Isi 54
“Ezi Nri ahụ nke Sitere n’Eluigwe”
ỤBỌCHỊ nke bu ụzọ abụwo n’ezie ụbọchị ọtụtụ ihe mere. Jisọs jiri ọrụ ebube zụọ ọtụtụ puku mmadụ, ma gbanahụ mgbalị ndị mmadụ mere ime ya eze. N’abalị ahụ o jere ije n’elu Osimiri Galili nke na-ama ebili; zọpụta Pita, bụ́ onye malitere imikpu na mmiri mgbe ọ na-eje ije n’elu mmiri ahụ ifufe na-ebugharị; meekwa ka ebili mmiri ahụ dajụọ iji zọpụta ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ ha ghara ikpu ekpu.
N’echi ya, ndị ahụ Jisọs ji ọrụ ebube zụọ n’akụkụ ugwu ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Galili chọtara ya na nso Kapanaum ma na-ajụ, sị: “Olee mgbe ị bịara n’ebe a?” Ka ọ na-abara ha mba, Jisọs sịrị na ha na-achọ ya n’ihi na ha na-atụ anya iri nri ọzọ n’efu. Ọ dụrụ ha ọdụ ịrụ ọrụ, ọ bụghị maka nri nke na-ala n’iyi, kama nri nke na-anọgide ruo ndụ ebighị ebi. Ya mere ndị ahụ jụrụ, sị: “Gịnị kwesịrị ka anyị mee, ka anyị wee rụọ ọru Chineke nile?”
Jisọs kpọtụrụ nanị otu ọrụ aha bụ́ nke kachasị ọrụ nile. Ọ na-akọwa sị, “Nke a bụ ọrụ Chineke, ka unu kwere n’onye ahụ Ya onwe ya zitere.”
Ma ndị ahụ enweghị okwukwe na Jisọs, n’agbanyeghị ọrụ ebube nile ọ rụrụ. Ọbụna n’agbanyeghị ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, ọ bụ ihe ijuanya na ha na-ajụ, sị: “Gịnịkwa ka gị onwe gị na-eme ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama, ka anyị wee hụ, kwerekwa gị? Gịnị ka ị na-arụ? Nna anyị ha riri manna n’ọhịa; dị ka e deworo n’akwụkwọ nsọ, sị, Nri nke sitere n’eluigwe ka o nyere ha ka ha rie.”
N’ịzaghachi arịrịọ ha maka ihe ịrịba ama, Jisọs mere ka o doo anya Ebe ọrụ ebube ọ na-arụ sitere, na-asị: “Ọ bụghị Mosis nyere unu nri ahụ nke sitere n’eluigwe; kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi nri ahụ nke sitere n’eluigwe. N’ihi na nri nke Chineke bụ nke ahụ na-esi n’eluigwe arịdata, nke na-enyekwa ụwa ndụ.”
Ndị ahụ kwuru sị, “Onyenwe anyị, nye anyị nri a mgbe nile.”
Jịsọs na-akọwa sị, “Mụ onwe m bụ nri na-enye ndụ: onye na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya ma ọlị, onye na-ekwerekwa na mụ akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị mgbe ọ bụla. Ma asịrị m unu, na unu ahụwo m, ma unu ekweghị. Ihe nile nke Nna m na-enye m ga-abịakwute m; onye na-abịakwutekwa m m gaghị achụpụ ya ma ọlị. N’ihi na esiwo m n’eluigwe rịdata, ọ bụghị ka m na-eme ihe mụ onwe m na-achọ, kama ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ. Ma nke a bụ ihe onye zitere m na-achọ, ka m ghara ịtụfu ihe ọ bụla n’ime ihe nile o nyeworo m, kama ka m mee ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchi ikpeazụ. N’ihi na nke a bụ ihe Nna m na-achọ, ka onye ọ bụla nke na-ele Ọkpara ya anya, nke na-ekwerekwa na ya, wee nwee ndụ ebighị ebi.”
Na nke a, ndị Juu malitere ịtamu ntamu megide Jisọs n’ihi na ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ nri nke siri n’eluigwe rịdata.” Ọ dịghị ihe ọzọ ha hụrụ n’ime ya ma ọ bụghị na ọ bụ nwa ụmụ mmadụ nkịtị mụrụ, ya mere dị ka ndị Nazaret mere, ha rụrụ ụka, na-asị: “Onye a, ọ́ bụghị Jisọs, nwa Josef, onye anyị onwe anyị maara nna ya na nne ya? Ò si aṅaa kwuo ugbu a, Esiwo m n’eluigwe rịdata?”
Jisọs na-azaghachi sị, “Unu atamula n’etiti onwe unu. Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna nke zitere m adọghị ya: mụ onwe m ga-emekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. E dewo ya n’akwụkwọ ndị amụma, sị, Ha nile ga-abụkwa ndị Chineke [“Jehova,” NW] ziworo ihe. Onye ọ bụla nke nụworo site n’ọnụ Nna m, nke mụtawokwara ihe, ọ na-abịakwute m. Ọ bụghị na mmadụ ọ bụla ahụwo Nna m, ma ọ bụghị onye ahụ nke si n’ebe Chineke nọ pụta, onye ahụ ahụwo Nna m. N’ezie, n’ezie, asị m unu, onye na-ekwere na-enwe ndụ ebighị ebi.”
N’ịgakwu n’ihu, Jisọs kwughachiri, sị: “Mụ onwe m bụ nri nke na-enye ndụ. Nna unu ha riri manna ahụ n’ọhịa, ha wee nwụọ. Nke a bụ nri nke si n’eluigwe rịdata, ka mmadụ wee rie ụfọdụ n’ime ya, gharakwa ịnwụ anwụ. Mụ onwe m bụ nri dị ndụ nke siri n’eluigwe rịdata: ọ bụrụ na mmadụ erie ụfọdụ n’ime nri a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Ee, site n’inwe okwukwe n’ebe Jisọs nọ, bụ́ onye Chineke zitere, ndị mmadụ pụrụ inwe ndụ ebighị ebi. Ọ dịghị manna, ma ọ bụ achịcha ọ bụla ọzọ pụrụ iweta nke ahụ!
O doro anya na nkwurịta okwu banyere nri nke si n’eluigwe rịdata malitere n’oge na-adịghị anya mgbe ndị ahụ chọtasịrị Jisọs na nso Kapanaum. Ma ọ gara n’ihu na-eru ọgwụgwụ ya ka oge na-aga mgbe Jisọs na-ezi ihe n’otu ụlọ nzukọ dị na Kapanaum. Jọn 6:25-51, 59; Abụ Ọma 78:24; Aịsaịa 54:13; Matiu 13:55-57.
▪ Olee ihe ndị meworo tupu okwu Jisọs banyere nri ahụ nke si n’eluigwe?
▪ N’ịdabere n’ihe Jisọs ka mesịrị nnọọ, n’ihi gịnị ka arịrịọ maka ihe ịrịba ama ji bụrụ nke na-ekwesịghị ekwesị ma ọlị?
▪ Gịnị mere ndị Juu ji tamuo megide Jisọs n’ihi na ọ sịrị na ya bụ ezi nri ahụ nke si n’eluigwe?
▪ Ebee ka a nọ nwee nkwurịta okwu banyere nri ahụ nke si n’eluigwe?