Isi 4
Ọ Dị Ime, ma Ọ Lụbeghị Di
MERI dị ime ọnwa atọ. Ị ga-echeta na o ji oge ọ dị ime ọhụrụ jee leta Elizabet, ma ugbu a, ọ laghachiwo Nazaret. N’oge na-adịghị anya, ọnọdụ ya ga-abụ nke mmadụ nile ga-amata n’obodo nke aka ya. N’ezie, ọ nọ n’ọnọdụ na-akpata nchegbu!
Ihe mere ọnọdụ a ji dị njọ karị bụ na Meri ekwewo nkwa ịghọ nwunye nke onye ọkwa nkà bụ Josef. Ọ matakwara na n’iwu Chineke nyere mba Israel, a ga-eji nkume tụgbuo nwanyị ọ bụla nke mmadụ kwere nkwa ọlụlụ, nke leziri anya kwere ka ya na nwoke ọzọ nwee mmekọahụ. Olee ụzọ ọ ga-esi kọwaara Josef otú o si dịrị ime?
Ebe ọ bụ na Meri anọghị n’ụlọ kemgbe ọnwa atọ, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ na-agụsi Josef agụụ ike ịhụ ya. Mgbe ha zutere, ọ ga-abụ na Meri kọọrọ ya ihe merenụ. Ọ pụrụ ịgbalị ike ya dum ịkọrọ ya na ọ bụ site n’ike mmụọ nsọ Chineke ka ya dị ime. Ma, dị ka ị pụrụ iche, nke a siiri Josef oké ike ikwere.
Josef maara ezigbo aha nke Meri nwere. Ọ ghaghịkwa ịbụ na ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ma, n’agbanyeghị ihe ọ pụrụ ikwu, o yiri ka ọ bụ mmadụ tụwara ya ime. Ọ bụrụgodi otú ahụ, Josef achọghị ka a tụgbuo ya ná nkume ma ọ bụ menye ya ihere n’ihu ọha. Ya mere, o kpebiri ịgba ya alụkwaghịm na nzuzo. N’oge ahụ, a na-ele ndị kwere onwe ha nkwa ọlụlụ anya dị ka ndị lụrụla di na nwunye, ọ ga-adịkwa mkpa ịgba alụkwaghịm ka e wee tọsaa nkwa ọlụlụ ahụ.
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ka Josef ka nọkwa na-atụgharị ihe ndị a n’uche ya, ọ rahụrụ ụra. Mmụọ ozi Jehova bịakwutere ya ná nrọ, wee sị: “Atụla egwu ikuru nwunye gị Meri: n’ihi na ihe nke ọ dị ime ya sitere n’aka mmụọ nsọ. Ọ ga-amụpụtakwa nwa nwoke; ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs; n’ihi na ya onwe ya ga-azọpụta ndị nke ya ná mmehie nile ha.”
Mgbe Josef tetara, o nwere obi ụtọ dị nnọọ ukwuu! N’atụfughị oge, o mere nnọọ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya. Ọ kpọọrọ Meri laa. Ihe omume ihu ọha nke a nọ ọnọdụ ememe agbamakwụkwọ, na-egosi na Josef na Meri aghọwo di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Ma Josef na Meri enweghị mmekọahụ ọ bụla n’oge nile ọ dị ime Jisọs.
Lee! Afọ ime Meri eruwela ọmụmụ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, Josef na-ekukwasị ya n’elu ịnyịnya ibu. Ebee ka ha na-eje, gịnị mere ha ji na-achọ ịga njem mgbe oge ịmụ nwa Meri rurula nnọọ nso? Luk 1:39-41, 56; Matiu 1:18-25; Deuterọnọmi 22:23, 24.
▪ Olee otú obi dị Josef mgbe ọ matara na Meri dị ime, n’ihi gịnịkwa?
▪ Olee otú Josef ga-esi gbaa Meri alụkwaghịm ebe ọ bụ na ha alụbeghị alụ?
▪ Ihe omume ihu ọha dị aṅaa weere ọnọdụ dị ka ememe agbamakwụkwọ Josef na Meri?