Isi 73
Onye Sameria nke Mere Omume Onye Agbata Obi
MA ELEGHỊ anya, Jisọs nọ nso Betani, bụ́ obodo nta dị ihe dị ka maịlụ abụọ site na Jerusalem. Otu nwoke bụ́ onye ọkà n’Iwu Mosis ji ajụjụ bịakwute ya, sị: “Onye ozizi, ọ̀ bụ gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”
Jisọs chọpụtara na nwoke ahụ, nke bụ onye ọkà iwu, anaghị ajụ nanị ka o wee mara, kama na ọ chọrọ ịnwa ya. Ọ pụrụ ịbụ na ihe onye ọkà iwu ahụ na-achọ bụ ka Jisọs zaa ya n’ụzọ ga-emejọ usoro echiche ndị Juu. Ya mere, o mere ka onye ọkà iwu ahụ mata onwe ya n’ọnyà, site n’ịjụ, sị: “Gịnị ka e deworo n’akwụkwọ Iwu? Ì si aṅaa agụ ya?”
Ná nzaghachi, onye ọkà iwu ahụ, n’igosipụta nghọta dị nnọọ ukwuu gụrụ site n’iwu Chineke nke dị na Deuteronọmi 6:5 na Levitikọs 19:18, na-asị: “Hụ Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke gị n’anya site n’obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, na ike gị dum, na uche gị dum; hụkwa onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”
Jisọs na-azaghachi sị, “Ị zara nke ọma: mee nke a, ị ga-adịkwa ndụ.”
Otú ọ dị, afọ ejubeghị onye ọkà iwu ahụ. Azịza Jisọs arụtụghị ihe aka kpọmkwem ruo ókè ọ chọrọ. Ọ chọrọ ka Jisọs mesiwanye ya ike na ụzọ o si ele ihe anya ziri ezi, na ọ bụkwa onye ezi omume n’ụzọ o si emeso ndị ọzọ. Ya mere ọ jụrụ, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?”
Ndị Juu kwere na okwu ahụ bụ “onye agbata obi” na-ezo aka ná ndị Juu ibe ha nanị, dị ka o yiri ka ihe ndị e kwuru n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị gburugburu Levitikọs 19:18 ọ̀ na-egosi. N’ezie, na mgbe ọzọ ọbụna onyeozi bụ Pita sịrị: “Unu onwe unu maara otú ọ bụ ihe na-ezighị ezi n’iwu ka nwoke nke bụ onye Juu were onwe ya rapara n’ahụ onye mba ọzọ ma ọ bụ ijekwuru ya.” Ya mere onye ọkà iwu ahụ nakwa ma eleghị anya, ndị na-eso ụzọ Jisọs, kwetara na ha bụ ndị ezi omume ma ọ bụrụ na ha jiri afọ ọma mesoo ndị Juu ibe ha, ebe ọ bụ na n’echiche nke ha, ndị na-abụghị ndị Juu abụghị ndị agbata obi ha n’ezie.
Olee otú Jisọs pụrụ isi gbazie echiche ndị na-ege ya ntị n’emejọghị ha? Ọ kọrọ otu akụkọ, ma eleghị anya nke dabeere n’ihe mere eme n’ezie. Jisọs na-akọwa sị, “Otu nwoke [onye Juu] si na Jerusalem na-arịda ịga Jeriko; o wee daba n’etiti ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị gbara ya ọtọ tiekwa ya ihe otiti, wee laa, hapụ ya nwunye ọrụ [“ọ dị ndụ ọnwụ ka mma,” NW].”
Jisọs gara n’ihu na-asị, “Ma otu mgbe ahụ otu onye nchụàjà na-arịda n’ụzọ ahụ: mgbe ọ hụrụ ya, o wee si n’akụkụ ụzọ ọzọ gabiga. Otú ahụ onye Livaị, mgbe ọ bịaruru ebe ahụ, hụkwa ya, o wee sikwa n’akụkụ ụzọ ọzọ gabiga. Ma otu onye Sameria, mgbe ọ nọ n’ije, ọ bịaruo n’ebe ọ nọ: mgbe ọ hụrụ ya, o wee nwee ọmịiko n’ahụ ya.”
