Isi 113
Iweda Onwe Ya Ala n’Ememe Ngabiga nke Ikpeazụ ahụ
PITA na Jọn, n’okpuru ntụziaka nke Jisọs, abịaruteworị Jerusalem ime nkwadebe maka Ememe Ngabiga ahụ. Ma eleghị anya, Jisọs, na ndị ozi iri ndị nke ọzọ, bịarutere n’uhuruchi. Anyanwụ amalitewo ịda ka Jisọs na ndị ya na ha so na-agbadata n’Ugwu Olive. Nke a bụ nke ikpeazụ Jisọs ga-esi n’elu ugwu nke a hụ obodo ahụ n’ehihie ruokwa mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ.
N’oge na-adịghị anya Jisọs na ndị ya na ha so bịarutere n’obodo ahụ wee garuo n’ụlọ ebe ha ga-anọ mee Ememe Ngabiga ahụ. Ha rịgoro stepụ dị n’ụlọ ahụ wee ruo n’ime ụlọ ahụ dị n’elu, bụ́ ebe ha hụrụ na e mesịwo nkwadebe nile maka Ememe Ngabiga ahụ nanị ha ga-eme. Jisọs elesiwo anya ihe omume nke a ike, dị ka o kwuru, sị: “Agụụ gụsiri m ike iso unu rie oriri ngabiga nke a mgbe mụ akahụghị ahụhụ.”
Dị ka omenala si dị, ndị na-ekere òkè n’Ememe Ngabiga na-aṅụ iko mmanya anọ. Mgbe ọ naara nke ihe àmà gosiri na ọ bụ iko nke atọ, Jisọs nyere ekele, wee sị: “Naranụ nke a, keekwa ya n’etiti onwe unu: n’ihi na asị m unu, M gaghị aṅụ ihe si n’osisi vine pụta ma ọlị site n’ugbu a, ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.”
N’otu mgbe n’oge nri ahụ, Jisọs biliri ọtọ, yipụ uwe elu ya, were otu ákwà nhicha ahụ, gbajuokwa mmiri n’otu efere. Dị ka o si adịkarị, onyenwe ụlọ na-ahụ na a sara ụkwụ onye ọbịa bịara na nke ya. Ma ebe ọ bụ na ọ dịghị onye bụ onye nwe ụlọ n’oge nke a, Jisọs hụrụ na e jere ozi onwe onye nke a. Nke ọ bụla n’ime ndị ozi ahụ pụrụ ijiworị ohere ahụ mee ihe ime nke a; ma, n’ihi na ma eleghị anya ha ka nwere nsọrịta mpì n’etiti onwe ha, ọ dịghị onye mere ya. Ugbu a ihere mere ha mgbe Jisọs malitere ịsa ụkwụ ha.
Mgbe Jisọs rutere n’ebe ọ nọ, Pita gbara isi akwara, sị: “Ị gaghị asa ụkwụ m ma ọlị.”
Jisọs sịrị, “Ọ bụrụ na asaghị m gị, mụ na gị enweghị òkè ọ bụla.”
Pita wee zaghachi sị, “Onyenwe anyị, ọ bụghị nanị ụkwụ m, kama aka m abụọ kwa na isi m.”
Jisọs zaghachiri sị, “Onye a saworo ahụ, mkpa ịsa ahụ ọzọ adịrịghị ya ma ọ bụghị ịsa ụkwụ ya, kama ahụ ya dum dị ọcha: unu onwe unu dịkwa ọcha, ma ọ bụghị unu nile.” O kwuru nke a n’ihi na ọ maara na Judas Iskarịọt na-eme atụmatụ ịrara ya nye.
Mgbe Jisọs sasịrị ụkwụ mmadụ 12 ahụ, gụnyere ụkwụ nke onye ahụ raara ya nye, bụ́ Judas, o yikwasịrị uwe elu ya wee nọdụghachi na table. Mgbe ahụ ọ jụrụ, sị: “Ùnu maara ihe m mewooro unu? Unu onwe unu na-akpọ m Onye ozizi, na, Onyenwe anyị: unu na-ekwukwa nke ọma; n’ihi na ọ bụ otú m dị. Ya mere, ọ bụrụ na mụ onwe m, bụ́ Onyenwe unu na Onye ozizi unu, sara ụkwụ unu, unu onwe unu na-ejikwa ụgwọ ịsarịta ụkwụ ibe unu. N’ihi na enyewo m unu ihe nṅomi, ka unu onwe unu wee na-emekwa dị ka mụ onwe m meere unu. N’ezie, n’ezie, asị m unu, Ohu adịghị aka onye nwe ya ukwuu; onye ozi adịghị akakwa onye zitere ya ukwuu. Ọ bụrụ na unu matara ihe ndị a, ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị unu ma a sị na unu na-eme ha.”
Lee nnọọ ezi ihe mmụta nke a bụ banyere mmadụ iweda onwe ya ala n’ije ozi! Ndị ozi ahụ ekwesịghị ịnọ na-achọ ọnọdụ mbụ, na-eche na ha dị oké mkpa nke na ndị ọzọ kwesịrị ịdị na-ejere ha ozi mgbe nile. Ọ dị mkpa ka ha gbasoo ihe nlereanya ahụ Jisọs setịpụrụ. Nke a abụghị nke ịsa ụkwụ dị ka omenala okpukpe. Ee e, kama ọ bụ nke ịdị njikere ije ozi n’eleghị mmadụ anya n’ihu, n’agbanyeghị otú o si bụrụ na ọrụ ahụ bụ ihe dị ala ma ọ bụ nke na-adịghị enye obi ụtọ. Matiu 26:20, 21; Mak 14:17, 18; Luk 22:14-18; 7:44; Jọn 13:1-17.
▪ Gịnị bụ ihe pụrụ iche banyere ọhụhụ Jisọs hụrụ Jerusalem mgbe ọ na-abanye obodo ahụ ime Ememe Ngabiga?
▪ N’oge Ememe Ngabiga ahụ, olee iko nke ihe àmà gosiri na ọ bụ ya ka Jisọs kesaara ndị ozi 12 ahụ mgbe o kpesịrị ekpere?
▪ Ozi onwe onye dị aṅaa ka a na-ejere ndị ọbịa dị ka omenala si dị n’oge Jisọs nọ n’elu ala, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka a na-ejighị jee ozi dị otú ahụ n’oge ememe Ngabiga ahụ Jisọs na ndị ozi ya mere?
▪ Gịnị bụ nzube Jisọs n’ije ozi ahụ dị ala nke ịsa ụkwụ ndị ozi ya?