Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • pr nkebi 4 p. 16-19
  • Krisendọm Emechuwo Chineke na Bible Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Krisendọm Emechuwo Chineke na Bible Ihu
  • Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozizi Ndị Na-adịghị na Bible
  • Omume Dị Iche Iche nke Asọpụrụghị Chineke
  • Ọ Bụghị nke Kraịst
  • Ikpe Chineke Megide “Onye Ahụ Na-emebi Iwu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ikpe Jehova Megide Ndị Ozizi Ụgha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Kraịst Adịgboroja Hà Nọchiri Anya Jeruselem Oge Ochie?
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Ebe Mgbaba Ha—Okwu Ụgha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
pr nkebi 4 p. 16-19

Nkebi nke 4

Krisendọm Emechuwo Chineke na Bible Ihu

1, 2. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-ejighị akwanyere Bible ùgwù, ma gịnị ka Bible na-ekwu?

1 Ndị mmadụ n’ọtụtụ ala ezerewo Bible, gharakwa inwe nkwanye ùgwù maka ya n’ihi àgwà ọjọọ nke ndị na-azọrọ na ha na-agbaso ya. N’ala ụfọdụ e kwuwo na Bible bụ akwụkwọ nke na-eduga n’agha, na ọ bụ akwụkwọ ndị ọcha, nakwa na ọ bụ akwụkwọ na-akwado ọchịchị ndị ala ọzọ ịchị mba ọzọ. Ma echiche ndị ahụ hiere ụzọ.

2 Bible, nke e dere n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, adịghị akwado agha ọchịchị ndị ala ọzọ na nrigbu anyaukwu bụ́ ndị e meworo n’aha Iso Ụzọ Kraịst ruo ogologo oge otú a. N’ụzọ megidere nke ahụ, site n’ịgụ Bible na ịmụta nkụzi nile nke ezi Iso Ụzọ Kraịst nke Jisọs kụziri, ị ga-ahụ na Bible katọsiri ike ibu agha, omume rụrụ arụ, na irigbu ndị ọzọ. Ihe bụ nsogbu bụ n’ebe ndị anyaukwu nọ, ọ bụghị na Bible. (1 Ndị Kọrint 13:​1-⁠6; James 4:1-⁠3; 5:1-⁠6; 1 Jọn 4:​7, 8) Ya mere ekwela ka àgwà na-ezighị ezi nke ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị bụ́ ndị na-ebi ndụ megidere ndụmọdụ ọma nke Bible gbochie gị irite uru site n’akụ ya nile.

3. Gịnị ka eziokwu nke akụkọ ihe ndị mere eme na-egosi banyere Krisendọm?

3 Ndị si na mba nile nke Krisendọm so ná ndị na-adịghị ebi ndụ kwekọrọ na Bible. A na-akọwa “Krisendọm” dị ka akụkụ nke ụwa ebe Iso Ụzọ Kraịst nwere ikike karị. Ọ bụkarịrị ụwa Ọdịda Anyanwụ na usoro chọọchị ya nile, nke site n’ihe dị ka narị afọ nke anọ O.A. ghọrọ ihe a ma ama. Krisendọm enwewo Bible ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ụkọchukwu ya na-azọrọkwa na ha na-akụzi ya ma bụrụkwa ndị nnọchianya Chineke. Ma ndị ụkọchukwu na ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm hà na-akụzi eziokwu? Omume ha ọ̀ na-anọchite anya Chineke na Bible n’ezie? Iso Ụzọ Kraịst ọ̀ dị irè n’ezie n’ime Krisendọm? Ee e. Eri okpukpe ya ghọrọ ihe a ma ama na narị afọ nke anọ, Krisendọm anwapụtawo onwe ya ịbụ onye iro nke Chineke na Bible. Ee, ihe ndị bụ eziokwu n’akụkọ ihe mere eme na-egosi na Krisendọm emechuwo Chineke na Bible ihu.

Ozizi Ndị Na-adịghị na Bible

4, 5. Ozizi ndị dị aṅaa na-adịghị na Bible ka chọọchị dị iche iche na-akụzi?

4 Ozizi ndị bụ isi nke Krisendọm dabeere n’akụkọ ọdịbendị oge ochie ndị na-emeghị eme​—⁠ndị nke Gris, Ijipt, Babilọn, na ndị ọzọ​—⁠ọ bụghị na Bible. A dịghị achọta nkụzi ndị dị ka na e kenyere mkpụrụ obi mmadụ anwụghị anwụ, ntaramahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, na Atọ n’Ime Otu (ndị atọ n’otu Chiatọ) n’ime Bible.

5 Dị ka ihe atụ, tụlee nkụzi nke na a ga-ata ndị ọjọọ ahụhụ ruo ebighị ebi n’ime hell nke na-ere ọkụ. Olee otú echiche nke a dị gị n’ahụ? Ọ na-akpasu ọtụtụ ndị iwe. Ha na-ahụ ya dị ka ihe ezi uche na-adịghị ya na Chineke ga-ata ụmụ mmadụ ahụhụ ruo ebighị ebi, na-edebe ha n’ihe mgbu na-afụ oké ụfụ. Echiche obi ịta mmiri dị otú ahụ ekwekọghị na Chineke nke Bible, n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Bible na-ekwu ihe doro anya na nkụzi dị otú ahụ ‘abatabeghị n’obi’ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.​—⁠Jeremaịa 7:31; 19:5; 32:35.

6. Olee otú Bible si ekwu ihe megidere nkụzi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?

6 Taa ọtụtụ okpukpe, gụnyere chọọchị nile nke Krisendọm, na-akụzi na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, bụ́ nke na-aga eluigwe ma ọ bụ hell mgbe a nwụrụ. Nke a abụghị nkụzi Bible. Kama nke ahụ, Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma banyere ndị nwụrụ anwụ, ha adịghị ama ihe ọ bụla, . . . n’ihi na e nweghị ọrụ ma ọ bụ atụmatụ ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe na Sheol [ili], ebe nke ị na-aga.” (Eklisiastis 9:​5, 10, NW) Onye ọbụ abụ ahụ na-ekwukwa na n’ọnwụ, mmadụ ‘na-alaghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.’​—⁠Abụ Ọma 146:4.

7. Gịnị bụ ahụhụ e nyere Adam na Iv maka imebi iwu Chineke?

7 Chetakwa na mgbe Adam na Iv mebiri iwu Chineke, ntaramahụhụ ha abụghị anwụghị anwụ. Nke ahụ gaara abụworị nkwụghachi ụgwọ ọma, ọ bụghị ahụhụ! Kama nke ahụ, a gwara ha na ha “ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta [ha].” Chineke mesiri ya ike nye Adam, sị: “N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) Otú a, nkụzi nke ikenye mkpụrụ obi anwụghị anwụ adịghị n’ime Bible kama Krisendọm gbazitere ya site n’aka ndị na-abụghị ndị Kraịst ndị biri ndụ tupu ha.

8. Olee otú Bible si ekwu ihe megidere ozizi Krisendọm nke Atọ n’Ime Otu?

8 Ọzọ, ozizi Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm na-egosi Chineke ịbụ Chineke dị atọ n’ime otu nke dị omimi. Ma a dịghịkwa ahụ nkụzi ahụ n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, n’Aịsaịa 40:25, Chineke na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ònyekwa ka unu ga-asị na mụ yiri ya, m wee hà ka ya?” Azịza ya doro anya: Ọ dịghị onye ya na ya pụrụ ịha. Ọzọ, Abụ Ọma 83:18 na-ekwu n’ụzọ dị mfe, sị: “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, nanị gị, bụ Onye Kachasị Ihe Nile Elu n’elu ụwa nile.”​—⁠Leekwa Aịsaịa 45:5; 46:9; Jọn 5:19; 6:38; 7:16.

9. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere nkụzi nile nke Bible na nkụzi nile nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm?

9 Nkụzi nile nke Bible banyere Chineke na nzube ya nile doro anya, dị mfe nghọta, bụrụkwa ndị ezi uche dị na ha. Ma nkụzi nile nke chọọchị nile nke Krisendọm adịghị otú ahụ. N’ụzọ kakwa njọ, ha na-emegide Bible.

Omume Dị Iche Iche nke Asọpụrụghị Chineke

10, 11. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Bible si na-achọ ka e mee ihe dị iche site n’ihe chọọchị nile nke Krisendọm nọworo na-eme?

10 Tinyere ịkụzi ozizi ụgha dị iche iche, Krisendọm emechụwokwa Chineke na Bible ihu site n’omume ya nile. Ihe ndị ụkọchukwu na chọọchị nile meworo na narị afọ ndị gafeworonụ, ma nọgide na-eme n’oge anyị, bụ ihe dị iche site n’ihe Chineke nke Bible chọrọ, nakwa ihe dị iche site n’ihe Onye Hiwere Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ Jisọs Kraịst, kụziri ma mee.

11 Dị ka ihe atụ, Jisọs kụziiri ndị na-eso ya ka ha ghara itinye aka n’ihe omume nile nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa a ma ọ bụ tinye aka n’agha ya nile. Ọ kụzikwaara ha ka ha na-ahụ udo n’anya, na-edebe iwu, hụ mmadụ ibe ha n’anya n’enweghị ikpọasị ọ bụla, ọbụna ịdị njikere iji ndụ nke ha chụọ àjà kama iwepụ ndụ nke ndị ọzọ.​—⁠Jọn 15:13; Ọrụ 10:34, 35; 1 Jọn 4:​20, 21.

12. Gịnị ka Jisọs kwuru na a ga-eji mata ezi ndị Kraịst?

12 N’ezie, Jisọs kụziri na ịhụnanya maka ndị ọzọ ga-abụ akara a ga-eji mara ezi ndị Kraịst pụọ n’ebe ndị Kraịst ụgha nọ, ndị na-eme ka à ga-asị. Ọ gwara ndị ga-eso ya, sị: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”​—⁠Jọn 13:34, 35; 15:12.

13, 14. Gịnị na-egosi na chọọchị nile nke Krisendọm adịghị anọchite anya Chineke?

13 Ma, site n’otu narị afọ ruo narị afọ ọzọ, ndị ụkọchukwu Krisendọm etinyewo aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma kwadoo agha dị iche iche nke mba ha dị iche iche. Ọbụna na ha akwadowo akụkụ ndị na-emegiderịta ibe ha n’agha n’ime Krisendọm, dị ka agha ụwa abụọ nke narị afọ nke a. Ná nserịta okwu ndị ahụ, ndị ụkọchukwu n’akụkụ nke ọ bụla kpere ekpere maka mmeri, ndị òtù nke otu okpukpe na-egbukwa ndị òtù nke otu okpukpe ahụ si mba ọzọ. Ma ọ bụ otú ahụ ka Bible kwuru na ụmụ Setan ga na-eme, ọ bụghị ụmụ Chineke. (1 Jọn 3:​10-12, 15) Otú a, ọ bụ ezie na ndị ụkọchukwu na ndị na-eso ha azọrọwo na ha bụ ndị Kraịst, ha emegidewo nkụzi nile nke Jisọs Kraịst, bụ́ onye gwara ndị na-eso ya ka ha ‘wepụ mma agha.’​—⁠Matiu 26:​51, 52.

14 Ruo ọtụtụ narị afọ chọọchị dị iche iche so ndị ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Krisendọm nwee nkwekọrịta mgbe mba ndị ahụ meriri ndị ọzọ, gbara ha n’ohu, ma ọ bụ weda ha n’ala n’oge ha na-achị ala ndị ọzọ. Nke ahụ bụ otú ọ dị ruo ọtụtụ narị afọ n’Africa. China nwekwara ahụmahụ nke a, mgbe mba ndị Ọwụwa Anyanwụ ji ike guzobe ebe ha ga na-enwe mmetụta, dị ka n’oge Agha Ọgwụ Opium ndị ahụ na n’oge Nnupụisi Òtù Nzuzo Ndị China.

15. Ajọ ihe ndị dị aṅaa ka Krisendọm kpataworo?

15 Okpukpe nile nke Krisendọm ebutewokwa ụzọ n’ịkpagbu, imekpọ ọnụ, na ọbụna igbu ndị na-ekwenyereghị ha n’ọtụtụ narị afọ ndị ahụ nke akụkọ ihe mere eme nke a na-akpọ Oge Ọchịchịrị. N’oge Njụta Okwukwe, nke were ọtụtụ narị afọ, e nyere iwu maka, mesookwa ndị ezi mmadụ, bụ́ ndị aka ha dị ọcha, omume obi ịta mmiri dị iche iche, dị ka mmekpọ ọnụ na igbu mmadụ. Ndị kpataworo ihe ndị ahụ bụ ndị ụkọchukwu na ndị na-eso ha, ha nile zọrọkwaara na ha bụ ndị Kraịst. Ọbụna na ha nwara ikpochapụ Bible ka ndị nkịtị wee ghara ịgụ ya.

Ọ Bụghị nke Kraịst

16, 17. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na chọọchị ndị ahụ abụghị nke Kraịst?

16 Ee e, mba na chọọchị nile nke Krisendọm abụbeghị nke Kraịst. Ha abụghị ndị na-ejere Chineke ozi. Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu banyere ha, sị: “Ha na-ekwupuṭa na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnarị ya, ebe ha bụ ihe arụ, ndị na-adịghị ekwenyekwa, bụrụkwa ndị a jụrụ ajụ n’ebe ezi ọrụ nile ọ bụla dị.”​—⁠Taịtọs 1:16.

17 Jisọs kwuru na a pụrụ ịmata okpukpe ụgha site n’ihe ọ rụpụtara, mkpụrụ ya. Ọ sịrị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ. Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. . . . Ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. Ezi osisi apụghị ịmị ajọ mkpụrụ, osisi na-abaghị n’ihe apụghịkwa ịmị mkpụrụ ọma. A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ. Ya mere unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha [ndị amụma ụgha].”​—⁠Matiu 7:​15-⁠20.

18. Gịnị siworo ná nkụzi na omume dị iche iche nke Krisendọm pụta?

18 Otú a, site n’ihe ha kụziworo na ihe ha meworo, okpukpe nile nke Krisendọm egosipụtawo na nzọrọ ha nke ikwere na Bible na nke ịbụ ndị na-atụ egwu Chineke na ịbụ nke Kraịst bụ ihe ụgha. Ha emechuwo Chineke na Bible ihu. N’ime nke ahụ, ha aghọwo ihe ịsọ oyi nye ọtụtụ nde mmadụ ma mee ka ha chee ihu pụọ n’ikwere n’Onye Kasị Elu.

19. Ọdịda Krisendọm ọ̀ pụtara na Chineke na Bible adawo?

19 Otú ọ dị, ọdịda nke ndị ụkọchukwu na chọọchị nile nke Krisendọm, nakwa ọdịda nke okpukpe ndị ọzọ nile na-abụghị nke Krisendọm, apụtaghị ọdịda nke Bible. Ọ pụtaghịkwa na Chineke adawo. Kama nke ahụ, Bible na-agwa anyị banyere Onye Kasị Elu nke dị adị na nke na-eche banyere anyị na ọdịnihu anyị. Ọ na-egosi ụzọ ọ ga-esi nyeghachi ndị nwere obi eziokwu ụgwọ ọrụ bụ́ ndị chọrọ ime ezi ihe, ndị chọrọ ịhụ ka ikpe ziri ezi na udo jupụtara n’ebe nile n’ụwa. Ọ na-egosikwa ihe mere Chineke jiworo kwere ka ihe ọjọọ na nhụjuanya dịrị na ụzọ ọ ga-esi wepụ n’ụwa ndị na-emerụ ụmụ mmadụ ibe ha ahụ, nakwa ndị na-azọrọ na ha na-ejere ya ozi ma ha adịghị eme otú ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

“Ọkụ ‘Hell’” nke Dante

Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe atụ Doré nke Ndị Na-ere Ọkwá Chọọchị​—⁠Giampolo maka Divine Comedy nke Dante

Atọ n’ime otu ndị Hindu

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara The British Museum ikike

Atọ n’ime otu nke Ijipt

[Ebe E Si Nweta Foto]

Museo Egizio, Turin

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

N’imegide nkụzi dị iche iche nke Jisọs, ndị ụkọchukwu n’akụkụ abụọ ahụ akwadowo agha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto U.S. Army

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya