Isi 130
N’Osimiri Galili
NDỊ ozi ahụ lọghachiri na Galili ugbu a, dị ka Jisọs buwororịị ụzọ gwa ha ka ha mee. Ma ha ejighị n’aka ihe ha gaje ime n’ebe ahụ. Mgbe nwa oge nta gasịrị, Pita gwara Tọmas, Nataniel, Jemes na nwanne ya nwoke bụ Jọn, na ndị ozi abụọ ndị ọzọ, sị: “Ana m aga igbu azụ.”
“Anyị onwe anyị ga-esokwa gị jee,” ka mmadụ isii ahụ zaghachiri.
N’ime ogologo abalị ahụ dum, ha egbuteghị azụ ọ bụla. Otú ọ dị, mgbe chi na-amalite ịbọ, Jisọs pụtara n’akụkụ osimiri ahụ, ma ndị ozi ahụ amataghị na ọ bụ Jisọs. O tiri mkpu, sị: “Ụmụntakịrị, ùnu ji ihe oriri ọ bụla?”
Ha si n’ofè ọzọ nke mmiri ahụ tie mkpu zaghachi ya sị, “Ee e.”
“Wụnyenụ ihe unu ji egbu azụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ, unu ga-ahụkwa,” ka ọ sịrị. Mgbe ha mekwara nke a, ha enweghị ike ịdọgota ụ̀gbụ́ ha n’ihi azụ nile dị n’ime ya.
“Ọ bụ Onyenwe anyị,” ka Jọn tiri ná mkpu.
Ka ọ nụrụ nke a, Pita yikwasịrị uwe elu ya n’ihi na o yipụwo uwe ya na mbụ, maba n’ime osimiri ahụ. Mgbe ahụ o gwuru mmiri ihe dị ka 90 mita ruo ụsọ osimiri ahụ. Ndị ozi ndị ọzọ ahụ ji ụgbọ nta ahụ sochie ya, dọkpụrụ ụ̀gbụ́ ahụ nke jupụtara n’azụ na-aga.
Mgbe ha rutere n’akụkụ osimiri ahụ, ha hụrụ ọkụ e ji icheku fụnwuo nke a tụkwasịrị azụ n’elu ya, achịcha dịkwa n’ebe ahụ. Jisọs sịrị, “Wetanụ ụfọdụ n’ime azụ unu gburu ugbu a.” Pita gara n’ụgbọ ahụ wee dọgota ụgbụ ahụ n’elu ala. O nwere 153 azụ ndị buru ibu n’ime ya!
Jisọs kpọrọ ha òkù sị, “Bịanụ, rie nri ụtụtụ.”
Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha obi siri ike ịjụ sị, “Gị onwe gị bụ ònye?” n’ihi na ha nile matara na ọ bụ Jisọs. Nke a bụ mpụta nke ugbo asaa ọ pụtara kemgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, ọ bụkwa nke ugbo atọ ndị ozi ahụ hụrụ ya anya dị ka otu ìgwè. O wee nye ha nri ụtụtụ ugbu a, na-enye nke ọ bụla n’ime ha achịcha na azụ.
Mgbe ha risịrị nri, ma eleghị anya Jisọs legara anya n’ebe nnukwute azụ ahụ ha gbutere dị wee jụọ Pita, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ndị a?” Ma eleghị anya ihe o kwuru pụtara, Ì nwere mmasị n’ebe ọrụ igbu azụ dị karịa ka i nwere n’ọrụ ahụ nke m kwadebeworo gị ịrụ?
“Gị onwe gị matara na ị bụ enyi m,” ka Pita zaghachiri.
“Na-enye ụmụ atụrụ m nri,” ka Jisọs na-azaghachi.
Ọzọ, nke ugbo abụọ, ọ jụrụ, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?”
“Ee, Onyenwe anyị; gị onwe gị matara na ị bụ enyi m,” ka Pita ji ezi obi zaa.
Jisọs nyekwara iwu ọzọ sị, “Na-azụ atụrụ m.”
Mgbe ahụ, na nke ugbo atọ, ọ jụrụ, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, àbụ m enyi gị?”
Ugbu a, iwe amalitewo iwe Pita. Ọ pụrụ iche ma Jisọs ọ̀ na-arụ ụka ma yà bụkwa onye na-anọgidesi ike n’ihe. E kwuwerị, n’oge na-adịbeghị anya mgbe a na-ekpe Jisọs ikpe igbu ya, Pita gọpụrụ ugbo atọ na ya amaghị onye ọ bụ. Ya mere Pita sịrị: “Onyenwe anyị, gị onwe gị matara ihe nile; gị onwe gị maara na ị bụ enyi m.”
Jisọs nyere ya iwu nke ugbo atọ sị, “Na-enye atụrụ m nri.”
Jisọs si otú a jiri Pita mee ihe dị ka ihe nlereanya iji mee ka ndị ọzọ ghọta ịdị mkpa nke ọrụ ahụ ọ chọrọ ka ha rụọ. N’oge na-adịghị anya ọ gaje ịhapụ ụwa, ọ chọkwara ka ha na-ebute ụzọ n’ijere ndị ahụ a gaje ịdọrọ bata n’ime ogige atụrụ Chineke ozi.
Dị nnọọ ka e kere Jisọs agbụ ma gbuo ya n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ahụ Chineke nyere ya ịrụ, ọ na-ekpughe ugbu a na Pita gaje ịta ahụhụ yiri nke ahụ. Jisọs gwara ya sị, “Mgbe ị dị n’okorobịa, ị na-eke onwe gị ihe okike n’úkwù, na-ejegharịkwa ebe ị na-achọ: ma mgbe ị ga-eme agadi, ị ga-esetị aka gị abụọ, onye ọzọ ga-eke gị ihe okike n’úkwù, burukwa gị gaa ebe ị na-achọghị.” N’agbanyeghị ọnwụ Pita gaje ịnwụ n’ihi okwukwe ya, Jisọs gbara ume, sị: Soo m [“Nọgide na-eso m,” NW].”
Ka ọ na-echigharị, Pita hụrụ Jọn ma jụọ, sị: “Onyenwe anyị, ma onye a, gịnị ga-eme ya?”
“Ọ bụrụ na ana m achọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa,” ka Jisọs zara, “ọ̀ bụ gịnị n’ebe ị nọ? Gị onwe gị soo m.” Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ghọtara okwu Jisọs ịbụ na Jọn onyeozi agaghị anwụ anwụ ma ọlị. Otú ọ dị, dị ka Jọn onyeozi mesịrị kọwaa, Jisọs ekwughị na ya agajeghị ịnwụ anwụ, ma ihe Jisọs kwuru bụ nanị: “Ọ bụrụ na ana m achọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ bụ gịnị n’ebe ị nọ?”
Jọn mesịkwara kwuo ihe a dị mkpa: “Ma ọtụtụ ihe ọzọ nke Jisọs mere dịkwa, nke, ma ọ bụrụ na e dere ha n’akwụkwọ n’otu n’otu, ọ dị m ka ọbụna ụwa n’onwe ya agaghị anagide akwụkwọ a ga-ede.” Jọn 21:1-25; Matiu 26:32; 28:7, 10.
▪ Gịnị na-egosi na ndị ozi ahụ ejighị n’aka ihe ha kwesịrị ime na Galili?
▪ Olee otú ndị ozi ahụ si mata onye Jisọs bụ n’Osimiri Galili?
▪ Ugbo òle ka Jisọs meworo ka a hụ ya anya ugbu a kemgbe o bilitesịrị n’ọnwụ?
▪ Olee ụzọ Jisọs si mesie ike ihe ọ chọrọ ka ndị ozi ahụ mee?
▪ Olee otú Jisọs si gosi ụzọ Pita ga-esi nwụọ?
▪ Okwu dị aṅaa nke Jisọs kwuru banyere Jọn ka ndị na-eso ụzọ ahụ ghọtahiere?