Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • pr nkebi 6 p. 22-25
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Oké Nhụjuanya na Ikpe Na-ezighị Ezi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Oké Nhụjuanya na Ikpe Na-ezighị Ezi?
  • Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Ihe Atụ
  • Ihe Gahiere
  • N’ihi Gịnị Ka O Jiworo Wee Ogologo Oge nke Ukwuu?
  • Chineke Gaje Itinye Aka n’Isi Nso
  • Nkwere Chineke Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị Na-eru Ọgwụgwụ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!
    Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!
  • Gịnị Bụ Ihe Siworo ná Nnupụisi Pụta?
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Ihe Mere Chineke Jiworo Kwere ka Ahụhụ Dịrị
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
pr nkebi 6 p. 22-25

Nkebi nke 6

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Oké Nhụjuanya na Ikpe Na-ezighị Ezi?

1, 2. N’ihi ahụmahụ ụmụ mmadụ, ajụjụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ?

1 Otú ọ dị, ọ bụrụ na Onye Kasị Elu ahụ zubere ka ndị zuru okè biri n’ụwa ruo ebighị ebi n’ime ọnọdụ paradaịs, ọ bụrụkwa na nke ahụ ka bụ nzube ya, n’ihi gịnị ka a na-enweghị paradaịs ugbu a? N’ihi gịnị ka, kama nke ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ jiworo nwee ọtụtụ narị afọ nke nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi?

2 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ jupụtara n’ahụhụ nke agha, mmeri ndị ọchịchị si ofesi, nrigbu, ikpe na-ezighị ezi, ịda ogbenye, ọdachi, ọrịa, na ọnwụ kpatara. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ihe ọjọọ jiworo mee ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha? Ọ bụrụ na Chineke nwere ike ime ihe nile, n’ihi gịnị ka o jiworo kwere ka e nwee oké nhụjuanya nke a ruo ọtụtụ puku afọ? Ebe Chineke haziri ma debe eluigwe na ụwa n’usoro nke ọma n’ụzọ dị ukwuu, n’ihi gịnị ka o ji kwere ka adịghị n’usoro na mbibi dịrị n’ụwa?

Otu Ihe Atụ

3-5. (a) Ihe atụ dị aṅaa pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe mere Chineke nke usoro ga-eji kwere ka e nwee adịghị n’usoro n’ụwa? (b) Olee nke n’ihe ndị ahụ pụrụ ịkpata ọnọdụ ahụ kwekọrọ n’ọnọdụ metụtara ụwa?

3 Ka anyị jiri otu ihe atụ kọwaa ihe mere Chineke nke usoro ga-eji kwere ka adịghị n’usoro dịrị n’ụwa. Cheedị echiche, biko, na ị gaara banye n’ime ọhịa wee jekwuru otu ụlọ, ka ị na-enyocha ụlọ ahụ, ị hụ na ọ dịghị n’usoro. A kụwasịrị window ya, uko ya mebisịrị emebisị, ụlọ ụzọ mbata ya e ji osisi wuo jupụtara n’oghere, ụzọ ya kokwasịrị nanị n’otu ihe njide ya, usoro pọmpụ ya adịghịkwa arụ ọrụ.

4 N’ihi ọrụ ndị a nile ọ gbara, ị̀ ga-ekpebi na ọ dịghị onye nhazi nwere ọgụgụ isi ọ pụrụ ịbụ ya haziri ụlọ ahụ? Adịghị n’usoro ahụ ọ̀ ga-emesi gị obi ike na ọ bụ nanị ihe ndabara pụrụ imepụtawo ụlọ ahụ? Ma ọ bụ ọ bụrụ na i kwubie na ọ dị onye haziri ma wuo ya, ị̀ ga-eche na onye a enweghị nkà, ọ dịghịkwa eche echiche?

5 Mgbe i nyochasikwuru ihe owuwu ahụ ike, ị na-ahụ na ná mbụ a rụrụ ya nke ọma, ọ na-enyekwa ihe àmà nke nlekọta sitere n’ezi echiche. Nanị ihe mere bụ na ihe ndị e ji wuo ya emebisịala, ọ na-adakasịkwa. Gịnị ka ọrụ na nsogbu ndị ahụ pụrụ igosipụta? Ha pụrụ ịdị na-atụ aro na (1) onye nwe ya nwụrụ; (2) ọ bụ onye owu ụlọ nke nwere nkà ma o nwekwaghị mmasị n’ụlọ ahụ; ma ọ bụ (3) o nyefere ụlọ ya ruo nwa oge n’aka ndị ọzọ na-enweghị ekele. Nke ikpeazụ yiri ọnọdụ metụtara ụwa a.

