụkwọ a ghọrọ ihe na-adịghị eju afọ dị ka nkọwa nke Mkpughe. Ihe fọdụrụ n’ụmụnna Kraịst aghaghị icheretụ nwa oge nta ka e wee nweta nghọta ziri ezi nke ihe ahụ e dekọrọ n’ike mmụọ nsọ.

19. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova Chineke si jiri òtù Jọn ahụ mee ihe ọbụna tupu a nụzuo olu égbè eluigwe asaa ahụ? (b) Olee mgbe e nyere òtù Jọn ahụ akwụkwọ nta ahụ a sagheworo, gịnịkwa ka nke a pụtaara ha?

19 Otú ọ dị, dị ka Jọn, Jehova jiri ha mee ihe ọbụna tupu e bipụtazuo olu égbè eluigwe asaa ahụ. Ha etinyewo mgbalị dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ruo 40 afọ tupu 1914, ha agbalịsiwokwa ike ịnọgide n’ọrụ n’oge agha ụwa mbụ ahụ. Ha egosipụtawo onwe ha ịbụ ndị ahụ ndị, mgbe onyenwe ha bịarutere, a hụrụ ka ha na-enye ezinụlọ ya nri ha n’oge kwesịrị ya. (Matiu 24:45-47) Otú a, na 1919 ọ bụ ha ka e nyere nwa akwụkwọ nta ahụ a sagheworo—ya bụ, ozi a na-akachighị akara ije kwusaara ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka Ezikiel, ha nwere ozi ha ga-ezijere otu nzukọ na-ekwesịghị ntụkwasị obi—Krisendọm—nke na-azọrọ na ya na-efe Chineke ma, n’ezie, na-adịghị eme otú ahụ. Dị ka Jọn, ha rụkwuru ọrụ nkwusa banyere “ọtụtụ ndị na ọtụtụ mba na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ eze.”

20. Gịnị ka oriri Jọn riri akwụkwọ ahụ sere onyinyo ya?

20 Oriri Jọn riri akwụkwọ ahụ sere onyinyo na ụmụnna Jisọs nakweere ọrụ ahụ. Ọ banyere n’ime ha ruo n’ókè na ihe e jizi mara ha ugbu a bụ akụkụ nke a nke Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, site na ya na-enweta ọzụzụ. Ma ihe ha gaje ikwusa nwere nkwupụta nke ihe Jehova kpere n’ikpe bụ́ ndị na-agaghị atọ ọtụtụ mmadụ ụtọ. N’ezie, ọ gụnyere ihe otiti ndị ahụ e buru amụma ha ná Mkpughe isi nke 8. Otú ọ dị, ọ bụ ihe dị ụtọ nye ndị Kraịst ahụ nwere obi eziokwu ịmara ihe ndị ahụ e kpere n’ikpe, ịghọtakwa na Jehova na-ejikwa ha eme ihe ọzọ n’ikwusa ihe ndị a.—Abụ Ọma 19:9, 10.

21. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ozi dị n’ime akwụkwọ ahụ siworo dịkwa ụtọ nye oké ìgwè mmadụ ahụ? (b) N’ihi gịnị ka ozi ọma ahụ ji bụrụ ozi ọjọọ nye ndị mmegide?

21 Ka oge na-aga, ozi dị n’akwụkwọ a ghọkwara ihe na-atọ ụtọ nye “oké ìgwè mmadụ, . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile,” bụ́ ndị a chọpụtara na ha na-asụ ude n’ihi ihe rụrụ arụ nile ha hụrụ a na-eme n’ime Krisendọm. (Mkpughe 7:9; Ezikiel 9:4) Ndị a rụsikwara ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma ahụ, na-eji okwu dị ụtọ, dịkwa amara na-eme ihe ịkọwa oké ndokwa nile Jehova meere ndị Kraịst yiri atụrụ. (Abụ Ọma 37:11, 29; Ndị Kọlọsi 4:6) Ma n’ebe ndị mmegide nọ, nke a bụ ozi ọjọọ. N’ihi gịnị? Ọ pụtara na usoro ihe nke ha tụkwasịrị obi—nke ọ pụkwara ịbụ na o wetaworo ha afọ ojuju na-adịru nwa oge—aghaghị ịgabiga. Nye ha, ozi ọma ahụ na-ama ọkwa mbibi.—Ndị Filipaị 1:27, 28; tụlee Deuterọnọmi 28:15; 2 Ndị Kọrint 2:15, 16.

[Foto ndị dị na peeji nke 160]

Òtù Jọn na ndị na-esonyere ha na-ekwusa ozi na-atọ ụtọ ma na-elukwa ilu nye ihe nile a kpọrọ mmadụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya