Isi 69
Okwu Banyere Onye Bụ Nna
N’OGE ememe ahụ, mkparịta ụka Jisọs na ndị ndú Juu siwanyere ike. Jisọs na-ekweta, sị, “Amatara m na unu bụ mkpụrụ Abraham; ma unu na-achọ ụzọ igbu m, n’ihi na okwu m enweghị ọnọdụ n’ime unu. Ana m ekwu ihe mụ onwe m hụworo n’ebe Nna m nọ: ya mere unu onwe unu na-emekwa ihe unu nụrụ n’ọnụ nna unu.”
Ọ bụ ezie na ọ kpọghị onye nna ha bụ aha, Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na nna ha dị iche n’ebe nke ya nọ. N’amataghị onye Jisọs bu n’uche, ndị ndú Juu ahụ zaghachiri, sị: “Nna anyị bụ Abraham.” Ha chere na ha nwere otu okwukwe ahụ dị ka Abraham, onye bụ enyi Chineke.
Otú ọ dị, Jisọs mere ka akpata oyi wụọ ha site n’ịzaghachi, sị: “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Abraham, unu ga-arụ ọrụ Abraham.” N’ikwu eziokwu, onye bụ nwa n’ezie na-eṅomi nna ya. Jisọs na-asị, “Ma ugbu a unu na-achọ ụzọ igbu m, bụ́ mmadụ nke gwaworo unu eziokwu, nke m nụrụ n’ọnụ Chineke: nke a ka Abraham na-emeghị.” Ya mere Jisọs kwukwara ọzọ, sị: “Unu onwe unu na-arụ ọrụ nna unu.”
Ha akapụghịkwa ịghọta onye Jisọs na-ekwu banyere ya. Ha nọgidere na-ekwu na ha bụ ụmụ Abraham dị ka iwu si dị, na-asị: “A mụghị anyị onwe anyị site n’ịkwa iko.” N’ihi ya, ebe ha na-azọrọ na ha bụ ndị na-efe ezi ofufe dị ka Abraham, ha sịrị: “Otu Nna ka anyị nwere, bụ́ Chineke.”
Ma Chineke ọ̀ bụ Nna ha n’ezie? Jisọs na-azaghachi sị, “Ọ bụrụ na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m n’anya: n’ihi na mụ onwe m siri n’ebe Chineke nọ pụta wee bịa; n’ihi na abịaghị m n’onwe m, kama ya onwe ya zitere m. N’ihi gịnị ka unu na-amaghị ihe m na-ekwu?”
Jisọs nwara igosi ndị ndú okpukpe a ihe ga-apụtara ha n’ihi ọjụjụ ha jụrụ ya. Ma ugbu a, n’ụzọ pụtakarịsịrị ìhè, ọ na-asị: “Unu onwe unu, sitere ná nna unu bụ Ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime.” Ụdị nna dị aṅaa ka Ekwensu bụ? Jisọs gosipụtara ya dị ka ogbu mmadụ, wee sịkwa: “Ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” Ya mere Jisọs mechiri okwu ya site n’ịsị: “Onye sitere na Chineke na-anụ okwu Chineke: n’ihi nke a ka unu onwe unu na-anụghị ya, n’ihi na unu esiteghị na Chineke.”
N’ịbụ ndị a kpasuru iwe n’ihi nkatọ Jisọs katọrọ ha, ndị Juu ahụ na-azaghachi, sị: “Anyị onwe anyị ékwughị nke ọma, sị na gị onwe gị bụ onye Sameria, i nwekwara mmụọ ọjọọ?” A na-eji aha ahụ bụ “onye Sameria” eme ihe ngosi oké nlelị na mkparị, ebe ọ bụ na ndị Juu kpọrọ ndị Sameria asị.
N’ileghara okwu nlelị ahụ nke ịkpọ ya onye Sameria anya, Jisọs na-azaghachi, sị: “Mụ onwe m enweghị mmụọ ọjọọ; kama ana m asọpụrụ Nna m, unu onwe unu na-emekwa m ihe ihere.” N’ịga n’ihu, Jisọs kwere nkwa ahụ dị ịtụnanya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla edebe okwu m, ọ gaghị ahụ onwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.” N’ezie, Jisọs adịghị ekwu na ndị nile bụ ndị na-eso ụzọ ya agaghị ahụ ọnwụ anya n’ụzọ nkịtị. Kama, ọ na-ekwu na ha agaghị ahụ mbibi ebighị ebi, ma ọ bụ “ọnwụ nke abụọ,” nke na-enweghị mbilite n’ọnwụ.
Otú ọ dị, ndị Juu ahụ weere okwu Jisọs n’ụzọ nkịtị. Ya mere, ha sịrị: “Ugbu a ka anyị maara na i nwere mmụọ ọjọọ. Abraham nwụrụ, ma ndị amụma; ma gị onwe gị na-asị, Ọ bụrụ na onye ọ bụla edebe okwu m, ọ gaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ̀ ga-abụ na gị onwe gị ka nna anyị Abraham ukwuu, onye nwụrụ anwụ? Ndị amụma nwụkwara: ònye ka ị na-eme onwe gị?”
Ná mkparịta ụka a nile, ọ pụtara ìhè na Jisọs na-adọrọ uche ndị a gaa n’eziokwu ahụ bụ na ya bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ma kama ịza ajụjụ ha kpọmkwem banyere onye ọ bụ, Jisọs na-asị: “Ọ bụrụ na mụ onwe m enye onwe m otuto, otuto nke m bụ ihe efu: Nna m bụ onye na-enye m otuto; onye unu onwe unu na-asị, na ọ bụ Chineke unu; unu amaghịkwa ya; ma mụ onwe m matara ya; ọ bụrụkwa na aga m asị, Amataghị m ya, m ga-eyi unu, bụrụ onye ụgha.”
Ka ọ na-aga n’ihu, Jisọs zoro aka n’ebe Abraham nwere okwukwe nọ, na-asị: “Obi tọrọ nna unu Abraham ụtọ nke ukwuu ịhụ ụbọchị m; o wee hụ, ya ṅụrịakwa ọṅụ.” Ee, site n’anya nke okwukwe, Abraham lepụrụ anya n’ihu n’ọbịbịa nke Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. N’ekweghị ekwe, ndị Juu ahụ na-azaghachi, sị: “Ị ka agbaghị [iri afọ ise], ị̀ hụwokwa Abraham?”
Jisọs na-azaghachi sị, “N’ezie, n’ezie, asị m unu, mgbe a ka amụghị Abraham mụ onwe m dị.” N’ezie, Jisọs na-ezo aka n’ọdịdị ọ dịrị dị ka onye dị ike nke bụ mmụọ n’eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ.
N’oké iwe n’ihi na Jisọs kwuru na ya adịwo tupu Abraham, ndị Juu ahụ tụtụkọtara nkume ịtụ ya. Ma o zopụrụ onwe ya wee si n’ụlọ ukwu ahụ pụọ n’emerụghị ahụ. Jọn 8:37-59; Mkpughe 3:14; 21:8.
▪ Jisọs si aṅaa na-egosi na Nna ya na nke ndị iro ya dị iche?
▪ Olee ihe ọkpụkpọ ndị Juu kpọrọ Jisọs onye Sameria na-egosipụta?
▪ N’echiche dị aṅaa ka Jisọs na-ekwu na ndị na-eso ụzọ ya agaghị ahụ ọnwụ anya?