Isi 58
Achịcha na Ihe Iko Achịcha ahụ
OKÉ ìgwè ndị mmadụ gbara Jisọs gburugburu na Dikapọlis ahụ. Ọtụtụ ndị si ebe dị anya bịa n’akụkụ mba nke a ndị Jentaịl bijupụtara ige ya ntị, ka ọ gwọọkwa ha ọrụsị ha dị iche iche. Ha buuru nkata ukwu, ma ọ bụ ngịga e ji akwanye ihe oriri dị ka ha na-eme mgbe ọ bụla ha si n’obodo ndị Jentaịl na-agafe.
Ma n’ikpeazụ, Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya wee sị: “Enwere m ọmịiko n’ahụ ìgwè mmadụ a, n’ihi na mụ na ha nọgidere ụbọchị atọ ugbu a, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri: ọ bụrụkwa na ezilaga m ha n’ụlọ ha n’ọnụ efu, ha ga-ada mbà n’ụzọ; ụfọdụ n’ime ha sikwa n’ebe dị anya bịa.”
Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ sị, “Ole ebe ka mmadụ ga-esi pụọ inwe ogbe achịcha inyeju ndị a afọ n’ime ọhịa ebe a?”
Jisos jụrụ, sị: “Ùnu nwere ogbe achịcha ole?”
Ha zaghachiri sị, “Asaa, na azụ nta ole na ole.”
Ka ọ na-agwa ndị ahụ ka ha nọdụ ala, Jisọs naara ogbe achịcha na azụ ndị ahụ, nye Chineke ekele; wee nyawaa ha, malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya. Ha wee kesaakwara ya ndị mmadụ ahụ, ndị sitekwara na ya rijuo afọ. Mgbe e mesịrị tụtụkọsịa nke fọrọ afọ, o juru nkata asaa, ọ bụ eziokwu na ihe ruru 4,000 ndị ikom, tinyekwara ndị inyom na ụmụntakịrị riri ya!
Jisọs zilagara ìgwè mmadụ ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya wee banye n’ụgbọ gafee banye n’ụsọ ebe ọdịda anyanwụ nke Osimiri Galili. N’ebe a, ndị Farisii na ndị òtù okpukpe Sadusii gbalịrị ịnwa Jisọs site n’ịgwa ya ka o nye ha ihe ịrịba ama nke sitere n’eluigwe.
N’ịmata mgbalị ha iji nwaa ya ọnwụnwa, Jisọs na-azaghachi, sị: “Mgbe o ruru anyasị, unu na-asị, Ihu eluigwe ga-adị mma: n’ihi na eluigwe na-acha uhie uhie. N’ụtụtụ unu na-asịkwa, Ihu eluigwe ga-ajọ njọ taa: n’ihi na eluigwe na-acha uhie uhie, gbarụọkwa. Unu maara ịtụle ihu eluigwe, ma unu apụghị ịtụle ihe ịrịba ama nke oge ndị a.”
Site na nke ahụ, Jisọs kpọrọ ha ọgbọ ajọ omume na nke na-akwa iko ma dọọ ha aka ná ntị dị ka ọ dọwororịị ndị Farisii tupu oge ahụ, na a gaghị enye ha ihe ịrịba ama ọ bụla ma ọ bụghị ihe ịrịba ama Jona. Ka ọ na-ahapụ ha, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ wee chee ihu ije Betsaịda n’ugwu ebe ọwụwa anyanwụ nke ụsọ Osimiri Galili. Ka ha nọ na njem ahụ, ndị na-eso ụzọ ya wee chọpụta na ha chefuru iwere achịcha ma e wezụga nanị otu nke ha ji n’ebe ahụ.
N’iburu n’uche nkwurịta okwu ahụ ya na ndị Farisii na ndị Sadusii bụ́ ndị na-akwado Herọd ka nwesịrị, Jisọs dụrụ ọdụ, sị: “Na-elenụ anya, lezienụ anya ihe ndị Farisii, bụ́ ihe na-eko achịcha, na ihe Herọd, bụ́ ihe na-eko achịcha.” O doro anya na ịkpọtụ ihe na-eko achịcha aha mere ka ndị ahụ na-eso ụzọ chee na Jisọs na-ekwu banyere achịcha nke ha chezọrọ iweta, ya mere ha wee malite ịrụrịta ụka n’okwu ahụ. N’ịhụta nghọtahie ha, Jisọs sịrị: “Gịnị mere unu na-ekwurịta n’onwe unu, n’ihi na unu enweghị ogbe achịcha?”
N’oge na-adịbeghị anya, Jisọs ji ọrụ ebube nye ọtụtụ puku ndị mmadụ achịcha, bụ́ ọrụ ebube ikpeazụ nke ọ ka rụsịrị nanị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ tupu mgbe ahụ ma eleghị anya. Ha kwesịrị ịmata na mkpa ya abụghị enweghị achịcha nkịtị. Ọ na-echetaghachiri ha sị, “Ùnu echetaghịkwa? Mgbe m nyawara ogbe achịcha ise nye [puku ndị ikom ise], nkata ole jupụtara n’iberibe ka unu bulitere?”
Ha zaghachiri sị, “Iri na abụọ.”
“Mgbe m nyawara asaa nye [puku ndị ikom anọ], iberibe jupụtara abọ òle ka unu tụtụkọrọ?”
Ha zaghachiri sị, “Asaa.”
Jisọs jụrụ sị, “Ùnu akaghọtaghị? Unu si aṅaa ghara ịtụgharị uche na agwaghị m unu okwu banyere ogbe achịcha? Ma na-ezenụ ihe ndị Farisii na ndị Sadusii, bụ́ ihe na-eko achịcha.”
Ndị na-eso ụzọ ya mesịrị ghọta ihe ọ na-ekwu. Ihe iko achịcha, bụ́ ihe na-eme ka achịcha fụlie elu, bụ okwu a na-ejikarị eme ihe n’igosi mmerụ. Ya mere ugbu a, ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na Jisọs ji okwu ihe atụ mee ihe, na ọ na-adọ ha aka ná ntị ka ha nọrọ na nche megide “ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii,” bụ́ ozizi nke na-emerụ emerụ. Mak 8:1-21; Matiu 15:32–16:12.
▪ N’ihi gịnị ka ndị mmadụ na-eji ebu nkata ihe oriri buru ibu?
▪ Mgbe ọ hapụrụ Dikapọlis, njem dịgasị aṅaa ka Jisọs ji ụgbọ mmiri na-eje?
▪ Nghọtahie dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ ya nwere banyere okwu Jisọs kwuru maka ihe iko achịcha?
▪ Gịnị ka Jisọs bu n’uche n’ịsị “ihe ndị Farisii na ndị Sadusii, bụ́ ihe na-eko achịcha”?