Akụkụ nke 4
Chineke Na-agwa Anyị Banyere Nzube Ya Nile
1, 2. Ànyị si aṅaa mara na Chineke na-enye ndị ji obi eziokwu na-ajụ azịza?
CHINEKE nke na-ahụ n’anya kpughere nzube ya n’ezie nye ndị ji obi eziokwu na-achọ ya. O nyere ụmụ mmadụ ndị na-achọ ịmara, azịza nye ajụjụ ndị dị ka ihe mere o ji kwere ka ahụhụ dịrị.
2 Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ [Chineke], ọ ga-eme ka ị chọta ya.” “Ma Chineke dị, onye nọ n’eluigwe, nke na-ekpughe ihe nzuzo nile.” “N’ezie Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na o kpugheghị izu nzuzo ya nye ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma ya.”—1 Ihe Emere 28:9; Daniel 2:28; Emos 3:7.
Ebee Ka Azịza Ndị ahụ Dị?
3. Ebee ka anyị pụrụ ịchọpụta ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị?
3 A na-achọta azịza nye ajụjụ ndị dị ka ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị na ihe ọ ga-eme banyere ya n’ihe ndekọ nke o mere ka e dee maka abamuru anyị. Ihe ndekọ ahụ bụ Okwu ya, bụ́ Bible Nsọ. “Ihe ọ bụla e deworo n’Akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zi ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.
4, 5. Gịnị mere ka Bible bụrụ akwụkwọ pụrụ iche?
4 N’ezie, Bible bụ akwụkwọ pụrụ iche. O nwere ihe ndekọ kasị zie ezi banyere akụkọ ihe mere eme mmadụ, ọbụna laa azụ gafere okike mmadụ. O nwezukwara ihe ndị kwesịrị oge a, n’ihi na amụma ndị dị na ya metụtara ihe ndị na-eme n’oge anyị nakwa n’ọdịnihu dị nso.
5 Ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ nwere ihe àmà ndị a maka izi ezi nke akụkọ ihe mere eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụ nanị ihe odide ole na ole nke ndị edemede a maara aha ha n’oge ochie ka dị. Ma e nwere ọtụtụ ihe odide, ụfọdụ ezughị ezu ma ụfọdụ zuru, nke Bible: ihe dị ka 6,000 nke Akwụkwọ Nsọ Hibru (39 akwụkwọ dị iche iche nke “Agba Ochie”) na ihe dị ka 13,000 nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (27 akwụkwọ dị iche iche nke “Agba Ọhụrụ”).
6. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jiri n’aka na Bible e nwere taa bụ otu ihe ahụ n’ụzọ bụ isi dị ka ọ dị mgbe Chineke mere ka e dee ya?
6 Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ onye nyere ike e ji dee Bible, ahụwo na e chebere izi ezi nke ihe ndị e dekọrọ na ya n’ime ihe odide ndị ahụ. Ya mere Bible ndị anyị nwere taa bụkebe otu ihe ahụ dị ka ihe odide ndị ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee. Ihe ọzọ na-enyere anyị aka ịghọta nke a bụ na ihe odide ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst malitere ịdị laa azụ n’ime otu narị afọ nke oge e ji dee ihe odide ndị mbụ. Ihe odide ole na ole nke ndị oge ochie na-ede edemede bụ́ ndị ka dị ugbu a enwekebeghị nke malitere ịdị n’ime ọbụna ọtụtụ narị afọ nke ndị dere ha kpọmkwem.
Onyinye Chineke
7. Ruo ókè hà aṅaa ka e kesaworo Bible?
7 Bible bụ akwụkwọ a kasị kesaa n’akụkọ ihe mere eme. E biwo ihe dị ka ijeri atọ. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ bịara nso n’ọnụ ọgụgụ ahụ. A sụgharịwokwa Bible ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ gaa n’ihe dị ka 2,000 asụsụ dị iche iche. Otú a, e mere atụmatụ na 98 pasenti nke ọnụ ọgụgụ ndị bi na mbara ụwa anyị nwere ohere ịgụ Bible.
8-10. Olee ihe ụfọdụ mere o ji kwesị ekwesị ka anyị nyochaa Bible?
8 N’ezie, akwụkwọ nke na-ekwu na o sitere n’aka Chineke ma nwee ihe àmà nile ndị na-egosi izi ezi ya, kwesịrị ka anyị nyochaa ya.a Ọ na-akọwa nzube nke ndụ, ihe ọnọdụ ụwa pụtara, na ihe ọdịnihu nwere. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ pụrụ ime nke ahụ.
9 Ee, Bible bụ ụzọ Chineke si agwa ezinụlọ mmadụ okwu. O duziri odide ya site n’ike ọrụ Ya, ma ọ bụ mmụọ, site n’iji ihe dị ka 40 mmadụ ndị dekọrọ ya mee ihe. Otú a, Chineke na-agwa anyị okwu site n’Okwu ya, bụ́ Bible Nsọ. Onyeozi bụ Pọl dere, sị: “Mgbe unu natara okwu nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, bụ́ okwu nke Chineke, ọ bụghị okwu mmadụ ka unu naara nke ọma, kama, otú ọ dị n’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.
10 Abraham Lincoln, bụ́ onye isi ala nke 16 nke mba United States, kpọrọ Bible “onyinye kasị mma Chineke nyetụworo mmadụ . . . Ma ọ bụghị ya, anyị agaghị ama ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ.” Ya mere, gịnị ka onyinye nke a kachasị na-agwa anyị banyere otú ahụhụ si malite, ihe mere Chineke ji kwere ka ọ dịrị, na ihe ọ ga-eme banyere ya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka inweta ihe ọmụma ka saa mbara banyere izi ezi nke Bible, lee akwụkwọ ahụ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1989.
[Foto dị na peeji nke 10]
Bible, nke Chineke mere ka e dee, bụ ụzọ o si agwa ezinụlọ mmadụ okwu