Isi 74
Ndụmọdụ E Nyere Mata, na Ntụziaka Banyere Ekpere
N’OGE ije ozi Jisọs na Judia, ọ banyere obodo nta nke Betani. Ọ bụ n’ebe a ka Mata, Meri, na nwanne ha nwoke bụ Lazarọs bi. Ma eleghị anya Jisọs zutere mmadụ atọ a na mbụ n’ozi ya, ya mere ha abụrụworị ezi ndị enyi ya. Otú o sina dị, Jisọs na-aga n’ụlọ Mata ugbu a, ọ na-anabatakwa ya.
Ọ dị Mata mkpa hie nne inye Jisọs ihe kachasị mma nke o nwere. N’ezie, ọ bụ ihe ùgwù dị ukwuu na Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa bịara n’ụlọ mmadụ! Ya mere Mata banyere n’ịkwadebe nri dị ukwuu, ma na-ahụkwa maka ọtụtụ ihe ndị ọzọ e doziri iji mee ka ọnụnọ Jisọs bụrụ nke ga-atọ ya ụtọ na nke ọ ga-atụsara ahụ karị.
N’aka nke ọzọ, nwanne nwanyị Mata bụ́ Meri nọdụrụ ala n’ụkwụ Jisọs na-ege ya ntị. Mgbe nwa oge gasịrị, Mata bịakwutere Jisọs ma sị ya: “Onyenwe anyị, ó metụghị gị n’obi na nwanne m nwanyị na-ahụpụ m ka nanị mụ na-eje ozi? Ya mere, gwa ya ka o nyere m aka.”
Ma Jisọs jụrụ ịgwa Meri ihe ọ bụla. Kama nke ahụ, o nyere Mata ndụmọdụ megide ichegbubiga onwe ya ókè n’ihe nkịtị ndị anya na-ahụ. Jisọs ji obi ọma na-aba mba sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe: ma otu ihe bụ ihe dị mkpa.” Jisọs na-asị na ọ dịghị mkpa itinye oge dị ukwuu n’ịkwadebe ọtụtụ ụdị ihe oriri dị iche iche. Nanị ole na ole ma ọ bụ ọbụna otu ụdị nri ga-ezu.
Ebumnuche Mata dị mma; ọ chọrọ ịbụ onye na-ele ọbịa anya nke ọma. Ma, site n’ichegbu onwe ya banyere ihe ndị nkịtị anya na-ahụ, ohere nke ịnata ntụziaka n’onwe ya site n’aka Ọkpara Chineke na-efunahụ ya! Ya mere Jisọs na-ekwubi, sị: “Meri họpụtara ezi òkè ahụ, nke a na-agaghị anapụ ya.”
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, n’oge ọzọ, otu onye na-eso ụzọ rịọrọ Jisọs, sị: “Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn zikwara ndi na-eso ụzọ ya.” Ọ pụrụ ịbụ na onye na-eso ụzọ nke a anọghị ya ihe dị ka otu afọ na ọkara gara aga mgbe Jisọs kụziri ekpere ihe atụ ahụ n’Ozizi Elu Ugwu ya. Ya mere Jisọs nyeghachiri ntụziaka ya ndị ahụ ma gaakwa n’ihu inye ihe atụ iji wee mesie mkpa ọ dị ike ịnọgide na-ekpe ekpere.
Jisọs na-amalite sị, “Ònye n’ime unu ga-enwe enyi, ga-ejekwukwa ya n’etiti abalị, sị ya, Enyi m, binye m ogbe achịcha atọ; n’ihi na otu enyi m esiwo n’ije bịakwute m, ma enweghị m ihe ọ bụla m ga-edebe n’ihu ya; ma onye ahụ ga-esi n’ime ụlọ zaa, sị, Esogbula m: E mechiwo ụzọ ugbu a, mụ na ụmụntakịrị m na-edinakwa n’ihe ndina anyị; apụghị m ibili inye gị? Asị m unu, Ọ bụrụkwa na ọ gaghị ebili inye ya n’ihi na ọ bụ enyi ya, ma n’ihi arịrịọ ya n’enweghị ihere ọ ga-ebili nye ya ka ihe dị ya mkpa hà.”
N’ịma atụ dị otú a, Jisọs ebughị n’uche ịsị na Jehova Chineke enweghị mmasị n’ịza arịrịọ anyị dị ka enyi ahụ dị n’akụkọ ya. Ee e, kama ọ na-egosipụta na ọ bụrụ na enyi na-enweghị mmasị ga-aza arịrịọ a rịọrọ n’adaghị mba, olee maka Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya! Ya mere Jisọs gara n’ihu, sị: “Mụ onwe m sịkwa unu, Rịọnụ [“nọgidenụ na-arịọ,” NW], a ga-enyekwa unu; chọọnụ [“nọgidenụ na-achọ,” NW] unu ga-achọtakwa; kụọnụ [“nọgidenụ na-akụ,” NW], a ga-emeghekwara unu. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta; onye na-achọkwa na-achọta; onye na-akụkwa ka a ga-emeghere.”
Mgbe ahụ, Jisọs zoro aka n’ebe nna nkịtị na-ezughị okè, nke na-emehie emehie nọ, na-asị: “Ma ònye n’etiti unu, bụ́ nna, ka nwa ya ga-arịọ ogbe achịcha, o nye ya nkume? ma ọ bụ azụ, o nye ya agwọ n’ọnọdụ azụ? ma ọ bụ a sị na ọ ga-arịọ àkwá ọkụkọ, ọ̀ ga-enye ya akpị? Ya mere, ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya?” N’ezie, lee nnọọ agbamume na-akpali akpali nke Jisọs nyere banyere ịnọgide n’ekpere. Luk 10:38–11:13.
▪ N’ihi gịnị ka Mata ji banye n’ụdị nkwado ihe dị ukwuu otú ahụ maka Jisọs?
▪ Gịnị ka Meri na-eme, gịnịkwa ka Jisọs ji jaa ya mma kama ịja Mata?
▪ Gịnị kpaliri Jisọs inyeghachi ntụziaka ya ndị ahụ banyere ekpere?
▪ Jisọs si aṅaa gosi mkpa ọ dị ịnọgide na-ekpe ekpere?