Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 41 p. 295-300
  • Ụbọchị Ikpe nke Chineke—Ihe Ọṅụ nke Ga-esi na Ya Pụta!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị Ikpe nke Chineke—Ihe Ọṅụ nke Ga-esi na Ya Pụta!
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụbọchị Ikpe ahụ nke Dị Otu Puku Afọ
  • Olee Ndị Ka A Ga-akpọlite ma Kpee Ha Ikpe?
  • Akwụkwọ nke Ndụ
  • Imeghe Akwụkwọ Ndị Ọzọ
  • Ọgwụgwụ nke Ọnwụ na Hedis
  • Ụbọchị Ikpe—Gịnị Ka Ọ Bụ?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Aha Gị Ọ̀ Dị “n’Akwụkwọ nke Ndụ”?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • “A Gaje Ime Ka Ọnwụ Ghara Ịdị Irè”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 41 p. 295-300

Isi nke 41

Ụbọchị Ikpe nke Chineke—Ihe Ọṅụ nke Ga-esi na Ya Pụta!

Ọhụụ 15—Mkpughe 20:11–21:8

Isiokwu: Mbilite n’ọnwụ nke ọha mmadụ, Ụbọchị Ikpe, na ngọzi nile nke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ

Oge mmezu ya: Ọchịchị Puku Afọ ahụ

1. (a) Gịnị fụnahụrụ ihe a kpọrọ mmadụ mgbe Adam na Iv mehiere? (b) Nzube dị aṅaa nke Chineke ka a na-agbanwebeghị, ànyị sikwa aṅaa mara?

DỊ KA ụmụ mmadụ, e kere anyị ka anyị dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. A sị na Adam na Iv rubeere iwu Chineke isi, ha agaraghị anwụ anwụ ma ọlị. (Jenesis 1:28; 2:8, 16, 17; Eklisiastis 3:10, 11) Ma mgbe ha mehiere, ha tụfuru izu okè na ndụ nke onwe ha na nke ụmụ ha, ọnwụ wee malite ịchị achị n’elu ihe a kpọrọ mmadụ dị ka onye iro ike na-adịghị agwụ. (Ndị Rom 5:12, 14; 1 Ndị Kọrint 15:26) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, nzube Chineke inwe ụmụ mmadụ zuru okè ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs agbanweghị. N’ihi oké ịhụnanya o nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, o zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs, onye nyere ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta maka “ọtụtụ mmadụ” n’etiti ụmụ Adam. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Ugbu a, Jisọs pụrụ iji uru àjà ya nke a iwu kwadoro mee ihe iji weghachi ụmụ mmadụ kwere ekwe ná ndụ nke izu okè n’elu ala bụ paradaịs. (1 Pita 3:18; 1 Jọn 2:2) Lee nnọọ oké ihe nke a bụ nke ụmụ mmadụ ga-eji n’ihi ya “tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa”!—Aịsaịa 25:8, 9.

2. Gịnị ka Jọn kọrọ ná Mkpughe 20:11, gịnị bụkwa “oké ocheeze dị ọcha” ahụ?

2 Mgbe e mechibidoworo Setan n’ime abyss ahụ, Ọchịchị Puku Afọ ahụ dị ebube nke Jisọs ga-amalite. “Ụbọchị” ahụ eruwo ugbu a mgbe Chineke “ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu nwoke ọ kara aka.” (Ọrụ 17:31; 2 Pita 3:8) Jọn kwupụtara, sị: “M wee hụ oké ocheeze dị ọcha, na onye na-anọkwasị ya, onye ụwa na eluigwe gbapụrụ n’ihu ya; a hụghịkwa ebe ọ bụla nye ha.” (Mkpughe 20:11) Gịnị bụ “oké ocheeze dị ọcha” nke a? Ọ dịghị ihe ọzọ ọ pụrụ ịbụ ma e wezụga ocheeze ikpe nke “Chineke, bụ́ Onyeikpe ọha mmadụ.” (Ndị Hibru 12:23) Ugbu a, ọ gaje ikpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe iji chọpụta ndị ga-erite uru site n’àjà mgbapụta Jisọs.—Mak 10:45.

