Nkebi nke 8
Dịrị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’Elu Ụwa Paradaịs
1, 2. Olee otú ndụ ga-adị n’okpuru ịchịisi Alaeze Chineke?
1 Olee otú ndụ ga-adị mgbe Chineke wepụrụ ajọ omume na nhụjuanya site n’ụwa ma webata ụwa ọhụrụ ya n’okpuru nchịkwa ịhụnanya nke Alaeze eluigwe ya? Chineke na-ekwe nkwa ‘ịsaghe aka ya ime ka afọ ju ihe nile ọ bụla dị ndụ.’—Abụ Ọma 145:16.
2 Olee ezi ọchịchọ ndị i nwere? Ọ̀ bụ na ha abụghị ndụ obi ụtọ, ọrụ bara uru, uju nke ihe onwunwe, gburugburu ebe obibi mara mma, udo n’etiti mmadụ nile, na nnwere onwe pụọ n’ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, nhụjuanya, na ọnwụ? Gịnịkwa banyere olileanya na-enye ọṅụ n’ime mmụọ? A na-enwetazu ihe ndị ahụ nile n’isi nso n’okpuru ịchịisi Alaeze Chineke. Rịba ama ihe amụma Bible na-ekwu banyere ngọzi ndị dị ebube ga-abịa n’ime ụwa ọhụrụ.
Ihe A Kpọrọ Mmadụ n’Udo Zuru Okè
3-6. Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị nwere na ụmụ mmadụ ga-enwe udo n’ụwa ọhụrụ?
3 “[Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; ọ na-esure ụgbọ ala nile [e ji alụ agha] n’ọkụ.”—Abụ Ọma 46:9.
4 “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4.
5 “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.
6 “Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ: ha etiwawo mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 14:7.
Mmadụ na Anụmanụ n’Udo
7, 8. Udo dị aṅaa ga-adị n’etiti ndị mmadụ na anụmanụ?
7 “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha. Nne ehi na anụ ọhịa bear ga-atakọkwa nri; ụmụ ha ga-amakpukọ; ọdụm ga-atakwa okporo ọka dị ka ehi. Nwa na-aṅụ ara ga-egwurikwa egwu n’elu ọnụ ajụala nọ, ọ bụkwa anya ubí ka nwa e mere ka ọ hapụ ara ga-atụkwasị aka ya. Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa.”—Aịsaịa 11:6-9.
8 “N’ụbọchị ahụ mụ na anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ nke ala ga-agbara ha ndụ . . . mee ka ha dinaa ala ná ntụkwasị obi.”—Hosea 2:18.
Ahụ Ike Zuru Okè, Ndụ Ebighị Ebi
9-14. Kọwaa ọnọdụ ahụ ike n’ime ụwa ọhụrụ.
9 “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 35:5, 6.
10 “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:4.
11 “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.
12 “Anụ ahụ ya ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata; ọ na-alaghachiru ụbọchị okorobịa ya.”—Job 33:25.
13 “Onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.
14 “Onye ọ bụla nke kwere na ya . . . [ga-enwe] ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
E Weghachite Ndị Nwụrụ Anwụ ná Ndụ
15-17. Olee olileanya e nwere maka ndị nwụworo anwụ?
15 “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15.
16 “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili [ncheta Chineke] ga-anụ olu ya, ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29.
17 “Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis [ili] nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha.”—Mkpughe 20:13.
Ụwa, Paradaịs nke Uju
18-22. Gaa na gịnị ka a ga-enwogha ụwa dum?
18 “Oké mmiri ozuzo nke ngọzi ga-adị. Osisi ọhịa ga-amịkwa mkpụrụ ya, ala ga-emekwa ihe omume ya, ha ga-anọkwa n’elu ala ha ná ntụkwasị obi.”—Ezikiel 34:26, 27.
19 “Ala emewo ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.”—Abụ Ọma 67:6.
20 “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose.”—Aịsaịa 35:1.
21 “Ugwu nile na ugwu nta nile ga-etiwa mkpu ọṅụ n’ihu unu, osisi nile nke ọhịa ga-akụkwa aka ha. N’ọnọdụ ogwu osisi fir ga-etolite, ọ bụkwa n’ọnọdụ uke ka osisi myrtle ga-etolite.”—Aịsaịa 55:12, 13.
22 “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:43.
Ezi Ụlọ Maka Mmadụ Nile
23, 24. Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị nwere na a ga-enwe ụlọ ọma zuru ezu maka mmadụ nile?
23 “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha . . . Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: . . . ndị m họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri.”—Aịsaịa 65:21-23.
24 “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.
Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs
25. Olileanya dị aṅaa dị ebube ka anyị nwere maka ọdịnihu?
25 Lee aha olileanya dị ebube ọ bụ maka ọdịnihu! Lee aha ezi nzube ndụ pụrụ inwe ugbu a mgbe e kegidere ya n’arịlịka nke olileanya siri ike nke na n’ụwa ọhụrụ Chineke, nsogbu nile nke taa ga-abụ ihe gafere agafe ruo mgbe ebighị ebi! “A gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịsaịa 65:17) Leekwa ka o si bụrụ ihe nkasi obi ịmara na ndụ mgbe ahụ ga-abụ nke agwụghị agwụ: “O [Chineke] lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 25:8.
26. Gịnị bụ ihe bụ isi maka ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke?
26 Ị̀ chọrọ ibi ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs ụwa ọhụrụ ahụ nke dị nnọọ nso ugbu a? ‘Gịnị ga-adị m mkpa ime iji nweta ihu ọma Chineke n’ọgwụgwụ ụwa nke a ma biri ndụ banye n’ime ụwa ọhụrụ ya?’ ka ị pụrụ ịjụ. Ọ dị gị mkpa ime ihe Jisọs gosipụtara n’ekpere nye Chineke: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
27. Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji kere okè ná nzube Chineke?
27 Ya mere, nweta Bible, wee chọpụta ma ihe ị gụworo n’akwụkwọ nta nke a hà bụkwa eziokwu. Chọta ndị ọzọ na-amụ ma na-akụzi eziokwu ndị a nke Bible. Nwere onwe gị pụọ n’okpukpe nile nke ihu abụọ ndị na-akụzi ma na-eme ihe ndị megidere Bible. Mụta otú ị ga-esi, gị na ọtụtụ nde ndị ọzọ nọwororị na-eme uche Chineke, pụrụ isi kere òkè ná nzube Chineke ka ụmụ mmadụ bie ndụ ebighị ebi n’elu ụwa paradaịs. Nabatakwa n’obi gị ihe Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ na-akpọsa banyere ọdịnihu dị nso: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
[Foto dị na peeji nke 31]
A ga-emezu nzube Chineke iweghachite paradaịs elu ụwa n’isi nso