Isi 112
Ememe Ngabiga Ikpeazụ nke Jisọs Adịwo Nso
KA TUESDAY, Nisan 11, na-abịaru ná njedebe, Jisọs na-emechi ozizi ihe ọ na-ezi ndị ozi ya n’Ugwu Olive. Lee nnọọ ụbọchị oké ọrụ nke a bụworo! Ugbu a, ma eleghị anya, mgbe ọ na-alaghachi Betani maka ịnọ ọnọdụ abalị ahụ, ọ gwara ndị ozi ya, sị: “Unu matara na ụbọchị abụọ site n’ugbu a, a ga-eme ememe ngabiga, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ ka a kpọgbuo ya.”—NW.
O yiri ka Jisọs na ndị ozi ya nọrọ echi ya, bụ́ Wednesday, Nisan 12, n’arụghị oké ọrụ ọ bụla. N’ụnyaahụ ya, ọ baworo ndị ndú okpukpe mba n’ihu ọha, ọ matakwara na ha na-achọ ụzọ igbu ya. Ya mere, na Wednesday, o gosighị onwe ya n’ihu ọha, ebe ọ na-achọghị ka ihe ọ bụla gbochie ya iso ndị ozi ya mee Ememe Ngabiga ahụ n’anyasị nke echi ya.
Ka ọ dị ugbu a, onye isi nchụàjà na ndị okenye obodo ezukọtawo n’obí onye isi nchụàjà ahụ, bụ́ Kaịafas. N’ịbụ ndi mba Jisọs baara ha ụnyaahụ ka na-agbakasị ahụ, ha na-eme atụmatụ iji ụzọ aghụghọ jide ya wee gbuo ya. Ma ha nọgidere na-ekwu, sị: “Ọ bụghị n’ememe a, ka ụzụ wee ghara ịpụta n’etiti ndị Juu.” Egwu ndị obodo na-atụ ha, ebe ọ bụ na ihe Jisọs masịrị ha.
Mgbe ndị ndú okpukpe ahụ nọ na-eme ajọ atụmatụ ha igbu Jisọs, ha nwetara otu onye ọbịa. N’ịbụrụ ha ihe ijuanya, ọ bụ otu n’ime ndị ozi Jisọs, bụ́ Judas Iskarịọt, bụ́ onye ahụ Setan kụnyeworo n’ime ya echiche ọjọọ ahụ nke ịrara Onyenwe ya nye n’aka ndị iro! Lee ka ọ ga-esiworị nye ha obi ụtọ mgbe Judas jụrụ, sị: “Gịnị ka unu na-achọ inye m, mụ onwe m ga-ararakwa ya nye n’aka unu?” Ha ji obi ụtọ kwere ịkwụ ya 30 mkpụrụ ego ọlaọcha, bụ́ ọnụ ahịa a na-eji azụta ohu dị ka ọgbụgba ndụ Iwu Mosis si kwuo. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, Judas malitere ịchọ ohere dị mma ọ ga-eji rara Jisọs nye n’aka ha mgbe ìgwè mmadụ na-anọghị ya.
Nisan 13 malitere n’anwụ ọdịda nke Wednesday. Jisọs esiworị Jeriko bịarute na Friday, ya mere nke a bụ anyasị nke isii, bụrụkwa nke ikpeazụ ọ ga-anọ na Betani. N’echi ya, bụ́ Thursday, ọ ga-adị mkpa ime nkwadebe ikpeazụ maka Ememe Ngabiga ahụ, bụ́ nke ga-amalite n’anwụ ọdịda. Nke a bụ mgbe a na-aghaghị igbu nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ wee hụọ ya n’ọkụ n’ebekasịghị ya ebekasị. Olee ebe ha ga-anọ mee oriri ahụ, ọ̀ bụkwa onye ga-eme nkwadebe ndị dị mkpa?
Jisọs ekwubeghị ihe ndị ahụ, ma eleghị anya iji gbochie ime ka Judas nwee ike ịgwa ndị isi nchụàjà ka ha wee bịa jide Jisọs n’oge a na-eme Ememe Ngabiga ahụ. Ma ugbu a, ma eleghị anya ná mmalite ehihie Thursday, Jisọs dupụrụ Pita na Jọn site na Betani, na-asị: “Gaanụ, doziere anyị oriri ngabiga, ka anyị wee rie.”
Ha jụrụ sị, “Olee ebe ị na-achọ ka anyị dozie?”
“Mgbe unu batasịrị n’ime obodo a,” ka Jisọs na-akọwa, “otu nwoke nke bu ite mmiri ga-ezute unu; soonụ ya baa n’ụlọ nke ọ na-aba n’ime ya. Unu ga-asịkwa nna nwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sị gị, Olee ebe ụlọ ọbịa dị, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri ngabiga? Onye ahụ ga-egosikwa unu ime ụlọ ukwu dị n’elu ụlọ a kwadebeworo: dozienụ n’ebe ahụ.”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na onye nwe ụlọ ahụ bụ onye na-eso ụzọ Jisọs, onye ọ pụrụ ịbụ na ọ na-atụ anya arịrịọ Jisọs ga-arịọ ya ka e jiri ụlọ ya mee ihe omume nke a pụrụ iche. Otú o sina dị, mgbe Pita na Jọn bịarutere na Jerusalem, ha hụrụ ihe nile kpọmkwem otú Jisọs kwuru na ọ ga-adị. Ya mere, ha abụọ hụrụ na a kwadebere nwa atụrụ ahụ, na e mekwara ndokwa ndị ọzọ nile iji lekọta mmadụ iri na atọ ahụ ga-abịa Ememe Ngabiga ahụ, bụ́ Jisọs na ndị ozi ya iri na abụọ. Matiu 26:1-5, 14-19; Mak 14:1, 2, 10-16; Luk 22:1-13; Ọpụpụ 21:32.
▪ Gịnị ka o yiri ka Jisọs mere na Wednesday, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
▪ Nzukọ dị aṅaa ka e mere n’ụlọ onye isi nchụàjà, ọ̀ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa ka Judas ji jee ileta ndị ndú okpukpe ahụ?
▪ Òle ndị ka Jisọs dupụrụ gaa Jerusalem na Thursday, ọ̀ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa?
▪ Gịnị ka ndị a e zipụrụ hụrụ nke kpughekwara ọzọ, ike ọrụ ebube Jisọs nwere?