Isi 25
Imere Onye Ekpenta Ebere
KA JISỌS na ndị na-eso ụzọ ya anọ na-eleta obodo ndị dị na Galili, akụkọ banyere oké ọrụ ndị ọ na-arụ gbasara n’ebe nile dị n’ógbè ahụ. Akụkọ banyere ihe ndị o meworo wee ruo n’otu obodo ebe e nwere otu nwoke onye na-arịa ọrịa ekpenta. Onye dibịa ahụ bụ Luk kọwara ya dị ka onye “ekpenta jupụtara n’ahụ.” Mgbe o ruru n’ókè dị njọ, ọrịa ọjọọ nke a na-eji nwayọọ nwayọọ na-akwarụsị akụkụ ahụ dị iche iche nke mmadụ. Ya mere, onye ekpenta nke a nọ n’ọnọdụ kwesịrị imere ebere.
Mgbe Jisọs rutere n’obodo ahụ, onye ekpenta ahụ jekwuuru ya. Dị ka Iwu Chineke si dị, onye ekpenta aghaghị ịdị na-eti mkpu iji mee ka ndị mmadụ mara, sị, “Onye rụrụ arụ, onye rụrụ arụ!” iji wee chebe ndị ọzọ irute ya nso, ka ha ghara ibute ọrịa ahụ. Onye ekpenta ahụ wee daa kpuo ihu ya n’ala, rịọkwa Jisọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị na-achọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
Lee nnọọ ụdị okwukwe nwoke ahụ nwere n’ebe Jisọs nọ! Ma, leekwa nnọọ otú ọrịa nke a ga-esiworị mee ka ọ jọọ njọ ile anya! Gịnị ka Jisọs ga-eme? Gịnị ka ị gaara eme? Site n’obi ebere, Jisọs setịpụrụ aka ya wee bitụ nwoke ahụ, wee sị: “Ana m achọ; ka e mee ka ị dị ọcha.” Ozugbo ahụkwa, ekpenta ahụ wee hapụ ya.
Ọ̀ ga-amasị gị ka onye nwere obi ebere dị otú a bụrụ eze gị? Ụzọ Jisọs si mesoo onye ekpenta nke a omume na-emesi anyị obi ike na n’ọchịchị Alaeze Ya, a ga-emezu amụma Bible ahụ, bụ́: “Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.” Ee, mgbe ahụ, Jisọs ga-emezu ọchịchọ obi ya inyere ndị nile e wedara n’ala aka.
Ọbụna tupu ọ gwọọ onye ekpenta ahụ, ozi Jisọs na-akpata oké aṅụrị n’etiti ndị mmadụ. N’imezu amụma Aịsaịa, Jisọs nyere nwoke ahụ ọ gwọrọ iwu ugbu a, sị: “Lezie anya ka ị ghara ịgwa onye ọ bụla okwu ọ bụla.” Ọ gwakwara ya, sị: “Laba, were onwe gị gosi onye nchụàjà, cheekwa n’ihu Chineke ihe banyere ime ka ị dị ọcha nke Mosis nyere n’iwu, ka ọ bụrụ ha àmà.”
Ma nwoke ahụ nwere obi ụtọ nke ukwuu nke na ọ pụghị imechi ọnụ ghara ịkọrọ mmadụ banyere ọrụ ebube ahụ. Ọ pụrụ wee malite ịgbasa ozi ahụ n’ebe nile, ọ ghaghịkwa ịbụ na ọ na-akpali oké mmasị na ọchịchọ ịmatakwu ihe banyere nke a n’etiti ndị mmadụ, nke mere na Jisọs enwekwaghị ike ịbanye n’obodo n’ezoghị ezo. N’ihi ya, Jisọs na-anọ n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ, ebe ndị mmadụ na-ebighị, ndị mmadụ sikwa ebe nile na-abịa ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha dị iche iche. Luk 5:12-16; Mak 1:40-45; Matiu 8:2-4; Levitikọs 13:45; 14:10-13; Abụ Ọma 72:13; Aịsaịa 42:1, 2.
▪ Mmetụta dị aṅaa ka ekpenta pụrụ inwe, oleekwa ihe a chọrọ ka onye ekpenta mee iji mee ka ndị ọzọ mara na ya na-abịa?
▪ Olee otú onye ekpenta si rịọ Jisọs arịrịọ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site ná nzaghachi Jisọs?
▪ Olee otú nwoke ahụ a gwọrọ si ghara irube isi n’ihe Jisọs kwuru, oleekwa ihe ndị si na nke a pụta?