Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 76
  • Isoro Onye Farisii Rie Nri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isoro Onye Farisii Rie Nri
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Esoro Onye Farisii Rie Ihe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • ‘Mụtanụ Ihe n’Ọnụ M’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Jisọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Jisọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 76

Isi 76

Isoro Onye Farisii Rie Nri

MGBE Jisọs zaghachisịrị ndị nkwutọ ndị a na-ajụ ebe o si nweta ike ya nke ịgwọ otu nwoke dara ogbi, otu onye Farisii kpọrọ ya òkù ịbịa rie nri anyasị. Tupu ha amalite iri nri, ndị Farisii na-abanye n’omenala nke ịsa aka ha ruo n’ikpere aka. Ha na-eme nke a tupu ha amalite iri nri na mgbe ha risịrị nri, ọbụnakwa mgbe e bupụtara ụdị nri ọzọ. Ọ bụ ezie na omenala ahụ emegideghị iwu Chineke e dere ede, ọ gafere ihe Chineke chọrọ n’ihe banyere ịdị ọcha nke usoro ihe omume.

Mgbe Jisọs na-edebeghị omenala ahụ, ọ tụrụ onye kpọrọ ya òkù n’anya. Ọ bụ eziokwu na ọ pụrụ ịbụ na o gosighị ịtụnanya ahụ site n’ikwu okwu, Jisọs chọpụtara ya ma sị: “Ugbu a ka unu onwe unu, bụ́ ndị Farisii, na-eme ka azụ iko na efere dị ọcha; ma ime unu jupụtara n’ịpụnara mmadụ ihe na ajọ ihe. Unu ndị na-enweghị uche, Onye ahụ nke mere azụ iko, ọ́ bụghị ya mekwara ime ya?”

Otú a, Jisọs kpughere ihu abụọ nke ndị Farisii ndị na-eme omenala nke isa aka ha ma ghara ịsacha obi ha pụọ n’ajọ omume. O nyere ndụmọdụ, sị: “Werenụ ihe dị n’ime rụọ ọrụ ebere; lee, ihe nile dịkwa ọcha n’ebe unu nọ.” Onyinye ha ga-abụ nke obi ịhụnanya kpaliri, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ime ka ndị ọzọ kpọọ ha ezi mmadụ mgbe ha na-eme ka a ga-asị na ha bụ ndị ezi mmadụ.

Jisọs gara n’ihu, na-ekwu sị, “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii; n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpà akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na rue na mkpà akwụkwọ nile, ma unu na-agabiga ikpe na ịhụnanya Chineke: ma ọ dị mkpa ka unu mee ihe ndị a, ka unu gharakwa ịhapụ ihe ahụ.” Iwu Chineke nyere ndị Israel chọrọ ka ha kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe si n’ubi ha pụta. Mkpà akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na rue bụ ụmụ ihe ọkụkụ ndị dị nta, ma ọ bụ akwụkwọ nri ndị e ji eme ka nri tọọ ụtọ. Ndị Farisii na-elezi anya ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke akwụkwọ nri ndị a na-adịchaghị mkpa, ma Jisọs katọrọ ha n’ihi ileda ihe ndị ka mkpa a chọrọ ha n’aka anya, bụ́ igosi ịhụnanya, ebere na ịdị umeala n’obi.

N’ịkatọ ha gaa n’ihu, Jisọs na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii; n’ihi na unu na-ahụ isi oche nile n’ụlọ nzukọ nile, na ekele n’ọma ahịa nile, n’anya. Ahụhụ ga-adịrị unu; n’ihi na unu dị ka ili nke na-apụtaghị ìhè, nke mmadụ ndị na-ejegharị n’elu ha n’amataghị ya.” Adịghị ọcha ha apụtaghị ìhè. Okpukpe nke ndị Farisii nwere ngosipụta elu ahụ ma ha enweghị ụdịdị mara mma nke ime! Ọ dabeere n’ihu abụọ.

Mgbe ọ na-ege ntị ná nkatọ ndị a, otu onye ọkà iwu, bụ́ otu n’ime ndị maara Iwu Chineke nke ọma, mere mkpesa, sị: “Onye ozizi, n’ikwu okwu a ị na-emekwa anyị ihe ihere.”

Jisọs jidekwara ndị a bụ ndị ọkà n’Iwu dị ka ndị ikpe mara, na-asị: “Ahụhụ ga-adịkwara unu ndị iwu; n’ihi na unu na-ebo mmadụ ibu dị ike obubu, ma unu onwe unu ejighị otu n’ime mkpịsị aka unu kpatụ ibu ahụ. Ahụhụ ga-adịrị unu; n’ihi na unu na-ewu ebe a na-eli ndị amụma, ma nna unu ha gburu ha.”

Ibu ndị ahụ Jisọs kwuru okwu ha bụ omenala dị iche iche a na-edeghị ede, ma ndị ọkà iwu a adịghị anwa anwa iwepụ ọbụna otu nke obere ọ bụla n’ime ha iji mee ka ọ dịtụrụ ndị ahụ mfe. Jisọs na-ekpughe na ha na-akwado ọbụna ogbugbu nke ndị amụma, ya mere ọ dọkwara aka ná ntị, sị: “[A ga-achọpụta] ọbara ndị amụma nile, nke a wụsịworo site na ntọala ụwa, n’aka ọgbọ a; site n’ọbara Ebel ruo n’ọbara Zekaraịa; onye a lara n’iyi n’agbata ebe ịchụàjà na ụlọ nsọ unu: ee, asị m unu, a ga-achọpụta ya n’aka ọgbọ a.”

Ụwa nke ụmụ mmadụ a pụrụ ịgbapụta nwere mmalite ya site n’ịmụ ụmụ nye Adam na Iv; otú a, Ebel dịrị ndụ na “ntọala ụwa.” Ná nsochi nke ogbugbu obi ọjọọ e gburu Zekaraịa, ndị agha Siria bibiri Juda. Ma Jisọs buru amụma banyere mbibi ka njọ maka ọgbọ nke ya n’ihi ajọ omume ha nke ka njọ. Mbibi nke a bịara n’ihe dị ka 38 afọ mgbe o kwusịrị okwu ya na 70 O.A.

N’ịgakwa n’ihu ná nkatọ ya, Jisọs kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị iwu; n’ihi na unu wepụrụ mkpịsị ugodi nke ọmụma ihe: unu onwe unu abataghị, unu gbochikwara ndị mbata.” Ndị ọkà n’Iwu bụ ndị nwere ibu ọrụ nke ịkọwara ndị ahụ Okwu Chineke, na-eme ka a ghọta ya. Ma ha adịghị eme nke a, ọbụna na-anapụkwa ndị mmadụ ohere ha nwere iji ghọta.

Ndị Farisii ahụ na ndị ọkà iwu were iwe ebe ọ dị ukwuu megide Jisọs n’ihi ikpughe ha. Mgbe ọ na-apụ n’ụlọ ahụ, ha malitere iji oké iwe na-emegide ya ma jirikwa ọtụtụ ajụjụ nọchibido ya. Ha nwara ịmata ya n’ọnyà ka o kwuo ihe ha ga-eji wee jide ya. Luk 11:​37-54; Deuterọnọmi 14:22; Maịka 6:⁠8; 2 Ihe Emere 24:​20-⁠25.

▪ Gịnị mere Jisọs ji katọọ ndị Farisii na ndị ọkà n’Iwu?

▪ Ibu dị aṅaa ka ndị ọkà iwu ahụ na-ebokwasị ndị mmadụ?

▪ Olee mgbe bụ “ntọala ụwa”?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya