Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • pr nkebi 2 p. 6-10
  • Ònye Pụrụ Ịgwa Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Pụrụ Ịgwa Anyị?
  • Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Ọ̀ Malitere ná Ndabara?
  • Nhazi Chọrọ Onye Nhazi
  • Ihe Bible Na-ekwu
  • “Oké Ọrụ”
  • Otú Anyị Pụrụ Isi Mara na Chineke Dị
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Nwee Mmasị n’Ihe E Kere Eke Mata Onye Kere Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • À Pụrụ Inwe Ihe E Kere Eke n’Enweghị Onye Okike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Ikwere na Chineke?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
pr nkebi 2 p. 6-10

Nkebi nke 2

Ònye Pụrụ Ịgwa Anyị?

1, 2. Gịnị bụ ụzọ kasị mma isi chọpụta ihe bụ nzube nke ihe a haziri?

1 Ònye pụrụ ịgwa anyị ihe bụ n’ezie nzube nke ndụ? Ọ dị mma, ọ bụrụ na ileta onye nhazi ígwè ọrụ ma hụ ka ọ na-arụ ọrụ n’ígwè ọrụ dị mgbagwoju anya nke ị na-amataghị, olee otú ị pụrụ isi chọpụta ihe e ji ya eme? Ụzọ kasị mma ga-abụ gị ịjụ onye nhazi ahụ.

2 Mgbe ahụ, gịnị banyere nhazi dị ebube anyị na-ahụ n’akụkụ anyị nile n’ụwa, dị ka n’ihe nile dị ndụ, gbadaa ruo ná mkpụrụ ndụ kasị nta na-adị ndụ? Ọbụna molecule na atọm ndị dị nta nke ukwuu karị n’ime mkpụrụ ndụ bụ ndị a haziri, dịrịkwa n’usoro, n’ụzọ dị egwu. Gịnịkwa banyere uche mmadụ a haziri n’ụzọ dị ebube? Gịnịkwa banyere usoro mbara ụwa anyị, na ụyọkọ kpakpando anyị bụ́ Milky Way, na eluigwe na ala? Ọ̀ bụ na nhazi ndị a dị egwu achọghị Onye Nhazi? N’ezie ọ pụrụ ịgwa anyị ihe mere o ji hazie ihe ndị dị otú ahụ.

Ndụ Ọ̀ Malitere ná Ndabara?

3, 4. Olee ọ̀tụ̀tụ̀ ikwe mee e nwere na ndụ sitere n’ihe ndabara?

3 Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana rịbara “ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ nke ịdị mgbagwoju anya na nke nhazi n’ihe ndị e kere eke” ama wee kwuo, sị: “Ntụle chiri anya nke okooko osisi, ahụhụ, ma ọ bụ anụ ndị na-enye nwa ha ara na-egosi nhazi nke akụkụ dị iche iche n’izi ezi nke fọrọ nke nta ka o yie ihe a na-apụghị ikweta ekweta.” Onye Britain na-enyocha mbara igwe bụ́ Sir Bernard Lovell, ka ọ na-ezo aka ná mmiri ọgwụ ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ dere, sị: “Ohere nke . . . ihe ndabara iduje ná mmepụta nke otu n’ime molecule kasị nta nke protein bụ ihe pere mpe gabiga ókè. . . . N’ụzọ dị irè, ọ pụghị ime eme ma ọlị.”

4 N’otu aka ahụ, onye nnyocha mbara igwe bụ́ Fred Hoyle kwuru, sị: “Ọdịdị dum nke nkà mmụta ihe ndị dị ndụ ọha na-anakwere ka na-ekwu na ndụ nọkatara malite. Ma dị ka ndị ọkà ná mmụta ihe ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ na-achọpụtakwu banyere ịdị mgbagwoju anya dị egwu nke ndụ, o doro anya na ohere nke ya ịmalite site ná mberede dị nta nke ukwuu nke na a pụrụ iwere ya n’ihe na-apụghị ime eme ma ọlị. Ndụ apụghị ịmalitewo ná ndabara.”

5-7. Olee otú mmụta banyere ihe ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ si egosi na ihe ndị dị ndụ apụghị isiteworị n’ihe ndabara?

5 Mmụta ihe ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ, otu n’ime akụkụ ihe ọmụmụ sayensị ndị kasị ọhụrụ, bụ ọmụmụ ihe nke ihe ndị dị ndụ n’ihe banyere ụkpụrụ ebumpụta ụwa dị n’ime mkpụrụ ndụ, molecule, na atọm dị iche iche. Onye ọkà ná mmụta ihe ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ bụ́ Michael Denton kwuru okwu banyere ihe ọ chọpụtaworo: “Ịdị mgbagwoju anya nke ụdị mkpụrụ ndụ kasị mfe a maara dị ukwuu nke ukwuu nke na ọ bụ ihe na-apụghị ikwe mee ịnakwere na ihe dị otú ahụ bụ nke a pụrụ ịtụkọta ọnụ na mberede site n’ihe omume a na-achịkwaghị achịkwa nke na-eyitụghị ihe pụrụ ime eme.” “Ma ọ bụghị nanị ịdị mgbagwoju anya nke usoro ihe ndị dị ndụ nke bụ oké ihe ịma aka, e nwekwara ọ̀tụ̀tụ̀ ọgụgụ isi dị oké elu nke a na-ahụkarị nnọọ ná nhazi ha.” “Ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke molecule ka . . . ọgụgụ isi dị ná nhazi ihe dị ndụ na izu okè nke ihe mgbaru ọsọ ndị e nwetara na-apụtakarị ìhè.”

6 Denton gara n’ihu ikwu, sị: “Ebe ọ bụla anyị lere anya, ime ebe ọ bụla anyị lenyere anya, anyị na-ahụ oké ịma mma na ọgụgụ isi nke ọdịdị dị elu gabigara ókè, nke na-emegide n’ụzọ dị ukwuu echiche nke ihe ndabara. Ọ̀ bụ nnọọ ezie na usoro ndị a na-ahazighị ahazi pụrụ iwuwo ihe dị adị, ihe kasị dị nta nke​—⁠protein ma ọ bụ ụkpụrụ ebumpụta ụwa dị n’ime mkpụrụ ndụ nke na-arụ ọrụ⁠—​dị mgbagwoju anya gabiga ikike mmepụta ihe nke anyị, ịdị adị nke bụ kpọmkwem ihe megidere ndabara, nke karịrị n’akụkụ ọ bụla ihe ọ bụla e mepụtara site n’ọgụgụ isi mmadụ?” O kwukwara, sị: “N’agbata mkpụrụ ndụ dị ndụ na usoro ihe ndị na-adịghị ndụ nke kasị dịrị n’usoro, dị ka nkume crystal ma ọ bụ mpekere snow, e nwere olulu ọdịiche buru oké ibu ma doo anya dị ka a pụrụ iche n’echiche.” Onye prọfesọ mmụta physics kwa, bụ́ Chet Raymo kwuru, sị: “O nyeghị m ọnụ okwu . . . Molecule nke ọ bụla yiri ihe a haziri n’ụzọ dị ebube maka ọrụ ya.”

7 Ọkà ná mmụta ihe ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ bụ́ Denton kwubiri na “ndị ka gbara isi akwara na-akwado na ịdị adị ọhụrụ a dum bụ ihe sitere kpọmkwem n’ihe ndabara” na-ekwenye n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. N’ezie, ọ na-akpọ nkwenkwe Darwin banyere ihe ndị dị ndụ isite n’ihe ndabara “oké akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme narị afọ nke iri abụọ banyere mmalite usoro ụwa.”

Nhazi Chọrọ Onye Nhazi

8, 9. Nye ihe atụ nke na-egosi na ihe ọ bụla a haziri aghaghị inwe onye nhazi.

8 Echiche nke na ihe ndị na-adịghị ndụ pụrụ ịmalite ịdị ndụ ná ndabara, site n’ihe mberede na-adịghị n’usoro, eyitụdịghị eziokwu nke na ọ pụghị ime eme. Ee e, ihe ndị dị ndụ a haziri n’ụzọ magburu onwe ha n’elu ụwa apụghị isitewo n’ihe mberede, ebe ọ bụ na ihe ọ bụla a haziri ahazi aghaghị inwe onye haziri ya. Ọ̀ dị ihe ị maara pụrụ iche? E nweghị. Ka ihe na-adịkwa mgbagwoju anya karị n’ụzọ e si hazie ya, otú ahụ ka onye nhazi ya na-aghaghị inwe ikike karị.

9 Anyị pụkwara ime ihe atụ okwu a n’ụzọ dị otú a: Mgbe anyị hụrụ ihe osise, anyị na-ekwere na onye na-ese ihe dị. Mgbe anyị gụrụ akwụkwọ, anyị na-ekwere na onye na-ede akwụkwọ dị. Mgbe anyị hụrụ ụlọ, anyị kwere na owu ụlọ dị. Mgbe anyị hụrụ ọkụ nduzi nke okporo ụzọ, anyị na-amara na òtù na-eme iwu dị. Ndị mere ihe ndị ahụ nile nwere nzube mere ha ji mee ihe. Ọ bụkwa ezie na ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị aghọtacha banyere ndị haziri ha, anyị adịghị arụ ụka ma ndị ahụ hà dị adị.

10. Ihe àmà dị aṅaa nke Onye Nhazi Kasị Elu ka a pụrụ ịhụ?

10 N’otu aka ahụ, a pụrụ ịhụ ihe àmà ịdị adị nke Onye Nhazi Kasị Elu ná nhazi, usoro, na mgbagwoju anya nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa. Ha nile nwere akara nke Ọgụgụ Isi Kasị Elu. Nke a bụkwa eziokwu banyere nhazi, usoro, na mgbagwoju anya nke eluigwe na ala na ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando dị na ya, nke ọ bụla na-enwe ọtụtụ ijeri kpakpando. Iwu ndị doro anya, dị ka ndị na-ahụ maka mmegharị ahụ, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ, ìhè, ụ̀zụ̀, ikike ndọta, na ike ndọda, na-achịkwakwa ihe dị iche iche ná mbara igwe. À pụrụ inwe iwu dị iche iche n’enweghị onye na-eme iwu? Ọkà mmụta sayensị banyere ụgbọ elu rọket bụ́ Dr. Wernher von Braun kwuru, sị: “Iwu ndị sitere n’okike nke eluigwe na ala ziri ezi nke ukwuu nke na anyị enweghị nsogbu ọ bụla iwu ụgbọ mbara igwe ifega n’ọnwa, nweekwa ike ikwu oge maka ofufe ụgbọ ahụ ruo kpọmkwem na sekọnd ya. A ghaghị inwe onye guzobere iwu ndị a.”

11. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji jụ ịdị adị nke Onye Nhazi Kasị Elu nanị n’ihi na anyị apụghị ịhụ ya anya?

11 N’eziokwu, anyị apụghị iji anya nkịtị anyị hụ Onye Nhazi na Omeiwu Kasị Elu ahụ anya. Ma ànyị na-agbagha ịdị adị nke ihe ndị ahụ dị ka ike ndọda, ike ndọta, eletrik, ma ọ bụ ụzarị redio nanị n’ihi na anyị apụghị ịhụ ha? Ee e, anyị adịghị eme otú ahụ n’ihi na anyị na-ahụ ike ha na-akpa. Mgbe ahụ n’ihi gịnị ka anyị ga-eji gbaghaa ịdị adị nke Onye Nhazi na Omeiwu Kasị Elu nanị n’ihi na anyị apụghị ịhụ ya, mgbe anyị pụrụ ịhụ ihe ndị sitere n’aka ọrụ ya dị ịtụnanya?

12, 13. Gịnị ka ihe àmà na-ekwu banyere ịdị adị nke Onye Okike?

12 Paul Davies, bụ́ prọfesọ mmụta physics, na-ekwubi na ịdị adị mmadụ abụghị nnọọ ihe mberede nke akara aka. Ọ na-ekwu, sị: “E bu n’uche n’ezie ka anyị nọrọ ebe a.” O kwukwara banyere eluigwe na ala, sị: “Site n’ọrụ sayensị m, ekwerewo m n’ụzọ siri ike karị na eluigwe na ala a na-ahụ anya bụ nke e ji ọ̀tụ̀tụ̀ ọgụgụ isi nke na-atụ n’anya nke ukwuu guzobe nke na apụghị m ịnakwere ya dị ka ihe dị adị nke a na-echebaraghị echiche. O yiri m ka a ghaghị inwe ọ̀tụ̀tụ̀ nkọwa dị omimi karị.”

13 Otú a, ihe àmà na-agwa anyị na eluigwe na ala, ụwa, na ihe ndị dị ndụ n’elu ụwa apụghị isitewo nanị n’ihe ndabara. Ha dum na-agba akaebe n’ekwupụtaghị okwu maka Onye Okike dị ike, nke nwere ọgụgụ isi dị elu.

Ihe Bible Na-ekwu

14. Gịnị ka Bible na-ekwubi banyere Onye Okike?

14 Bible, akwụkwọ kasị ochie nke ihe a kpọrọ mmadụ, na-enwe otu nkwubi okwu ahụ. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Hibru, nke Pọl onyeozi dere, a gwara anyị, sị: “N’ihi na ezinụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya; ma onye rụrụ ihe nile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, nke Jọn onyeozi dere, na-ekwukwa, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, i kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.”​—⁠Mkpughe 4:11.

15. Olee otú anyị pụrụ isi hụta àgwà ụfọdụ nke Chineke?

15 Bible na-egosi na ọ bụ ezie na a pụghị ịhụ Chineke anya, a pụrụ ịhụta ụdị Chineke ọ bụ site n’ihe o mere. Ọ na-ekwu, sị: “Àgwà [Onye Okike] ndị ahụ anya na-adịghị ahụ, ya bụ ikike na ịbụ chi ebighị ebi ya, ka a hụworo, eri mgbe ụwa malitere, nye anya nke uche, n’ihe ndị o meworo.”​—⁠Ndị Rom 1:20, The New English Bible.

16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ọṅụ na ụmụ mmadụ apụghị ịhụ Chineke?

16 Ya mere Bible na-esi n’ihe kpatara ihe kpọrọ anyị gaa n’ihe ọ kpatara. Ihe ọ kpatara​—⁠ihe ndị dị egwu e mere⁠—​bụ ihe àmà nke Ihe Kpatara Ihe nke dị ike, nwere ọgụgụ isi: Chineke. Ọzọ, anyị pụrụ inwe ekele na a pụghị ịhụ ya anya, ebe ọ bụ na dị ka Onye Okike nke eluigwe na ala nile, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere ike dị ukwuu nke na ụmụ mmadụ nke anụ ahụ na ọbara apụghị ịtụ anya ịhụ ya anya ma nọgide ndụ. Nke ahụ bụkwa nnọọ ihe Bible na-ekwu: “Mmadụ agaghị ahụ [Chineke] anya, dịkwa ndụ.”​—⁠Ọpụpụ 33:20.

17, 18. N’ihi gịnị ka echiche nke ịdị adị nke Onye Okike kwesịrị iji dị anyị mkpa?

17 Echiche nke Onye Nhazi Ukwu, Onye Kasị Elu​—⁠Chineke⁠—​kwesịrị ịdị oké mkpa nye anyị. Ọ bụrụ na Onye Okike mere anyị, mgbe ahụ ọ ghaghị inwe ihe mere, bụ́ nzube, o ji kee anyị. Ọ bụrụ na e kere anyị inwe nzube ná ndụ, mgbe ahụ e nwere ihe mere a ga-eji nwee olileanya na ihe ga-akara anyị mma n’ọdịnihu. Ma ọ bụghị otú ahụ, anyị ga-adị ndụ nanị ma nwụọ n’enweghị olileanya. Ya mere ọ dị oké mkpa ka anyị chọpụta ihe bụ nzube Chineke maka anyị. Mgbe ahụ anyị pụrụ ịhọrọ ma anyị chọrọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya ma ọ bụ na anyị agaghị ebi.

18 Ọzọ, Bible na-ekwu na Onye Okike ahụ bụ Chineke na-ahụ n’anya nke na-eche banyere anyị nke ukwuu. Pita onyeozi kwuru, sị: “Ihe nile banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7; leekwa Jọn 3:16 na 1 Jọn 4:​8, 16.) Otu ụzọ anyị pụrụ isi hụ ókè hà aṅaa ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi bụ site n’ịtụle ụzọ dị ebube o siworo mee anyị, n’uche na n’elu ahụ.

“Oké Ọrụ”

19. Eziokwu dị aṅaa ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid na-akpọtụrụ anyị uche ya?

19 N’ime Bible ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwetara, sị: “E jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.” (Abụ Ọma 139:14) N’ezie nke ahụ bụ eziokwu, n’ihi na Onye Nhazi Kasị Elu haziri ụbụrụ na ahụ mmadụ n’ụzọ dị ebube.

20. Olee otú otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma si kọwaa ụbụrụ mmadụ?

20 Dị ka ihe atụ, ụbụrụ gị dị mgbagwoju anya nke ukwuu karịa kọmputa ọ bụla. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-asị: “Nzirịta ozi n’ime usoro ịrụ ọrụ ụbụrụ dị mgbagwoju anya karịa usoro nkwurịta okwu telifon bukarịsịrị ibu; ikike inye azịza ihe dị iche iche nke ụbụrụ mmadụ nwere ji ihe dị nnọọ ukwuu karịa ikike nke kọmputa ndị kasị dị ike.”

21. Mgbe anyị hụrụ ihe ụbụrụ na-eme, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi?

21 A kwakọbara ọtụtụ narị nde ihe ndị mere eme na onyinyo dị iche iche n’ụbụrụ gị, ma ọ bụghị nanị ụlọ nkwakọba ihe ndị mere eme. Ị pụrụ iji ya mụta ịkpọ mkpọrọhịhị, ime achịcha, ịsụ asụsụ ala ọzọ, iji kọmputa eme ihe, ma ọ bụ ife ụgbọ elu. Ị pụrụ iche echiche otú oge ezumike ga-adị ka ya ma ọ bụ otú mkpụrụ osisi ga-esi tọọ ụtọ. Ị pụrụ ịtụle ma mee ihe dị iche iche. Ị pụrụ ime atụmatụ, mata uru ihe, hụ n’anya, ma were echiche gị tụlee ihe ndị gara aga, ihe ndị dị ugbu a, na ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ebe anyị bụ́ mmadụ apụghị ịhazi ihe dị ka ụbụrụ mmadụ dị egwu, mgbe ahụ o doro anya na Onye nke haziri ya nwere amamihe na ikike karịrị nke mmadụ ọ bụla nke ukwuu.

22. Gịnị ka ndị mmụta sayensị kwenyere banyere ụbụrụ mmadụ?

22 Banyere ụbụrụ, ndị mmụta sayensị kwetara, sị: “Otú ígwè ọrụ nke a e mere n’ụzọ dị ebube, nke dị n’usoro ma dịkwa oké mgbagwoju anya si arụ ọrụ ndị a bụ nnọọ ihe a na-apụghị ịghọta. . . . Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla ụmụ mmadụ ga-enwe ike inweta azịza nye ihe ijuanya nile e nwere n’otu n’otu bụ́ ndị ụbụrụ na-ewepụta.” (Scientific American) Onye prọfesọ mmụta physics bụ́ Raymo na-asịkwa: “Ọ bụrụ na a sị kwuo eziokwu, anyị a ka amụtabeghị ihe dị ukwuu otú ụbụrụ mmadụ si echekwa ihe ọmụma, ma ọ bụ otú o si enwe ike ịkpọlite ihe ndị dị ná ncheta mgbe ọ bụla ọ chọrọ. . . . E nwere ihe ruru otu narị ijeri mkpụrụ ndụ akwara na-ebu ozi n’ahụ n’ụbụrụ mmadụ. Mkpụrụ ndụ nke ọ bụla na-ekere òkè ná nzirịta ozi, ya na ọtụtụ puku mkpụrụ ndụ ndị ọzọ site n’usoro ihe nzipụ ozi yiri osisi. Ohere ndị e nwere maka iso ndị ọzọ mekọrịta ihe na-eju anya nke ukwuu.”

23, 24. Kpọọ aha ụfọdụ akụkụ ahụ a haziri n’ụzọ dị ebube, okwu dị aṅaa ka otu injinia kwukwara?

23 Anya gị na-ahụzi ihe nke ọma ma na-anọzi n’ọnọdụ ọ bụla dịnụ karịa kamera ọ bụla; n’ezie, ha bụ kamera na-arụrụ onwe ha ọrụ n’akụkụ nile, jiri aka ha ahazi onwe ha ile ihe nke ọma, na-ahụ ụcha dị iche iche, ma na-ahụ ihe ndị na-emegharị emegharị. Ntị gị pụrụ ịmata ụdị ụ̀zụ̀ dị iche iche ma nye gị echiche nke nduzi na nguzozi. Obi gị bụ pọmpụ nke nwere ikike ndị injinia kasị mma na-enwebeghị ike ime ihe yiri ya. Ihe ndị ọzọ magburu onwe ha bụ akụkụ ahụ ndị ọzọ: imi, ire, usoro ngweri nri, na aka gị, ka a kpọtụ ole na ole aha.

24 Otú a, otu injinia e were ọrụ ịhazi na iwu otu nnukwute kọmputa tụgharịrị uche, sị: “Ọ bụrụ na ígwè kọmputa m chọrọ onye nhazi, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị otú ahụ nke ukwuu karị banyere ígwè ọrụ ahụ dị mgbagwoju anya nke ihe mejupụtara ya bụ akụkụ ahụ dị iche iche, usoro mmiri ọgwụ, na usoro nke ndụ, nke bụ ahụ mmadụ m​—⁠nke bụ n’aka nke ọzọ, akụkụ dị nta nke ukwuu nke usoro mbara igwe na ala, bụ́ nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o nweghị nsọtụ?”

25, 26. Gịnị ka Onye Nhazi Ukwu ahụ ga-enwe ike ịgwa anyị?

25 Dị ka ndị mmadụ bu nzube n’uche mgbe ha mere ụgbọ elu, kọmputa, ịnyịnya ígwè, na ihe ndị ọzọ, otú ahụ ka Onye Nhazi nke ụbụrụ na ahụ mmadụ na-aghaghị inwe nzube n’ịhazi anyị. Onye Nhazi nke a aghaghịkwa inwe amamihe karịrị nke ụmụ mmadụ, ebe ọ na-adịghị onye n’ime anyị nke pụrụ ime ihe ndị yiri ihe ndị ọ haziri. Mgbe ahụ, ezi uche dị na ya na ọ bụ ya bụ Onye pụrụ ịgwa anyị ihe mere o ji hazie anyị, ihe mere o ji tinye anyị n’ụwa, na ebe anyị na-aga.

26 Mgbe anyị mụtara ihe ndị ahụ, mgbe ahụ a pụrụ iji ụbụrụ na ahụ dị ebube Chineke nyere anyị mee ihe iji mezuo nzube anyị ná ndu. Ma olee ebe anyị pụrụ isi mụta banyere nzube ya nile? Ebee ka o nyere anyị ihe ọmụma ahụ?

[Foto dị na peeji nke 7]

Ụzọ kasị mma isi chọpụta ihe mere e ji rụpụta ihe bụ ịjụ onye rụrụ ya

[Foto dị na peeji nke 8]

A pụrụ ịhụ ịdị mgbagwoju anya na nhazi nke ihe ndị dị ndụ n’ime “molecule DNA”

[Foto dị na peeji nke 9]

“Ikike inye azịza ihe dị iche iche nke ụbụrụ mmadụ nwere ji ihe dị nnọọ ukwuu karịa ikike nke kọmputa ndị kasị dị ike”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya