Isi 96
Jisọs na Nwa Okoro Bụ Onye Ọchịchị nke Bara Ọgaranya
KA JISỌS na-agabiga n’ógbè nke Perea, na-eche ihu na Jerusalem, otu nwa okorobịa gbakwutere ya wee daa gbunye ikpere n’ala n’ihu ya. A kpọrọ nwoke ahụ onye ọchịchị, ma eleghị anya nke pụtara na o ji ọkwá ukwu n’ụlọ nzukọ dị n’ógbè ahụ ma ọ bụ ọbụna bụrụ onye òtù nke nnọkọ ikpe Sanhedrin. Ọ bakwara ọgaranya nke ukwuu. Ọ na-ajụ sị, “Ezi Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”
Jisọs na-azaghachi sị, “Gịnị mere ị na-akpọ m ezi onye? Ọ dịghị onye ọ bụla bụ ezi onye ma ọ bụghị otu onye, bụ́ Chineke.” Ma eleghị anya nwa okorobịa ahụ jiri okwu ahụ bụ “ezi onye” mee ihe dị ka utu aha, ya mere Jisọs mere ka ọ mara na utu aha dị otú ahụ dịịrị nanị Chineke.
Jisọs na-aga n’ihu sị, “Ma ọ bụrụ na ị na-achọ ịba n’ime ndụ ahụ, debe ihe nile e nyere n’iwu.”
Nwoke ahụ jụrụ sị, “Ole?”
N’ihota ise n’ime Iwu Iri ahụ, Jisọs na-aza, sị: “Egbula mmadụ, Akwala iko, Ezula ohi, Agbala àmà ụgha, Sọpụrụ nna gị na nne gị.” N’inyekwu otu iwu nke dị mkpa ọbụna karị, Jisọs na-asị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”
“Ihe ndị a nile ka m rịbara ama site n’okorobịa,” ka nwoke ahụ ji obi eziokwu nile na-azaghachi. “Gịnị fọdụụrụ m ọzọ ime?”
N’ige ntị n’arịrịọ ahụ nwoke a ji ịnụ ọkụ n’obi na-arịọsi ike, Jisọs nwere ịhụnanya n’ebe ọ nọ. Ma Jisọs ghọtara otú o si jiri ihe onwunwe kpọrọ ihe nke ukwuu, wee jiri maka ya kpọtụ uche n’ihe dị ya mkpa: “Otu ihe fọdụụrụ gị ime: Laba, ree ka ihe i nwere hà, nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ n’eluigwe: bịakwa, soo m.”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs na-emetara nwoke ahụ ebere ka ọ na-ele ya mgbe ọ na-ebili, tụgharịa, na-enwe mwute dị omimi. Ihe onwunwe ya na-eme ka o kpuo ìsì n’ebe ezi akụ dị. Jisọs kwara arịrị, sị: “Lee otú ọ dịịrị ndị nwere akụ ike ịba n’alaeze Chineke!”
Okwu Jisọs nwụrụ ndị na-eso ụzọ ya ibubo n’ahụ. Ma ha nwere ihe ijuanya ọbụna karị mgbe ọ gara n’ihu ikwupụta otu ụkpụrụ nke jikọtara ihe nile, sị: “Ọ dịkarịịrị kamel mfe ịgabiga n’anya àgị̀gá karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.”
“Ònyekwa ka a pụrụ ịzọpụta?” ka ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ịmata.
N’ilekwasị ha anya kpọmkwem, Jisọs na-aza, sị: “N’ebe mmadụ nọ ọ bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ bụghị n’ebe Chineke nọ: n’ihi na a pụrụ ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.”
N’ịghọta na ha onwe ha ahọrọwo ihe dị nnọọ iche n’ihe nwa okorobịa ahụ bụ onye ọchịchị nke bakwara ọgaranya họọrọ, Pita na-asị: “Lee, anyị onwe anyị hapụrụ ihe nile, wee soo gị.” Ya mere, o wee jụọ, sị: “Gịnịkwa ka anyị ga-enwe?”
Jisọs kwere ha nkwa sị, “Unu onwe unu ndị sooro m, n’ịmụ ọzọ ahụ, mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’oche nke ebube ya, unu onwe unu ga-anọkwasịkwa n’oche eze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” Ee, Jisọs na-egosi na a ga-enwe oge ime ka ọnọdụ nile dị n’elu ala dị ọhụrụ, ka ihe nile wee dị otú ha dị n’ogige Iden. Pita na ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ ahụ ga-anatakwa nkwụghachi ụgwọ nke isoro Kraịst chịa achị n’elu Paradaịs nke a ga-ezu ụwa ọnụ. N’ezie, oké nkwụghachi ụgwọ dị otú ahụ kwesịrị àjà ọ bụla a chụrụ n’ihi ya!
Otú ọ dị, ọbụna ugbu a, e nwere ụgwọ ọrụ ndị a na-enweta, dị ka Jisọs kwusiri ike, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ́ bụghị na ọ ga-anata [otu narị otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.”
Dị ka Jisọs kwere ná nkwa, n’ebe ọ bụla ndị na-eso ụzọ ya jere n’elu ala, ha na-enweta mmekọrịta chiri anya nke ha na ndị Kraịst ibe ha, bụ́ nke dị mma, dịkwa oké ọnụ ahịa karịa nke a na-enwe n’etiti ndị sitere n’òtù ezinụlọ anụ ahụ pụta. O doro anya na ma nkwụghachi ụgwọ nke a ma nke ndụ ebighị ebi n’ime Alaeze eluigwe Chineke funahụchara nwa okorobịa ahụ bụ onye ọchịchị nke bakwara ọgaranya.
Mgbe e mesịrị, Jisọs kwukwara, sị: “Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ; ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.” Gịnị ka o bu n’uche kwuo nke a?
Ihe o bu n’uche bụ na ọtụtụ “ndị bu ụzọ” n’inweta ihe ùgwù dị iche iche nke okpukpe, dị ka nwa okorobịa ahụ bụ onye ọchịchị nke bakwara ọgaranya, agaghị abanye n’ime Alaeze ahụ. Ha ga-abụ “ndị ikpeazụ.” Ma ọtụtụ ndị, gụnyere ndị ahụ dị umeala n’obi, ndị na-eso ụzọ Jisọs, bụ́ ndị ndị Farisii ahụ gụrụ onwe ha ná ndị ezi omume na-eleda anya dị ka “ndị ikpeazụ”—dị ka ndị elu ala, ma ọ bụ ‛am ha·’aʹrets—ga-aghọ “ndị bu ụzọ.” Ha ịghọ “ndị bu ụzọ” pụtara na ha ga-anata ihe ùgwù nke ịghọ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa achị n’ime Alaeze ahụ. Mak 10:17-31; Matiu 19:16-30; Luk 18:18-30.
▪ Dị ka ihe àmà na-egosi, olee ụdị onye ọchịchị nwa okorobịa ahụ bara ọgaranya na-aghaghị ịbụworị?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs na-ekweghị ka a kpọọ ya ezi onye?
▪ N’ụzọ dị aṅaa ka ahụmahụ nke nwa okorobịa ahụ bụ onye ọchịchị si mee ihe atụ nke ihe ize ndụ dị n’ịba ọgaranya?
▪ Nkwụghachi ụgwọ dịgasị aṅaa ka Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya ná nkwa?
▪ Olee ụzọ ndị mbụ si aghọ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ a ghọọkwa ndị mbụ?