Isi 68
Ịkụzikwu Ihe n’Ụbọchị nke Asaa
N’ỤBỌCHỊ ikpeazụ nke Ememe Ụlọ Ntu, bụ́ nke asaa, ka na-aga n’ihu. Jisọs na-akụzi ihe n’akụkụ ụlọ nsọ ahụ nke a na-akpọ “ebe a na-edebe ụtụ a na-atụ.” O doro anya na nke a bụ akụkụ ebe ahụ a na-akpọ Ụlọ Nzukọ Ụmụ Nwanyị bụ́ ebe e debere igbe dị iche iche ebe ndị mmadụ na-atụnye ụtụ ha.
N’abalị ọ bụla n’oge ememe ahụ, a na-enwe ngosipụta pụrụ iche nke inye ìhè n’akụkụ ebe a nke ụlọ nsọ ahụ. E guzobere ihe ndọba oriọna ukwu anọ n’ebe ahụ, nke ọ bụla nwere efere anọ buru ibu nke mmanụ juru. Ìhè nke na-esite n’oriọna ndị a nke na-amịta mmanụ site n’efere mmanụ 16 ndị ahụ dị ike nke ukwuu inye ìhè n’akụkụ ebe ahụ nile ruo ebe dị anya n’abalị. Ihe Jisọs na-ekwu ugbu a pụrụ ichetara ndị na-ege ya ntị ihe ngosi nke a. Jisọs na-akpọsa sị, “Mụ onwe m bụ ìhè nke ụwa: onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
Ndị Farisii jụrụ, sị: “Gị onwe gị na-agbara onwe gị àmà; àmà nke gị abụghị ezie.”
Ná nzaghachi, Jisọs na-ekwu, sị: “A sịkwa na mụ onwe m gbaara onwe m àmà, àmà nke m bụ ezie; n’ihi na amatara m ebe m si bịa, na ebe m na-ala; ma unu onwe unu amataghị ebe m si bịa, ma ọ bụ ebe m na-ala.” O kwukwara, sị: “Mụ onwe m bụ onye na-agbara onwe m àmà, Nna nke zitere m na-agbakwara m àmà.”
Ndị Farisii na-achọ ịmata, “Olee ebe Nna gị dị?”
Jisọs na-aza ha sị, “Unu amataghị m, unu amataghịkwarị Nna m: ọ bụrụ na unu matara m, unu ga-amatakwa Nna m.” N’agbanyeghị na ndị Farisii ka chọrọ ka e jide Jisọs, ọ dịghị onye metụrụ ya aka.
Jisọs na-ekwukwa sị, “Mụ onwe m na-ala . . . ebe mụ onwe m na-ala, unu onwe unu apụghị ịbịa.”
N’ihi nke a, ndị Juu ahụ malitere ịjụ onwe ha, sị: “Ọ̀ ga-egbu onwe ya, na ọ na-asị, Ebe mụ onwe m na-ala, unu onwe unu apụghị ịbịa?”
Jisọs na-akọwa sị, “Unu onwe unu si n’ebe dị ala pụta; mụ onwe m si n’ebe dị elu pụta: unu onwe unu si n’ụwa nke a pụta; mụ onwe m esighị n’ụwa nke a pụta.” Mgbe ahụ o kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na unu ekweghị na mụ onwe m bụ ya, unu ga-anwụ ná mmehie nile unu.”
O doro anya na Jisọs na-ezo aka n’ọdịdị ya tupu ọ ghọọ mmadụ nakwa n’eziokwu bụ na ọ bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst. N’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na ha sitere n’oké ịkwa emo jụọ, sị: “Gị onwe gị bụ ònye?”
N’ihi ọjụjụ ha jụrụ ya, Jisọs na-azaghachi, sị: ‘N’ihi gịnị ka m na-agwadịrị unu okwu ma ọlị?’ Ma ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye zitere m bụ ezie; ihe mụ onwe m nụkwara n’ọnụ ya, ihe ndị a ka m na-agwa ụwa.” Jisọs gara n’ihu ịsị: “Mgbe ọ bụla unu ga-eweliworị Nwa nke mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-amara na mụ onwe m bụ ya, na ọ dịghịkwa ihe m na-eme n’onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a. Mụ na onye zitere m nọkwa; ọ hapụghị nanị mụ; n’ihi na mụ onwe m na-eme ihe na-atọ ya ụtọ mgbe nile.”
Mgbe Jisọs kwuru ihe ndị a, ọtụtụ tinyere okwukwe n’ebe ọ nọ. Ọ gwara ndị a, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ezie; unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”
Ndị mmegide ahụ na-ekwukanye okwu, na-asị, “Anyị bụ mkpụrụ Abraham, ọ ka adịghịkwa mgbe ọ bụla anyị bụ ohu onye ọ bụla: gị onwe gị si aṅaa kwuo, A ga-eme ka unu pụọ n’ohu?”
Ọ bụ ezie na ndị Juu anọwo ọtụtụ mgbe n’okpuru ịchịisi ndị ọzọ, ha adịghị ewe ndị mkpagbu dị otú ahụ dị ka ndị nwe ha. Ha ekweghị ka a na-akpọ ha ndị ohu. Ma Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na ha bụ ndị ohu n’ezie. N’ụzọ dị aṅaa? Jisọs na-asị, “N’ezie, n’ezie, asị m unu, onye ọ bụla nke na-emehie bụ ohu mmehie.”
Ọjụjụ ha jụrụ ikwere na ha bụ ohu nye mmehie tinyere ndị Juu ahụ n’ọnọdụ dị ize ndụ. Jisọs na-akọwa sị, “Ohu adịghị anọgide n’ụlọ ruo mgbe ebighị ebi: nwa na-anọgide ebighị ebi.” Ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe nketa ruuru onye ohu, ọ pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a chụpụrụ mgbe ọ bụla. Nanị nwa nke a mụrụ ma ọ bụ nke e kuchiri n’ezinụlọ ahụ na-anọgide “ebighị ebi,” nke pụtara, ogologo oge nile ọ na-adị ndụ.
Jisọs na-aga n’ihu ikwu sị, “Ya mere ọ bụrụ na Ọkpara ga-eme ka unu pụọ n’ohu, unu ga-abụ ndị pụworo n’ohu n’ezie.” Otú a, eziokwu nke na-eme ka ndị mmadụ pụọ n’ohu bụ eziokwu nke metụtara Ọkpara ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọ bụ nanị site n’àjà nke ndụ mmadụ ya zuru okè ka a pụrụ isi mee ka onye ọ bụla pụọ n’ohu mmehie nke na-akpata ọnwụ. Jọn 8:12-36.
▪ Ebee ka Jisọs na-ezi ihe n’ụbọchị nke asaa? Gịnị na-eme n’ebe ahụ n’abalị, oleekwa otú nke ahụ si na-emetụta ozizi Jisọs?
▪ Gịnị ka Jisọs na-ekwu banyere ebe o si bịa, gịnị ka nke a kwesịkwara ikpughe banyere onye ọ bụ?
▪ N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Juu si bụrụ ohu, ma eziokwu dị aṅaa ga-eme ka ha pụọ n’ohu?