3. (a) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ nke bụ na ocheeze Chineke bụ “oké ocheeze,” na ọ dịkwa “ọcha”? (b) Ònye ga-ekpe ikpe n’Ụbọchị Ikpe ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihe ndabere dị aṅaa?

3 Ocheeze Chineke bụ “oké ocheeze,” na-emesi ike ịdị ebube nke Jehova dị ka Eze nke bụ Onyenwenụ, ọ dịkwa “ọcha,” na-adọrọ uche gaa n’ezi omume ya na-enweghị ntụpọ ọ bụla. Ọ bụ Onyeikpe kasị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 19:7-11; Aịsaịa 33:22; 51:5, 8) Otú ọ dị, ọ rarawo ọrụ ikpe ikpe nye Jisọs Kraịst: “Nna m adịghị ekpekwa mmadụ ọ bụla ikpe, kama o werewo ikpe nile nye Ọkpara ya.” (Jọn 5:22) Jisọs na 144,000 ndị òtù ya nọ, bụ́ ndị ‘e nyeworo ike ikpe ikpe ruo otu puku afọ.’ (Mkpughe 20:4) Ọbụna otú ahụ, ọ bụ ụkpụrụ nile nke Jehova ga-ekpebi ihe ga-eme onye ọ bụla n’otu n’otu n’ime Ụbọchị Ikpe ahụ.

4. Gịnị ka ọ pụtara na “ụwa na eluigwe gbapụrụ”?

4 Ò si aṅaa bụrụ na “ụwa na eluigwe gbapụrụ”? Nke a bụ otu eluigwe ahụ nke e kewapụrụ dị ka akwụkwọ odide n’oge e meghere akara nke isii ahụ—ndị ike ọchịchị bụ mmadụ ndị “a kpadoworo nye ọkụ . . . a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (Mkpughe 6:14; 2 Pita 3:7) Ụwa ahụ bụ usoro ihe a haziri ahazi nke na-adị n’okpuru ọchịchị nke a. (Mkpughe 8:7) Mbibi nke anụ ọhịa ahụ na ndị eze nke ụwa na usuu ndị agha ha nile, tinyere ndị ahụ natara akara nke anụ ọhịa ahụ na ndị ahụ na-efe ihe oyiyi ya ofufe, kara akara mgbapụ nke eluigwe na ụwa nke a. (Mkpughe 19:19-21) Ebe e mezuworo ihe e kpere n’ikpe n’isi ụwa na eluigwe nke Setan, Onyeikpe Ukwu ahụ na-ekewapụta Ụbọchị Ikpe ọzọ.

Ụbọchị Ikpe ahụ nke Dị Otu Puku Afọ

5. Mgbe ụwa ochie na eluigwe ochie ahụ gbapụsịrị, olee ndị fọdụrụ ka e kpee ha ikpe?

5 Olee ndị ka ọ fọdụrụ ka e kpee ha ikpe mgbe ụwa na eluigwe ochie ahụ gbapụworo? Ọ bụghị ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke 144,000, n’ihi na e kpeworị ndị a ikpe, kaakwa ha akara. Ọ bụrụ na e nwere ndị e tere mmadụ ka dị ndụ n’elu ala mgbe Amagedọn gasịrị, ha aghaghị ịnwụ n’oge na-adịghị anya wee natakwa nkwụghachi ụgwọ eluigwe ha site ná mbilite n’ọnwụ. (1 Pita 4:17; Mkpughe 7:2-4) Otú ọ dị, ọtụtụ nde ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ndị siworo n’oké mkpagbu ahụ pụta ugbu a na-eguzo n’ebe a na-ahụ ha anya nke ọma “n’ihu ocheeze ahụ.” A gụworị ndị a ná ndị ezi omume ka ha wee lanarị n’ihi okwukwe ha nwere n’ọbara Jisọs nke a wụfuru, ma ikpe ikpe ha aghaghị ịnọgide na-aga n’ihu n’otu puku afọ ahụ dum ka Jisọs nọgidere na-eduzi ha gaa “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” Mgbe ahụ, ebe ha bụworo ndị e weghachiri n’izu okè nke mmadụ, bụrụkwa ndị e leworo ule mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-agụ ha ná ndị ezi omume n’echiche kasị zuo ezu. (Mkpughe 7:9, 10, 14, 17) Ụmụntakịrị ndị dịrị ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ na ụmụ ọ bụla oké ìgwè mmadụ ahụ ga-amụ n’ime Puku Afọ ahụ ga-adịkwa mkpa ka e kpee ha ikpe n’otu ụzọ ahụ n’ime otu puku afọ ahụ.—Tụlee Jenesis 1:28; 9:7; 1 Ndị Kọrint 7:14.

6. (a) Ìgwè mmadụ dị aṅaa ka Jọn hụrụ, gịnịkwa ka e gosiri site n’okwu ahụ bụ “ndị ukwu na ndị nta”? (b) Olee ụzọ o si bụrụ na ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị ahụ nọ ná ncheta nke Chineke?

6 Otú ọ dị, Jọn hụrụ otu ìgwè mmadụ nke hiri nnọọ nne karịa oké ìgwè mmadụ ahụ lanarịrịnụ. Ọ ga-eru ọtụtụ puku nde mmadụ! “M wee hụ ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ; e wee saghee akwụkwọ dị iche iche.” (Mkpughe 20:12a) “Ndị ukwu na ndị nta” gụnyere ma ndị a maara aha ha ma ndị a na-amachaghị aha ha n’etiti ụmụ mmadụ, bụ́ ndị dịworo ndụ, nwụọkwa n’elu ala ebe a n’ime 6,000 afọ gara aga. N’Oziọma ahụ nke Jọn onyeozi dere n’oge na-adịghị anya mgbe o desịrị Mkpughe, Jisọs kwuru banyere Nna ya, sị: “O nyekwara [Jisọs] ike ịrụ ọrụ ikpe, n’ihi na ọ bụ Nwa nke mmadụ. Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:27-29) Lee nnọọ oké ọrụ nke a bụ—imerụ ọnwụ na olili ozu nile wereworo ọnọdụ n’akụkọ ihe mere eme nile! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-eji nwayọọ nwayọọ na-akpọlite ọtụtụ nde ndị a dị ná ncheta nke Chineke ka oké ìgwè mmadụ ahụ—bụ́ ndị dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ ma e jiri ha tụnyere ndị nke ọzọ a—wee nwee ike ilekọta ihe isi ike ndị pụrụ ibilite n’ihi na ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ pụrụ ibu ụzọ chọọ ịgbaso ụzọ ndụ ochie ha, ya na adịghị ike na àgwà ya nile nke anụ ahụ.

Olee Ndị Ka A Ga-akpọlite ma Kpee Ha Ikpe?

7, 8. (a) Akwụkwọ dị aṅaa ka e meghere, gịnị werekwaara ọnọdụ mgbe nke a gasịrị? (b) Olee ndị na-agaghị enwe mbilite n’ọnwụ?

7 Jọn kwukwara, sị: “A saghekwara akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ: e wee kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe nile e dererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche, dị ka ọrụ nile ha si dị. Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha: e wee kpee ha ikpe n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ha si dị.” (Mkpughe 20:12b, 13) Nke a ga-abụ nnọọ oké ihe nkiri! ‘Oké osimiri, ọnwụ, na Hedis’ na-ekerecha òkè, ma rịba ama na okwu ndị a abụghị ihe kwụgasịịrị onwe ha.a Jona, mgbe ọ nọ n’afọ otu azụ, wee si otú a bụrụ na ọ nọ n’ime oké osimiri, kwuru okwu banyere onwe ya dị ka onye nọ na Sheol, ma ọ bụ Hedis. (Jona 2:2, NW) Ọ bụrụ na ọnwụ nke sitere n’Adam ejibido mmadụ, ọ ghaghị ịbụkwa na ọ nọ na Hedis. Okwu amụma ndị a na-emesi anyị obi ike na ọ dịghị onye ọ bụla a ga-elefuru anya.