Ọtụtụ ndị nchụàjà na ndị Livaị na-ejere ha ozi n’ụlọ nsọ bi na Jeriko, bụ́ ebe dị 14 maịlụ, n’okporo ụzọ dị ize ndụ nke si n’elu ebe ha na-eje ozi n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem gbadata ihe dị 3,000 amaụkwụ. E lere anya na ndị nchụàjà na ndị Livaị ga-enyere onye Juu ibe ha nọ n’oké nsogbu aka. Ma ha emeghị otú ahụ. Kama nke ahụ, otu onye Sameria mere otú ahụ. Ndị Juu kpọrọ ndị Sameria asị n’ebe ọ dị ukwuu nke na n’oge na-adịbeghị anya, ha ka nyesịrị Jisọs mkparị dị ukwuu site n’ịkpọ ya “onye Sameria.”
Gịnị ka onye Sameria ahụ mere iji nyere onye Juu ahụ aka? Jisọs na-asị, “O wee bịakwute ya, kee ọnyá ya nile, wụkwasị ha mmanụ na mmanya vine; o wee tụkwasị ya n’anụ ụlọ nke aka ya, dubata ya n’ụlọ ndị ọbịa, wee lee ya anya nke ọma. N’echi ya o wee tụpụta shilling abụọ [ihe dị ka ụgwọ ọrụ ụbọchị abụọ], nye onye nwe ụlọ ndị ọbịa ahụ, sị, Lee ya anya nke ọma; ihe ọ bụla i mefukwara karị, mụ onwe m, mgbe m latara, m ga-akwụghachi gị.”
Mgbe ọ kọsịrị akụkọ ahụ, Jisọs jụrụ onye ọkà iwu ahụ, sị: “Ọ̀ bụ ònye n’ime mmadụ atọ a, ka i chere, gosiri onwe ya ka onye agbata obi nke onye ahụ dabara n’etiti ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe?”
N’ihi na ahụ erughị ya ala ikweta na onye Sameria mere nke ọma, onye ọkà iwu ahụ zara n’ụzọ dị mfe, sị: “Onye ahụ nke meere ya ebere.”
Jisọs kwubiri okwu ya sị, “Gaa, gị onwe gị meekwa otú ahụ.”
A sị na Jisọs gwara onye ọkà iwu ahụ kpọmkwem na ndị na-abụghị ndụ Juu bụkwa ndị agbata obi ya, ọ bụghị nanị na nwoke ahụ agaraghị anabata nke a, kama ọtụtụ n’ime ìgwè ndị ahụ na-ege ntị ma eleghị anya gaara adụnyere nwoke ahụ úkwù ná mkparịta ụka ya na Jisọs. Otú ọ dị, akụkọ nke a nke yiri ihe na-eme eme n’ezie mere ka ọ pụta ìhè n’ụzọ a na-apụghị ịgbagha ya na ndị agbata obi anyị gụnyere ndị na-esighị n’agbụrụ ma ọ bụ mba anyị. Lee nnọọ ụzọ mara mma e si akụzi ihe nke Jisọs nwere! Luk 10:25-37; Ọrụ 10:28; Jọn 4:9; 8:48.
▪ Ajụjụ dịgasị aṅaa ka onye ọkà iwu ahụ jụrụ Jisọs, gịnịkwa ka o yiri bụ nzube o ji jụọ ha?
▪ Ole ndị ka ndị Juu ahụ kwere bụ ndị agbata obi ha, oleekwa ihe mere a ga-eji kwere na ọbụna ndị na-eso ụzọ ahụ nwekwara otu echiche nke a?
▪ Jisọs si aṅaa kọwaa echiche nke ziri ezi nke na onye ọkà iwu ahụ apụghị ịgbagha ya?