Isi 51
Igbu Mmadụ n’Oge Ememe Ncheta Ọmụmụ
MGBE o nyesịrị ndị ozi ya ntụziaka, Jisọs zipụrụ ha abụọ abụọ gaa n’ókèala ahụ. Eleghị anya e kenyekọrọ ụmụnne ahụ bụ Pita na Andru, dị ka e kenyekọrọ Jemes na Jọn, Filip na Batolomiu, Tọmas na Matiu, Jemes na Tadiọs, Saịmọn na Judas Iskarịọt. Òtù ndị nkwusa isii ahụ kwusara ozi ọma nke Alaeze, jirikwa ọrụ ebube gwọọ ọtụtụ ndị n’ebe ọ bụla ha jere.
Ka ọ dị ugbu a, Jọn Onye Na-eme Baptism ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọwo ebe ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ mgbe ahụ. Ị pụrụ icheta na Jọn ekwupụtawo n’ihu ọha na o zighị ezi ka Herọd Antipas kpọrọ Herọdias, bụ́ nwunye nwanne ya nwoke bụ Filip, ka ọ bụrụzie nwunye ya. Ebe ọ bụ na Herọd Antipas na-asị na ya na-agbaso Iwu Mosis, Jọn kpughere njikọ ịkwa iko nke a n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọ bụ n’ihi nke a ka Herọd ji tụba Jọn n’ụlọ mkpọrọ, eleghị anya site ná nrụgide nke Herọdias.
Herọd Antipas ghọtara na Jọn bụ onye ezi omume ọbụna na-eji obi ụtọ na-ege ya ntị. N’ihi ya, ọ maghị ihe ọ ga-eme. N’aka nke ọzọ, Herọdias kpọrọ Jọn asị, ma na-achọ ụzọ a ga-esi gbuo ya. N’ikpeazụ, ohere ọ na-achọ kemgbe dapụtara.
Ihe fọrọ nke nta tupu Ememe Ngabiga nke afọ 32 O.A., Herọd dokwara oké ememe maka ncheta ọmụmụ ya. Ndị gbakọtara maka ememe ahụ bụ ndị isi ọchịchị Herọd ndị ji ọkwá ukwu, na ndị isi agha, nakwa ndị nnukwu mmadụ si Galili. Ka mgbede ụbọchị ahụ na-aga n’ihu, a kpọbatara Salome, bụ́ nwa agbọghọ nke Herọdias mụtaara di mbụ ya bụ Filip, ka ọ tee egwu n’ihu ndị ọbịa ahụ gbakọtaranụ. Ihe o mere tọrọ ndị ikom gbakọtara ebe ahụ ụtọ nke ukwuu.
Ihe Salome mere tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. Ọ kwupụtara sị, “Rịọ m ihe ọ bụla ị na-achọ, na m ga-enye gị ya.” Ọbụna na ọ ṅụrụ iyi, sị: “Ihe ọ bụla ị ga-arịọ m, m ga-enye gị ya, ruo nkera nke alaeze m.”
Tupu ọ rịọ ihe ọ bụla, Salome jekwuuru nne ya. Ọ jụrụ sị, “Gịnị ka m ga-arịọrọ onwe m?”
Ugbu a ka ohere ahụ dapụtara! Herọdias na-azaghachi ngwa ngwa sị, “Isi Jọn onye na-eme baptism.”
Ozugbo ahụ, Salome gaghachikwuuru Herọd wee rịọ, sị: “Ana m achọ ka i nye m isi Jọn Baptist n’ọkwá ugbu a.”
O wutere Herọd nke ukwuu. Ma n’ihi ndị ahụ ya na ha nọdụrụ ná nri, bụ́ ndị nụworo iyi ọ ṅụrụ, ọ ga-eme ya ihere ịjụ inye ya, ọ bụ ezie na nke a bụ igbu onye na-adịghị ihe o mere. E zijere onye ogbu mmadụ ka o jee n’ụlọ mkpọrọ ozugbo wee mezuo ihe ahụ na-anwụ ibubo n’ahụ. N’oge na-adịghị anya, o butere isi Jọn n’ọkwá, wee bunye ya Salome. Nwa agbọghọ ahụ wee bunyekwa ya nne ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ ihe merenụ, ha bịara bupụ ozu ya ma lie ya, mgbe ahụ ha kọọrọ Jisọs ihe mere.
E mesịa, mgbe Herọd nụrụ otú Jisọs si agwọ ndị mmadụ, na-achụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ, ọ tụrụ egwu, na-eche na Jisọs bụ n’ezie Jọn e si n’ọnwụ kpọlite. Mgbe e mesịrị, o nwere ọchịchọ siri ike ịhụ Jisọs, ọ bụghị iji nụrụ ozi ya, kama iji nwapụta ma ihe ahụ ọ na-atụ egwu ya ọ dị otú ahụ ma ọ bụ na ọ dịghị. Matiu 10:1-5; 11:1; 14:1-12; Mak 6:14-29; Luk 9:7-9.
▪ Gịnị mere e ji tụọ Jọn mkpọrọ, gịnịkwa mere Herọd achọghị igbu ya?
▪ Olee otú Herọdias si mesịa nwee ike ịhụ na e gburu Jọn?
▪ Mgbe ọnwụ Jọn gasịrị, gịnị mere Herọd ji chọọ ịhụ Jisọs?