8 Otú ọ dị, e nwekwara ọnụ ọgụgụ a na-amaghị ama nke ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ na-enweghị nchegharị, bụ́ ndị jụrụ Jisọs na ndị ozi ahụ, ga-eso na nke a, tinyekwara “onye ahụ na-emebi iwu” n’ihe banyere okpukpe, na ndị Kraịst e tere mmanụ ‘ndị dahierenụ.’ (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3; Ndị Hibru 6:4-6; Matiu 23:29-33) Jisọs kwukwara okwu banyere ndị yiri ewu n’oge ọgwụgwụ ụwa, bụ́ ndị ga-abanye “n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya,” ya bụ, “mbibi ebighị ebi.” (Matiu 25:41, 46, NW) Ndị a agaghị enwe mbilite n’ọnwụ!

9. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na a ga-emere ụfọdụ ndị amara pụrụ iche ná mbilite n’ọnwụ ahụ, oleekwa ndị ndị a gụnyere?

9 N’aka nke ọzọ, a ga-emere ndị ụfọdụ amara pụrụ iche ná mbilite n’ọnwụ ahụ. Pọl onyeozi gosiri nke a mgbe ọ sịrị: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ, . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) N’ihe banyere mbilite n’ọnwụ nke elu ala, “ndị ezi omume” ga-agụnye ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe n’oge ochie—Abraham, Rehab, na ọtụtụ ndị ọzọ—ndị a gụrụ dị ka ndị ezi omume iji wee bụrụ ndị enyi nke Chineke. (Jemes 2:21, 23, 25) Ndị ezi omume so n’atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’oge ugbu a ga-esokwa n’otu òtù nke a. O yiri ka à ga-akpọlite ndị a kwesịrị ntụkwasị obi n’akụkụ mmalite nke Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs. (Job 14:13-15; 27:5; Daniel 12:13; Ndị Hibru 11:35, 39, 40) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-ekenye ọtụtụ n’ime ndị ezi omume ndị a bilitere n’ọnwụ ihe ùgwù ndị pụrụ iche n’ilekọta oké ọrụ mweghachi ahụ a ga-arụ n’ime Paradaịs.—Abụ Ọma 45:16; tụlee Aịsaịa 32:1, 16-18; 61:5; 65:21-23.

10. N’ime ndị ahụ ga-ebilite n’ọnwụ, olee ndị bụ “ndị ajọ omume”?

10 Ma, olee ndị bụ “ndị ajọ omume” ahụ e hotara n’Ọrụ Ndị Ozi 24:15? Ndị a ga-agụnye oké ìgwè ihe a kpọrọ mmadụ ndị nwụworo n’ogologo akụkọ ihe mere eme nile, karịsịa ndị ahụ biri ‘n’oge nile nke amaghị ihe.’ (Ọrụ 17:30) N’ihi ebe a mụrụ ha ma ọ bụ oge ha dịrị ndụ n’ime ya, ndị a enweghị ohere ịmụta ihe banyere irubere nzube Jehova isi. Ọzọkwa, a pụrụ inwe ụfọdụ ndị nụrụ ozi nzọpụta ahụ, ma ghara inye nzaghachi zuru ezu n’oge ahụ ma ọ bụ ndị nwụrụ tupu ha enwee ọganihu ruo ná nraranye na ime baptism. Ná mbilite n’ọnwụ ahụ, ọ ga-adị ụdị ndị ahụ mkpa imekwu nhazigharị n’echiche na ụzọ ndụ ha ka ha wee rite uru site n’ohere nke a nke inweta ndụ ebighị ebi.

Akwụkwọ nke Ndụ

11. (a) Gịnị bụ akwụkwọ “nke ndụ” ahụ, ọ̀ bụkwa aha olee ndị ka e dere n’ime akwụkwọ nke a? (b) N’ihi gịnị ka a ga-eji meghee akwụkwọ nke ndụ ahụ n’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ?

11 Jọn kwuru okwu banyere “akwụkwọ nke ndụ.” Nke a bụ ihe ndekọ nke ndị nile ruru eru inweta ndụ ebighị ebi site n’aka Jehova. E debanyewo aha nke ụmụnna Jisọs e tere mmanụ, nke oké ìgwè mmadụ ahụ, na nke ndị nwere okwukwe n’oge ochie, dị ka Mosis, n’ime akwụkwọ nke a. (Ọpụpụ 32:32, 33; Daniel 12:1; Mkpughe 3:5) Ka ọ dịgodị ugbu a, ọ dịbeghị nke ọ bụla n’ime “ndị ajọ omume” ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ndị aha ha banyeworo n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ. Ya mere, a ga-emeghe akwụkwọ nke ndụ ahụ n’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ ka o wee kwe omume ideba aha nke ndị ọzọ ruru eru. Ndị a na-emechaghị deba aha ha n’ime akwụkwọ ahụ ka a ‘ga-atụba n’ime ọdọ ọkụ ahụ.’—Mkpughe 20:15; tụlee Ndị Hibru 3:19.

12. Gịnị ga-ekpebi ma a ga-edenye aha mmadụ n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ e meghere, oleekwa ụzọ Onyeikpe ahụ Jehova họpụtara si setịpụ ihe nlereanya?

12 Ya mere, gịnị ga-ekpebi ma à ga-edeba aha mmadụ n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ e meghere n’oge ahụ? Isi ihe dị mkpa ga-abụ otu ihe ahụ dịkwa n’oge Adam na Iv: irubere Jehova isi. Dị ka Jọn onyeozi degaara ndị Kraịst ibe ya ọ hụrụ n’anya: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:4-7, 17) N’okwu banyere nrubeisi, Onyeikpe ahụ Jehova họpụtara setịpụrụ ihe nlereanya: “Ọ bụ ezie na [Jisọs] bụ Ọkpara, ma ọ mụtara ịṅa ntị ya site n’ahụhụ nile ọ hụrụ; ebe e mesịrị ya ka o zuo okè, o wee ghọọrọ ndị nile na-aṅa ya ntị onye na-ewetara ha nzọpụta ebighị ebi.”—Ndị Hibru 5:8, 9.

Imeghe Akwụkwọ Ndị Ọzọ

13. Olee ụzọ ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ na-aghaghị isi gosipụta nrubeisi ha, ụkpụrụ dịkwa aṅaa ka ha na-aghaghị ịgbaso?

13 Olee ụzọ ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ na-aghaghị isi gosipụta nrubeisi ha? Jisọs n’onwe ya zoro aka n’oké ihe abụọ ahụ e nyere n’iwu, na-asị: “Nke mbụ bụ, Nụrụ, Israel; Onyenwe anyị, bụ́ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu: ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum. Nke abụọ bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mak 12:29-31) E nwekwara ụkpụrụ Jehova ndị e guzobeworo nke ọma, ndị ha na-aghaghị ịgbaso, ndị dị ka ịjụ izu ohi, ikwu okwu ụgha, igbu mmadụ, na ime omume na-adịghị ọcha.—1 Timoti 1:8-11; Mkpughe 21:8.

14. Olee akwụkwọ ndị ọzọ e meghere, gịnị dịkwa n’ime ha?

14 Otú ọ dị, Jọn ka kwutere okwu akwụkwọ ndị ọzọ a ga-emeghe n’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ. (Mkpughe 20:12) Gịnị ka ndị a ga-abụ? Mgbe ụfọdụ, Jehova enyewo ndụmọdụ ndị ụfọdụ kpọmkwem maka ọnọdụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, n’oge Mosis, o nyere usoro iwu ndị zuru ezu, ndị ga-ewetara ndị Israel ndụ ma ọ bụrụ na ha edebe ha. (Deuterọnọmi 4:40; 32:45-47) N’ime narị afọ mbụ ahụ, e nyere ndụmọdụ ọhụrụ iji nyere ndị kwere ekwe aka ịgbaso ụkpụrụ nile nke Jehova n’okpuru usoro nke ndị Kraịst. (Matiu 28:19, 20; Jọn 13:34; 15:9, 10) Ugbu a, Jọn na-akọ na ‘a ga-ekpe ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe nile e dererịị n’akwụkwọ ndị ahụ, dị ka ọrụ nile ha si dị.’ Ya mere, ihe àmà gosiri na mmeghe nke akwụkwọ ndị a ga-akpọsa ihe zuru ezu Jehova chọrọ ihe a kpọrọ mmadụ n’aka n’ime puku afọ ahụ. Site n’itinye ụkpụrụ na iwu nile nke akwụkwọ ndị ahụ n’ọrụ ná ndụ ha, ụmụ mmadụ na-erube isi ga-enwe ike ime ka ndụ ha dịwanye ogologo, wee mesịa nweta ndụ ebighị ebi.

15. Usoro inye ọzụzụ dị aṅaa ga-adị mkpa n’oge mbilite n’ọnwụ ahụ, oleekwa ụzọ o yiri ka mbilite n’ọnwụ ahụ ọ̀ ga-esi gaa?

15 Lee nnọọ ọrụ izi ihe dị ukwuu nke ọchịchị chineke, bụ́ nke ga-adị mkpa ka a rụọ! Na 2005, Ndịàmà Jehova nọ gburugburu ụwa na-eduzi nkezi nke ihe karịrị 6,061,534 ọmụmụ Bible ebe obibi n’ebe dị iche iche. Ma n’oge mbilite n’ọnwụ ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-eduzi ọtụtụ nde ọmụmụ ihe, ndị dabeere na Bible nakwa n’akwụkwọ ọhụrụ ndị ahụ! Ọ ga-adị mkpa ka ndị Chineke nile ghọọ ndị ozizi, na-arụsikwa ọrụ ike. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ahụ bilitere n’ọnwụ, ka ha na-enwe ọganihu, ga-ekerekwa òkè n’oké ọrụ ozizi ihe nke a. O yiri ka à ga-ahazi mbilite n’ọnwụ ahụ n’ụzọ ga-eme ka o kwe omume ndị dị ndụ inwe ọṅụ nke ịnabata ndị ikwu na ndị enyi ha, bụ́ ndị ga-emesịkwa nwee ike ịnabata ma zie ndị ọzọ ihe. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 15:19-28, 58.) Ihe ahụ karịrị nde Ndịàmà Jehova isii ndị na-arụsi ọrụ ike ugbu a n’ịgbasa eziokwu ahụ na-atọ ezi ntọala maka ihe ùgwù ndị ha nwere olileanya inweta n’oge mbilite n’ọnwụ ahụ.—Aịsaịa 50:4; 54:13.

16. (a) Olee ndị ka a na-agaghị edenye aha ha n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ? (b) Olee ndị mbilite n’ọnwụ nke ha ga-abụ “nke ndụ”?

16 N’ihe banyere mbilite n’ọnwụ nke elu ala ahụ, Jisọs sịrị na “ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” N’ebe a, e gosiri ọdịiche dị n’etiti “ndụ” na “ikpe,” na-egosi na ndị ahụ bilitere n’ọnwụ, bụ́ ndị “mere ihe na-adịghị mma” mgbe e zisịworo ha ihe n’Akwụkwọ Nsọ ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ, sitekwa n’akwụkwọ ndị ahụ, bụ ndị a ga-ekpe ikpe ịbụ ndị na-ekwesịghị ịdị ndụ. A gaghị edenye aha ha n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ. (Jọn 5:29) Nke a ga-abụkwa eziokwu banyere onye ọ bụla nke na-agbasobu ụzọ ikwesị ntụkwasị obi ma mesịa, n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, dahie n’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ. A pụrụ ihichapụ aha e hichapụ. (Ọpụpụ 32:32, 33) N’aka nke ọzọ, ndị ji nrubeisi gbasoo ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị ahụ ga-eme ka aha ha dịgide n’ihe ndekọ ahụ, bụ́ akwụkwọ nke ndụ, nọgidekwa na-adị ndụ. Nye ha, mbilite n’ọnwụ ahụ ga-abụ “nke ndụ.”

Ọgwụgwụ nke Ọnwụ na Hedis

17. (a) Ihe omume dị aṅaa nke dị ebube ka Jọn kọwara? (b) Olee mgbe a na-eme ka Hedis tọgbọrọ n’efu? (ch) Olee mgbe a ga-atụba ọnwụ nke sitere n’aka Adam “n’ọdọ ọkụ ahụ”?