Ihe Gahiere

6, 7. Gịnị mere Adam na Iv mgbe ha mebiri iwu Chineke?

6 Site n’ihe ndekọ mbụ nke Bible, anyị na-amụta na ọ bụghị nzube Chineke ka ndị mmadụ taa ahụhụ ma ọ bụ nwụọ. Nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv, nwụrụ nanị n’ihi na ha nupụụrụ Chineke isi. (Jenesis, isi nke 2 na 3) Mgbe ha nupụrụ isi, ha adịkwaghị eme uche Chineke. Ha si ná nlekọta Chineke pụọ. Ya bụ na ha si n’ebe Chineke nọ, bụ́ “isi iyi ndụ,” kwụpụ onwe ha.​—⁠Abụ Ọma 36:9.

7 Dị ka ígwè ọrụ nke ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ọrụ mgbe a kwụpụrụ ya n’ebe o si enweta ike, ahụ na uche ha retọsịrị. N’ihi ya, Adam na Iv dakasịrị, kaa nká, mesịakwa nwụọ. Gịnị mezịrị? Ha laghachiri n’ebe ha sitere: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” Chineke adọwo ha aka ná ntị na ọnwụ ga-abụ ihe ga-esite n’inupụrụ iwu ya isi: “Ị ghaghị ịnwụ anwụ.”​—⁠Jenesis 2:17; 3:19.

8. Olee otú mmehie nke nne na nna anyị mbụ si metụta ezinụlọ mmadụ?

8 Ọ bụghị nanị na nne na nna anyị mbụ nwụrụ kamakwa ụmụ ha nile, agbụrụ mmadụ dum, abụwokwa ndị e doro n’okpuru ọnwụ. N’ihi gịnị? N’ihi na dị ka iwu ebumpụta ụwa si dị, ụmụ na-eketa àgwà dị iche iche nke ndị mụrụ ha. Ihe ụmụ nile nke nne na nna anyị mbụ ketakwara bụ ezughị okè na ọnwụ. Ndị Rom 5:12 na-agwa anyị, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam, nna ochie ihe a kpọrọ mmadụ] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere [site n’iketa ezughị okè, ya bụ, ọchịchọ ime mmehie].” Ebe ọ bụkwa na mmehie, ezughị okè, na ọnwụ agwụla ihe ụmụ mmadụ maara, ụfọdụ na-ele ha anya dị ka ihe ndị sitere n’okike na ihe ndị a na-apụghị izere ezere. Ma, e kenyere ụmụ mmadụ mbụ ikike na ọchịchọ ibi ndụ ruo ebighị ebi. Ọ bụ ya mere o ji abụ mgbakasị ahụ nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ mgbe ha chetara na n’ọdịnihu ọnwụ pụrụ iweta ndụ ha ná njedebe.

N’ihi Gịnị Ka O Jiworo Wee Ogologo Oge nke Ukwuu?

9. N’ihi gịnị ka Chineke jiworo kwere ka nhụjuanya gaa n’ihu ruo ogologo oge nke ukwuu?

9 N’ihi gịnị ka Chineke jiworo nye ụmụ mmadụ ohere ime ihe masịrị ha ruo ogologo oge nke ukwuu? N’ihi gịnị ka o jiworo kwere ka nhụjuanya dịrị ruo ọtụtụ narị afọ ndị a? Otu isi ihe kpatara ya bụ na e welitere otu ihe iseokwu dị oké mkpa: Ònye ka o ruuru ịchị isi? Chineke ò kwesịrị ịbụ Onye Na-achị ụmụ mmadụ, ka hà pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịchị onwe ha n’adabereghị n’ebe ọ nọ?

10. Ikike dị aṅaa ka e nyere ụmụ mmadụ, tinyere ibu ọrụ dị aṅaa?

10 E kenyere ụmụ mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ, ya bụ, ikike nke ịhọrọ ihe. E meghị ha dị ka ígwè na-arụ ọrụ ka mmadụ ma ọ bụ dị ka anụmanụ, ndị a na-eji amamihe ebumpụta ụwa eduzi. Ya mere ụmụ mmadụ pụrụ ịhọrọ onye ha ga-ejere ozi. (Deuterọnọmi 30:19; 2 Ndị Kọrint 3:17) Otú a, Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị: “Dị ka ndị nweere onwe ha, ma unu enweghị inwe onwe unu ahụ dị ka ihe mkpuchi nke ihe ọjọọ, kama dị ka ndị ohu nke Chineke.” (1 Pita 2:16) Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ nwere onyinye ahụ dị ebube nke nnwere onwe ime nhọrọ, ha aghaghị ịnakwere ihe si n’ihe ha họọrọ ime pụta.

11. Gịnị ga-abụ ụzọ e nwere nanị ya isi chọpụta ma ụzọ nke adabereghị na Chineke ọ̀ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma?

11 Nne na nna anyị mbụ họọrọ ihe na-adịghị mma. Ha họọrọ ụzọ nke inwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ. N’eziokwu, Chineke pụrụ imewo ka mmadụ abụọ mbụ ahụ nupụrụ isi nwụọ ozugbo mgbe ha jiri nnwere onwe ha ime nhọrọ mee ihe na-ezighị ezi. Ma nke ahụ agaraghị aza ajụjụ ahụ banyere iru eru Chineke ịchị ụmụ mmadụ. Ebe mmadụ abụọ mbụ ahụ chọrọ nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ, a ghaghị ịza ajụjụ ahụ: Ụzọ ahụ ọ̀ pụrụ iduga ná ndụ obi ụtọ, nke ihe ịga nke ọma? Ụzọ e nwere nanị ya isi chọpụta bụ ikwere ka nne na nna anyị mbụ na ụmụ ha gawara onwe ha, ebe nke ahụ bụ nhọrọ ha. Oge ga-egosipụta ma è kere ụmụ mmadụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịchị onwe ha n’adabereghị n’Onye Okike ha.

12. Olee otú Jeremaịa si tụọ ịchịisi mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị otú a?

12 Jeremaịa so dee Bible maara ihe ọ ga-arụpụta. N’ịbụ onye mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ dị ike nke Chineke na-eduzi ya, o dere n’eziokwu, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọ m aka ná ntị, Jehova.” (Jeremaịa 10:​23, 24) Ọ maara na ụmụ mmadụ aghaghị inwe nduzi amamihe si n’eluigwe nke Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi nnọọ na Chineke ekeghị ụmụ mmadụ inwe ihe ịga nke ọma n’adabereghị ná nduzi ya.

13. Gịnị ka ihe ndị sitere n’ọtụtụ puku afọ nke ịchịisi mmadụ gosipụtaworo n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya?

13 Ihe ndị sitere n’ọtụtụ puku afọ nke ịchịisi mmadụ na-egosi n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ dịrịghị ụmụ mmadụ iduzi ihe ndị ha na-eme n’adabereghị n’Onye Okike ha. Ebe ha nwaworo ya, ọ bụ nanị onwe ha ka ha ga-ata ụta maka ihe ọdachi ndị siworo na ya pụta. Bible na-eme ka nke a doo anya: “Oké nkume ahụ [Chineke], ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ: n’ihi na ụzọ ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ. Ha ebibiwo onwe ha, ọ bụghị nke ụmụ ya ka ọrụ nke dị ha n’ahụ bụ.”​—⁠Deuterọnọmi 32:​4, 5.

Chineke Gaje Itinye Aka n’Isi Nso

14. N’ihi gịnị ka Chineke na-agaghị ejikwa gbuo oge n’itinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ?

14 Ka o nyeworo ohere maka ngosipụta zuru ezu nke ọdịda ịchịisi mmadụ n’ọtụtụ narị afọ, Chineke pụrụ ịga n’ihu ugbu a itinye aka n’ihe omume nke ụmụ mmadụ ma kwụsị nhụjuanya, iru újú, ọrịa, na ọnwụ. Ka o nyeworo ụmụ mmadụ ohere iru ọ̀tụ̀tụ̀ ha kasị elu nke ihe ndị ha rụpụtaworo ná nkà sayensị, mmepụta ihe, nkà ọgwụ na ahụ ike, na n’akụkụ ndị ọzọ, ọ dịkwaghị mkpa ka Chineke nye ohere maka narị afọ ndị ọzọ maka ụmụ mmadụ adabereghị n’ebe Onye Okike ha nọ iji gosipụta ma hà pụrụ iweta ụwa dị n’udo, nke dị ka paradaịs. Ha ewetabeghị ya, ha apụghịkwa. Nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ arụpụtawo ụwa nke jọgburu onwe ya, na-akpọ asị, na-eweta ọnwụ.

15. Ndụmọdụ dị aṅaa nke Bible ka anyị ga-eme nke ọma ịṅa ntị na ya?

15 Ọ bụ ezie na e nwewo ndị ọchịchị nwere obi eziokwu bụ́ ndị chọsiworo ike inyere ihe a kpọrọ mmadụ aka, mgbalị ha nile enwebeghị ihe ịga nke ọma. N’ebe ọ bụla taa, e nwere ihe àmà nke ndakpọ n’ịchịisi ụmụ mmadụ. Ọ bụ ya mere Bible ji na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.”​—⁠Abụ Ọma 146:3.

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Ọbụna ndị ọchịchị ụwa nwere obi eziokwu enwebeghị ike iweta ụwa nke udo, nke dị ka paradaịs

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya