Isi 62
Ihe Mmụta Banyere Ịdị Umeala n’Obi
KA Ọ gwọsịrị nwa okoro ahụ mmụọ ọjọọ ji n’ógbè dị nso na Sizaria Filipaị, Jisọs chọrọ ịlaghachi n’ụlọ ya na Kapanaum. Otú ọ dị, ọ chọrọ ka nanị ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ na njem ahụ ka ọ kwadebekwuo ha maka ọnwụ ya na ibu ọrụ ga-adịkwasị ha mgbe nke ahụ gasịrị. Ọ na-akọwara ha sị, “A na-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka mmadụ; ha ga-egbukwa ya; mgbe e gbusịrị ya, ọ ga-esi n’ọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.”
Ọ bụrịị eziokwu na Jisọs ekwuwo banyere nke a na mbụ, ndị ozi ya atọ hụkwara n’ezie nnwogha ya mgbe a tụlere “ọpụpụ” ya, ndị na-eso ụzọ ya enwebeghị nghọta banyere okwu ahụ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha na-anwa ikwu na agaghị egbu ya, dị ka Pita mere na mbụ, ma egwu na-atụ ha ịjụkwu ya ajụjụ banyere ya.
Ha mesịrị bata na Kapanaum, bụ́ ebe ghọworo ihe dị ka isi ụlọ ọrụ n’oge ije ozi Jisọs. Ọ bụkwa obodo nke Pita na ụfọdụ ndị ozi ndị ọzọ. N’ebe ahụ, ndị na-anakọta ụtụ isi ụlọ nsọ bịakwutere Pita. Ma eleghị anya na-anwa igosi na Jisọs na-eme ihe megidere ihe a nakweere dị ka omenala, ha jụrụ, sị: “Onye ozizi unu ọ́ dịghị atụ ego ụtụ [ụlọ nsọ]?”
Pita na-aza sị, “Ee.”
Jisọs, bụ́ onye bataworo n’ụlọ ma eleghị anya ngwa ngwa mgbe nke a gasịrị, maara ihe garanụ. Ya mere ọbụna tupu Pita enwee ike iwelite okwu ahụ, Jisọs jụrụ, sị: “Gịnị bụ uche gị, Saịmọn? Ndị eze ụwa, site n’aka ole ndị ka ha na-anara ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ n’isi mmadụ? N’aka ụmụ ha, ma ọ bụ n’aka ndị ọbịa?”
Pita na-aza sị, “N’aka ndị ọbịa.”
Jisọs wee kwuo sị, “Ya mere ụmụ ha pụrụ n’ime ya.” Ebe Nna Jisọs bụ Eze nke eluigwe na ala, Onye a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ, ọ bụghị n’ezie ihe a chọrọ n’iwu na Ọkpara Chineke ga-atụ ụtụ ụlọ nsọ ahụ. Jisọs na-asị, “Ma, ka anyị wee ghara ime ka ha maa n’ọnyà, gaa ruo oké osimiri, tụba nko azụ, were azụ nke buru ụzọ pụta; mgbe ị saghesịrị ọnụ ya, ị ga-ahụkwa otu shekel [mkpụrụ ego drachma anọ]: were nke ahụ, nye ha ka ọ bụrụ nke mụ na gị.”
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nọkọtara mgbe ha lọghachiri site na Kapanaum, ma eleghị anya n’ụlọ Pita, ha jụrụ: “Onyekwa dịkarịrị ukwuu n’alaeze eluigwe?” Jisọs matara ihe kpaliri ajụjụ ha, ebe ọ matara ihe gara n’etiti ha mgbe ha na-abịa n’azụ ya n’oge ha si Sizarịa Filipaị na-alọta. Ya mere ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka unu na-ekwurịta n’ụzọ?” Ná mgbagwoju anya, ndị na-eso ụzọ ya mechiri ọnụ, n’ihi na ha arụrịtawo ụka n’etiti onwe ha banyere onye kachasị ukwuu.
Mgbe o ruworo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ Jisọs ziworo ha ihe, ọ̀ bụ ihe ijuanya na ndị na-eso ụzọ ahụ ga-enwe ụdị nrụrịta ụka nke a? Ọ na-egosi nnọọ mmetụta dị ike nke ezughị okè mmadụ na-enwe, dịkwa ka nke nzụlite okpukpe mmadụ na-enwe. Okpukpe ndị Juu nke a zụlitere ndị na-eso ụzọ ahụ na ya na-emesi ọkwá ma ọ bụ ọnọdụ ike ná mmekọrịta nile. Tinyere nke ahụ, Pita, n’ihi nkwa Jisọs kwere ya na ọ ga-anata “mkpịsị ugodi” ụfọdụ nke Alaeze, chere na ya karịrị ndị ọzọ. Jemes na Jọn pụkwara inweworị otu echiche ahụ n’ihi ịbụ ndị nwere ihe ùgwù nke ịhụ nnwogha Jisọs.
N’agbanyeghị ihe kpatara ya, Jisọs dokwara ihe omume na-akpali akpali ná mgbalị nke imezi àgwà ha. Ọ kpọrọ otu nwatakịrị, guzobe ya n’etiti ha, konye ya aka, wee sị: “Ọ bụrụ na unu echigharịghị, bịa dị ka ụmụ ntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị. Ya mere, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya dị ka nwatakịrị a, onye ahụ dịkarịrị ukwuu n’alaeze eluigwe. Ọzọ, onye ọ bụla nke ga-anara otu nwatakịrị dị otú a nke ọma n’aha m, ọ bụ mụ onwe m ka ọ na-anara nke ọma.”
Lee ụzọ dị ebube ọ bụ isi gbazie ndị na-eso ụzọ ya olu! Jisọs ewesoghị ha iwe wee na-akpọ ha ndị mpako, ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị nwere oké ọchịchọ. Ee e, o ji ihe atụ na-ezi ozizi ya nke ịgbazi olu site n’iji ihe nlereanya nke ụmụntakịrị mee ihe, bụ́ ndị dị umeala n’obi, ndị na-enweghị oké ọchịchọ, na ndị na-enweghị echiche ọ bụla nke inwe ọkwá n’etiti onwe ha. N’ụzọ dị otú a, Jisọs gosiri na ndị na-eso ụzọ ya nwere mkpa nke ịzụlite otu ụdị àgwà ndị a ndị e ji mara ụmụaka dị umeala n’obi. Dị ka Jisọs si mechie okwu ya: “Onye dịkarịrị nta n’etiti unu nile, onye ahụ bụ onye ukwu.” Matiu 17:22-27; 18:1-5; Mak 9:30-37; Luk 9:43-48.
▪ Mgbe ha lọghachiri Kapanaum, olee ihe ozizi nke Jisọs na-akụzigharị, oleekwa otú e si na-anara ya?
▪ Gịnị mere na Jisọs anọghị n’iwu ịtụ ụtụ ụlọ nsọ, ma gịnị mere o ji kwụọ ya?
▪ Gịnị, ma eleghị anya, so kpata nrụrịta ụka ndị na-eso ụzọ ahụ, oleekwa otú Jisọs si na-agbazi ha olu?