Isi 127
E Liri Ya na Friday—Ili Tọgbọrọ n’Efu na Sunday
KA Ọ dị ugbu a, ọ bụ n’oge uhuruchi nke Friday, Ụbọchị Izu Ike nke Nisan 15 ga-amalitekwa mgbe anyanwụ dara. Ozu Jisọs kwụbara n’elu osisi ahụ, ma ndị ohi abụọ ahụ nọ n’akụkụ ya ka dị ndụ. A na-akpọ ehihie Friday ụbọchị Nkwadebe n’ihi na ọ bụ mgbe ndị mmadụ na-eji akwadebe ihe oriri, rụzuokwa ọrụ ndị ọzọ dị oké mkpa, bụ́ ndị na-apụghị ichere ruo mgbe Ụbọchị Izu Ike ahụ gasịrị.
Ụbọchị Izu Ike nke gaje ịmalite n’oge na-adịghị anya abụghị nanị Ụbọchị Izu Ike efu (ụbọchị nke asaa n’izu) kama ọ bụkwa Ụbọchị Izu Ike okpukpu abụọ ma ọ bụ “oké ụbọchị.” A na-akpọ ya nke a n’ihi na Nisan 15, nke bụ ụbọchị mbụ nke Ememe Achịcha Ekoghị Eko nke a na-eme ụbọchị asaa (nke na-abụkwa Ụbọchị Izu Ike mgbe nile, n’agbanyeghị ụbọchị ọ dabara na ya n’izu), dabakwara n’otu ụbọchị ahụ dị ka Ụbọchị Izu Ike nkịtị.
Dị ka Iwu Chineke si dị, a naghị ahapụ ozu ka ọ kwụba n’elu osisi ruo echi ya. N’ihi ya, ndị Juu gwara Paịlet ka e mee ka ọnwụ nke ndị ahụ a na-egbu egbu dịkwuo ngwa ngwa site n’ịkụjisị ha ụkwụ. N’ihi ya, ndị agha ahụ kụjisịrị ụkwụ ndị ohi abụọ ahụ. Ma ebe o yiri ka Jisọs ọ̀ nwụwo, a kụjighị ụkwụ nke ya. Nke a mezuru ihe ahụ e dere n’akwụkwọ nsọ, bụ: “A gaghị etiji otu ọkpụkpụ ya.”
Otú ọ dị, iji wepụ obi abụọ ọ bụla a na-enwe ma Jisọs ọ̀ nwụkwara anwụ n’ezie, otu n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ. Ube ahụ mapuru akụkụ ebe obi ya dị, ozugbo ahụ, ọbara na mmiri wee gbapụta. Jọn onyeozi, onye ji anya ya hụ ihe a nile, na-akọ na nke a mezuru ihe ọzọ e dere n’akwụkwọ nsọ: “Ha ga-elegide onye ahụ nke ha mapuru amapu.”
Onye ọzọ nọkwa oge a na-egbu ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ bụ Josef onye si n’obodo Arịmatịa, bụ́ onye a ma ama ná nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ. Ọ jụrụ ajụ ịkwado mmeso ikpe na-ezighị ezi nke ụlọ ikpe ukwu ahụ mesoro Jisọs. Josef bụ n’ezie onye na-eso ụzọ Jisọs, ọ bụ ezie na egwu na-atụ ya igosipụta onwe ya dị ka otu n’ime ha. Otú ọ dị, ugbu a, o ji obi ike mee ihe wee jekwuru Paịlet ịrịọ ka e bunye ya ozu Jisọs. Paịlet kpọrọ onye ọchịagha na-elekọta ebe ahụ, mgbe onye ọchịagha ahụ mesikwara ya ike na Jisọs anwụwo, Paịlet mere ka e bunye ya ozu ahụ.
Josef buuru ozu ahụ wee jiri ezi ákwà ọcha fụchie ya iji kwadebe ya maka olili. Nikọdimọs, bụ́ onye ọzọ sokwa ná nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ nyeere ya aka. Nikọdimọs ekwupụtaghịkwa okwukwe o nwere na Jisọs n’ihi egwu nke ọnọdụ ya ifunahụ ya. Ma ugbu a, o wetara ùkwù myrrh ruru otu narị pound [33 kilogram] n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị Rom na aloes dị oke ọnụ ahịa. E ji ákwà ozu nke ụ́dà ụtọ ndị a dị na ya wee kee ozu Jisọs, n’ụzọ ahụ ndị Juu na-esi akwadebe ozu maka olili.
Mgbe ahụ, ha tọgbọrọ ozu ahụ n’ili ọhụrụ nke Josef nke a wapụtara na nkume nke dị n’ubi a gbara ogige nke dị nso ebe ahụ. N’ikpeazụ, e ji otu nnukwute nkume buchie ọnụ ili ahụ. Iji wee lisịa ozu ahụ tupu Ụbọchị Izu Ike amalite, e mere ihe ngwa ngwa n’ịkwadebe ozu ahụ. Ya mere, Meri Magdalini na Meri nne Jemes nke Nta, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nọrịị na-enye aka ná nkwadebe ahụ, gbalara n’ụlọ ije kwadebe ụ́dà ụtọ na mmanụ ndị ọzọ na-esi ísì ụtọ. Atụmatụ ha bụ na mgbe Ụbọchị Izu Ike ahụ gasịrị, ha ga-etekwu ihe ndị ahụ n’ahụ Jisọs iji chebe ya ruo ogologo oge karị.
N’echi ya, nke bụ Saturday (Ụbọchị Izu Ike), ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jekwuuru Paịlet wee sị: “Onye nwe anyị, anyị chetara na onye nduhie ahụ sịrị, mgbe ọ nọ ná ndụ, Mgbe ụbọchị atọ gasịrị m ga-esi n’ọnwụ bilie. Ya mere, nye iwu ka e mechie ili ahụ sie ike ruo ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbịa zuru ya laa ma e leghị anya, wee sị ndị Juu, E mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie: njehie ikpeazụ a ga-ajọkwa njọ karịa nke mbụ.”
Paịlet zara, sị, “Unu nwere òtù ndị nche: labanụ, mechienụ ya sie ike, dị ka unu matara.” Ya mere ha lara wee mechisie ili ahụ ike site n’ịdọchi nkume ahụ n’ọnụ ya, debekwa ndị agha Rom dị ka ndị nche.
N’isi ụtụtụ Sunday, Meri Magdalini, Meri nne Jemes, ha na Salomi, Joana, na ndị inyom ndị ọzọ, wetara ụ́dà ụtọ dị iche iche n’ili ahụ iji tee ozu Jisọs. Mgbe ha nọ n’ụzọ, ha sịrịtara onwe ha: “Ònye ga-akpọhepụrụ anyị nkume ahụ n’ọnụ ụzọ ili?” Ma mgbe ha rutere n’ebe ahụ, ha hụrụ na ala ọma jijiji emewo, mmụọ ozi Jehova akpọhepụwokwa nkume ahụ. Ndị nche ahụ anọghịkwa ya, ili ahụ tọgbọkwa n’efu! Matiu 27:57–28:2; Mak 15:42–16:4; Luk 23:50–24:3, 10; Jọn 19:14, Jn 19:31–20:1; Jn 12:42; Levitikọs 23:5-7; Deuterọnọmi 21:22, 23; Abụ Ọma 34:20; Zekaraịa 12:10.
▪ N’ihi gịnị ka a na-eji akpọ Friday ụbọchị Nkwadebe, gịnị bụkwa “oké” Ụbọchị Izu Ike?
▪ Akụkụ akwụkwọ nsọ dịgasị aṅaa mezuru n’ihe banyere anụ ahụ Jisọs?
▪ Gịnị ka Josef na Nikọdimọs mere n’ihe banyere olili Jisọs, gịnị bụkwa njikọ dị n’etiti ha na Jisọs?
▪ Olee arịrịọ ndị nchụàjà ahụ rịọrọ Paịlet, ò sikwa aṅaa zaghachi?
▪ Gịnị mere n’isi ụtụtụ Sunday?