17 Jọn gara n’ihu ịkọwa otu ihe dị ebube n’ezie! “E wee tụba ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke abụọ ahụ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ. Ọ bụrụkwa na a hụghị onye ọ bụla ka e dererịị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ ahụ, e wee tụba ya n’ọdọ ọkụ ahụ.” (Mkpughe 20:14, 15) N’ọgwụgwụ nke Ụbọchị Ikpe ahụ nke ga-adịru otu puku afọ, a na-ewepụchasị “ọnwụ na Hedis” kpam kpam. N’ihi gịnị ka nke a ga-eji wee otu puku afọ? Hedis, bụ́ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, ka a na-eme ka ọ tọgbọrọ n’efu mgbe nke ikpeazụ n’ime ndị nọ ná ncheta Chineke bilitere n’ọnwụ. Ma, ruo ogologo oge ndị mmadụ ọ bụla ka nọ na-enwe ntụpọ sitere ná mmehie e ketara eketa, ọnwụ nke sitere n’aka Adam ka dịnyeere ha. Ọ ga-adị mkpa ka ndị nile a kpọlitere n’ọnwụ bịa n’elu ala, tinyekwara oké ìgwè mmadụ ahụ ndị ga-alanarị Amagedọn, rube isi n’ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị ahụ ruo mgbe a ga-ejiworị uru nke àjà mgbapụta Jisọs mee ihe n’iwepụchasị ọrịa, ịka nká, na adịghị ike ndị ọzọ e ketara eketa. Mgbe ahụ, a tụba ọnwụ sitere n’aka Adam, ya na Hedis, “n’ọdọ ọkụ ahụ.” Ha ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi!

18. (a) Olee ụzọ Pọl onyeozi si kọwaa ihe ịga nke ọma nke ọchịchị Jisọs dị ka Eze? (b) Gịnị ka Jisọs ga-eji ezinụlọ mmadụ e mere ka o zuo okè mee? (ch) Olee ihe ndị ọzọ ga-eme n’ọgwụgwụ puku afọ ahụ?

18 Otú a, usoro ihe omume ahụ nke Pọl onyeozi kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint ga-abịaru ná mmezu ya: “N’ihi na [Jisọs aghaghị] ịbụ eze, ruo mgbe Ọ [Chineke] ga-edebeworị ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ [nke sitere n’aka Adam] ghara ịdị irè.” Gịnị ọzọ ga-eme? “Mgbe ọ bụla a ga-edoworị ihe nile n’okpuru ya, mgbe ahụ ka a ga-edo Ọkpara ahụ onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru ya.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jisọs “ga-arara alaeze ya nye n’aka Chineke, onye bụkwa Nna.” (1 Ndị Kọrint 15:24-28) Ee, Jisọs, ebe o meriworo ọnwụ nke sitere n’aka Adam site n’uru nke àjà mgbapụta ya, ga-enyefe ezinụlọ mmadụ nke e mere ka o zuo okè n’aka Nna ya, bụ́ Jehova. Ihe àmà gosiri na ọ bụ n’oge a, ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, ka a ga-atọhapụ Setan, a ga-elekwa ule ikpeazụ ahụ iji kpebie ndị aha ha ga-adịgide n’akwụkwọ nke ndụ ahụ. “Jisienụ ike” ka aha unu soro na ya!—Luk 13:24; Mkpughe 20:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ site n’oké osimiri agaghị agụnye ndị ahụ rụrụ arụ biri n’ụwa, bụ́ ndị lara n’iyi n’Iju Mmiri ahụ nke oge Noa; mbibi ahụ bụ nke zuru ezu, otú ahụkwa ka mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe ga-adị n’oké mkpagbu ahụ.—Matiu 25:41, 46; 2 Pita 3:5-7.

[Foto dị na peeji nke 298]

A pụrụ idebakwa aha nke “ndị ajọ omume” bilitere n’ọnwụ, bụ́ ndị rubere isi n’akwụkwọ ndị ahụ e meghere n’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ n’ime akwụkwọ nke ndụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya