Isi 97
Ndị Ọrụ n’Ubi Vine ahụ
“ỌTỤTỤ ndị bu ụzọ,” ka Jisọs ka kwusịrị nnọọ, “ga-abụ ndị ikpeazụ; ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.” Ugbu a, o mere ihe atụ nke a site n’ịkọ otu akụkọ. Ọ malitere, na-asị, “Alaeze eluigwe yiri nwoke nke bụ nna nwe ụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ igote ndị ọrụ ije n’ubi vine ya.”
Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ma mgbe [onye ahụ nwe ụlọ] na ndị ọrụ ahụ nwere otu olu ka o nye ha otu shilling kwa ụbọchị, o zigara ha n’ubi vine ya. O wee pụọ dị ka oge hour nke atọ, hụ ndị ọzọ ka ha na-eguzo n’ọma ahịa n’arụghị ọrụ; o wee sị ndị ahụ, Unu onwe unu gaakwa n’ubi vine nke m, ihe ọ bụla ziri ezi ka m ga-enye unu. Ha wee jee. O wee pụọkwa ọzọ dị ka oge hour nke isii na nke iteghete, meekwa otú ahụ. O wee pụọ dị ka oge hour nke iri na otu, hụ ndị ọzọ ka ha na-eguzo; ọ sị ha, Gịnị mere unu guzoro n’ebe a ụbọchị dum n’arụghị ọrụ? Ha sị ya, N’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla goro anyị ịrụ ọrụ. Ọ sị ha, unu onwe unu gaakwa n’ubi vine nke m.”
Onye ahụ nwe ụlọ, ma ọ bụ onye nwe ubi vine ahụ, bụ Jehova Chineke, ubi vine ahụ bụkwa mba Israel. Ndị ọrụ ahụ nọ n’ubi vine bụ mmadụ ndị a kpọbatara n’ime ọgbụgba ndụ Iwu ahụ; ha bụ kpọmkwem ndị Juu ahụ dịrị ndụ n’oge ndị ozi. Ọ bụ nanị ndị ahụ malitere ọrụ n’ụtụtụ ka e sooro nwee nkwekọrịta banyere ego ole a ga-akwụ. Ụgwọ ọrụ bụ otu shilling maka ọrụ ụbọchị ahụ. Ebe ọ bụ na “oge hour nke atọ” bụ elekere itoolu nke ụtụtụ, ndị ahụ a kpọrọ n’oge hour nke 3, nke 6, nke 9 na nke 11 rụrụ ọrụ nanị hour 9, 6, 3, 1 hour dị ka oge e ji kpọọ ha si dị.
Ndị ahụ rụrụ ọrụ hour 12 ma ọ bụ n’ogologo ụbọchị ahụ dum nọchiri anya ndị ndú ndị Juu, bụ́ ndị nọworo kemgbe n’ọrụ metụtara okpukpe. Ha eyighị ndị na-eso ụzọ Jisọs, bụ́ ndị nọworo n’ọrụ ịkụ ọkụ azụ na ọrụ ndị ọzọ e ji akpata ego n’akụkụ ka ukwuu nke ndụ ha. Ọ bụ nanị mgbe oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke afọ 29 O.A. ruru ka “nna nwe ụlọ” ahụ zipụrụ Jisọs Kraịst ka o jee chịkọta ndị a ịbụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha si otú a ghọọ “ndị ikpeazụ,” ma ọ bụ ndị malitere ọrụ n’ubi vine ahụ ná hour nke 11.
N’ikpeazụ, ụbọchị ọrụ ihe atụ ahụ gwụsịrị n’ọnwụ Jisọs, oge wee ruo ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ. A gbasoro ụkpụrụ ahụ a na-adịghị ejibu eme ihe nke ibu ụzọ kwụọ ndị ikpeazụ ụgwọ, dị ka a kọwara, sị: “Ma mgbe o ruru anyasị, onye nwe ubi vine ahụ sị onye o tinyere ihe ya n’aka, Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha, malite site ná ndị ikpeazụ ruo ndị bu ụzọ. Mgbe ndị e goro n’oge hour nke iri na otu bịara, ha wee nata otu onye otu shilling. Ma mgbe ndị bu ụzọ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka; ma ha onwe ha natakwara otu onye otu shilling. Ma mgbe ha natara ya, ha tamube megide nna nwa ụlọ ahụ, sị, Ndị ikpeazụ a rụrụ otu hour, i wee mee ka anyị na ha hara, anyị ndị buru ibu arọ nke ụbọchị taa, ya na ifufe dị ọkụ. Ma ọ zara otu onye n’ime ha, sị, Enyi m, emejọghị m gị: mụ na gị ó nweghị otu olu ka m nye gị otu shilling? Welie nke bụ nke gị, laa; ana m achọ ka m nye onye ikpeazụ a dị ka m nyekwara gị. Ó zighị ezi n’iwu ka m were ihe nile nke m mee ihe m na-achọ? ma ọ bụ anya gị ọ̀ jọrọ njọ, n’ihi na mụ onwe m bụ ezi mmadụ?” Ná nkwubi okwu, Jisọs na-ekwughachi otu ihe o kwuworo na mbụ, sị: “Otú a ndị ikpeazụ ga-ebu ụzọ, ndị bu ụzọ ga-abụkwa ndị ikpeazụ.”
Nnata a natara otu shilling ahụ mere, ọ bụghị mgbe Jisọs nwụrụ, kama na Pentikọst nke afọ 33 O.A., mgbe Kraịst, bụ́ ‘onye ahụ e tinyere ihe n’aka ya,’ wụpụrụ mmụọ nsọ n’isi ndị na-eso ụzọ ya. Ndị a na-eso ụzọ Jisọs yiri “ndị ikpeazụ” ma ọ bụ ndị ahụ malitere ọrụ ná hour nke 11. Otu shilling ahụ anọchighị anya onyinye nke mmụọ nsọ n’onwe ya. Otu shilling ahụ bụ ihe ndị ahụ na-eso ụzọ ya ga-eji mee ihe n’elu ala ebe a. Ọ bụ ihe ha ga-eji kwadoo ndụ ha, ndụ ebighị ebi ha. Ọ bụ ihe ùgwù nke ịbụ ndị Israel ime mmụọ, ndị e tere mmanụ ikwusa ozi banyere Alaeze Chineke.
N’oge na-adịghị anya, ndị ahụ e bu ụzọ goo ọrụ hụrụ na a kwụwo ndị na-eso ụzọ Jisọs ụgwọ, ha hụkwara ka ha ji otu shilling ihe atụ nke a na-eme ihe. Ma ha chọrọ ihe karịrị mmụọ nsọ ahụ na ihe ùgwù ya ndị ọzọ metụtara Alaeze ahụ. Ntamu na okwu mmegide ha bịara n’ụdị nke ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst, bụ́ ndị ọrụ “ikpeazụ” n’ubi vine ahụ.
Mmezu narị afọ mbụ ahụ ọ̀ bụ nanị mmezu e nwere nke ihe atụ Jisọs? Ee e, ndị ụkọchukwu Krisendọm n’ime narị afọ nke iri abụọ nke a abụrụwokwa “ndị mbụ” e were n’ọrụ n’ubi vine ihe atụ nke Chineke n’ihi ọnọdụ na ibu ọrụ ha nile. Ha lere ndị nkwusa raara onwe ha nye, bụ́ ndị so Watch Tower Bible and Tract Society na-arụ ọrụ anya dị ka “ndị ikpeazụ” n’inwe ezi ọrụ ọ bụla e kenyere ha n’ozi Chineke. Ma n’ezie, ọ bụ ndị a, bụ́ ndị ndị ụkọchukwu ledara anya, natara otu shilling ahụ—bụ́ ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị nnọchianya e tere mmanụ nke Alaeze eluigwe nke Chineke. Matiu 19:30–20:16.
▪ Gịnị ka ubi vine ahụ na-anọchi anya ya? Ole ndị ka onye nwe ubi vine ahụ na ndị ahụ rụrụ ọrụ hour 12 na 1 hour na-anọchi anya ha?
▪ Olee mgbe ụbọchị ọrụ ihe atụ ahụ gwụsịrị, oleekwa mgbe a kwụrụ ndị ọrụ ụgwọ?
▪ Gịnị ka e sere onyinyo ya site n’ịkwụ otu shilling ahụ?